Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ụzọ Ị Pụrụ Isi Nye Aka

Ụzọ Ị Pụrụ Isi Nye Aka

Ụzọ Ị Pụrụ Isi Nye Aka

“Enyemaka dị ụmụaka dara mbà n’obi mkpa. Ma ụmụaka apụghị inweta enyemaka ahụ n’onwe ha. Onye toworo eto aghaghị ịmata nsogbu ahụ ma were ya dị ka ihe kwesịrị nlebara anya. Nke ahụ bụ akụkụ siri ike na ya.”—Dr. Mark S. Gold.

GỊNỊ ka ị pụrụ ime ma ọ bụrụ na o yie gị ka nwa gị nọ n’afọ iri na ụma ọ̀ dara mbà n’obi? Nke mbụ, adịla ngwa n’iru ná nkwubi okwu. E kwuwerị, mgbaàmà ndị ahụ nwere ike ịdị na-egosi ihe ọzọ dị nnọọ iche. * Ọzọkwa, ndị ntorobịa nile na-enwe oge ụfọdụ ha na-adịghị enwe obi ụtọ. Ma ọ bụrụ na ọnọdụ ahụ adịgide ma yie ka ọ karịala ọnọdụ enweghị obi ụtọ bụ́ nke na-adịghị adịte aka, ọ pụrụ ịkasị mma ịga hụ dọkịta. Banyere nke a, ọ dị mma iburu n’uche okwu Jisọs bụ́: “Mkpa dibịa akpaghị ndị dị ike, kama ọ na-akpa ndị ahụ na-adịghị mma.”—Matiu 9:12.

Ezochirila dọkịta gị ihe ọmụma ọ bụla pụrụ inye aka bụ́ nke ị pụrụ inye, gụnyere mgbanwe ụfọdụ weere ọnọdụ n’oge na-adịbeghị anya ná ndụ nwa ahụ bụ́ ndị pụrụ iso mee ka ọ ghara inwe mmasị n’ihe. Jide n’aka na dọkịta ahụ wepụtara oge zuru ezu gee ntị n’ihe mgbaàmà ndị ahụ tupu o kwuo ihe ọ chọpụtara. “Ọ gaghị ekwe omume inweta ihe ọmụma nile dị mkpa iji chọpụta n’ụzọ zuru ezu ihe na-eme nwatakịrị na nanị nnọkọ otu ugbo nke were minit iri abụọ,” ka Dr. David G. Fassler na–adọ aka ná ntị.

Nwere onwe gị ịjụ dọkịta ahụ ajụjụ ọ bụla ị pụrụ inwe. Dị ka ihe atụ, ọ bụrụ na dọkịta echee na nwa gị nọ n’afọ iri na ụma dara mbà n’obi, ị pụrụ ịjụ ya ihe mere o ji chee na ọ bụghị nsogbu ndị ọzọ. Ọ bụrụ na i nwee obi abụọ banyere nnyocha dọkịta ahụ mere, gwa ya na ị ga-achọ ịjụta echiche onye nke abụọ. N’ezie, ọ dịghị dọkịta ọ bụla na-akwụwa aka ọtọ bụ́ onye nwere obi ziri ezi nke ga-asị gị emela otú ahụ.

Iche Ọnọdụ ahụ Ihu

Ọ bụrụ na nwa gị nọ n’afọ iri na ụma dara mbà n’obi, emela ihere maka ọnọdụ ahụ. Nke bụ́ eziokwu bụ na ndị na-eto eto kasị bụrụ ndị ezigbo mmadụ pụrụ ịda mbà n’obi. N’ezie Bible na-egosi na ụfọdụ ndị gbalịrị ike ha ijere Chineke ozi nwere mmetụta uche ndị na-egbu mgbu, n’agbanyeghị afọ ndụ ha. Tụlee ihe banyere Job bụ́ onye kwesịrị ntụkwasị obi, onye chere na Chineke agbahapụwo ya wee kwupụta na ike ndụ agwụwo ya. (Job 10:1; 29:2, 4, 5) Hana bụ ohu Chineke nke ghọrọ onye ‘ọ dị ilu ná mkpụrụ obi’ nke na ọ pụghị iri ihe. (1 Samuel 1:4-10) E nwekwara nwoke na-asọpụrụ Chineke bụ́ Jekọb, bụ́ onye ruru újú ruo ọtụtụ ụbọchị mgbe nwa ya nwoke nwụsịrị, ọ ‘jụkwara na a gaghị akasi ya obi.’ Leenụ, ọbụna Jekọb kwuru na ya chọrọ isoro nwa ya baa n’ili! (Jenesis 37:33-35) N’ihi ya, ahụhụ mmetụta uche adịghị abịakarị n’ihi ntụpọ ụfọdụ e nwere n’ụzọ ime mmụọ.

