Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Olee Otú M Pụrụ Isi Mee Ka Ọgụgụ Bible Na-atọ Ụtọ Karị?

Olee Otú M Pụrụ Isi Mee Ka Ọgụgụ Bible Na-atọ Ụtọ Karị?

Ndị Na-eto Eto Na-ajụ Sị . . .

Olee Otú M Pụrụ Isi Mee Ka Ọgụgụ Bible Na-atọ Ụtọ Karị?

“Mgbe ụfọdụ Bible na-esi ike ịghọta, nke ahụ pụkwara ịdị na-akụda mmụọ.”—Annalieza, onye dị afọ 17.

“Bible na-agwụ m ike.”—Kimberly, onye dị afọ 22.

ỌTỤTỤ ndị mmadụ enweghị mmasị ịgụ ihe. N’ihi ya, akwụkwọ buru ibu dị ka Bible pụrụ iyi ihe bubigara ibu ókè—ọbụnadị nye ndị na-agụ akwụkwọ nke ukwuu. “Nye m, Bible bụ akwụkwọ buru ibu nke nwere ọtụtụ okwu ndị siri ike ịghọta,” ka Tammy dị afọ 17 kwuru. “Ịgụ Bible chọrọ itinyesi uche ike n’ihe na ntachi obi.”

Tụkwasị na nke a, ihe omume ụlọ akwụkwọ a ga-eme n’ụlọ, ọrụ ụlọ, nakwa ntụrụndụ pụrụ iwere ihe dị ukwuu n’oge na ume ọrụ gị. Nke a kwa pụrụ ime ka o sie ike itinye uche n’ihe na inweta obi ụtọ n’ọgụgụ Bible. Alicia, bụ́ otu n’ime Ndịàmà Jehova, na-ewepụtakwa oge iji kwadebe maka na iji jee nzukọ ndị Kraịst nakwa isoro ndị ọzọ kerịta ihe ndị o kwere. O kwetara, sị: “Ịgụ Bible pụrụ ịbụ ihe siri ike n’ihi na o yiri ka e nwere ọtụtụ ihe a ga-eme.”

Ma, Alicia, Tammy, na ọtụtụ ndị ntorobịa ndị ọzọ emerichawo ihe ịma aka ahụ. Ugbu a, ha na-agụchi Bible anya ma na-enweta obi ụtọ n’ịgụ ya. Gị onwe gị pụkwara ime otú ahụ! Tụlee ihe atọ ị pụrụ ime iji mee ka ọgụgụ Bible na-atọ ụtọ karị.

Wepụta Oge Maka Ịgụ Bible

“Echere m na ihe mere ndị na-eto eto ji asị na ịgụ Bible na-agwụ ike bụ n’ihi na ha agụrubeghị ya otú dị mma,” ka Kelly dị afọ 18 na-ekwu. Dị nnọọ ka egwuregwu ị na-egwu mgbe ọ bụla si atọ gị ụtọ, ịgụ Bible ga na-atọ gị ụtọ ka ị na-agụchi ya anya.

Gịnịkwanụ ma ọ bụrụ na i nwere nnọọ ntakịrị ohere? Pọl onyeozi na-adụ ọdụ, sị: “Lezienụ anya nke ọma otú unu na-ejegharị, ọ dịghị ka ndị na-amaghị ihe, kama dị ka ndị maara ihe; na-azụchapụrụ onwe unu oge a nile, n’ihi na ụbọchị ndị a jọrọ njọ.” (Ndị Efesọs 5:15, 16) Ị pụrụ ‘ịzụchapụta oge’ site n’ịghara ịdị na-etinye oge dị ukwuu n’ihe ndị na-adịchaghị mkpa dị ka ikiri TV. Okwu Pọl ji mee ihe maka “oge” pụrụ ịpụta oge a kara aka maka otu nzube kpọmkwem. Olee mgbe pụrụ ịbụrụ gị oge a a kara aka iji gụọ Bible?

