Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ọchịchị Nchịgbu Mmadụ Chịrị Ibe Ya

Ọchịchị Nchịgbu Mmadụ Chịrị Ibe Ya

Ọchịchị Nchịgbu Mmadụ Chịrị Ibe Ya

AKỤKỌ ihe mere eme na-egosi ịbụ eziokwu nke Eklisiastis 8:9: “Mmadụ nwere ike n’ahụ mmadụ ibe ya imejọ ya.” Ma ọ bụ dị ka Jerusalem Bible nke ndị Katọlik si kwuo ya, “mmadụ na-achịgbu ibe ya achịgbu.” E mejọwo ọtụtụ nde ndị mmadụ, a nọwo na-eme otú ahụ n’okpuru ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ ụdị ọchịchị nile dị iche iche nke ụmụ mmadụ nweworo. E mere ka e cheta nhụjuanya a n’okwu osote odeakwụkwọ nke Ọfịs Na-ahụ Maka Ihe Ndị Metụtara Ndị India nke Ngalaba Na-ahụ Maka Ihe Ndị Na-eme na United States kwuru mgbe a na-eme ememe mgbaafọ 175 nke nguzobe e guzobere Ọfịs Na-ahụ Maka Ihe Ndị Metụtara Ndị India.

O kwuru na kama ịbụ oge ememe, ọ bụ “oge ikwu eziokwu dị oké mwute, oge ịkwa ụta.” O kwetara na ọrụ mbụ nke ụlọ ọrụ ahụ n’afọ ndị 1830 bụ isi n’ala agbụrụ ndị dị n’ebe ndịda ọwụwa anyanwụ—ndị Cherokee, ndị Creek, ndị Choctaw, ndị Chickasaw, na ndị Seminole—chụpụ ha. “E ji iyi egwu, aghụghọ, na ike mee ka agbụrụ ndị a buru ibu jiri ụkwụ gaa n’ebe ọdịda anyanwụ dị Kilomita 1,600, na-eli ọtụtụ puku ndị ha meworo agadi, ụmụntakịrị ha na ndị ha na-adịkwaghị ike n’ili ndị a na-egwumighị egwumi na Njem Anya Mmiri ahụ.”

Ọ gara n’ihu ikwu, sị: “Ma n’oge ndị a e mepekwuworo anya, a ghaghị ikweta na mgbasa ahụ a ma ụma na-agbasa ọrịa, mbibi ahụ e bibiri ihe ka ukwuu n’ìgwè atụ buru ibu, ojiji e jiri ajọ ihe ọṅụṅụ na-aba n’anya mebie uche na ahụ ha, na ogbugbu iberibe e gburu ndị inyom na ụmụaka, kpatara ọdachi dị nnọọ egwu nke na a pụghị iwere ya nnọọ dị ka ihe a na-apụghị izere ezere si ná ndịrịta iche nke ụzọ ime ihe pụta.” * O kwetara, sị: “Ụlọ ọrụ a zubere ibibi ihe nile e jikọtara ha na ndị India. Ụlọ ọrụ a machibidoro ịsụ asụsụ ndị India . . . meekwa ka ihere mewa ndị India na ha bụ ndị India. Nke kacha njọ bụ na Ụlọ Ọrụ Na-ahụ Maka Ihe Ndị Metụtara Ndị India mesoro ụmụaka e tinyere n’ụlọ akwụkwọ ha ndị a na-ebi ebi na ha ihe n’ụzọ dị otú a, na-emekpọ ha ọnụ n’ụzọ mmetụta uche, n’ụzọ anụ ahụ, nakwa n’ụzọ ime mmụọ.”

O mechiri okwu ya site n’ikwu, sị: “Ka anyị malite site n’igosipụta oké mwute anyị nwere maka ihe ụlọ ọrụ a meworo n’oge gara aga. . . . Ọ dịghị mgbe ọ bụla ọzọ anyị ga-eso zuo ihe onwunwe ndị India. . . . Ọ dịghị mgbe ọ bụla ọzọ anyị ga-emegide okpukpe unu, asụsụ unu, ememe okpukpe unu, ma ọ bụ nke ọ bụla n’ime ụzọ dị iche iche agbụrụ unu si eme ihe.” N’ụzọ dị ịrịba ama, o kwuru, sị: “Anyị aghaghị ijikọta aka hichaa anya mmiri nke ọgbọ asaa. Anyị nile aghaghị ikwe ka a gwọọ obi anyị tiwara etiwa.”—Akwụkwọ nta bụ́ Vital Speeches of the Day, October 1, 2000.

Nanị ezi ihe ngwọta na-adịgide adịgide e nwere maka mmejọ nke mmadụ na-emejọ ibe ya bụ Alaeze Chineke, bụ́ nke ga-eme ka a maliteghachi imeso mmadụ nile n’ụzọ ziri ezi ma ‘hichapụkwa anya mmiri nile ọ bụla n’anya ha; ọnwụ agaghị adịkwa ọzọ; iru újú ma ọ bụ ịkwa ákwá ma ọ bụ ahụ ụfụ agaghị adịkwa ọzọ: ihe mbụ nile agabigawo.’—Mkpughe 21:3, 4.

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 4 Akụkọ ihe mere eme nke Ndị American Indian na-egosi na agbụrụ ndị ahụ na-esekarị okwu n’etiti onwe ha, nke na ha ‘na-alụ ọgụ maka ókèala, ịnyịnya, na atụ mgbe nile.’—Akwụkwọ bụ́ The People Called Apache.

[Ebe E Si Nweta Foto Dị na peeji 31]

Onye India: Ihe osise dabeere na foto Edward S. Curtis sere; Map: Mountain High Maps® Copyright © 1997 Digital Wisdom, Inc.; Ebe obibi ndị India: Leslie’s