Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ị Pụrụ Inweta Enyemaka

Ị Pụrụ Inweta Enyemaka

Ị Pụrụ Inweta Enyemaka

‘MKPỤRỤ ọgwụ ụra 49 dị n’iko a. Ọ̀ bụ m ṅụọ ha ka ọ̀ bụ mụ aṅụla ha?’ ka otu nwoke dị afọ 28 nọ na Switzerland jụrụ onwe ya. Nwunye ya na ụmụ ya ahapụwo ya, ọ malitekwara inwe oké ịda mbà n’obi. Otú ọ dị, mgbe ọ ṅụsịrị ọgwụ ahụ, ọ gwara onwe ya, sị: ‘Mbanụ. Achọghị m ịnwụ!’ Ihe ọma mere na ọ lanarịrị wee kọọ akụkọ a. Ọchịchọ igbu onwe onye adịghị akpatakarị ọnwụ.

Alex Crosby nke Ụlọ Ọrụ Na-ahụ Maka Nchịkwa na Mgbochi Ọrịa nke United States kwuru banyere ndị nọ n’afọ iri na ụma na-anwa igbu onwe ha, sị: “Ọ bụrụ na ị pụrụ igbochi ya ruo ọbụna nanị awa ole na ole, ị pụrụ ime ka ọ ghara iwere ọnọdụ. Ọ bụrụ na i mee ihe banyere ya, e nwere ọtụtụ ndị ị pụrụ igbochi ịga n’ihu igbu onwe ha. Ị pụrụ ịzọpụta ndụ ha.”

Mgbe Prọfesọ Hisashi Kurosawa na-arụ ọrụ n’Ụlọ Ọrụ Na-ahụ Maka Ịzọpụta Ndụ na Ọnọdụ Mberede n’Ụlọ Akwụkwọ Nkà Mmụta Ọgwụ dị na Japan, o nyeere ọtụtụ ndị na-achọ igbu onwe ha aka inweghachi ọchịchọ ịdị ndụ. Ee, site n’ime ihe ụfọdụ, a pụrụ ịzọpụta ndụ ọtụtụ ndị. Enyemaka dị aṅaa dị mkpa?

Iche Nsogbu Ndị Na-apụtaghị Ìhè Ihu

Dị ka e kwuru n’isiokwu bu ụzọ, ndị nnyocha na-ekwu na pasent 90 nke ndị gburu onwe ha na-arịa ọrịa uche ma ọ bụ nwere nsogbu nke iji ihe na-eri ahụ eme ihe na-akpata. N’ihi ya, Eve K. Mościcki, nke Ụlọ Ọrụ Mba United States Na-ahụ Maka Ahụ Ike Uche, na-ekwu, sị: “Olileanya kasịnụ maka igbochi igbu onwe onye nke ndị nọ n’afọ ndụ nile bụ igbochi ọrịa uche na iji ihe na-eri ahụ eme ihe.”

N’ụzọ dị mwute, ọtụtụ ndị nwere nsogbu ndị dị otú ahụ adịghị enwekarị ọchịchọ ịchọ enyemaka. N’ihi gịnị? “N’ihi na e nwere ajọ mbunobi siri ike n’etiti ọha mmadụ,” ka Yoshitomo Takahashi nke Ụlọ Ọrụ Obodo Ukwu Tokyo Na-ahụ Maka Nkà Mmụta Ọrịa Uche na-ekwu. Ọ gbakwụnyere na ọ bụ ya mere na ọbụna ndị ọ na-edoghị anya ma ahụ ọ̀ dị ha ji ala azụ ịchọ ọgwụgwọ ozugbo.

Otú ọ dị, ụfọdụ adịghị ekwe ka ihere gbochie ha. Hiroshi Ogawa, onye na-ama ọkwa na telivishọn bụ́ onye a maara nke ọma, onye nọworo na-eme ihe omume na telivishọn na Japan ruo afọ 17, kwetara n’ihu ọha na ya dara mbà n’obi nakwa na ọbụna ọ fọdụrụ nke nta ka ya gbuo onwe ya. “E ji ịda mbà n’obi tụnyere azụ̀zụ̀ nke uche,” ka Ogawa kwuru. Onye ọ bụla pụrụ ibute ya, ka ọ kọwara, ma a pụrụ ịgbake na ya.