Ka o sina dị, ịda mbà n’obi nke onye nọ n’afọ iri na ụma pụrụ isiri ndị mụrụ ya ike. “Aghaghị m ịkpachara anya banyere ihe ndị m na-ekwu ma na-eme,” ka nne nke otu onye nọ n’afọ iri na ụma dara mbà n’obi na-ekwu. “M na-enwe nchegbu, na-atụ ụjọ, na-ese okwu, na-ewe iwe ma na-enwe ike ọgwụgwụ.” Onye ọzọ na-ekweta, sị: “Ana m apụ ma hụ nne nke ya na nwa ya nwanyị nọ n’afọ iri na ụma gara ahịa, obi na-agbawa m n’ihi na ana m eche na ohere nke mụ na [nwa m nwanyị] ime otú ahụ efunahụwo m, na agaghịkwa m enwe ya ọzọ.”

Mmetụta ndị dị otú ahụ dị otú ha kwesịrị. Otú ọ dị, mgbe ụfọdụ, ha pụrụ irikpu mmadụ. Ọ bụrụ na nke ahụ emee, gịnị ma ị kọọrọ ya otu enyi ị tụkwasịrị obi? Ilu 17:17 na-ekwu, sị: “Na mgbe nile ka enyi na-ahụ n’anya, a na-amụkwa nwanne banyere ahụhụ.” Ọzọkwa, elegharala ekpere anya. Bible na-emesi anyị obi ike na ọ bụrụ na anyị atụkwasị Chineke ibu anyị, ọ ga-anagide anyị.—Abụ Ọma 55:22

Àgwà nke Ịta Ụta

Ọtụtụ nne na nna nke ndị nọ n’afọ iri na ụma dara mbà n’obi na-aghọ ndị nwere nkụda mmụọ nke ukwuu ma na-eche na ụta dịịrị ha n’ụzọ ụfọdụ maka ọnọdụ ahụ. “Mgbe nwa gị dara mbà n’obi,” ka otu nne na-ekweta, “ị na-enwe obi amamikpe, ọ dịghịkwa onye ọ bụla pụrụ ime ka i kweta ịhapụ inwe mmetụta dị otú ahụ. Ị na-anọgide na-eche, sị, ‘Olee ebe anyị mejọrọ ihe? Olee ebe mgbanwe a malitere? Olee otú m si tụnye ụtụ na nke a?’” Olee otú ndị mụrụ ụmụ pụrụ isi mee ka echiche ha dịrị otú kwesịrị n’ọnọdụ a?

Obi abụọ adịghị ya na ọnọdụ na-agbakasị ahụ e nwere n’ebe obibi pụrụ imetụta nwatakịrị n’ụzọ dị njọ. E nwere ezi ihe mere Bible ji adụ ndị bụ́ nna ọdụ, sị: “Akpasula ụmụ unu iwe, ka obi ghara ifu ha.” (Ndị Kọlọsi 3:21) Ya mere, a na-adụ ndị mụrụ ụmụ ọdụ inyocha ụzọ ha si emeso ụmụ ha ihe ma mee mgbanwe n’ebe ndị ọ dị mkpa. Ma ịda mbà n’obi adịghị abụkarị n’ihi azụghị nwa nke ọma. N’ezie, a pụrụ inwe nsogbu ahụ n’ime ezinụlọ ndị kasị nwee ịhụnanya. N’ihi ya, ọ dịghị mkpa ka ndị mụrụ ụmụ bụ́ ndị na-anwa ike ha inyere ụmụ ha aka nwee obi amamikpe.

