Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

A Na-anabata Gị ná Mgbakọ Distrikti “Ndị Na-ezi Okwu Chineke”!

A Na-anabata Gị ná Mgbakọ Distrikti “Ndị Na-ezi Okwu Chineke”!

A Na-anabata Gị ná Mgbakọ Distrikti “Ndị Na-ezi Okwu Chineke”!

ỌTỤTỤ NDE MMADỤ GA-AGA n’ọtụtụ narị ebe dị iche iche gbaa ụwa gburugburu. Na Nigeria nanị, e dokwara inwe mgbakọ 136. A ga-enwe nke mbụ n’October 12-14, nweekwa nke ikpeazụ na January 18-20, 2002. Ma eleghị anya, a ga-enwe otu n’ime mgbakọ a ga-ewe ụbọchị atọ—Friday ruo Sunday—n’obodo na-adịghị anya site n’ụlọ gị.

N’ihe ka ukwuu n’ebe ndị a ga-enwe ya, usoro ihe omume ahụ ga-eji olu ụtọ malite ụbọchị ọ bụla site n’elekere anya 9:30 nke ụtụtụ. Okwu ndị dabeere n’isiokwu Bible bụ́ “Izi Ihe Alaeze Na-amịpụta Ezi Mkpụrụ,” “Ndị ‘Oké Ọrụ Nile nke Chineke’ Na-akpali” na “Ka Ezi Omume Jehova Na-atọ Gị Ụtọ,” ga-esochi okwu nnabata na Friday. Nnọkọ ụtụtụ ga-eji okwu bụ́ isi bụ́, “Ndị A Kwadebere n’Ụzọ Zuru Ezu Dị Ka Ndị Na-ezi Okwu Chineke” mechie.

Usoro isiokwu nwere akụkụ atọ bụ́ “Izi Onwe Anyị Ihe Mgbe Anyị Na-ezi Ndị Ọzọ” ga-esochi okwu mbụ a ga-ekwu n’ehihie bụ́, “Ndị E mere Ka Ha Dị Ọcha Maka Ọrụ Ọma.” Nke a ga-emesi ike mkpa ọ dị mmadụ ime ihe ọ na-ekwusa n’ihe banyere omume ọma, ọmụmụ Bible onwe onye, na mkpa ọ dị iguzogide mgbalị Ekwensu iduhie anyị. Okwu bụ́ “Kpọọ Ihe Otiti Ụwa nke Ihe Ndị Na-akpali Agụụ Mmekọahụ Asị” ga-esochi. Usoro ihe omume ụbọchị ahụ ga-ejizi ntụle nke Aisaia isi 60, nke isiokwu ya bụ “Jehova Ejiri Ìhè Chọọ Ndị Ya Mma” wee mechie.

Okwu ndị a ga-ekwu na Saturday bụ́ “Ịchọta Izu Ike n’Okpuru Yoke Kraịst,” “Ṅomie Onye Ozizi Ukwu Ahụ,” na “Ị̀ Dị Njikere Ijere Ndị Ọzọ Ozi?” ga-elekwasị anya ná mkpa ọ dị ịgbaso ihe nlereanya Kraịst. A ga-enwekwa usoro isiokwu abụọ ga-ewe awa abụọ na Saturday nke isiokwu ha bụ “Ndị Ozi Bụ́ Ndị Ndị Ọzọ Na-esite n’Aka Ha Aghọ Ndị Kwere Ekwe” na “Rite Uru n’Ụzọ Ka Zuo Ezuo Site ná Mmụta Ọchịchị Chineke.” Usoro isiokwu nke ụtụtụ ga-atụ aro dị iche iche n’ihe banyere ime ndị na-eso ụzọ, ihe omume nke ehihie ga-akọwapụta ụzọ ndị a pụrụ isi ritekwuo uru site n’ọmụmụ Bible na ịga nzukọ ndị Kraịst. Usoro ihe omume nke ụtụtụ ga-eji okwu baptism mechie, mgbe e kwusịrị ya, a ga-enwe ohere maka ime ndị nile ruru eru baptism. Ọ ga-agụsi ọtụtụ ndị agụụ ike ịnụ okwu mmechi nke ehihie Saturday bụ́, “Ndokwa Ndị Ọhụrụ Maka Ọganihu Ime Mmụọ Anyị.”

Ihe omume ụtụtụ Sunday ga-agụnye usoro isiokwu nwere akụkụ atọ nke na-akọwa akwụkwọ Malakaị ma na-egosi n’ụzọ mara mma otú o si metụta ọnọdụ ndị dị n’oge anyị. Ihe nkiri a ga-eji ejiji zuru ezu mee banyere nnupụisi nke Kora, Detan na Abaịram megide ịchịisi Chineke nyere Mosis ga-esochi nke a. Mgbe e mesịrị, a ga-ekwu okwu ga-eme ka ihe mmụta dị n’ihe nkiri ahụ pụta ìhè. Ihe omume nke ehihie ga-agụnye okwu ihu ọha nke isiokwu ya bụ “Olee Ndị Na-akụziri Mba Nile Eziokwu Ahụ?”

N’ezie, ị ga-eriju afọ n’ụzọ ime mmụọ site n’ịnọ ya ụbọchị atọ ahụ nile. Maka ebe kasị dịrị nso n’ụlọ gị, kpọtụrụ Ụlọ Nzukọ Alaeze nke Ndịàmà Jehova dị n’ógbè gị ma ọ bụ detara ndị na-ebipụta magazin a akwụkwọ. E depụtara ebe ndị a ga-enwe mgbakọ nile na Nigeria n’Ụlọ Nche nke May 1, 2001.