Gwa Mmadụ

“Mgbe mmadụ na-agwaghị onye ọzọ nsogbu ya, ọ ga-elewezi ya anya dị ka ihe dị nnọọ ukwuu nakwa nke na-enweghị ngwọta,” ka Béla Buda, bụ́ onye Hungary na-arụ ọrụ ahụ ike nke e hotara ihe o kwuru na mbụ, na-ekwu. Okwu a na-emesi ike amamihe dị n’ilu ochie dị na Bible bụ́: “Ọchịchọ nke ya onwe ya na-achọsi ike ka onye na-ekewapụ onwe ya na-achọ, ọ bụ ezi nzube ihe nile ka ọ na-alụsosi ọgụ ike.”—Ilu 18:1.

Ṅaa ntị n’okwu amamihe ndị ahụ. Nanị gị eburula nsogbu gị ndị na-anyịgbu gị. Chọọ onye ị pụrụ ịtụkwasị obi, bụ́kwa onye ị pụrụ ịkọrọ ya. ‘Ma,’ ka ị pụrụ ikwu, ‘enweghị m onye ọ bụla m pụrụ ịkọrọ.’ Dị ka ọkachamara n’ihe banyere ahụ ike uche bụ́ Dr. Naoki Sato si kwuo, ọtụtụ ndị na-eche otú ahụ. Sato kwuru na ndị na-achọ igbu onwe ha pụrụ izere ịkọrọ ndị ọzọ n’ihi na ha achọghị ikpughe adịghị ike ha.

Olee ebe mmadụ pụrụ inweta onye ga-ege ya ntị? N’ọtụtụ ebe onye ahụ pụrụ ịchọ enyemaka nke ụlọ ọrụ na-ahụ maka igbochi igbu onwe onye ma ọ bụ ụlọ ọrụ na-aza òkù fon nzuzo ma ọ bụ chọta ezigbo dọkịta na-agwọ nsogbu mmetụta uche. Ma ụfọdụ ndị ọkachamara na-akwadokwa ebe ọzọ a pụrụ isi nweta enyemaka—okpukpe. Olee otú nke ahụ pụrụ isi nye aka?

Ịchọta Enyemaka nke Dị Mkpa

Marin, bụ́ onye ọrụsị nọ na Bulgaria, malitere inwe ọchịchọ siri ike nke igbu onwe ya. Otu ụbọchị, ọ hụrụ na mberede akwụkwọ okpukpe bụ́ lNche, bụ́ akwụkwọ Ndịàmà Jehova bipụtara. O mere ihe ahụ magazin ahụ tụrụ aro ya bụ́ ime ka Ndịàmà Jehova leta ya. Marin na-akọwa ihe si na ya pụta: “Amụtara m n’ọnụ ha na ndụ bụ onyinye sitere n’aka Nna anyị nke eluigwe nakwa na o rughịrị anyị imerụ onwe anyị ahụ ma ọ bụ ịma ụma gbuo onwe anyị. N’ihi ya, akagburu m ọchịchọ m nweburu igbu onwe m ma malite inwe mmasị ọzọ n’ịdị ndụ!” Marin nwetakwara nkwado ịhụnanya site n’aka ọgbakọ ndị Kraịst. Ọ bụ ezie na ọ ka bụ onye ọrụsị, ọ na-ekwu, sị: “Ndụ m dịzi jụụ ma na-enye m ọṅụ, o jupụtakwara n’ọtụtụ ihe ndị dị mma ime—ọbụna karịa ka m nwere oge ime! Ọ bụ Jehova na Ndịàmà ya mere ka m nweta nke a.”

Nwa okorobịa Switzerland ahụ e hotara ná mmalite nwetakwara enyemaka site n’aka Ndịàmà Jehova. Taa, ọ na-ekwute “obiọma nke otu ezinụlọ ndị Kraịst” bụ́ ndị kpọbatara ya n’ụlọ ha. Ọ na-ekwukwa, sị: “Mgbe e mesịrị, ndị òtù ọgbakọ [nke Ndịàmà Jehova] n’otu n’otu na-akpọ m òkù nri ruo ọtụtụ ụbọchị. Ihe nyere aka abụghị nanị na e mesoro m n’ụzọ afọ ọma kamakwa n’ihi na agwara m mmadụ banyere nsogbu m.”

