Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Nwatakịrị Nwanyị nke Nwere Olileanya Na-egbukepụ Egbukepụ

Nwatakịrị Nwanyị nke Nwere Olileanya Na-egbukepụ Egbukepụ

Nwatakịrị Nwanyị nke Nwere Olileanya Na-egbukepụ Egbukepụ

NDỊ na-ebipụta Teta! natara akwụkwọ ozi site n’aka otu nwatakịrị nwanyị dị afọ 12 aha ya bụ Stephanie. “Achọrọ m ịgwa unu otú akwụkwọ ndị ahụ siworo nyere m aka nke ukwuu n’ụlọ akwụkwọ,” ka o dere. “N’oge na-adịbeghị anya, e nyere anyị ihe omume n’isiokwu bụ́ ‘Ndịrịta Iche Ọdịbendị.’ Mụ na ezinụlọ m nyochara akwụkwọ ndị ahụ, na-ebekapụta ihe odide na ihe osise ndị kwekọrọ n’isiokwu ahụ. E mesịa, amapawara m ihe ndị ahụ anyị chọtara na bọọdụ ịma ọkwa.” Onye nkụzi Stephanie gwara klas ahụ ka ha họpụta ihe omume ise ndị ha chere kasị mma. “Echi ya,” ka Stephanie na-ede, “achọpụtara m na nke m so n’ime ise ndị ahụ kasị mma.”

Otu n’ime ebe ndị Stephanie si họrọ ihe o jiri mee ihe bụ Teta! (Bekee) nke October 22, 1998, nke isiokwu dị n’ihu akwụkwọ ya bụ “Ọ̀ Dị Mgbe Mmadụ Nile Ga-ahụ Ibe Ha n’Anya?” Dị ka otu n’ime Ndịàmà Jehova, Stephanie kwenyesiri ike na ndị si n’ọdịbendị dịgasị iche iche pribikọ ọnụ n’udo. N’ezie, o so n’òtù ụmụnna zuru ụwa ọnụ nke eziokwu Bible meworo ka ndị bụbu ndị iro, so na ya—gụnyere ndị Tutsi na ndị Hutu, ndị Germany na ndị Russia, ndị Armenia na ndị Turk, ndị Japan na ndị America—dịrị n’otu. Ha nile na-agbalịkọ iṅomi Onye Okike ha. N’ụzọ dị aṅaa? Otu n’ime amaokwu Bible ndị Stephanie jiri mee ihe n’ihe omume ya na-enye azịza ya: “Chineke abụghị onye na-ele mmadụ anya n’ihu: kama n’ime mba ọ bụla onye na-atụ egwu Ya, onye na-arụkwa ọrụ ezi omume, bụ onye Ọ na-anara nke ọma.” (Ọrụ 10:34, 35) Ndịàmà Jehova na-arụsi ọrụ ike iji gosipụta eleghị mmadụ anya n’ihu dị otú ahụ n’otú ha si emeso ndị ọzọ ihe.

Stephanie na-atụ anya mmezu nke nkwa Bible bụ́ na n’isi nso Alaeze Chineke ga-eweta ọnọdụ ezi omume n’ụwa anyị. (Mkpughe 21:3, 4) N’ụwa ebe ọtụtụ ndị ntorobịa ji egwu na obi abụọ eche ọdịnihu ihu, Stephanie dị nnọọ iche dị ka onye nwere olileanya na-egbukepụ egbukepụ.