Ọ dịkwa mkpa ịghara ịta onye ahụ nọ n’afọ iri na ụma dara mbà n’obi ụta. E kwuwerị, o nwere ike bụrụ na ọ dịghị ihe ọ pụrụ ime banyere nsogbu ahụ. “Agaghị m ata ya ụta ma ọlị maka inwe ọkọ kịtịkpa ma ọ bụ ma oyi baa ya n’ahụ,” ka otu nne kwuru. “Ma mgbe ọ dara mbà n’obi,” ka ọ na-ekweta, “emere m otú ahụ. Atara m nwa m ụta maka ịda ọrịa—bụ́ nke na-ewute m nke ukwuu.” Ile ịda mbà n’obi anya dị ka ọrịa kama ịbụ adịghị ike ga-enyere ndị mụrụ ụmụ nakwa ndị ọzọ aka ilekwasị anya n’otú ha pụrụ isi kwadoo onye ahụ nwere nsogbu ahụ.

Ịzụlite onye nọ n’afọ iri na ụma nke dara mbà n’obi pụrụ ịkpatara ndị mụrụ ya oké esemokwu. “Anyị tara ibe anyị ụta,” ka otu onye bụ́ nwunye na-ekwu, “karịsịa mgbe anyị chere banyere ụdị ndụ anyị tụrụ anya ya na ụdị ndụ anyị mesịrị na-ebi n’ihi nwa anyị nwoke.” Tim, bụ́ onye nwa ya nwayị dara mbà n’obi, na-ekweta, sị: “Ọ dị mfe ịta onye òtù ọlụlụ gị ụta. Ọ bụrụ na nne na nna na-enwe nsogbu alụmdi na nwunye tupu nwa ha amalite igosipụta ihe mgbaàmà nke ịda mbà n’obi, akparamàgwà na-eju anya nke nwata ahụ pụrụ ịbụ ihe ga-etisazi ihe.” Ekwela ka ịda mbà n’obi nke nwa gị kpata nkewa n’alụmdi na nwunye gị! N’ezie, ọ baghị uru ọ bụla ịta mmadụ ụta—ma ọ̀ bụ onwe gị, nwa gị, ma ọ bụ onye òtù ọlụlụ gị. Ihe dị mkpa bụ ịkwado onye ahụ nwere nsogbu ahụ.

Inye Nkwado

Bible na-adụ ndị Kraịst ọdụ, sị: “Na-agụgụnụ ndị dara mbà n’obi.” (1 Ndị Tesalọnaịka 5:14) Ọ bụrụ na onye ntorobịa ahụ dara mbà n’obi na-eche na ya enwechaghị ùgwù onwe onye, ị pụrụ inye aka. N’ụzọ dị aṅaa? N’ezie, ọ bụghị site n’ikwu okwu amamikpe ndị dị ka, “I kwesịghị inwe mmetụta dị otú ahụ” ma ọ bụ, “Àgwà ahụ adịghị mma.” Kama nke ahụ, gbalịa ịdị na-enwe ọmịiko site n’igosipụta “mmetụta maka ndị ọzọ.” (1 Pita 3:8, NW) Pọl nyere ndị Kraịst ndụmọdụ ‘iso ndị na-akwa ákwá n’ịkwa ákwá.’ (Ndị Rom 12:15) Cheta na onye dara mbà n’obi n’ezie na-enwe nnọọ ihe mgbu. Ihe mgbu ahụ abụghị nke e chepụtara echepụta, ọ bụghịkwa nke a na-ama ụma egosipụta nanị iji dọta uche ndị ọzọ. Mgbe i gesịrị ntị, gbalịa ịchọpụta ihe onye ahụ nwere nsogbu ahụ na-eche. Jụọ ya ihe mere o ji eche otú ahụ. Jirizie nwayọọ na ndidi nyere onye ahụ nọ n’afọ iri na ụma aka ịhụ ihe mere ile onwe ya anya n’ụzọ dị ala otú ahụ ji bụrụ nke na-ekwesịghị ekwesị. Imesighachi onye nwere nsogbu ahụ obi ike na Chineke hụrụ ya n’anya ma nwee obi ebere n’ebe ọ nọ pụrụ inye aka ibelata nchegbu ya.—1 Pita 5:6, 7.

