Inwe Ụdị Ihe Dị Iche Iche—Ihe Dị Oké Mkpa Maka Ndụ
Inwe Ụdị Ihe Dị Iche Iche—Ihe Dị Oké Mkpa Maka Ndụ
N’AFỌ ndị 1840, ọnụ ọgụgụ ndị bi na Ireland gafere nde asatọ, na-eme ka ọ bụrụ mba mmadụ kasị biri na Europe. Poteto bụ ihe oriri ha bụ́ isi, otu ụdị a na-akpọ lumper bụkwa nke ihe ka ọtụtụ na-akọ.
Na 1845 ndị ọrụ ugbo kọrọ lumper dị ka ha na-emebu, ma ọrịa akụ́kụ́ bịara kpochapụ ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ ha nile. “Ihe ka ọtụtụ ná ndị Ireland lanarịrị afọ ihe isi ike ahụ,” ka Paul Raeburn dere n’akwụkwọ ya bụ́ The Last Harvest—The Genetic Gamble That Threatens to Destroy American Agriculture. “Mbibi ahụ mere ọzọ n’afọ so ya. Ndị ọrụ ugbo enweghị ihe ha pụrụ ime karịa ịkọghachi otu udị poteto ahụ. Ha enweghị ụdị ọzọ. Ọrịa akụ́kụ́ ahụ bịakwara ọzọ, na nke ugbu a ọ kpara ha nnọọ aka ọjọọ. Ahụhụ ọ kpatara enweghị atụ.” Ndị ọkọ akụkọ ihe mere eme na-eme atụmatụ na ihe dị ka otu nde mmadụ nwụrụ n’agụụ, ebe nde mmadụ 1.5 ọzọ kwagara ná mba ndị ọzọ, ihe ka ọtụtụ n’ime ha kwagara United States. Ndị na-akwapụghị nọ dị ka ndị ogbenye ọnụ ntụ.
N’ugwu Andes nke Ebe Ndịda America, ndị ọrụ ugbo na-akọ ọtụtụ ụdị poteto, ọ bụkwa nanị ole na ole ka ọrịa akụ́kụ́ ahụ metụtara. N’ihi ya, ọ gbasaghị ebe nile. N’ụzọ doro anya, inwe ụdị akụ́kụ́ dị iche iche na-abụ ihe nchebe. Ịkọ nanị otu ụdị ihe ọkụkụ ekwekọghị n’usoro a bụ́ isi maka nlanarị, ọ na-ekpughepụkwa ihe ọkụkụ nye ọrịa na ụmụ ahụhụ, bụ́ ndị pụrụ ibibi ihe dum e nwetara n’ubi n’otu ógbè. Ọ bụ ya mere ọtụtụ ndị ọrụ ugbo ji adabere nnọọ n’iji ọgwụ ahụhụ na ụdị ọgwụ dị iche iche eme ihe mgbe nile, n’agbanyeghị na
ọgwụ ndị dị otú ahụ na-abụkarị ihe ize ndụ na gburugburu ebe obibi.N’ihi gịnịzi ka ndị ọrụ ugbo ji eji otu ụdị ihe ọkụkụ edochi anya ọtụtụ ụdị ndị ha nọworo na-akọ n’ógbè ha? Ọ na-abụkarị n’ihi ajọ ọnọdụ akụ̀ na ụba. Ịkọ otu ụdị na-eme ka owuwe ihe ubi dị mfe, na-eme ka ihe ubi maa mma, burụ nke na-agaghị emebi ngwa ngwa, hiekwa nne. A malitere ime nke a n’ụzọ dị ukwuu n’afọ ndị 1960 site n’ihe a na-akpọzi usoro ọhụrụ nke ịkọ ugbo.