Ihe nwoke a mụtara na Bible gbara ya ume nke ukwuu, karịsịa mgbe ọ mụtara banyere ịhụnanya nke ezi Chineke ahụ, bụ́ Jehova nwere n’ebe ihe a kpọrọ mmadụ nọ. (Jọn 3:16) N’ezie, Jehova Chineke nwere ntị na-anụ ihe iji gee gị ntị mgbe ị ‘na-awụsị obi gị’ n’ihu ya. (Abụ Ọma 62:8) “Anya Ya na-ejegharị n’ụwa nile,” ọ bụghị iji chọpụta mmejọ ndị mmadụ, kama ọ bụ “igosi Onwe ya onye dị ike n’akụkụ ndị obi ha zuru okè n’ebe Ọ nọ.” (2 Ihe E Mere 16:9) Jehova na-emesi anyị obi ike, sị: “Atụla egwu, gị ka M nọnyeere: elela anya gburugburu n’ụjọ, n’ihi na Mụ onwe m bụ Chineke gị: M ga-agba gị ume; ee, M ga-enyere gị aka; ee, M ga-eji aka nri nke ezi omume m kwagide gị.”—Aịsaịa 41:10.

Banyere nkwa Chineke kwere maka ụwa ọhụrụ, nwoke Switzerland ahụ kwuru, sị: “Nke a enyeworo m aka nke ukwuu ibelata ibu arọ nke nkụda mmụọ m.” Olileanya a, bụ́ nke a kọwara dị ka “arịlịka nke mkpụrụ obi,” gụnyere nkwa nke ndụ ebighị ebi n’ime Paradaịs n’elu ụwa.—Ndị Hibru 6:19; Abụ Ọma 37:10, 11, 29.

Ndụ Gị Dị Ndị Ọzọ Mkpa

N’eziokwu, ị pụrụ ịnọ n’ọnọdụ ndị na-eme ka i chee na ị nọ nanị gị nakwa na ọ dịghị onye ọnwụ gị ga-emetụta. Otú ọ dị, cheta na: E nwere nnukwu ọdịiche dị n’etiti iche na ị nọ nanị gị na nnanị gị. N’oge Bible, ọ dị mgbe onye amụma bụ́ Elaịja nwere ịda mbà n’obi. Ọ gwara Jehova, sị: ‘Ha weere mma agha gbuo ndị amụma Gị; ọ fọdụrụ mụ onwe m, nanị m.’ Ee, Elaịja chere nnọọ na ọ nọ nanị ya—e nwekwara ihe kpatara ya. E gbuwo ọtụtụ n’ime ndị amụma ibe ya. E yiwo ya egwu ọnwụ, ọ nọkwa na-agba ọsọ ndụ. Ma ọ̀ nọ nanị ya n’ezie? Ee e. Jehova mere ka ọ mata na e nwere ihe dị ka mmadụ 7,000 na-eguzosi ike n’ihe bụ́ ndị, dị ka ya onwe ya, ji ikwesị ntụkwasị obi na-agbalị ijere ezi Chineke ahụ ozi n’oge ndị ahụ dị egwu. (1 Ndị Eze 19:1-18) Otú ọ dị, gịnị banyere gị onwe gị? Ọ̀ pụrụ ịbụ na ị nọghị nanị gị dị ka i chere?

Ọ dị ndị na-eche banyere gị. Ị pụrụ iche echiche banyere ndị mụrụ gị, onye òtù ọlụlụ gị, ụmụ gị, na ndị enyi gị. Ma a ka nwere ndị ọzọ. N’ọgbakọ Ndịàmà Jehova, ị pụrụ ịchọta ndị Kraịst tozuru okè bụ́ ndị nwere mmasị n’ebe ị nọ, bụ́ ndị ga-ege gị ntị, ndị ga-esorokwa gị kpee ekpere ma kpeere gị ekpere. (Jemes 5:14, 15) Ọ bụrụgodịkwa na mmadụ nile na-ezughị okè agbahapụ gị, ọ dị Onye na-agaghị ahapụ gị ma ọlị. Eze Devid nke mgbe ochie, kwuru, sị: “N’ihi na nna m na nne m ahapụwo m, ma Jehova ga-ekubata m.” (Abụ Ọma 27:10) Ee, ‘ihe nile banyere gị na-emetụ Jehova n’obi.’ (1 Pita 5:7) Ya adịla mgbe ị ga-echezọ na ị dị oké ọnụ ahịa n’anya Jehova.

