Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Olee Otú M Pụrụ Isi Kwụsị Ịdị Na-echegbu Onwe M nke Ukwuu?

Olee Otú M Pụrụ Isi Kwụsị Ịdị Na-echegbu Onwe M nke Ukwuu?

Ndị Na-eto Eto Na-ajụ Sị . . .

Olee Otú M Pụrụ Isi Kwụsị Ịdị Na-echegbu Onwe M nke Ukwuu?

“Otu n’ime ihe ndị kasị akpatara onye na-eto eto nchegbu pụrụ ịbụ ọdịnihu. Ị na-enwe nchegbu banyere onwe gị. Èkwesịrị m ịhapụ ụlọ? Ịga akwụkwọ? Ịmalite ozi oge nile? Ịlụ di ma ọ bụ nwunye? I nwere nnọọ ọtụtụ ihe ị pụrụ isi na ha mee nhọrọ nke na ụjọ na-atụzi gị.”—Shane, afọ 20.

Ị̀ NA-ECHEGBU onwe gị nke ukwuu? Ọtụtụ ndị ntorobịa na-eme otú ahụ, n’ihi ihe dịgasịkwa iche iche. Otu obere akwụkwọ akụkọ e bipụtara iji nye ndị mụrụ ụmụ nduzi kọrọ, sị: “Nnyocha e mere gburugburu ụwa na nso nso a n’etiti ndị nọ n’afọ iri na ụma bụ́ ndị dị site n’afọ 15 ruo 18 ná mba 41 kpughere na inweta ezigbo ọrụ bụ ihe bụ́ isi ndị nọ n’afọ iri na ụma nke taa na-echegbu onwe ha maka ya.” Ihe na-esote ya bụ nchegbu banyere ahụ ike nne na nna ha. Ụjọ nke onye ha hụrụ n’anya ịnwụnahụ ha sokwa n’ihe ndị bụ́ isi n’ime ihe ndị ahụ.

Otu nnyocha Ngalaba Mmụta nke United States mere chọpụtara na “nrụgide inweta akara ule ndị dị mma” bụ isi nchegbu nke ọtụtụ ndị ntorobịa nọ na United States. Otu nnyocha ahụ kpughere na ọtụtụ ndị na-eto eto na-enwe mmetụta yiri nke Shane (bụ́ onye e hotara ná mmalite). Onye ntorobịa ọzọ, nke aha ya bụ Ashley, na-ekwu, sị: “Ana m enwe nchegbu maka ọdịnihu m.”

Ma, ndị ntorobịa ndị ọzọ na-echegbu onwe ha banyere nchebe nke ndụ ha. Dị ka nnyocha e mere na 1996 si kwuo, ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ pasent 50 nke ndị ntorobịa nọ na United States chere na a na-emezi ihe ike n’ụlọ akwụkwọ ha karị. Ihe karịrị nde asatọ nke ndị nọ n’afọ iri na ụma (pasent 37) kwuru na ọ dịwo onye ha maara a gbara égbè!

Otú ọ dị, ọ bụghị nchegbu nile dị nnọọ njọ. Nye ọtụtụ ndị ntorobịa, ihe kasị echegbu ha metụtara ndụ ha na-adị n’etiti ọha mmadụ. Otu magazin dị n’Internet bụ́ nke e dere maka ndị nne na nna na-ekwu, sị: “Ndị nọ n’afọ iri na ụma na-echegbu onwe ha banyere inwe enyi nwoke ma ọ bụ enyi nwanyị, ma karịsịa, ha na-echegbu onwe ha banyere enweghị enyi ma ọlị.” Otu nwa agbọghọ nọ n’afọ iri na ụma nke aha ya bụ Meagan kwara arịrị, sị: “Olee otú mmadụ si abụ onye dị ụtọ n’anya na onye wara anya? Achọrọ m inwe enyi ụfọdụ.” N’otu aka ahụ, otu onye ntorobịa bụ́ onye Kraịst dị afọ 15 nke aha ya bụ Natanael na-ekwu, sị: “Ụmụaka nọ n’ụlọ akwụkwọ na-echegbu onwe ha banyere ụdị uwe ha ga-akwa. Ha na-echegbu onwe ha banyere otú ha si eje ije, ekwu okwu, na otú ha dị n’anya ndị ọzọ. Ha na-atụ ụjọ ịbụ ndị na-eme ka ndị iberibe.”

