Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gịnị Dị Njọ n’Imegwara Ihe?

Gịnị Dị Njọ n’Imegwara Ihe?

Ndị Na-eto Eto Na-ajụ Sị . . .

Gịnị Dị Njọ n’Imegwara Ihe?

“Ọ kparịrị m.”—Conneel, onye dị afọ 15, nọ n’ụlọ mkpọrọ n’ihi igbu ọchụ.

Andrew dị afọ 14, bụ́ onye gburu otu onye nkụzi ná nnọkọ oriri na ọṅụṅụ ụlọ akwụkwọ haziri, kwuru na ya kpọrọ ndị nkụzi na ndị mụrụ ya asị ma na-eweso ụmụ agbọghọ iwe n’ihi ịjụ ya.

MAGAZIN bụ́ Time kpọrọ ya “omume na-akpata ọnwụ.” Otu onye ntorobịa iwe ji zobatara égbè n’ụlọ akwụkwọ malite ịgba ụmụ akwụkwọ ibe ya na ndị nkụzi égbè. Ọdachi ndị dị otú ahụ amalitewo iyi ihe a na-ahụkarị na United States nke na otu akụkọ ụwa nke ụlọ ọrụ TV kọwara omume ahụ dị ka “ntiwapụ nke ime ihe ike.”

Ọ bụ ihe ndabara ọma na ịgba ndị mmadụ égbè n’ụlọ akwụkwọ ka bụ ihe a na-adịghị ahụkebe. N’agbanyeghị nke ahụ, mpụ ndị e mere na nso nso a n’ihi iwe na-ekpughe nnọọ otú iwe si jide ụfọdụ ndị ntorobịa n’ezie. Olee ihe o yiri ka ọ bụ ya na-akpata ntiwapụ nke iwe ọkụ ndị dị otú ahụ? Dị ka ihe àmà gosiri, ụfọdụ n’ime ndị ntorobịa a na-ewe iwe n’ihi ikpe na-ezighị ezi ma ọ bụ iji ike eme ihe n’ụzọ na-ezighị ezi nke ndị nọ n’isi mesoro ha. Dị ka ihe àmà gosiri, ndị ọzọ bụ njakịrị ndị ọgbọ ha nọgidere na-ama ha kpasuru ha iwe. A nọwo na-ama otu nwatakịrị nwoke dị afọ 12 nke gbagburu nwa klas ya—gbagbuokwa onwe ya—njakịrị banyere ibubiga ibu ókè.

N’eziokwu, ihe ka n’ọnụ ọgụgụ ná ndị ntorobịa ma eleghị anya enweghị mgbe ha ga-echesi echiche ike ime ihe ike dị otú ahụ gabigara ókè. Ka o sina dị, iguzogide mmetụta nke ịbụ onye a kpasuru iwe na mwute ndị na-ebilite mgbe a kpara ókè megide gị n’ihi agbụrụ, mgbe a na-achọ gị okwu, ma ọ bụ na-ama gị ajọ njakịrị adịghị mfe. N’icheghachi echiche azụ n’oge ọ ka nọ n’ụlọ akwụkwọ, Ben kwuru, sị: “Adị m mkpụmkpụ karịa ihe ka ukwuu n’ụmụaka ndị ọzọ bụ́ ndị ọgbọ m. N’ihi na a na-akpụru isi m ala, ụmụaka ndị ọzọ na-ama m njakịrị mgbe nile ma na-akụ m aka n’isi. Nke a na-ewe m ezigbo iwe. Ihe mekwuru ka ọ ka njọ bụ na mgbe m gara ka ndị nọ n’isi nyere m aka, ha leghaara m anya. O mere ka iwe wekwuo m ọbụna karị!” Ben na-agbakwụnye, sị: “Nanị ihe gbochiri m iwere égbè gbagbuo ndị a bụ na enwetalighị m ya.”

