Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Enyemaka Maka Ndị Inyom A Na-eti Ihe

Enyemaka Maka Ndị Inyom A Na-eti Ihe

Enyemaka Maka Ndị Inyom A Na-eti Ihe

GỊNỊ ka a pụrụ ime iji nyere ndị inyom a na-emeso ihe ike aka? Nke mbụ, mmadụ aghaghị ịghọta ahụhụ ha na-ata. Mgbe mgbe, mmerụ ahụ ndị na-eti nwunye ha ihe na-akpata adịghị abụ nanị nke anụ ahụ. Ọ na-agụnyekarị mbá na mmaja, nke na onye a na-emeso ya na-enwe mmetụta nke ịbụ onye na-abaghị n’ihe na onye na-enweghị enyemaka.

Tụlee ihe banyere Roxana, bụ́ onye a kọrọ akụkọ ya n’isiokwu nke mbụ. Mgbe ụfọdụ, di ya na-eji okwu eme ihe dị ka ngwá ọgụ. “Ọ na-akọ m ọnụ,” ka Roxana kwuru. “Ọ na-asị: ‘Ị gụchaghịdị akwụkwọ. Olee otú ị ga-esi elekọta ụmụaka ma m anọghị ya? Ị bụ nne dị umengwụ, nke na-amaghị ọrụ ya. Ì chere na ndị ọchịchị ga-ekwe ka ị kpọrọ ụmụ anyị ma ọ bụrụ na ị hapụ m?’”

Di Roxana na-anọgide na-achịkwa nwunye ya site n’ịdị na-ejichi ego. Ọ dịghị ekwe ya ka ọ kwọọ ụgbọala ha, ọ na-akpọkwa ya na fon mgbe nile n’ụbọchị iji chọpụta ihe ọ na-eme. Ọ bụrụ na o kwuo uche ya, oké iwe abịa di ya. N’ihi ya, Roxana amụtawo ịghara ikwu uche ya ma ọlị.

Dị ka a pụrụ ịhụ, mmadụ imeso onye òtù ọlụlụ ya n’ụzọ dị njọ bụ okwu dị mgbagwoju anya. Iji nye aka, jiri ọmịiko gee ntị. Cheta na ọ na-esikarịrị nnọọ onye a na-eti ihe ike ikwu banyere ihe ndị nọworo na-eme ya. Nzube gị kwesịrị ịbụ iwusikwu onye ahụ ike ka ọ na-eme ihe banyere ọnọdụ ya n’ókè ike kwere ya.

Ọ pụrụ ịdị ụfọdụ ndị inyom a na-eti ihe mkpa ịchọ enyemaka n’aka ndị ọchịchị. Mgbe ụfọdụ, oge ihe siri ike—dị ka mgbe ndị uwe ojii batara n’okwu ahụ—pụrụ ime ka nwoke na-emegbu nwunye ya hụ ókè omume ya dịruru ná njọ. Otú ọ dị, n’eziokwu, mkpali ọ bụla o nwere ịgbanwe na-emikarị ala ozugbo nsogbu ahụ gafesịrị.

Nwanyị ahụ a na-eti ihe ò kwesịrị ịhapụ di ya? Bible adịghị ele nkewa nke di na nwunye anya dị ka obere ihe. Otú ọ dị, o kwughị na ọ bụ iwu na nwanyị a na-eti ihe ga-anọgide na-ebinyere nwoke na-etinye ahụ ike ya na ma eleghị anya ọbụna ndụ ya n’ihe ize ndụ. Onye Kraịst bụ́ Pọl onyeozi dere, sị: “A sna bezie na o kewapronwe ya, ya nọgide n’enweghị di; ma o meghị otú a, ka e mee ka ya na di ya dị n’otu.” (1 Ndị Kọrint 7:10-16, ọ bụ anyị dere okwu ụfọdụ n’aka akwụkwọ dị iche.) Ebe ọ bụ na Bible adịghị amachibido nkewa n’ọnọdụ ndị dị oké njọ, ihe ọ bụla nwanyị mere n’okwu a bụ mkpebi dịịrị ya. (Ndị Galetia 6:5) Ọ dịghị onye kwesịrị ịmanye nwanyị ịhapụ di ya, ma ọ dịghịkwa onye kwesịrị ịrụgide nwanyị a na-eti ihe isoro nwoke na-emegbu ya na-ebi mgbe a na-eyi ahụ ike, ndụ, na ọnọdụ ime mmụọ ya egwu.