Usoro Ọhụrụ nke Ịkọ Ugbo
Site n’oké mkpọsa gọọmenti na òtù dị iche iche na-eme, a rụgidere ndị ọrụ ugbo nọ n’ala ndị na-enwekarị ụnwụ nri iji otu ụdị mkpụrụ, nke na-emepụta ihe n’ụba, karịsịa osikapa na ọka wheat dochie anya ụdị akụ́kụ́ ha dị iche iche. E toro mkpụrụ akụ́kụ́ ndị a dị “ebube” dị ka ihe ngwọta nke agụụ e nwere n’ụwa. Ma ha adịghị ọnụ ala—ọnụ ego mkpụrụ akụ́kú jiri okpukpu atọ dị elu karị. Ọ na-adabere nnọọ ná mmiri ọgwụ, gụnyere fatịlaịza iji mepụta ihe, e kwubeghịdị ngwá ọrụ ndị dị oké ọnụ dị ka traktọ. Ma, site n’enyemaka ego nke gọọmenti, usoro ọhụrụ nke ịkọ ugbo bịara wuwe ewuwe. “Ọ bụ ezie na o mewo ka agụụ ghara ịgụgbu ọtụtụ nde mmadụ,” ka Raeburn na-ekwu, “[ọ] na-eyizi inwe ihe oriri zuru ezu n’ụwa egwu.”
Dị ka a pụrụ isi kwuo ya, ọ pụrụ ịbụ na usoro ọhụrụ ahụ nke ịkọ ugbo wetara uru na-adịru nwa oge ma weta ihe ize ndụ ndị ga-adịte aka. N’oge na-adịghị anya inwe otu ụdị ihe ọkụkụ ghọrọ ihe zuru ebe nile na kọntinent dị iche iche—ebe iji fatịlaịza eme ihe nke ukwuu mere ka ahịhịa na-etokwu, ọgwụ ahụhụ gbukwara ahụhụ ndị bara uru. N’ubi osikapa, mmiri ọgwụ ndị na-egbu egbu gburu azụ̀, oporo, nshịkọ, akịrị, na akwụkwọ nri nakwa ihe ndị na-eto n’ọhịa—ndị ihe ka ọtụtụ n’ime ha bara uru iji emeju ihe oriri. Ikuru mmiri ọgwụ mekwara ka ụfọdụ ndị ọrụ ugbo daa ọrịa.
Otu onye nkụzi ná Ngalaba Nkà Mmụta Ihe Ndị Dị Ndụ na Mahadum Ọha dị na United Kingdom, bụ́ Dr. Mae-Wan Ho, dere, sị: “O doola nnọọ anya na ịkọ nanị otu ụdị ihe ọkụkụ, bụ́ nke a malitere eri e nwere ‘usoro ọhụrụ nke ịkọ ugbo’ emetụtawo ụdị ihe dị ndụ dị iche iche na inwe ihe oriri zuru ezu n’ụwa nile, n’ụzọ dị njọ.” Dị ka Òtù UN Na-ahụ Maka Nri na Ọrụ Ugbo si kwuo, pasent 75 nke ụdị mkpụrụ ndụ ihe nketa dị iche iche dị n’akụ́kụ́ ndị a na-akụ akụ eri otu narị afọ gara aga adịkwaghị, karịsịa n’ihi usoro iji ọrụ ugbo achụ nta ego.
Otu akwụkwọ nke Worldwatch Institute bipụtara na-adọ aka ná ntị na “ihe ize ndụ ndị anyị na-etinye njikọ nke ihe ndị dị ndụ na gburugburu ha na ya iji mee ka e nwee otu ụdị mkpụrụ ndụ ihe nketa, dị ukwuu.” Olee otú e si egbochi ihe ize ndụ ndị a? A chọrọ ndị ọkà mmụta ọrụ ugbo na mmiri ọgwụ ndị dị irè nakwa ịkwado ndị ọrụ ugbo n’ụzọ ego. Otú ọ dị, e jighị n’aka na nke ahụ ga-egbochili ya. Inwe otu ụdị mkpụrụ ndụ ihe nketa so kpata otu ọrịa akụ́kụ́ bibiri ọka na United States nakwa mmebi nke ala osikapa dị ọkara nde hekta n’Indonesia. Otú ọ dị, n’afọ ndị na-adịbeghị anya, a malitewo usoro ọhụrụ nke ịkọ ugbo, nke gụnyere ịgbanwe akụkụ bụ́ isi nke ihe e kere eke—mkpụrụ ndụ ihe nketa.