Ndụ bụ onyinye sitere n’aka Chineke. N’eziokwu, mgbe ụfọdụ ndụ pụrụ iyi ibu arọ kama iyi onyinye. Otú ọ dị, ị̀ pụrụ ichetụ n’echiche otú obi ga-adị gị ma ọ bụrụ na i nye mmadụ onyinye bara uru, ya atụfuo ya tupu o jiri ya mee ihe n’ezie? Anyị bụ́ ụmụ mmadụ na-ezughị okè amalitechabeghị iji onyinye nke ndụ eme ihe. N’eziokwu, Bible na-egosi na ndụ anyị na-adị ugbu a abụghịdị “ndụ ahụ nke bụ́ ndụ n’ezie” n’anya Chineke. (1 Timoti 6:19) Ee, n’ọdịnihu dị nso, ndụ anyị ga-abụ nke na-eju afọ karị, nke nwere nzube karị, ma na-enye obi ụtọ karị. Ọ̀ bụ n’ụzọ dị aṅaa?

Bible na-ekwu, sị: “[Chineke] ga-ehichapụkwa anya mmiri nile ọ bụla n’anya ha; ọnwụ agaghị adịkwa ọzọ; iru újú ma ọ bụ ịkwa ákwá ma ọ bụ ahụ ụfụ agaghị adịkwa ọzọ: ihe mbụ nile agabigawo.” (Mkpughe 21:3, 4) Gbalịa ise onyinyo otú ndụ gị ga-adị mgbe e mezuru okwu ndị ahụ. Jiri nwayọọ. Gbalịa ise onyinyo zuru ezu, nke mara mma. Onyinyo ahụ abụghị echiche efu. Ka ị na-atụgharị uche n’otú Jehova siworo mesoo ndị ya n’oge gara aga, obi ike i nwere n’ebe ọ nọ ga-esikwu ike, onyinyo ahụ pụkwara iyikwu ihe dị adị nye gị.—Abụ Ọma 136:1-26.

Ọ pụrụ iwe oge ụfọdụ tupu i nwetaghachichaa ọchịchọ gị ịdị ndụ. Nọgide na-ekpegara “Chineke nke nkasi obi nile; Onye na-akasi anyị obi ná mkpagbu anyị nile,” ekpere. (2 Ndị Kọrint 1:3, 4; Ndị Rom 12:12; 1 Ndị Tesalọnaịka 5:17) Jehova ga-enye gị ume dị gị mkpa. Ọ ga-akụziri gị na ndụ kwesịrị obibi.—Aịsaịa 40:29.

[Igbe/Foto dị na peeji nke 19]

Olee Otú Ị Pụrụ Isi Nyere Onye Yiri Ka Ọ̀ Ga-egbu Onwe Ya Aka?

Gịnị ka i kwesịrị ime ma ọ bụrụ na mmadụ akọọrọ gị na ya chọrọ igbu onwe ya? “Bụrụ onye na-ege ntị nke ọma,” ka Ụlọ Ọrụ Na-ahụ Maka Nchịkwa na Mgbochi Ọrịa nke United States (CDC), na-adụ ọdụ ya. Hapụ ya ka o kwupụta mmetụta ọ na-enwe. Otú ọ dị, n’ọtụtụ ọnọdụ, onye na-achọ igbu onwe ya na-agbachi nnọọ nkịtị n’ekwughị ihe ọ bụla. Gwa ya na ị maara na ọ na-enwe ihe mgbu ma ọ bụ na o nweghị olileanya n’ezie. Ọ bụrụ na i jiri nwayọọ kwuo mgbanwe ụfọdụ ị chọpụtara n’àgwà ya, ị pụrụ ịkpali ya ịmalite ikwu okwu ma kọọrọ gị nsogbu ya.

Ka ị na-ege ntị, gosi ọmịiko. “Ọ dị mkpa imesi ya ike na ndụ onye ahụ dị gị na ndị ọzọ mkpa,” ka ụlọ ọrụ CDC, na-ekwu. Mee ka ọ mata otú ọnwụ ya ga-esi gbawaa gị na ndị ọzọ obi. Nyere onye ahụ aka ịhụ na Onye Okike ya na-eche banyere ya.—1 Pita 5:7.