Ọtụtụ ndị na-agụ Bible n’ụtụtụ, mgbe ha tụlesịrị otu akụkụ Akwụkwọ Nsọ na nkọwa ndị dị n’akwụkwọ nta bụ́ Inyocha AkwkwNsKwa bch. * Ọ na-amasị ndị ọzọ karị ịgụ ya tupu ha alakpuo n’abalị. Họrọ oge kwesịrị ekwesị nke ga-adịrị gị mma, na-ahazigharịkwa ihe dị ka mkpa si dị. Alicia na-ekwu, sị: “Ịdị na-eme mgbanwe bụ n’ezie isi ihe na-enyere m aka ịnọgịde na-agbaso usoro ọgụgụ ihe m.”

Ụfọdụ ndị ntorobịa bụ́ ndị Kraịst na-ewepụta minit 10 ruo 15 kwa ụbọchị iji gụọ Bible. Site n’ime otú ahụ, ha enwewo ike ịgụcha Bible dum n’ime otu afọ ma ọ bụ abụọ! Ọ bụrụgodị na ị gaghị emeli ya, mee ya ihe mgbaru ọsọ gị ịgụ otu akụkụ Bible kwa ụbọchị. Site n’ịrapagidesi ike n’oge ị kara aka maka ịgụ Bible, ịhụnanya gị maka Okwu Chineke ga-ebuwanye ibu.—Abụ Ọma 119:97; 1 Pita 2:2.

Kpee Ekpere Maka Amamihe

N’eziokwu, akụkụ ụfọdụ nke Okwu Chineke na-esiri ọbụna ndị na-agụchi Bible anya ike ịghọta. Onye chepụtara Bible, bụ́ Jehova Chineke, chọrọ ka ị ghọta Okwu ya. Akwụkwọ Ọrụ Ndị Ozi na-akọ banyere otu onye njem bụ́ onye Etiopia, onye na-aghọtalighị n’ụzọ zuru ezu otu amụma dị n’Aịsaịa isi 53. Nwoke ahụ dị njikere ịrịọ maka enyemaka, mmụọ ozi Jehova zigakwara onye ozi ala ọzọ bụ́ Filip ịkọwara ya amụma ahụ.—Ọrụ 8:26-39.

Ya mere, ọgụgụ Bible nke bara uru adịghị amalite ma ọlị n’ịgụ ihe, kama nke ahụ n’ekpere. Tupu ha emepee Bible ha, ụfọdụ ndị na-eme ka ọ bụrụ omume ha ikpegara Jehova ekpere maka amamihe iji ghọta nakwa iji ihe ha na-amụta n’ọgụgụ ihe ha mee ihe. (2 Timoti 2:7; Jemes 1:5) Mmụọ Chineke pụrụ ọbụna ime ka i cheta amaokwu Bible ndị ga-enyere gị aka ịza ajụjụ ma ọ bụ ịnagide ọnwụnwa dị iche iche.

Otu nwa okorobịa bụ́ onye Kraịst chetara, sị: “Mgbe m dị afọ 12, nna m gbahapụrụ ezinụlọ anyị. N’otu abalị, edina m n’àkwà na-ekpe ekpere, na-arịọ Jehova ka o mee ka nna m lọghachi. Mgbe ahụ e weere m Bible m ma gụọ Abụ Ọma 10:14: ‘N’aka Gị [Jehova] ka onye na-ahụju anya na-ahapụ onwe ya; Onye na-enyere nwa mgbei aka ka Ị bụworo.’ Akwụsịtụrụ m. Ọ dị m ka Jehova ọ na-agwa m okwu na-emekwa ka m mara na ya bụ onye inyeaka m, ọ bụ Nna m. Olee nna ka ya mma m pụrụ inwe?”