Nsogbu—Akụkụ nke Ndụ

Ọ ga-adị mma ma ọ bụrụ na anyị ga-adị ndụ n’enweghị nchegbu ọ bụla. Otú ọ dị, Bible na-ekwu na: “Mmadụ nke nwanyị mụrụ, ụbọchị ndụ ya dị mkpụmkpụ, afọ ejuwokwa ya n’ahụhụ.” (Job 14:1) Ya mere, nsogbu—na nchegbu ndị na-eso ya—bụ akụkụ nke ndụ. Ma ọ bụrụ na i kwe ka nchegbu na nchekasị rikpuo gị, ị pụrụ imerụ onwe gị ahụ nke ukwuu. Bible na-adọ aka ná ntị, sị: “Nchegbu n’obi mmadụ na-eme ka obi huru ala.”—Ilu 12:25.

Otu ụzọ isi zere nchegbu na-enweghị isi bụ ịchịkwa àgwà nke gị. Ana, bụ́ onye dị afọ 16 na-ekwu, sị: “Ọtụtụ n’ime ụmụ klas m na-echegbu onwe ha banyere ịtụrụ ime ma ọ bụ inweta ọrịa a na-ebute site ná mmekọahụ.” Ma ị pụrụ izere nchegbu ndị dị otú ahụ site n’ịgbaso ụkpụrụ omume nke Bible. (Ndị Galetia 6:7) Ị gbasogodị ya, ọ bụghị nsogbu gị nile pụrụ ịbụ ndị doro nnọọ anya ma ọ bụ ndị a ga-edozi n’ụzọ dị mfe. Olee otú ị pụrụ isi kwụsị ịdị na-echegbu onwe gị nke ukwuu?

“Nwee Nchegbu n’Ụzọ Amamihe Dị na Ya”

Ọtụtụ ndị na-ekwe ka nchegbu napụ ha ikike ime ihe ọ bụla. Ma otu isiokwu pụtara n’otu magazin maka ndị nọ n’afọ iri na ụma tụrụ aro na mmadụ pụrụ ‘inwe nchegbu n’ụzọ amamihe dị na ya’ site n’ime ka nchegbu kpalie ya ime ihe bara uru! Bible nwere ọtụtụ ụkpụrụ ndị ga-enyere gị aka ime nke ahụ. Tụlee Ilu 21:5: “Echiche nile nke onye dị nkọ na-eduba nanị n’uru.” Were dị ka ihe atụ, na ị chọrọ inwe nnọkọ gị na ndị enyi gị ụfọdụ nọ n’ọgbakọ unu. Nhazi dị mma pụrụ ime ka i zere nchegbu dị ukwuu. Jụọ onwe gị, sị, ‘Ole ndị kpọmkwem ka m ga-akpọ? Olee mgbe m chọrọ ka ha bịarute? Olee mgbe m chọrọ ka ha laa? Gịnị dị m mkpa n’ezie ịkwadebe n’ụdị ihe oriri na ihe ọṅụṅụ? Olee ihe omume mkpori ndụ ụfọdụ ga-amasị onye ọ bụla?’ Ka ị na-echebakwuru ihe echiche nke ọma otú ahụ ka ọ ga-eyikarị ka nnọkọ gị ọ̀ ga-aga nke ọma.

Otú ọ dị, ị pụrụ ịkpali nchegbu site n’ikwe ka ihe gabiga nnọọ ókè. Jisọs Kraịst nyere otu nwanyị nyere nnọọ onwe ya nsogbu karịa ka ọ dị mkpa n’ịkwadebere onye ọbịa ya ihe oriri, ndụmọdụ a: “Ihe ole na ole, ma ọ bụ nanị otu ihe, dị mkpa.” (Luk 10:42, NW) Ya mere jụọ onwe gị, sị, ‘Olee ihe dị mkpa n’ezie iji mee ka nnọkọ a gaa nke ọma?’ Ime ka ihe dị mfe pụrụ inyere gị aka ibelata nchekasị.