Usoro Ịgbanwe Mkpụrụ Ndụ Ihe Nketa
Nnyocha nke mkpụrụ ndụ ihe nketa edugawo n’ọrụ ọhụrụ na-enye ezigbo ego bụ́ nkà na ụzụ banyere ihe ndị dị ndụ. Dị ka aha ya na-egosi, ọ na-ejikọta nkà mmụta ihe ndị dị ndụ na nkà na ụzụ nke oge a site n’usoro ndị dị ka nkà mgbanwe
mkpụrụ ndụ ihe nketa. Ụfọdụ ụlọ ọrụ ọhụrụ ndị na-ahụ maka nkà na ụzụ banyere ihe ndị dị ndụ, dị ka a na-akpọ ha, bụ ọkachamara n’ọrụ ugbo, ha na-arụsikwa ọrụ ike inweta mkpụrụ akụ́kụ́ ndị na-emepụta ihe n’ụba, ndị na-eguzogide ọrịa, oké ọkọchị, na ice, ndị na-adịghịkwa achọcha mmiri ọgwụ ndị dị ize ndụ. Ọ bụrụ na a pụrụ iru ihe mgbaru ọsọ ndị dị otú ahụ, ọ ga-aba uru dị ukwuu. Ma ụfọdụ ekwupụtawo nchegbu ha banyere ihe ọkụkụ ndị a gbanwere mkpụrụ ndụ ihe nketa ha.“Site n’okike, a na-enwe ụdị dị iche iche nke mkpụrụ ndụ ihe nketa ruo n’ókè ụfọdụ,” ka akwụkwọ bụ́ Genetic Engineering, Food, and Our Environment na-ekwu. “A pụrụ ịgwakọta mkpụrụ ndụ otu ụdị okooko osisi rose na ụdị okooko osisi rose ọzọ, ma a pụghị ma ọlị ime otú ahụ n’etiti okooko osisi rose na poteto. . . . N’aka nke ọzọ, nkà mgbanwe mkpụrụ ndụ ihe nketa na-agụnyekarị iwere mkpụrụ ndụ ihe nketa nke otu ụdị ihe tinye ya n’ụdị ihe ọzọ ná mgbalị iwefe njimara a chọrọ. Dị ka ihe atụ, nke a nwere ike ịpụta isi n’azụ̀ (dị ka azụ̀ flounder) e nwetara n’ógbè arctic họrọ otu mkpụrụ ndụ ihe nketa nke na-akpata mmepụta nke mmiri ọgwụ na-eme ka ihe ghara ịkpụkọ akpụkọ n’ihi oyi, ma tinye ya n’ime poteto ma ọ bụ mkpụrụ osisi strawberry iji mee ka ọ na-eguzogide ice. Ugbu a, a pụrụ itinye mkpụrụ ndụ ihe nketa ndị e nwetara site na nje bacteria, nje virus, ụmụ ahụhụ, ụmụ anụmanụ ma ọ bụ ọbụna ụmụ mmadụ n’ihe ọkụkụ.” * Ihe ọ pụtara bụ na nkà na ụzụ banyere ihe ndị dị ndụ na-eme ka ụmụ mmadụ nwee ike iwepụ ọdịiche dị n’etiti ihe dị iche iche.
Dị ka ọ dị banyere usoro ọhụrụ nke ịkọ ugbo, ihe ụfọdụ ndị na-akpọ usoro imegharị mkpụrụ ndụ ihe nketa so akpata nsogbu nke inwe otu ụdị mkpụrụ ndụ ihe nketa—ụfọdụ na-ekwu na ọ kadịrịị njọ n’ihi na ndị ọkà n’ihe banyere mkpụrụ ndụ ihe nketa pụrụ iji usoro ndị dị ka isite n’otu mkpụrụ ndụ mepụta ihe dị ndụ yiri ihe ahụ e si na ya nweta mkpụrụ ndụ ahụ nakwa ịzụ uru ahụ e tinyere ná ngwakọta nwere ihe ndị ga-eme ka ọ dịgide ndụ, mee ihe, bụ́ usoro ndị na-emepụta ihe ndị yiri ibe ha n’ụzọ nile. N’ihi ya, a ka nwere nchegbu banyere mbibi nke ụdị dị iche iche nke ihe ndị dị ndụ. Otú ọ dị, ihe ọkụkụ ndị a gbanwere mkpụrụ ndụ ihe nketa ha na-akpali nchegbu ndị ọhụrụ, dị ka mmetụta ndị ha pụrụ inwe n’ahụ anyị nakwa na gburugburu ebe obibi. “Anyị na-asọ ìsì na-abanye n’ọgbọ ọhụrụ nke ịkọ ugbo dabere na nkà na ụzụ banyere ihe ndị dị ndụ, na-enwe atụmanya dị ukwuu na ihe mgbochi ole na ole, nakwa obere ihe ọmụma banyere ihe ndị pụrụ isi na ya pụta,” ka onye edemede sayensị bụ́ Jeremy Rifkin, kwuru. *
N’aka nke ọzọ, ikike ịgbanwe ndụ site ná mkpụrụ ndụ ihe nketa pụrụ ịba oké uru, n’ihi ya kwa a na-asọ mpi inweta mkpụrụ akụ́kụ́ ndị ọhụrụ na ihe ndị ọzọ dị ndụ ndị a gbanwere mkpụrụ ndụ ihe nketa ha. Ka ọ dịgodị, mkpochapụ nke ihe ọkụkụ ka na-aga n’ihu. Dị ka e kwuru ná mmalite, iji zere ọdachi, ụfọdụ gọọmenti na ụlọ ọrụ ndị mmadụ nwe eguzobewo ebe nkwakọba mkpụrụ akụ́kụ́. Ebe nkwakọba ndị a hà ga-eme ka ọgbọ na-abịa n’ihu nwee ụdị mkpụrụ akụ́kụ́ dị iche iche ha ga-akụ, werekwa ihe ubi ha?