Olee otú i kwesịrị isi lee ndị ntorobịa ndị na-achọ imerụ ndị kpasuworo ha iwe ahụ anya? Gịnịkwa ka i kwesịrị ime ma ọ bụrụ na e mesoo gị onwe gị mmeso ọjọọ? Iji zaa ha, tụlee ihe Okwu Chineke nwere ikwu.

Njide Onwe Onye—Ihe Àmà nke Ike!

Mmeso ọjọọ na ikpe na-ezighị ezi abụghị ihe ọhụrụ ma ọlị. Otu onye so dee Bible nyere ndụmọdụ a: “Haa aka iwe iwe, hapụkwa ọnụma: emela ka iwe gị dị ọkụ, ọ na-eduba nanị n’ime ihe ọjọọ.” (Abụ Ọma 37:8) Ọtụtụ mgbe, iwe na-agụnyekarị enweghị njide onwe onye, a na-egosipụtakwa ya n’ajụghị ase ihe ga-esi na ya pụta. Mmadụ ikwe ka iwe ya “dị ọkụ” pụrụ ịkpata ntiwapụ nke oké iwe! Gịnị pụrụ isi na ya pụta?

Tụlee ihe atụ dị na Bible banyere Ken na Ebel. “Ken wee wee iwe dị ọkụ nke ukwuu” n’ebe nwanne ya nwoke bụ́ Ebel nọ. N’ihi ya, “o ruo, mgbe ha nọ n’ọhịa, na Ken biliri imegide Ebel, bụ́ nwanne ya, wee gbuo ya.” (Jenesis 4:5, 8) Ihe atụ ọzọ nke iwe a na-achịkwaghị achịkwa metụtara Eze Sọl. N’inwe ekworo maka ike nwa okorobịa bụ́ Devid na-akpa n’agha, n’ezie ọ tụrụ, ọ bụghị nanị Devid kamakwa nwa ya nwoke bụ́ Jonatan, ube!—1 Samuel 18:11; 19:10; 20:30-34.

N’eziokwu, e nwere oge ụfọdụ o kwesịrị ekwesị iwe iwe. Ma ọbụna mgbe ahụ, iwe ziri ezi pụrụ ịrụpụta ihe ọjọọ ma ọ bụrụ na a chịkwaghị ya achịkwa. Dị ka ihe atụ, Simeọn na Livaị nwere ezi ihe mere ha ga-eji wesoo Shekem iwe mgbe ha nụrụ na o dinara nwanne ha nwanyị, bụ́ Daịna, n’ike. Ma kama ijide onwe ha, ha were iwe dị ọkụ, dị ka ihe ndị ha mesịrị kwuo gosiri: “Ọ̀ ga-eme nwanne anyị nwanyị dị ka a na-eme nwanyị na-akwa iko?” (Jenesis 34:31) Mgbe iwe ha rịkwara elu nke ukwuu, ha “weere mma agha ha n’otu n’otu, bịakwasị obodo ahụ mgbe ọ dị ná ntụkwasị obi, ha wee gbuo ndị ikom nile” bi n’obodo Shekem. Iwe ha fere ndị ọzọ n’ihi na “ụmụ ndị ikom Jekọb” ndị ọzọ sonyere n’igbu ọchụ ahụ. (Jenesis 34:25-27) Ọbụna ọtụtụ afọ mgbe ọ gasịrị, nna Simeọn na Livaị, bụ́ Jekọb, katọrọ iwe ha a na-achịkwaghị achịkwa.—Jenesis 49:5-7.

Anyị mụtara otu ihe dị mkpa site na nke a: Iwe a na-achịkwaghị achịkwa abụghị ihe àmà nke ịdị ike kama nke adịghị ike. Ilu 16:32 na-ekwu, sị: “Ọ dị mma, bụ́ onye na-adịghị ewe iwe ọsọ ọsọ, karịa dike: ọ dịkwa mma, bụ́ onye na-achmmụọ ya, karịa onye na-ewere obodo n’agha.” (Ọ bụ anyị dere okwu ụfọdụ n’aka akwụkwọ dị iche.)