È Nwere Olileanya Dịịrị Ndị Na-eti Nwunye Ha Ihe?

Mmadụ iti onye òtù ọlụlụ ya ihe bụ ajọ mmebi nke ụkpụrụ Bible. Ná Ndị Efesọs 4:29, 31, anyị na-agụ, sị: “Ka okwu ọ bụla nke na-ere ure ghara isi n’ọnụ unu pụta . . . Ka e wepụ ihe ilu na ọnụma na iwe na iti mkpu na nkwulu nile, ha na obi ọjọọ nile, n’etiti unu.”

Ọ dịghị di ọ bụla nke na-azọrọ na ya bụ onye na-eso ụzọ Kraịst nke pụrụ n’ezie ikwu na ya hụrụ nwunye ya n’anya ma ọ bụrụ na ọ na-emegbu ya. Ọ bụrụ na ọ na-emejọ nwunye ya, uru gịnị ka ọrụ ọma ya ndị ọzọ nile ga-aba? Onye ‘na-eti mmadụ aka’ erughị eru maka ihe ùgwù ndị pụrụ iche n’ọgbakọ ndị Kraịst. (1 Timoti 3:3; 1 Ndị Kọrint 13:1-3) N’ezie, a pụrụ ịchụpụ onye ọ bụla sịrị na ya bụ onye Kraịst nke na-ewekarị iwe ọkụ n’enweghị nchegharị n’ọgbakọ.—Ndị Galetia 5:19-21; 2 Jọn 9, 10.

Ndị ikom na-eme ihe ike hà pụrụ ịgbanwe àgwà ha? Ụfọdụ ndị agbanwewo. Otú ọ dị, dị ka ọ na-adịkarị, onye na-eti nwunye ya ihe agaghị agbanwe ọ gwụla ma (1) o kwetara na àgwà ya ekwesịghị ekwesị, (2) ma ọ chọrọ ịgbanwe ụzọ ya, nakwa (3) ma ọ chọrọ enyemaka. Ndịàmà Jehova achọpụtawo na Bible pụrụ inwe mmetụta dị ike maka ime mgbanwe. Ọtụtụ ndị nwere mmasị bụ́ ndị na-eso ha amụ Bible azụlitewo ọchịchọ siri ike ime ihe na-atọ Chineke ụtọ. Banyere Jehova Chineke, ndị ọhụrụ a a na-amụrụ Bible na-amụta na “onye na-ahụ ihe ike n’anya ka mkpụrụ obi Ya na-akpọ asị.” (Abụ Ọma 11:5) N’ezie, ka onye na-eti nwunye ya ihe nwee ike ịgbanwe àgwà ya, ọ ga-eme ihe karịrị ịghara iti ihe. Ọ gụnyekwara ịmụta àgwà ọhụrụ ọ ga na-akpaso nwunye ya.

Mgbe nwoke nwetara ihe ọmụma banyere Chineke, ọ na-amụta ile nwunye ya anya dị ka “onye inyeaka” ọ bụghị dị ka ohu, dị ka onye e kwesịkwara ‘inye nsọpụrụ’ ọ bụghị dị ka onye dị ala. (Jenesis 2:18; 1 Pita 3:7) Ọ na-amụtakwa inwe ọmịiko na mkpa ọ dị ya ige ntị n’echiche nwunye ya. (Jenesis 21:12; Eklisiastis 4:1) Usoro ọmụmụ Bible nke Ndịàmà Jehova na-eduzi enyeworo ọtụtụ ndị di na nwunye aka. Ohere ọ bụla adịghị maka onye ọchịchị nchịgbu, onye ọchịchị aka ike, ma ọ bụ onye arụrụala n’ezinụlọ ndị Kraịst.—Ndị Efesọs 5:25, 28, 29.

