“Olee Ndị Na-ezi Mba Dị Iche Iche Eziokwu Ahụ?”
Bịa, Nụrụ Okwu Ihu Ọha n’Efu
“Olee Ndị Na-ezi Mba Dị Iche Iche Eziokwu Ahụ?”
Otu bishọp kwuru n’otu mgbe, sị: “Eziokwu na-enweghị mgbagha bụ ihe anyị nile na-apụghị inweta.” Echiche ahụ ò ziri ezi? Ka ọ̀ dị ebe a pụrụ inweta eziokwu na-enweghị mgbagha? Ọ̀ pụrụ ikwe mee na oge ga-abịa mgbe mmadụ nile ga na-ekwu eziokwu?
Malite n’ọnwa ọzọ, a ga-ekwu okwu ahụ isiokwu ya dị n’elu ná Mgbakọ Distrikti “Ndị Na-ezi Okwu Chineke” nke Ndịàmà Jehova bụ́ nke ga-adị 136 na Nigeria. N’eziokwu, ọ ga-abụ ihe pụtara ìhè n’ihe dị ka mgbakọ 2,000 dị otú ahụ bụ́ ndị a na-enwe n’ihe dị ka mba 150 n’ụwa nile.
Ajụjụ ụfọdụ a ga-aza gụnyere: Olee ebe eziokwu malitere? Olee otú e si na-ekpughe eziokwu? Olee akwụkwọ bụ́ isi e ji ekpughe eziokwu?
Ị pụrụ ige okwu a dị mkpa ná mgbakọ dị nso n’ebe obibi gị. Kpọtụrụ Ndịàmà Jehova nọ n’ógbè gị, ma ọ bụ detara ndị bipụtara magazin a akwụkwọ iji mata ebe nke kasị gị nso a ga-enwe mgbakọ ahụ. Mbipụta May 1, 2001, nke magazin anyị a na-ebipụtakọ ya na nke a, bụ́ Ụlọ Nche, depụtara ebe nile a ga-enwe mgbakọ na Nigeria.