Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ọrụ Dị Oké Mkpa nke Ndị Bụ́ Nna

Ọrụ Dị Oké Mkpa nke Ndị Bụ́ Nna

Ọrụ Dị Oké Mkpa nke Ndị Bụ́ Nna

“ỌNỤ ọgụgụ na-abawanye ụba nke ụmụ okorobịa chọrọ ikeresi òkè ike n’ịzụlite ụmụ ha. Pasent 82 nke ndị ikom dị afọ 21 ruo 39 na-ekpebi ịrụ ọrụ ga-enyekwu ha ohere isoro ezinụlọ ha nọkọọ,” ka akwụkwọ akụkọ Canada bụ́ Toronto Star na-ekwu banyere otu nchọpụta nke Mahadum Harvard mere na nso nso a. Dị ka nnyocha ahụ gosiri, bụ́ nke a nọ na ya gbaa ndị ikom na ndị inyom 1,008 si United States ndị dị afọ 21 ruo 65 na ụma ajụjụ ọnụ, pasent 71 nke ụmụ okorobịa kwuru na ha “ga-ekwe ka e gbubilata ụgwọ ọnwa ha iji nwetakwuo oge iji soro ezinụlọ ha nọkọọ.”

Gịnị mere ọtụtụ ndị nna ji na-achọ isoro ụmụ ha na-emekọrịtakwu ihe? David Blankenhorn, bụ́ otu n’ime ndị guzobere òtù bụ́ National Fatherhood Initiative, bụ́ nke na-akwalite ịbụ nna na-arụ ọrụ ya, onye dị uchu, kwuru na n’otu nnyocha e mere ndị ikom 1,600 si United States na 1994, pasent 50 kwuru na nna ha egboghị mkpa mmetụta uche ha n’oge ha bụ nwata. Ọtụtụ ndị bụ́ nna taa achọghị ka ihe a mee ọzọ.

Ndị nna bụ́ ndị na-eso ụmụ ha emekọrịta ihe n’ụzọ chiri anya pụrụ inwe mmetụta dị mma n’ahụ ha. Ka ọ na-ezo aka ná nchọpụta ahụ nke Ngalaba Na-ahụ Maka Ahụ Ike na Ijere Ọha Ozi nke United States bipụtara, akwụkwọ akụkọ bụ́ The Toronto Star kwuru na mgbe ndị nna so ụmụ ha na-eri nri, soro ha na-eme mkpapụ, nyere ha aka n’ihe omume a ga-eme n’ụlọ, a na-enwe “nsogbu akparamàgwà ole na ole karị, iso ndị ọzọ na-emekọrịtakwu ihe na ime nnọọ nke ọma n’ụlọ akwụkwọ karị n’etiti ụmụaka na ndị nọ n’oge uto ha.”

Ihe ndị ahụ e kwuru n’elu na-egosi ndokwa maka ịzụlite ụmụaka bụ́ nke dị irè taa dịkwa ka ọ dị mgbe e dere ya mbụ ihe karịrị puku afọ atọ gara aga. Onye Mmalite nke ezinụlọ nyere ndị bụ́ nna ntụziaka kpọmkwem ka ha na-ekeresi okè ike n’ịzụlite ụmụ ha. (Ndị Efesọs 3:14, 15; 6:4) A dụrụ ndị bụ́ nna ọdụ ịkụbanye ịhụnanya maka Chineke n’obi ụmụ ha nakwa ịgwa ha banyere iwu nchịkwa nakwa ihe ndị Chineke nyere n’iwu. Chineke gwara ha ka ha mee nke a ‘mgbe ha na-anọdụ n’ụlọ ha, na mgbe ha na-eje ije n’ụzọ, na mgbe ha na-edina ala, na mgbe ha na-ebili ọtọ.’—Deuterọnọmi 6:7.

Ịzụ ụmụ bụ ọrụ onye ọ bụla na-ekere òkè na ya. Bible na-adụ ụmụ ọdụ, sị: “Nụrụ ịdọ aka ná ntị nke nna gị, ahapụkwala iwu nne gị.” (Ilu 1:8, ọ bụ anyị dere okwu ụfọdụ n’aka akwụkwọ dị iche.) Òkè nna na-ekere dị oké mkpa. Ọ na-agụnye ịkwado na ịkwanyere nne ùgwù nakwa ikere òkè n’ọrụ ịzụ ụmụ. Ọ na-achọkwa iwepụta oge iji na-agụrụ ụmụaka ahụ ihe na isoro ha na-ekwurịta okwu. Nke a na-egbo mkpa mmetụta uche dị oké mkpa nke ụmụaka.

N’enweghị ihe ịrụ ụka ọ bụla, Bible bụ isi iyi kasịnụ nke ndụmọdụ a pụrụ ịdabere na ya na nke ụkpụrụ ndị dị mma maka ezinụlọ ndị nwere ezi uche. Nna nke na-egbo mkpa ime mmụọ, nke mmetụta uche, na nke anụ ahụ nke ezinụlọ ya n’ụzọ zuru ezu na-arụzu ọrụ Chineke kenyere ya.