Ị̀ pụrụ ime ka ọ bụrụ omume gị ikpe ekpere mgbe ọ bụla ị nọdụrụ ala ịgụ Bible? Adrian na-atụ aro, sị: “Kpee ekpere tupu ị malite ịgụ ihe—nakwa mgbe ị gụsịrị—ka o wee ghọọ n’ezie mkparịta ụka n’etiti gị na Jehova.” Ekpere sitere n’ala ala obi ga-eme ka mkpebi gị ịrapagidesi ike n’usoro ọgụgụ Bible gị mie emie, ọ ga-emekwa ka mmekọrịta gị na Chineke sikwuo ike.—Jemes 4:8.

Mee Ka O Nwee Mmetụta Siri Ike n’Uche Gị

Kimberly, bụ́ onye a kpọtụrụ aha ná mmalite chọpụtara na Bible na-agwụ ya ike. N’eziokwu, Bible bụ nnọọ akwụkwọ ochie —nke e dere ogologo oge tupu e mepụta kọmputa, telivishọn, ma ọ bụ ụgbọelu—ndị a kpọtụkwara aha na Bible anwụọla kemgbe ọtụtụ puku afọ gara aga. Ka o sina dị, Pọl onyeozi dere, sị: “Okwu Chineke dị ndụ, na-arụsikwa ọrụ ike.” (Ndị Hibru 4:12) Olee otú akwụkwọ ochie dị otú ahụ pụrụ isi na-arụsi ọrụ ike?

N’oge nke odeakwụkwọ bụ́ Ezra, a kpọkọtara ọtụtụ puku ndị ikom, ndị inyom, na “onye ọ bụla nke na-aghọta ịnụ ihe” na Jerusalem ige ntị n’ọgụgụ nke Iwu Mosis. N’oge ahụ, Iwu ahụ anọworị ihe karịrị 1,000 afọ! N’agbanyeghị nke ahụ, Ezra na ndị na-enyere ya aka “wee gụọ n’akwụkwọ ahụ, bụ́ n’iwu Chineke, gụpụta ya nke ọma, wee mee ka a mata isi ya, ha wee ghọta ọgụgụ ya.” (Ọ bụ anyị dere okwu ụfọdụ n’aka akwụkwọ dị iche.) Mgbe ndị ikom a kọwachara Akwụkwọ Nsọ ma mee ka ọgụgụ ya nwee nghọta, gịnị mere? “Ndị ahụ nile wee jee iri ihe, na ịṅụ ihe ọṅụṅụ, na iziga òkè, na ime ka oké ọṅụ dị, n’ihi na ha ghọtara okwu nile nke e mere ka ha mara.”—Nehemaịa 8:1-12.

Olee otú ị pụrụ isi ‘mata isi’ ọgụgụ Bible gị? Cathy, onye ịgụ akwụkwọ na-esiri ike, na-agụpụta ihe ọ na-agụ iji mee ka uche ya dịrị na ya. Nicki na-agbalị iwere onwe ya dị ka a ga-asị na ọ nọ n’ebe ihe ahụ a na-akọ maka ya na-eme. “Ana m eche otú ọ ga-adị m ịnọ n’ụdị ọnọdụ ahụ,” ka ọ sịrị. “Akụkọ kasị amasị m abụwo mgbe nile akụkọ banyere Rut na Naomi. Apụrụ m ịgụ ya ọtụtụ ugboro. Mgbe m kwagara n’otu obodo ukwu ọhụrụ, enwetara m nkasi obi site n’akụkọ a n’ihi na apụrụ m iche n’echiche otú ịga ebe ọ na-amabughị dị Rut n’obi, n’enweghịkwa onye ọ maara. Ahụrụ m otú o si tụkwasị Jehova obi, o nyekwaara m aka n’ezie imekwa otú ahụ.”—Rut, isi 1-4.