Nzuzu nke Dị n’Imegwara Ihe

Ya mere, Akwụkwọ Nsọ na-enye okwu ndụmọdụ a: “Unu enyeghachila onye ọ bụla ihe ọjọọ n’ọnọdụ ihe ọjọọ. . . . Unu abọlara onwe unu ọ́bọ̀.” (Ndị Rom 12:17, 19) Imegwara ihe—ma o metụtara ime ihe ike nkịtị ma ọ bụ nanị okwu ọjọọ—bụ omume asọpụrụghị Chineke. N’otu mgbe ahụ, ụdị ịbọ ọbọ ahụ abaghị nnọọ uru ma bụrụ ihe amamihe na-adịghị na ya. Otu ihe bụ na ime ihe ike na-akpatakarị imekwu ihe ike. (Matiu 26:52) Okwu ọjọọ na-akpatakarịkwa okwu ọjọọ ka ukwuu. Chetakwa na iwe anaghị abụkarị ihe ziri ezi. Dị ka ihe atụ, ị̀ pụrụ ịmata n’ezie ma onye ahụ mejọrọ gị o buuru gị ihe ọjọọ n’obi? Ọ̀ pụrụ ịbụ nanị na onye ahụ echeghị echiche ma ọ bụ na ọ maghị ihe? Ọ bụrụgodị na o buuru gị ihe ọjọọ n’obi, ọnọdụ ahụ ò mere ka imegwara bụrụ ihe kwesịrị ekwesị?

Tụlee ihe Bible kwuru n’Eklisiastis 7:21, 22: “Atụkwasịla obi gị n’okwu nile a na-ekwu; ka i wee ghara ịnụ ka ohu gị na-akọcha gị: n’ihi na ọtụtụ mgbe obi gị mawooro na gị onwe gị akọchawo ndị ọzọ.” Ee, ọ bụ ihe na-adịghị enye obi ụtọ ịnụ ka ndị mmadụ na-ekwu ihe ndị na-adịghị mma banyere gị. Ma Bible kwetara na ọ bụ ihe na-eme eme ná ndụ. Ọ́ bụghị eziokwu na ma eleghị anya na i kwuwo ihe banyere ndị ọzọ ndị ọ gaara aka mma ma a sị na i kwughị ha? Ya mere, gịnị mere ị ga-eji na-ewebiga iwe ókè mgbe mmadụ kwuru ihe na-adịghị mma banyere gị? Ọtụtụ mgbe, ihe kasị mma ime banyere njakịrị bụ nanị ileghara ya anya.

N’otu aka ahụ, ọ bụ ihe amamihe na-adịghị na ya iwebiga iwe ókè mgbe i chere na e mesowo gị mmeso ọjọọ. Otu onye nọ n’afọ iri na ụma aha ya bụ David na-echeta ihe mere mgbe ya na ndị Kraịst ibe ya ụfọdụ tụrụ basketball. “Otu onye so n’ìgwè nke ọzọ tụrụ m bọl ahụ n’ahụ” ka David kwuru. N’ikwubi ngwa ngwa na o mere nke a n’ihi na o buuru ya ihe ọjọọ n’obi, David megwaara, tụgwara ya bọl ahụ n’ahụ. “Ara gbara m,” ka David kwetara. Ma tupu ihe emebikwuo, David kpegaara Jehova ekpere. Ọ jụrụ onwe ya sị, ‘Gịnị ka m na-eme, ịlụso nwanna m nwoke bụ́ onye Kraịst ọgụ?’ Ka e mesịrị, ha rịọrịtara onwe ha mgbaghara.

