Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ime Ka A Mata Ihe Ndị Na-akpata Ya

Ime Ka A Mata Ihe Ndị Na-akpata Ya

Ime Ka A Mata Ihe Ndị Na-akpata Ya

“Dị ka ọ na-adịkarị, ọ bụghị nanị otu ihe na-akpata ịda mbà n’obi nke ndị nọ n’afọ iri na ụma kama ọ bụ njikọ nke ihe ndị na-akpata nchekasị.”—Dr. Kathleen McCoy.

GỊNỊ na-akpata ịda mbà n’obi nke ndị nọ n’afọ iri na ụma? Ọ pụrụ ịgụnye ọtụtụ ihe. Otu ihe bụ na, mgbanwe anụ ahụ na nke mmetụta uche ndị mmalite oge uto na-eweta pụrụ ime ka ndị na-eto eto jupụta n’obi abụọ na egwu, na-eme ka ha bụrụ ndị pụrụ inwe ajọ ọnọdụ uche. Ọzọkwa, ndị nọ n’afọ iri na ụma na-enwekarị mmetụta uche ndị na-adịghị mma mgbe ha chere na ndị ọgbọ ha ma ọ bụ onye ha zụliteworo mmetụta ịhụnanya n’ebe ọ nọ ajụwo ha. Ọzọkwa, dị ka e kwuru n’isiokwu anyị ji malite, ndị nọ n’afọ iri na ụma nke taa na-etolite n’ụwa nke pụrụ ịkpata ịda mbà n’obi n’onwe ya. N’ezie anyị na-ebi ‘n’oge dị oké egwu.’—2 Timoti 3:1.

N’ime ka nsogbu ahụ ka njọ, ndị ntorobịa na-enwe nrụgide nke ndụ, kpmkwem na nke mbya, ha enweghịkwa ma nkà ma ahụmahụ nke ndị tozuworo okè nwere. N’ihi ya, ndị nọ n’afọ iri na ụma na-eyikarị ndị na-eme njem nleta bụ́ ndị na-achọ ụzọ n’ógbè ndị ha na-amaghị nke ọma—na-abụ ndị ihe ndị gbara ha gburugburu gbara gharịị, ọtụtụ mgbe kwa, ha adịghị achọ ịrịọ maka enyemaka. Ọnọdụ ndị a pụrụ ịghọ ihe ndị ga-akpalite ịda mbà n’obi.

Ma e nwere ọtụtụ ihe ndị ọzọ pụrụ iso kpata ịda mbà n’obi nke ndị nọ n’afọ iri na ụma. Ka anyị tụlee nanị ole na ole n’ime ha.

Ịda Mbà n’Obi na Mfu

Mgbe ụfọdụ ịda mbà n’obi na-abịa mgbe e nwesịrị oké mfu—ikekwe ọnwụ nke onye a hụrụ n’anya ma ọ bụ ịbụ onye nne ma ọ bụ nna ya hapụrụ site n’ịgba alụkwaghịm. Ọbụna ọnwụ nke anụ e ji mere enyi pụrụ itinye onye nọ n’afọ iri na ụma n’inwe ịda mbà n’obi.

E nwekwara ụdị mfu ndị na-adịghị apụtacha ìhè. Dị ka ihe atụ, ịkwaga n’ógbè ọhụrụ pụtara mmadụ ịhapụ ebe ọ maara nke ọma na ndị enyi ọ hụrụ n’anya. Ọbụna iru ihe mgbaru ọsọ mmadụ tụsiworo anya ya ike—dị ka ịgụsị akwụkwọ—pụrụ ịkpalite mmetụta nke mfu. E kwuwerị, mmadụ ịmalite ụdị ndụ ọhụrụ pụtara na ọ ga-ahapụ ọnọdụ ntụsara ahụ na nke enweghị nchekasị ọ nọbu. E nwekwara ndị ntorobịa na-aghaghị idi ụdị ụfọdụ nke ọrịa na-adịghị ala ala. N’ọnọdụ dị otú ahụ, ihe mgbu nke mmadụ ịgbapụ iche n’ebe ndị ọgbọ ya nọ—ikekwe ọbụna bụrụ onye ha na-eleghara anya—pụrụ ime ka onye nọ n’afọ iri na ụma nwee mmetụta nke ịbụ onye na-adịchaghịzi otú o kwesịrị ịdị.