Ihe ọzọ na-akpata nchegbu pụrụ ịbụ ịnọ ná nchebe n’ụlọ akwụkwọ gị. Ọ pụrụ ịbụ na ọ dịghị nnukwu ihe ị pụrụ ime iji gbanwee ọnọdụ dị n’ebe ahụ. Ma ị pụrụ ime ihe ụfọdụ iji chebe onwe gị. “Onye nwere ezi uche ahụwo ihe ọjọọ, wee zobe onwe ya,” ka Ilu 22:3 na-ekwu. Nanị izere ebe ndị dị ize ndụ—ọ bụghị nanị ebe ndị mmadụ na-anọghị kamakwa ebe ndị a na-adịghị elekọta anya bụ́ ebe ndị isi ike na-agbakọtakarị—pụrụ ibelata ohere ndị i nwere ịdaba ná nsogbu.

Ọrụ ụlọ akwụkwọ pụrụ ịbụ ihe ọzọ na-eweta nchegbu. Ma eleghị anya i nwere ọtụtụ ihe omume dị mkpa ị ga-eme n’ụlọ, ị na-echegbukwa onwe gị na ị gaghị emecha ha nile n’oge. Ụkpụrụ dị ná Ndị Filipaị 1:10 (NW) na-enye aka: ‘Jide ihe ndị ka mkpa n’aka.’ Ee, mụta ibute ihe ndị ka mkpa ụzọ! Chọpụta ihe omume chọrọ ka e buru ụzọ mee ya, burukwa ụzọ mee ya. E mesịa, gaa na nke ọzọ. Nke nta nke nta, ị ga-amalite ịchịkwa ọnọdụ ahụ.

Nata Ndụmọdụ

Mgbe Aaron bụ onye ntorobịa, o chegburu onwe ya nke ukwuu banyere ịgafe ule ikpeazụ ya nke na ọ malitere inwe obi mgbu. Ọ na-echeta, sị: “Agwara m nne na nna m, ha wee kpọga m na nke dọkịta. Ozugbo, ọ hụrụ na ọ dịghị ihe mere obi m ma kọwaa otú nchekasị pụrụ isi metụta ahụ. Nne na nna m mesịrị nyere m aka ịghọta na emewo m ihe nile m nwere ike ime n’ịkwadebe maka ule ndị ahụ nakwa na ugbu a ọ dị m mkpa ichegbu onwe m karị banyere ilekọta onwe m. Nchekasị m kwụsịrị, obi mgbu ahụ kwụsịrị, emekwara m nke ọma n’ule m.”

Ọ bụrụ na nchegbu erikpuo gị, agbachila nkịtị. Ilu 12:25, bụ́ nke e hotara akụkụ ya ụfọdụ na mbụ, na-ekwu n’ozuzu ya, sị: “Nchegbu n’obi mmadụ na-eme ka obi huru ala; ma okwu ọma na-eme ka ọ ṅụrịa.” Ọ bụ nanị ma i kwupụta “nchegbu obi” gị ka ị pụrụ inweta “okwu ọma” nke agbamume!

Nke mbụ, ị pụrụ ịchọ isoro nne na nna gị kwurịta ya; ha pụrụ nnọọ ịtụrụ gị aro ụfọdụ. Ebe ọzọ ị ga-enweta nkwado bụ n’etiti ndị Kraịst nọ n’ọgbakọ gị bụ́ ndị tozuru ókè n’ụzọ ime mmụọ. Janelle, bụ́ onye dị afọ 15 na-akọ, sị: “Enwere m nchegbu banyere ịga kọleji, atụrụ m ụjọ izute ihe nile—ọgwụ ọjọọ, mmekọahụ, ime ihe ike—ruo mgbe m sooro otu onye okenye ọgbakọ kwurịta okwu. Ọ tụụrụ m ọtụtụ aro ndị bara uru. Enwere m mmetụta ka mma ozugbo n’ihi na ugbu a aghọtara m na m pụrụ ịchịkwa ọnọdụ ahụ.”

Eyigharịla Ihe

Mgbe ụfọdụ e nwere ihe dị anyị mkpa ime, ma anyị eyigharịa ya n’ihi na ọ dịghị anyị mma. Dị ka ihe atụ, Shevone, bụ́ onye dị afọ 19, na onye Kraịst ibe ya nwere nghọtahie. Ọ maara na ọ dị ya mkpa iso ya kwurịta ya, ma o yigharịrị ya. “Ka m na-eyigharịkwu ya, otú ahụ ka ọ na-enyekwu m nsogbu n’obi,” ka o kwupụtara. Shevone chetaziri okwu Jisọs dị na Matiu 5:23, 24, bụ́ nke na-agba ndị Kraịst ume idozi nsogbu ndị dị otú ahụ ozugbo. “Mgbe m mesịrị mee otú ahụ,” ka Shevone na-echeta, “obi ruru m ala.”