“Okwu Chineke dị ndụ, na-arụsikwa ọrụ ike.” (Ndị Hibru 4:12) N’ihi ya, amamihe dị na Bible pụrụ inyere ndị di na nwunye aka ịtụle nsogbu ndị ha na-eche ihu ma nye ha obi ike ime ihe banyere ha. Tụkwasị na nke ahụ, Bible nwere olileanya e ji n’aka na-akasi obi nke ịhụ ụwa nke ime ihe ike na-adịghị na ya mgbe Eze eluigwe nke Jehova ga-achị ihe nile a kpọrọ mmadụ na-erube isi. Bible na-ekwu, sị: “Ọ ga-anapụta ogbenye mgbe ọ na-etiku ya; ọ ga-anapụtakwa onye e wedara n’ala mgbe ọ dịghị onye na-enyere ya aka. Ọ ga-esi n’aka nzọgbu na n’aka ime ihe ike gbapụta mkpụrụ obi ha.”—Abụ Ọma 72:12, 14.

[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 12]

Ohere ọ bụla adịghị maka onye ọchịchị nchịgbu, onye ọchịchị aka ike, ma ọ bụ onye arụrụala n’ezinụlọ ndị Kraịst

[Igbe dị na peeji nke 8]

Ịgbazi Echiche Ndị Na-ezighị ezi

• Ọ bụ ndị inyom a na-eti ihe na-eme ihe di ha ji eme otú ahụ.

Ọtụtụ ndị na-eti nwunye ha ihe adịghị anabata ụta maka omume ha, na-azọrọ na ọ bụ nwunye ha na-akpali ha ime otú ahụ. Ọbụna ndị enyi ụfọdụ nke ezinụlọ pụrụ ikwere n’echiche bụ́ na nwanyị ahụ dị isi ike, ka a sịkwa ihe mere di ya adịghị ejideli onwe ya site n’oge ruo n’oge. Ma nke a pụtara ịta onye e tiri ihe ụta na ikwu na onye ahụ tiri ihe meziri emezi. N’ezie, ndị inyom a na-eti ihe na-etinye mgbalị dị ukwuu iji mee ka obi jụrụ di ha. E wezụga nke ahụ, ọ dịghị ọnọdụ ọ bụla mmadụ iti nwunye ya ihe ziri ezi na ya. Akwụkwọ bụ́ The Batterer—A Psychological Profile na-ekwu, sị: “Ndị ikom ụlọikpe zigara ịnara ọgwụgwọ maka iti nwunye ha ihe bụ ndị ime ihe ike riri ahụ. Ha na-ewere ya dị ka ụzọ isi mejụọ iwe na ịda mbà n’obi, ụzọ isi nwee nchịkwa ma dozie esemokwu, na ihe na-ebelata nrụgide. . . . Mgbe mgbe, ha apụghịdị ikweta na ha nwere nsogbu ma ọ bụ lee nsogbu ahụ anya dị ka ihe dị njọ.”

• Mmanya na-aba n’anya na-eme ka nwoke tie nwunye ya ihe.