N’eziokwu, ọtụtụ ndị na-eto eto na-enwe mfu ndị dị otú ahụ ma ghara ịbụ ndị ha rikpuru. Ha na-enwe mwute, ha na-ebe ákwá, ha na-eru újú—ma ka oge na-aga, ọnọdụ ahụ na-abịa mara ha ahụ. Otú ọ dị, gịnị mere o ji abụ na ihe ka ọtụtụ ná ndị nọ n’afọ iri na ụma na-anagideli nrụgide nke ndụ, ebe ndị ọzọ na-enwe obi ịda mbà? E nweghị azịza ndị dị mfe, n’ihi na ịda mbà n’obi bụ nsogbu dị mgbagwoju anya. Ma ụfọdụ ndị nọ n’afọ iri na ụma nwere ike ịdaba n’ọnọdụ ahụ karị.

Njikọ Ya na Mmiri Ọgwụ Ahụ Nwere

Ọtụtụ ndị ọkachamara n’ihe metụtara ahụ ike nke uche kweere na mmiri ọgwụ ahụ ahaghị otú o kwesịrị n’ụbụrụ na-ekere òkè bụ́ isi n’ịda mbà n’obi. * Ahaghị otú kwesịrị ahụ nwere ike bụrụ nke e butere site n’ọmụmụ, n’ihi na ndị nnyocha achọpụtawo na ndị nọ n’afọ iri na ụma bụ́ ndị nwere nne ma ọ bụ nna dara mbà n’obi yikarịrị ka hà ga-adaba n’ọnọdụ ahụ n’onwe ha. “N’ọtụtụ ọnọdụ, ụmụaka ndị dara mbà n’obi na-enwe ma ọ dịkarịa ala nne ma ọ bụ nna nke na-enwekwa nsogbu nke ịda mbà n’obi,” ka akwụkwọ bụ́ Lonely, Sad and Angry na-ekwu.

Nke a na-ewelite ajụjụ bụ́, Ụmụaka hà na-eketa ịda mbà n’obi eketa n’ezie, ka ọ̀ bụ nnọọ na ha na-amta ịda mbà n’obi amta site n’ibinyere nne ma ọ bụ nna dara mbà n’obi? ‘Ajụjụ ahụ bụ́ ma ọ̀ bụ ihe e bu pụta ụwa ka ọ bụ ihe a zụlitere azụlite’ siri ike ọzịza, n’ihi na ụbụrụ dị oké mgbagwoju anya, dịkwa ka ọ dị n’ọtụtụ ihe ndị ọzọ pụrụ iso kpata ịda mbà n’obi nke ndị nọ n’afọ iri na ụma.

Ịda Mbà n’Obi na Ọnọdụ Ezinụlọ

Ịda mbà n’obi abụrụwo nke a kpọrọ okwu dịịrị ezinụlọ, e nwekwara ezi ihe kpatara ya. Dị ka e kwuworo, a pụrụ inwe ihe e ketara eketa bụ́ nke na-ebufe àgwà nke ịda mbà n’obi site n’otu ọgbọ gaa n’ọzọ. Ma ọnọdụ ezinụlọ pụkwara ikere òkè. “Ụmụaka ndị nne na nna ha na-emeso ihe n’ụzọ na-adịghị mma nọ n’ihe ize ndụ dị ukwuu nke ịda mbà n’obi,” ka Dr. Mark S. Gold dere. “Otú ahụ ka ọ dịkwa ụmụaka ndị nne na nna ha na-atụchakarị, bụ́kwa ndị na-elekwasị anya n’erughị eru nke nwa ha.” Ịda mbà n’obi pụkwara ịmalite mgbe nne na nna na-echebebiga nwa ha ókè ma na-egosipụta ịhụnanya gabigara ókè n’ebe ha nọ. Otú ọ dị, n’ụzọ na-akpali mmasị, otu onye nnyocha chọpụtara na ụmụaka na-aka eyi ka ha ga-ada mbà n’obi mgbe ndị mụrụ ha na-adịghị nnọọ egosi mmasị n’ebe ha nọ.