Ị̀ na-eyigharị ihe—ọrụ na-adịghị gị ụtọ ọrụrụ ma ọ bụ izute mmadụ ihu na ihu bụ́ nke obi na-erughị gị ala ime? Hụ na i mere ihe maka ya ngwa ngwa, ị ga-ewepụkwa otu ihe n’ime ihe ndị ị na-echegbu onwe gị maka ha.

Ọnọdụ Ndị Tara Akpụ

Ọ bụghị ọnọdụ nile ka a na-edozi nnọọ n’ụzọ dị mfe. Tụlee ihe banyere otu nwa okorobịa aha ya bụ Abdur. Nne ya na-arịa ọrịa cancer, ọ ghaghịkwa ịkwado ma nne ya ma nwanne ya nwoke nke ọ tọrọ. Dị ka o kwesịrị ịdị, Abdur na-enwe nchegbu banyere ọnọdụ nne ya. Ma ọ na-ekwu, sị: “Amụtara m ihe site n’okwu Jisọs, ‘ònye n’etiti unu pụrụ ịtụkwasị otu cubit n’ogologo ya site n’ichegbu onwe ya?’ Kama ịda mbà n’obi, ana m agbalị ịtụle ọnọdụ ahụ ma chọpụta ihe ndị ga-arụpụta ihe kasị mma.”—Matiu 6:27.

Ọ dịghị mfe ịnọ jụụ n’oge nsogbu. Ụfọdụ na-enwe nnọọ obi erughị ala nke na ha adịghịzi elekọta onwe ha, na-ajụ iri ihe. Otú ọ dị, akwụkwọ bụ́ Helping Your Teenager Deal With Stress na-adọ aka ná ntị na mgbe ị na-enyeghị ahụ gị ihe ndị bụ́ isi na-edozi ahụ, ‘ọbụna ị gaghị enwecha ike ịnagide mmetụta ọjọọ nke nrụgide, ọbụnakwa ị ga-abụ onye pụrụ inwe nnukwu nsogbu ahụ ike.’ Ya mere lekọta onwe gị anya. Na-ezu ike nke ọma ma na-eri ihe na-edozi ahụ.

Ị pụrụ inweta ahụ iru ala kasịnụ site n’ịgbaso ndụmọdụ Bible: “Tụkwasị Jehova ihe O nyeworo gị dị ka ibu, Ya onwe ya ga-anagidekwa gị: Ọ gaghị ekwe ka e wezụga onye ezi omume n’ọnọdụ ya ruo mgbe ebighị ebi.” (Abụ Ọma 55:22) Shane, bụ́ onye a kpọtụrụ aha ná mmalite, nwere nchegbu banyere ọdịnihu ya. “Amalitere m ilekwasị anya n’Okwu Chineke na nzube ya karị,” ka ọ na-echeta. N’oge na-adịghị anya, ọ ghọtara na ọdịnihu ya ga-abụ nke obi ụtọ ma ọ bụrụ na o jiri ndụ ya jeere Chineke ozi. (Mkpughe 4:11) “Akwụsịrị m inwe nchegbu banyere onwe m,” ka Shane na-ekwu. “Enwere m ihe ka mkpa m ga-eche banyere ya.”

Ya mere, mgbe ị hụrụ na ị na-echegbu onwe gị nke ukwuu, chọọ ụzọ ndị bara uru isi mee ihe banyere nsogbu gị. Nata ndụmọdụ nke ndị tozuworo okè. Karịsịakwa, wegara Jehova nchegbu gị “n’ihi na ihe nile banyere [gị] na-emetụ Ya n’obi.” (1 Pita 5:7) Site n’enyemaka ya, ma eleghị anya ị ga-akwụsị ichegbu onwe gị nke ukwuu.

[Foto dị na peeji nke 13]

Soro nne na nna gị kwurịta ihe ndị na-echegbu gị

[Foto dị na peeji nke 14]

Ruo ókè i mere ihe ngwa ngwa banyere nsogbu ndị i nwere, ókè ahụ ka ị pụrụ ịkwụsị ichegbu onwe gị