Ka Bible wee ‘na-arụsi ọrụ ike,’ ntụgharị uche dị mkpa. Oge ọ bụla ị gụrụ ya, wepụta oge iji tụgharịa uche n’akụkụ Akwụkwọ Nsọ ndị ị gụrụ na iji tụlee otú ị pụrụ isi jiri ihe ndị ị mụtara mee ihe. I nwere ike ime nnyocha n’ihe ndị e ji amụ Bible nke Ndịàmà Jehova bipụtara iji mee ka ọgụgụ Bible gị bakwuo uru. *

Nọgidesie Ike!

Ịrapagidesi ike n’otu usoro ọgụgụ Bible adịghị mfe. Ọ pụrụ ịdị mkpa ịdị na-ahazigharị ọbụna usoro ọgụgụ Bible kasị mma site n’oge ruo n’oge. Olee otú ị pụrụ isi nọgidesie ike n’ihe mgbaru ọsọ gị nke bụ́ ịgụ Bible kwa ụbọchị?

Ndị enyi na ndị ezinụlọ gị pụrụ inyere gị aka. Amber dị afọ 15, sịrị: “Mụ na nwanne m nwanyị na-ekerịta otu ọnụ ụlọ. N’abalị ụfọdụ, ike na-agwụ m nke ukwuu nke na nanị ihe m na-achọ bụ ịrahụ ụra, ma nwanne m nwanyị na-echetara m ịgụ Bible m. N’ihi ya adịghị m echefu ya echefu!” Ọ bụrụ na ị chọpụta otu akụkụ Akwụkwọ Nsọ ma ọ bụ akụkụ ihe odide ịbụ nke na-adọrọ mmasị, soro ndị ọzọ kwurịta ya. Nke a ga-eme ka i jiri Okwu Chineke kpọrọkwuo ihe karị, ọ pụkwara ọbụna ịkpali ha inwe mmasị ịgụ Bible. (Ndị Rom 1:11, 12) Ọ bụrụ na i leghara ọgụgụ Bible gị anya otu ụbọchị ma ọ bụ karịa, adala mbà! Malite ebe ị kwụsịrị, ma kpebisikwuo ike ịrapagidesi ike n’usoro gị.

Echefukwala ọtụtụ uru ndị na-abịa site n’ịgụ Bible kwa ụbọchị. Site n’ịṅa Jehova ntị site n’Okwu ya, gị na ya pụrụ inwe mmekọrịta chiri anya. Ị ga-abịa mata echiche ya na mmetụta ya. (Ilu 2:1-5) Eziokwu ndị a dị oké ọnụ ahịa bụ́ ndị sitere n’aka Nna anyị nke eluigwe ga-aghọ ihe nchebe. “Gịnị ka okorobịa ga-eji mee ka ụzọ ya dị ọcha?” ka onye ọbụ abụ ahụ jụrụ. “Ọ bụ n’ilezi ya anya dị ka okwu Gị si dị.” (Abụ Ọma 119:9) Ya mere, malite—rapagidesiekwa ike—n’otu usoro ọgụgụ Bible. Ọ pụrụ ịtọ gị ụtọ karịa otú i chere na ọ ga-atọ gị!

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

^ par. 11 Nke Ndịàmà Jehova bipụtara.

^ par. 22 Mbipụta Ụlọ nche nke October 1, 2000, peeji nke 16-17, tụrụ ọtụtụ aro ndị bara uru iji nyere gị aka ime nnyocha miri emi karị n’ime Bible.

[Foto ndị dị na peeji nke 20]

Ekpere na ime nnyocha ga-eme ka ọgụgụ Bible gị ka mma, ọ ga-enyekwara gị aka ịghọta ihe Akwụkwọ Nsọ pụtara

[Foto dị na peeji nke 21]

Iwere onwe gị dị ka a ga-asị na ị nọ n’ebe ihe ahụ a na-akọ mere ga-eme ka Akwụkwọ Nsọ na-akpali gị akpali