N’ọnọdụ ndị dị otú ahụ, ọ dị mma icheta ihe nlereanya nke Jisọs Kraịst. “Mgbe a na-ekwutọ Ya, Ọ dịghị ekwutọghachi ọzọ; mgbe Ọ na-ahụ ahụhụ, Ọ dịghị aba mba.” (1 Pita 2:23) Ee, mgbe i nọ ná nrụgide, kama iwe iwe, kpegara Chineke ekpere ma rịọ ya ka o nyere gị aka inwe njide onwe onye. Ọ ‘ga-ewere karị Mmụọ Nsọ nke ukwuu nye ndị na-arịọ Ya.’ (Luk 11:13) Kama imegwara mgbe mmadụ mejọrọ gị, ma eleghị anya ihe ị ga-eme bụ ịgakwuru onye ahụ ka unu kwurịta ya. (Matiu 5:23, 24) Ma ọ bụ, ọ bụrụ na ị bụ onye a nọgidere na-amaja n’ụzọ ụfọdụ dị nnọọ njọ, ma eleghị anya site n’aka nwa akwụkwọ na-achọ okwu, achọla imegwara ya n’ụzọ jọrọ njọ. Kama nke ahụ, ọ dị gị mkpa ime ihe ụfọdụ ezi uche dị na ha iji chebe onwe gị. *

Onye Ntorobịa nke Wezụgara Iwe

Ọtụtụ ndị ntorobịa etinyewo ụkpụrụ Bible ndị a n’ọrụ, ọ rụpụtawokwa ihe ndị dị mma. Dị ka ihe atụ, a gbahapụrụ Catrina ka onye ọzọ kuchie ya mgbe ọ ka dị na nwata. Ọ sịrị: “Enwere m nsogbu nke iwe iwe n’ihi na aghọtaghị m ihe mere nne mụrụ m ji gbahapụ m. N’ihi ya, ana m eweso nne kuchiri m iwe. Ná nzuzu, echere m na ọ bụrụ na m kpasuo ya iwe, na ana m emegwara nne mụrụ m ihe n’ezie n’ụzọ ụfọdụ. N’ihi ya, emere m ihe nile—ịkpọ iyi, iti ụkwụ n’ala, iti mkpu n’oké iwe. Ịkwachi ụzọ n’ike bụ nke m na-emekarị. Ana m asịkwa, ‘Akpọrọ m gị asị!’—nanị n’ihi na iwe ji m nke ukwuu. N’ileghachi anya azụ, apụghị m ikweta na m mere ihe ndị a.”

Gịnị nyeere Catrina aka ịchịkwa iwe ya? Ọ na-aza, sị: “Ọ bụ ịgụ Bible! Nke a dị oké mkpa n’ihi na Jehova maara mmetụta anyị na-enwe.” Catrina chọtakwara nkasi obi mgbe ya na ezinụlọ ya gụrụ isiokwu ndị dị na Teta! bụ́ ndị kwuru okwu banyere ọnọdụ ezinụlọ ya kpọmkwem. * “Anyị nile na-enwe ike ịnọdụkọta ala ọnụ ma ghọta ihe ibe anyị na-eche,” ka ọ na-echeta.

Gị onwe gị kwa pụrụ ịmụta ịchịkwa iwe gị. Mgbe a mara gị njakịrị, chọọ gị okwu, ma ọ bụ mesoo gị mmeso ọjọọ, cheta ihe Bible kwuru n’Abụ Ọma 4:4: “Maanụ jijiji, emehiekwala.” (Ọ bụ anyị dere okwu ahụ n’aka akwụkwọ dị iche.) Okwu ndị ahụ pụrụ inyere gị aka izere iwe iwe na-ebibi ihe.

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

^ par. 18 Iji nweta ndụmọdụ ezi uche dị na ya n’ịnagide ndị nkụzi na-adịghị ekpe ikpe ziri ezi, ụmụ akwụkwọ na-achọ okwu, na ndị mmaja, lee isiokwu bụ́ “Ndị Na-eto Na-ajụ Sị . . . ” ndị pụtara ná mbipụta Teta! (Bekee) nke February 8, 1984; August 22, 1985; na August 8, 1989.

^ par. 21 Lee usoro isiokwu bụ́ “Nkuchi—Ọṅụ, Ihe Ịma Aka Dị Iche Iche,” nke pụtara ná mbipụta Teta! nke May 8, 1996.

[Foto dị na peeji nke 25]

Ọtụtụ mgbe, ihe kasị mma ime banyere njakịrị bụ nanị ileghara ya anya