Ndị ọkachamara na-atụkwa aro iwepụ ihe ọ bụla onye ahụ pụrụ iji gbuo onwe ya—karịsịa égbè. Ọ bụrụ na ọnọdụ ya dị njọ, i kwesịrị ịgba onye ahụ ume inweta nlekọta ahụ ike. N’ọnọdụ ndị dị oké njọ, o nwere ike ọ dịghị ihe ọzọ ị pụrụ ime karịa ịkpọ ndị ọrụ ahụ ike na-ahụ maka ọnọdụ mberede n’onwe gị.

[Igbe dị na peeji nke 21]

‘Chineke Ọ̀ Ga-agbaghara M Maka Inwe Mmetụta Dị Otú A?’

Iso Ndịàmà Jehova na-akpakọrịta enyeworo ọtụtụ ndị aka iwepụ echiche igbu onwe ha n’obi ha. Ma, ọ dịghị onye ihe omume ndị na-akpata nchekasị ná ndụ ma ọ bụ ịda mbà n’obi na-apụghị imetụta. Obi ndị Kraịst bụ́ ndị cheworo echiche igbu onwe ha na-amakarị ha ikpe nke ukwuu n’ihi iche echiche dị otú ahụ. Obi amamikpe ahụ pụrụ nanị ịtụkwasị ihe n’ibu arọ ha. Ya mere, olee otú a pụrụ isi chịkwaa mmetụta dị otú ahụ?

O kwesịrị nrịba ama na ụfọdụ ndị ikom na ndị inyom kwesịrị ntụkwasị obi n’oge Bible kwupụtara oké mwute ha nwere banyere ndụ. N’otu oge, Rebeka, bụ́ nwunye nna ochie ahụ bụ́ Aịsak, nwere nnọọ mwute n’ihi otu nsogbu ezinụlọ nke na ọ sịrị: “Ike ndụ m agwụsịwo m.” (Jenesis 27:46) Job, bụ́ onye ụmụ ya nwụnahụrụ, onye na-enwekwaghị ahụ ike, onye akụ̀ na ụba, na ọnọdụ ya n’etiti ọha mmadụ funahụrụ, kwuru, sị: “Ike ndụ m agwụwo mkpụrụ obi m.” (Job 10:1) N’otu oge, Mosis tikuru Chineke, sị: ‘Biko, gbusịa m.’ (Ọnụ Ọgụgụ 11:15) N’otu oge, Elaịja, bụ́ onye amụma Chineke, kwuru, sị: “O zuwo; ugbu a, Jehova, wepụ ndụ m.” (1 Ndị Eze 19:4) Onye amụma bụ́ Jona kwukwara ugboro ugboro, sị: “Ọ ka m mma ịnwụ ọnwụ karịa ịdị ndụ.”—Jona 4:8.

Jehova ọ̀ katọrọ mmadụ ndị a n’ihi inwe mmetụta ndị ha nwere? Ee e. Ọbụna o chekwara okwu ha n’ime Bible. Otú ọ dị, ọ dị oké mkpa ịrịba ama na ọ dịghị nke ọ bụla n’ime ndị ahụ kwesịrị ntụkwasị obi kwere ka mmetụta ha kpalie ha igbu onwe ha. Jehova jiri ha kpọrọ ihe, ọ chọrọ ka ha dịrị ndụ. Nke bụ́ eziokwu bụ na Chineke na-eche banyere ndụ nke ndị ajọ omume. Ọ na-agba ha ume ka ha gbanwee ụzọ ha “wee dị ndụ.” (Ezikiel 33:11) Lee otú ọ na-aghaghị isi chọọ karị ka ndị na-enwe mmasị inweta ihu ọma ya dịgide ndụ!

Chineke enyewo àjà mgbapụta nke Ọkpara ya, ọgbakọ ndị Kraịst, Bible, na ihe ùgwù nke ikpe ekpere. Ụzọ a a na-esi esoro Chineke ekwurịta okwu—ekpere—adịghị akpọchi akpọchi ma ọlị. Chineke pụrụ ịnụ, ọ na-anụkwa ihe ndị nile ji obi umeala, na nke eziokwu, abịakwute ya na-arịọ. “Ya mere ka anyị were nkwuwa okwu bịaruo ocheeze amara, ka e wee meere anyị ebere, ka anyị wee hụkwa amara inyere anyị aka n’oge mkpa.”—Ndị Hibru 4:16.

[Igbe dị na peeji nke 22]

Ọ̀ Dịwo Onye Ị Hụrụ n’Anya Gburu Onwe Ya?