Ebe Nkwakọba Mkpụrụ Akụ́kụ́—Ọ̀ Bụ Ihe Nchebe Pụọ ná Mkpochapụ?
Ubi bụ́ Royal Botanic Gardens dị na Kew, England, amalitewo otu ihe ọ na-eto dị ka “otu n’ime ọrụ nchekwa kasị ukwuu zuru ụwa ọnụ a rụtụworo”—Atụmatụ Ọrụ Nkwakọba Mkpụrụ Akụ́kụ́ Maka Narị Afọ Iri A. Nzube bụ́ isi nke atụmatụ ọrụ ahụ bụ (1) ịchịkọta na ichebe pasent 10—ihe karịrị ụdị 24,000 n’ime ihe ọkụkụ ụwa ndị na-amị mkpụrụ ka ọ na-erule 2010 nakwa (2) ogologo oge tupu mgbe ahụ, ịchịkọta na ichekwa mkpụrụ nke ihe ọkụkụ na-amị mkpụrụ dị na United Kingdom dum. Mba ndị ọzọ eguzobewokwa ebe nkwakọba mkpụru akụ́kụ́, ma ọ bụ ebe nkwakọba mkpụrụ ndụ ihe nketa, dị ka a na-akpọ ha mgbe ụfọdụ.
Ọkà mmụta ihe ndị dị ndụ bụ́ John Tuxill
na-ekwu na ọ dịkarịa ala pasent 90 nke ọtụtụ nde mkpụrụ akụ́kụ́ ndị a kwakọbara n’ebe nkwakọba mkpụrụ akụ́kụ́ bụ nke ihe ọkụkụ ndị bara uru maka oriri na iji emepụta ihe, dị ka ọka wheat, osikapa, ọka, ọka sorghum, poteto, yabasị, garlic, okpete, ogho, àgwà soybean, na àgwà ndị ọzọ, nanị ịkpọtụ ole na ole aha. Ma mkpụrụ akụ́kụ́ bụ ihe dị ndụ nke na-adịgide ndụ nanị ruo oge ike dị ha n’ime dịruru. N’ihi ya ruo n’ókè hà aṅaa ka a pụrụ ịdabere ná nkwakọba mkpụrụ akụ́kụ́?Nsogbu Dị n’Ebe Nkwakọba Ihe Ahụ
Inwe ebe nkwakọba mkpụrụ akụ́kụ́ na-efu ego—ngụkọta nke ihe dị ka nde $300 kwa afọ, dị ka Tuxill si kwuo. Otú ọ dị, ọbụna ego a nwere ike ọ gaghị ezu, ka ọ na-ekwu, n’ihi na “ọ bụ nanị pasent 13 nke mkpụrụ akụ́kụ́ ndị e debere mkpụrụ ndụ ihe nketa ha n’ebe nkwakọba ihe dị n’ụlọ ọrụ ndị a na-elekọta nke ọma, ndị a pụrụ ichekwa ruo ogologo oge.” Ebe ọ bụ na mkpụrụ akụ́kụ́ ndị a na-echekwaghị nke ọma adịghị anọte aka, a ghaghị ịkụ ha n’oge ka e nwee ike inweta mkpụrụ akụ́kụ́ ọzọ; ma ọ bụghị ya, ebe nkwakọba mkpụrụ akụ́kụ́ aghọọ ebe ndebe mkpụrụ akụ́kụ́ ndị mebiri emebi. Otú ọ dị, ụdị ọrụ a ahụ chọrọ ndị ọrụ na ego dị ukwuu, bụ́ nke na-eme ka ihe sikwuoro ụlọ ọrụ ndị nwewororị nsogbu ego ike.