Otú ọ dị, nke a aptaghna ndị nile nọ n’afọ iri na ụma bụ́ ndị dara mbà n’obi bụ n’ihi na nne na nna ha azụghị ha nke ọma. Ịzọrọ ihe dị otú ahụ n’eleghị anya n’azụ ga-abụ ileghara ọtụtụ ihe ndị ọzọ pụrụ iso kpata nsogbu ahụ anya. Ma, n’ọnọdụ ụfọdụ, ọnọdụ ndị e nwere n’ezinụlọ bụ isi ihe dị mkpa nke pụrụ imetụta ọnọdụ ahụ. “Ụmụaka nọ n’ezinụlọ nne na nna na-esekarị okwu nọ n’ihe ize ndụ ka ukwuu nke ịda mbà n’obi karịa ụmụaka nọ gburugburu ebe ndị a na-adịghị enwecha nsogbu,” ka Dr. David G. Fassler dere. “Otu ihe na-akpata ya bụ na nne na nna ahụ na-ese okwu na-etinye nnọọ uche n’esemokwu ha nke na ha na-eleghara mkpa nke ụmụ ha anya. Ihe ọzọ bụ na nne na nna ahụ na-esekarị okwu n’ihi ụmụ ha, bụ́ nke pụrụ ịkpatara ụmụ ahụ obi amamikpe, iwe, na ọnụma.”

Ndị a bụ nanị ihe ụfọdụ pụrụ iso kpata ịda mbà n’obi nke ndị nọ n’afọ iri na ụma. E nwekwara ndị ọzọ. Dị ka ihe atụ, ụfọdụ ndị ọkachamara na-ekwu na ihe ndị metụtara gburugburu ebe obibi (dị ka erighị ihe na-edozi ahụ, nsí, na iji ihe na-eri ahụ eme ihe n’ụzọ na-ezighị ezi) pụrụ ịkpata ịda mbà n’obi. Ndị ọzọ na-ekwu na ụfọdụ ọgwụ (dị ka ụfọdụ ọgwụ ọkọ na nke nkụjụ ahụ) pụrụ iso kpata ya. O yikwara ka ụmụaka ndị nwere nsogbu ịmụta ihe hà pụrụ ịda mbà n’obi karịsịa, ikekwe n’ihi na ùgwù onwe onye ha yiri ka ọ na-adalata adalata ka ha na-aghọta na ha apụghị ịchụkwudo ụmụ klas ha.

Otú ọ dị, n’agbanyeghị ihe na-akpata ya, ọ dị oké mkpa ịtụle ajụjụ bụ́, Olee otú a pụrụ isi nyere ndị nọ n’afọ iri na ụma dara mbà n’obi aka?

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 11 Ụfọdụ na-eche na ọ bụ ezie na ọtụtụ ndị na-enwe nsogbu ahụ bu ọnọdụ ahaghị otú kwesịrị ahụ pụta ụwa, ndị ọzọ na-enwe ahụ ike ná mmalite ma ghọzie ndị na-adakarị mbà n’obi mgbe ihe omume na-akpaghasị uche gbanwere ọdịdị nke ụbụrụ ha.

[Foto ndị dị na peeji nke 8, 9]

Esemokwu ezinụlọ na-akpatakarị ịda mbà n’obi