A pụrụ inwe ihe ndị ọzọ bara uru ị pụrụ ime. Dị ka ihe atụ, ọ pụrụ ịdị gị mkpa ijide n’aka na nwa gị nọ n’afọ iri na ụma na-ezu ike nke ọma, na-eri ihe na-edozi ahụ nke ọma, ma na-emega ahụ nke ọma. (Eklisiastis 4:6) Ọ bụrụ na e nwere ọgwụ ndị a sịrị ka ọ na-aṅụ, ọ ga-abụ ihe amamihe dị na ya inyere onye ahụ nọ n’afọ iri na ụma aka ịhụ mkpa ọ dị ịṅụ ha. Adala mbà n’inye nkwado, akwụsịkwala igosi ịhụnanya.

N’eziokwu, ịda mbà n’obi nke onye nọ n’afọ iri na ụma pụrụ ịbụ ahụmahụ na-emekpa ahụ, nye onye nwere nsogbu ahụ nakwa ndị ọzọ nọ n’ezinụlọ. N’ikpeazụ, ndidi, nnọgidesi ike, na ịhụnanya ga-abụ ihe mgbakwasị ụkwụ maka inyere ndị nọ n’afọ iri na ụma dara mbà n’obi aka.

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 3 A sịrị na ọrịa ụfọdụ—gụnyere mononucleosis, ọrịa shuga, ụkọ ọbara, hypothyroidism, na ụkọ shuga n’ọbara—pụrụ ịkpata mgbaàmà ndị yiri nke ịda mbà n’obi.

[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 11]

Onye dara mbà n’obi n’ezie na-enwe nnọọ ihe mgbu. Ihe mgbu ahụ abụghị nke e chepụtara echepụta

[Igbe dị na peeji nke 13]

Ọ BỤRỤ NA Ị BỤ ONYE NỌ N’AFỌ IRI NA ỤMA NKE DARA MBÀ N’OBI

Ị nọghị n’enweghị enyemaka, ọnọdụ gị abụghịkwa nke olileanya na-adịtụghị na ya. Ịda mbà n’obi gị nwere ike ịbụ n’ihi (1) mmiri ọgwụ ahụ ahaghị otú o kwesịrị ma ọ bụ (2) ọnọdụ ndị e nwere ná ndụ bụ́ ndị ị na-apụghị ịchịkwa. Nke ọ sọrọ ya bụrụ n’ime ha, ụta adịghịrị gị maka ọnọdụ gị. N’agbanyeghị nke ahụ, gịnị ka ị pụrụ ime banyere ya?

Bible na-ekwu na “e nwere enyi na-arapara n’ahụ karịa nwanne.” (Ilu 18:24, NW) Gịnị ma ị chọta ụdị enyi ahụ ma kọọrọ ya mmetụta gị? Nne gị ma ọ bụ nna gị ma ọ bụ onye ọzọ tozuworo okè pụrụ ịbụ onye inyeaka gị kasịnụ n’ọgụ ahụ ị na-alụso ịda mbà n’obi.

Ọ bụrụ na ndị mụrụ gị echee na ị dara mbà n’obi, ha pụrụ ịkpọrọ gị gaa na nke onye dọkịta nwere ahụmahụ n’ịgwọ nsogbu ahụ. Nke a bụ ihe amamihe dị na ya ime, n’ihi na mgbe mgbe, a pụrụ ime ka ịda mbà n’obi belata nke ukwuu site n’ọgwụgwọ, ma ya bụrụ n’ebe a na-agwọ ya. Dị ka ihe atụ, ọ bụrụ na ọ bụ mmiri ọgwụ ahụ ahaghị otú o kwesịrị kpatara ya, a pụrụ inye gị ọgwụ na-akwụsị ịda mbà n’obi. Ọ bụrụ na ọ dị otú a n’ọnọdụ nke gị, emela ihere ịṅụ ọgwụ. Nanị ihe ọ ga-eme bụ ime ka mmiri ọgwụ dị n’ahụ gị dịghachi otú o kwesịrị, nke a pụkwara ịbụ isi ihe ga-enyere gị aka inwetaghachi ọṅụ na ahụ ike ruo n’ọ̀tụ̀tụ̀ ụfọdụ ná ndụ gị.