Akwụkwọ bụ́ Seeds of Change—The Living Treasure na-akọwa na Ụlọ Nchekwa Mkpụrụ Akụ́kụ́ Mba, dị na Colorado, U.S.A., enwewo “ọtụtụ nsogbu, gụnyere iwere ọkụ, mmebi nke ihe ndị na-eme ka ihe jụọ oyi, na enweghị ndị ọrụ zuru ezu bụ́ nke meworo ka e nwee ọtụtụ ikpo mkpụrụ akụ́kụ́ ndị a na-edebaghị n’akwụkwọ.” Nsogbu ndọrọ ndọrọ ọchịchị, ndakpọ akụ̀ na ụba, na ọdachi ndị na-emere onwe ha na-emetụtakwa ebe ndị a na-akwakọba mkpụrụ akụ́kụ́.
Nchekwa nke na-ewe ogologo oge na-akpatakwa nsogbu ndị ọzọ. N’ụdị ebe ha na-eto, akụ́kụ́ nwere ikike dị nta ma dị mkpa n’ikwekọ n’ọnọdụ ọhụrụ, nke a na-emekwa ka ha nwee ike ịlanarị ọrịa na nsogbu ndị ọzọ. Ma mgbe ha nọworo n’ebe nkwakọba mkpụrụ akụ́kụ́ ahụ bụ́ nke e chebere echebe ruo ogologo oge, ha nwere ike ha agakwaghị enwe ike nnagide ahụ. Otú ọ dị, mkpụrụ nke ọtụtụ akụ́kụ́ e chekwara nke ọma pụrụ ịnọru ọtụtụ narị afọ tupu a kụọ ha ọzọ. N’agbanyeghị erughị eru nakwa ejighị ihe n’aka ndị dị otú ahụ, ịdị adị nke ebe ndị a na-akwakọba mkpụrụ akụ́kụ́ na-egosi nchegbu na-arị elu e nwere maka ọdịnihu nke ihe ọkụkụ a na-eri eri nke ihe a kpọrọ mmadụ.
Otú ọ dị, ụzọ kasị mma isi belata mkpochapụ bụ ichekwa ụdị ebe ha na-eto ma nwetaghachi ụdị ihe ọkụkụ dị iche iche. Ma iji mee nke ahụ, ka Tuxill na-ekwu, ọ dị anyị mkpa “ịzụlite àgwà ọhụrụ n’ụzọ anyị si egbo mkpa anyị ma ghara ibibi ihe ndị ọzọ e kere eke.” Ka o sina dị, ruo ókè hà aṅaa ka ezi uche dị na ya iche na ụmụ mmadu ‘ga-azụlite àgwà ọhụrụ’ n’ebe ihe ndị e kere eke nọ, ka ha ji oké ịnụ ọkụ n’obi na-achọ ọganihu n’imepụta ihe na nke akụ̀ na ụba? Dị ka anyị hụworo, a na-eme ka ọbụna ọrụ ugbo sonye ná nnukwu achụmnta ego e ji ngwá ọrụ ụwa ndị bụ́ ọkpọka achụ, bụ́ nke ọchịchọ uru ahịa na-akwali. A ghaghị inwe ihe ngwọta ọzọ.
[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]
^ par. 13 A ka na-arụ ụka banyere nchepụta dị iche iche banyere mmetụta ihe oriri ndị a gbanwere mkpụrụ ndụ ihe nketa ha pụrụ inwe n’ahụ ike nke anụmanụ na mmadụ na gburugburu ebe obibi. Ngwakọta nke mkpụrụ ndụ ihe nketa nke ihe ndị dị ndụ bụ́ ndị dị nnọọ iche n’ebe ibe ha nọ emewo ka ụfọdụ jụọ ajụjụ metụtara ụkpụrụ omume.—Lee Teta! (Bekee), April 22, 2000, peeji nke 25-27.