Mgbe mmadụ gburu onwe ya, ndị òtù ezinụlọ na ezi ndị enyi ya na-enwe oké mgbasasị uche. Ọtụtụ ndị na-ata onwe ha ụta maka ọdachi ahụ. Ha na-ekwu ihe ndị dị ka: ‘A sị nnọọ na mụ na ya nọtụkwuru n’ụbọchị ahụ,’ ‘A sị nnọọ na m kwara ire m nga n’oge ahụ,’ ‘A sị nnọọ na m metụkwuru ihe iji nyere ya aka.’ Ihe ọ pụtara bụ, ‘A sị nnọọ na m mere nke a ma ọ bụ nke ọzọ, onye m hụrụ n’anya ka gaara anọ ndụ ruo ugbu a.’ Otú ọ dị, ọ̀ bụ ihe ezi uche dị na ya ịta onwe gị ụta maka ogbugbu onye ọzọ gburu onwe ya?

Cheta, ọ dị nnọọ mfe ịhụ mgbaàmà nke echiche igbu onwe onye mgbe onye ahụ gbusịrị onwe ya. Ọ dịghị adị mfe ịhụ mgbaàmà ahụ tupu mmadụ egbuo onwe ya. Bible na-ekwu, sị: “Nanị obi maara ilu ya, ọ dịghịkwa onye ọzọ pụrụ iso ya ṅụrịa ọṅụ ya.” (Ilu 14:10, Tanakh) Mgbe ụfọdụ, ọ dịghị ekwe nnọọ omume ịghọta ihe onye ọzọ na-eche ma ọ bụ mmetụta ọ na-enwe. Ọtụtụ ndị na-eche echiche igbu onwe ha apụghị nnọọ ịgwa ndị ọzọ, ọbụna ndị òtù ezinụlọ nọ ha nso, mmetụta ha na-enwe n’ụzọ zuru ezu.

Akwụkwọ bụ́ Giving Sorrow Words (Ikwupụta Iru Újú Ekwupụta) na-ekwu nke a banyere mgbaàmà ndị na-egosi na mmadụ pụrụ ịdị na-eche echiche igbu onwe ya, sị: “Nke bụ́ eziokwu bụ na ọ dịghị adịkarị mfe ịmata mgbaàmà ndị dị otú ahụ.” Otu akwụkwọ ahụ na-ekwukwa na ị hụgodị mgbaàmà ụfọdụ, nke ahụ n’onwe ya agaghị eme ka i jide n’aka na ị gaara egbochi onye ahụ igbu onwe ya. Kama imekpa onwe gị ahụ, ị pụrụ inweta nkasi obi n’okwu Eze Solomọn nwere amamihe: “Ndị dị ndụ maara na ha ga-anwụ: ma ndị nwụrụ anwụ adịghị ama ihe ọ bụla.” (Eklisiastis 9:5) Onye ị hụrụ n’anya anọghị ná mmekpa ahụ na hel na-ere ọkụ. Mmekpa ahụ nke uche na nke mmetụta uche mere ka o gbuo onwe ya akwụsịla. Ọ nọghị n’ahụhụ; ọ na-ezu nnọọ ike.

Ọ pụrụ ịkasị mma ugbu a ilekwasị anya n’ọdịmma nke ndị dị ndụ, gụnyere gị onwe gị. Solomọn gara n’ihu ikwu, sị: “Ihe ọ bụla aka gị na-ahụ ime, were ike gị mee ya” mgbe ị dị ndụ. (Eklisiastis 9:10) Jide n’aka na olileanya onye ahụ gburu onwe ya nwere ịdị ndụ n’ọdịnihu dị n’aka Jehova, bụ́ “Nna nke obi ebere nile na Chineke nke nkasi obi nile.”—2 Ndị Kọrint 1:3. *

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 40 Ị ga-achọta echiche dị otú o kwesịrị banyere olileanya maka ọdịnihu nke ndị gburu onwe ha n’isiokwu bụ́ “Echiche nke Bible: Ndị Gburu Onwe Ha—Hà Ga-ebilite n’Ọnwụ?” dị na Teta! (Bekee) nke September 8, 1990.

[Foto ndị dị na peeji nke 18]

Gwa mmadụ

[Foto dị na peeji nke 20]

Ndị ọzọ nwere mmasị ná ndụ gị