Ọtụtụ ndị dara mbà n’obi enwetawo nkasi obi site n’ịgụ Bible nakwa site n’ịbịarukwu Chineke nso site n’ekpere. Bible na-emesi anyị obi ike, sị: “Jehova nọ nso ndị obi ha tiwara etiwa, Ọ na-azọpụtakwa ndị a zọpịaworo n’ime mmụọ ha.” *Abụ Ọma 34:18.

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 28 Iji nwetakwuo ihe ọmụma, lee isiokwu bụ́ “Ndị Na-eto Eto Na-ajụ Sị . . . M̀ Kwesịrị Ịgwa Mmadụ na M Dara Mbà n’Obi?” bụ́ nke pụtara ná mbipụta Teta! nke November 8, 2000.

[Igbe/Foto dị na peeji nke 14]

ENYEMAKA NA OLILEANYA MAKA NDỊ NWERE NSOGBU AHỤ

Ebe ọ bụ na ịda mbà n’obi bụ isiokwu dị mgbagwoju anya, ọ bụghị akụkụ ya nile ka a pụrụ ịtụle n’usoro isiokwu a dị mkpirikpi. Otú o sina dị, ndị na-ebipụta Teta! nwere obi ike na isi ihe ndị e kwuru n’ebe a pụrụ inyere ndị nọ n’afọ iri na ụma na ndị mụrụ ha aka ịtachiri nsogbu a na-agwụ ike obi.

Ị pụrụ ịrịbawo ama na ihe dị ukwuu ná nduzi ndị e nyere n’isiokwu bu ụzọ dabeere na Bible. N’eziokwu, ọ bụ akwụkwọ ochie. Ma, ndụmọdụ ya dịkwa irè taa dị ka ọ dị mgbe e dere ya. N’ihi gịnị? N’ihi na n’agbanyeghị na oge agbanweela, ọdịdị mmadụ agbanwebeghị. Isi ihe ndị chere ọgbọ ndị gara aga ihu na-echekwa anyị ihu. Ihe dị iche bụ na taa, nsogbu ndị a ka ukwuu ma na-enwe mmetụta ka ukwuu.

Otú ọ dị, e nwere ihe ọzọ mere Bible ji dị nnọọ irè: E dere ya n’ike mmụọ nsọ Chineke. (2 Timoti 3:16) Dị ka Onye Okike anyị, ọ maara ihe dị anyị mkpa iji nwee ọṅụ na afọ ojuju ná ndụ.

N’ezie, Bible abụghị akwụkwọ ahụ ike. N’ihi ya, ọ dịghị akagbu mkpa ọ dị anyị ịchọ ọgwụgwọ kwesịrị ekwesị maka ọrịa dị iche iche, dị ka ịda mbà n’obi. Ma, Bible nwere ụkpụrụ ndị pụrụ inyere anyị aka ịkasi ndị nwere nsogbu ahụ obi. Tụkwasị na nke ahụ, o bu nkwa Chineke bụ́ na n’oge na-adịghị anya ọ ga-agwọ ọrịa anyị nile. (Abụ Ọma 103:3) Ee, Jehova na-ezube “ime ka obi nke ndị a zọpịara azọpịa n’ime mmụọ ha dị ndụ.”—Aịsaịa 57:15.

Ọ̀ ga-amasị gị ịmụtakwu banyere olileanya a dị ebube? Biko kpọtụrụ Ndịàmà Jehova nọ n’ógbè unu ma ọ bụ deta akwụkwọ n’adres nke kwesịrị ekwesị dị na peeji nke 5 na magazin a.

[Foto dị na peeji nke 10]

Gbalịa ịdị na-egosipụta mmetụta maka ndị ọzọ

[Foto dị na peeji nke 11]

Ọ bụrụ na ọnọdụ uche nke ịda mbà n’obi nke onye nọ n’afọ iri na ụma adịgide, ọ bụ ihe amamihe dị na ya ịga hụ dọkịta

[Foto ndị dị na peeji nke 12]

Dị ka nne ma ọ bụ nna, adịla ngwa n’ịta onwe gị, onye òtù ọlụlụ gị, ma ọ bụ nwa gị nọ n’afọ iri na ụma ụta