N’eziokwu, ndị ikom ụfọdụ na-aka eme ihe ike mgbe ha ṅụrụ mmanya. Ma ọ̀ bụ ihe ezi uche dị na ya ịta mmanya ahụ na-aba n’anya ụta? “Ịbụ onye mmanya na-egbu na-eme ka onye ahụ na-eti nwunye ya ihe nwee ihe ọ ga-ata ụta maka àgwà ya, kama ịta onwe ya ụta,” ka K. J. Wilson dere n’akwụkwọ ya bụ́ When Violence Begins at Home. Ọ gara n’ihu ikwu, sị: “O yiri ka n’obodo anyị, ime ihe ike n’ebe obibi ọ̀ na-aka ekwe nghọta mgbe ọ bụ onye mmanya na-egbu mere ya. Nwanyị a na-emejọ pụrụ izere ile di ya anya dị ka onye na-emejọ ya, kama na-ele ya anya dị ka onye na-aṅụ oké mmanya ma ọ bụ onye aṅụrụma.” Echiche dị otú ahụ, ka Wilson na-ekwu, pụrụ ime ka nwanyị nwee olileanya na-agaghị emezu emezu bụ́ na “ọ bụrụ na nwoke ahụ akwụsị nnọọ aṅụrụma, ime ihe ike ahụ ga-akwụsị.”

Ka ọ dị ugbu a, ọtụtụ ndị nnyocha na-ele aṅụrụma na mmadụ iti nwunye ya ihe anya dị ka nsogbu abụọ dịrịtara iche. E kwuwerị, ọnụ ọgụgụ ka ukwuu nke ndị ikom nwere nsogbu nke iji ihe na-eri ahụ eme ihe adịghị eti nwunye ha ihe. Ndị dere akwụkwọ bụ́ When Men Batter Women na-ekwu, sị: “Ihe na-eme ka iti nwanyị ihe dịgide bụ ihe ịga nke ọma ọ na-enwe n’ịchịkwa nwanyị a na-eti ihe, imenye ya ụjọ, na ime ka ọ nọgide na-edo onwe ya n’okpuru. . . . Ịṅụbiga mmanya ókè na ịṅụ ọgwụ ọjọọ bụ akụkụ nke ndụ nke onye na-eti nwunye ya ihe. Ma ọ ga-abụ ihie ụzọ iwere ya na ọ bụ ya iji ọgwụ ọjọọ eme ihe na-akpata ime ihe ike ahụ.”

• Ndị na-eti nwunye ha ihe na-emeso onye ọ bụla ihe ike.

Mgbe mgbe, onye ahụ na-eti nwunye ya ihe pụrụ ịbụ ezigbo enyi nke ndị ọzọ. Ọ na-eyikwasị nnọọ àgwà dị iche. Ọ bụ nke a mere ọ pụrụ iji siere ndị enyi nke ezinụlọ ha ike ikweta akụkọ ahụ bụ́ na ọ na-eme ihe ike. Ma, nke bụ́ eziokwu bụ na onye na-eti nwunye ya ihe na-ahọrọ ime ihe n’ụzọ obi ọjọọ dị ka ụzọ isi na-achịkwa nwunye ya.

• Ndị inyom adịghị ajụ ịbụ ndị e mejọrọ.

Ma eleghị anya, echiche a sitere n’aghọtaghị ọnọdụ enweghị enyemaka nke nwanyị na-enweghị ebe ọ ga-agbaga nọ na ya. Nwanyị a na-eti ihe pụrụ inwe ndị enyi ga-akpọbata ya ruo otu izu ma ọ bụ abụọ, ma gịnị ka ọ ga-eme mgbe nke ahụ gasịrị? Ịchọta ọrụ na ịkwụ ụgwọ ụlọ ka ha na-elekọta ụmụaka bụ atụmanya ndị na-akụda obi. Iwu nwekwara ike ịmachi mmadụ ịkpọrọ ụmụ gbaa ọsọ. Ụfọdụ ndị anwaala ịgbapụ ma bụrụ ndị a chụgharịrị ma kpọghachite n’ike ma ọ bụ jiri ọgwụ kpọghachite ha. Ndị enyi na-amaghị ihe na-aganụ pụrụ ihie ụzọ n’ikwere na ndị inyom dị otú ahụ ajụghị mmeso ọjọọ ahụ.