^ par. 14 Magazin bụ́ New Scientist na-ekwu na sugar beet nke Europe bụ́ “nke a gbanwere mkpụru ndụ ihe nketa ya iguzogide otu ọgwụ ahịhịa, nwetara na mberede mkpụrụ ndụ ihe nketa ndị na-eguzogide ọgwụ ahịhịa ọzọ.” Mkpụrụ ndụ ihe nketa ahụ nke gahiere ụzọ, mịbatara n’ime beet ahụ mgbe ụdị beet dị iche a gbanwere mkpụrụ ndụ ihe nketa ya ka o wee na-eguzogide ọgwụ ahụhụ dị iche, mere ka ọ maa ifuru na mberede. Ụfọdụ ndị ọkà mmụta sayensị na-atụ egwu na ojiji e ji ihe ọkụkụ ndị na-eguzogide ọgwụ ahịhịa eme ihe n’ebe nile pụrụ ịkpata mmepụta nke ọtụtụ ahịhịa ndị na-eguzogide ọgwụ ahịhịa dị iche iche.
[Igbe/Foto dị na peeji nke 7]
Onye Ọrụ Ugbo—Ọ̀ ‘Na-adịwanye Ụkọ’?
“Kemgbe afọ 1950, ọnụ ọgụgụ ndị ọrụ ugbo adalatawo nke ukwuu ná mba nile bara ọgaranya, n’ógbè ụfọdụ o jiriwo ihe karịrị pasent 80 dalata,” ka magazin bụ́ World Watch na-ekwu. Dị ka ihe atụ, na United States, ọnụ ọgụgụ ndị ọrụ ugbo dịzi ala karịa ndị mkpọrọ. Gịnị na-akpata nhapụ a a na-ahapụ ịkọ ugbo?
Ihe ndị kasị akpata ya bụ ịkpata ego na-adịwanye nta, ịbanyekwu n’ụgwọ n’ihi ọrụ ugbo, ịdawanye ogbenye, na ijiwanye ígwè ọrụ eme ihe. Na 1910, ndị ọrụ ugbo nọ na United States na-enweta ihe dị ka cent 40 n’ime dollar ọ bụla ndị ahịa jiri zụrụ ihe oriri, ma ka ọ na-erule 1997, ókè nke ndị ọrụ ugbo dalataruru ihe dị ka cent 7. Onye na-akọ ọka wheat, ka magazin bụ́ World Watch na-ekwu, “na-enweta nanị cent 6 n’ime dollar ọ bụla e tinyere n’ịzụta otu ogbe bred.” Nke a pụtara na ego ole ndị ahịa na-akwụ maka ihe mfụchi bred bụkwa ihe ha na-akwụ onye ọrụ ugbo maka ọka wheat ya. Ná mba ndị ka na-emepe emepe, ndị ọrụ ugbo nọ n’ọnọdụ ka njọ. Onye ọrụ ugbo n’Australia ma ọ bụ Europe pụrụ ịgbaziri ego n’ụlọ akụ̀ iji nagidelie afọ ọjọọ, onye oru ugbo nọ n’Ebe Ọdịda Anyanwụ Africa nwere ike ọ gaghị anwale ịkọ ugbo ọzọ. O nwere ike ọ gaghịdị alanarị afọ ọjọọ ahụ.
[Foto ndị dị na peeji nke 7]
“Ịkụ nanị otu ụdị ihe ọkụkụ, bụ́ nke a malitere eri e nwere ‘usoro ọhụrụ nke ịkọ ugbo’ emetụtawo ụdị dị iche iche nke ihe ndị dị ndụ na inwe ihe oriri zuru ezu n’ụwa nile, n’ụzọ dị njọ.”—Dr. Mae-Wan Ho
[Ebe E Sigasị Nweta Foto]
Foto dị n’azụ: Ngalaba Ọrụ Ugbo nke United States
Centro Internacional de Mejoramiento de Maíz y Trigo (CIMMYT)
[Foto ndị dị na peeji nke 8]
A na-echekwa mkpụrụ akụ́kụ́ nke ihe ọkụkụ ndị bara uru n’Ebe Nkwakọba Mkpụrụ Akụ́kụ́ Maka Narị Afọ Iri A
[Ebe E Si Nweta Foto]
© Trustees of Royal Botanic Gardens, Kew