Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

“Ikekwe Ọ Ga-agbanwe na nke Ugbu A”

“Ikekwe Ọ Ga-agbanwe na nke Ugbu A”

“Ikekwe Ọ Ga-agbanwe na nke Ugbu A”

ROXANA * bụ nne nwere ụmụ anọ bụ́ onye dị gara gara, maakwa mma, nke lụrụ otu dọkịta na-awa ahụ n’Ebe Ndịda America bụ́ onye a na-akwanyere ùgwù nke ọma. “Di m na-adọrọ anya ndị inyom, ndị ikom na-enwekwa mmasị n’ebe ọ nọ,” ka ọ na-ekwu. Ma e nwere ihe na-adịghị mma di Roxana na-eme, nke ọbụna ezi ndị enyi ha na-adịghị ahụ. “N’ụlọ, ọ bụ onye a na-atụ ụjọ. Ọ na-ekwobiga ekworo ókè.”

Ihu Roxana na-egosipụta nchegbu n’ụzọ doro anya ka ọ na-akọ akụkọ ya gaa n’ihu. “Nsogbu ahụ bidoro mgbe nanị izu ole na ole anyị lụrụ di na nwunye gasịrị. Ụmụnne m ndị nwoke na nne m bịara ileta anyị, mụ na ha nọkọrịtakwara n’ụzọ dị ụtọ, na-ekwurịta okwu ma na-achị ọchị. Ma mgbe ha lara, di m ji ike kwaba m n’oche e ji emere àkwà, iwe juru ya obi. Ihe a na-emenụ gbagwojuru m anya.”

N’ụzọ dị mwute, nke ahụ bụ nnọọ mmalite nke ahụmahụ ọjọọ Roxana, eri ọtụtụ afọ, e tiwo ya ihe ugboro ugboro. Mmeso ọjọọ ahụ yiri ka ọ na-agbaso usoro na-adịghị agbanwe agbanwe. Di Roxana na-eti ya ihe, e mesịa, ọ rịọ ya nnọọ ezigbo arịrịọ ma kwe nkwa na ọ gaghị eme ya ọzọ. Àgwà ya na-aka mma—ma ọ dịghị ihe ọzọ ruo oge ụfọdụ. Mgbe ahụ, ahụmahụ ọjọọ ahụ amalitekwa ọzọ. “Ana m anọgide na-eche na ikekwe ọ ga-agbanwe na nke ugbu a,” ka Roxana na-ekwu. “Ọbụna mgbe m gbapụrụ, ana m alaghachikwuru ya mgbe mgbe.”

Roxana na-atụ ụjọ na otu ụbọchị ime ihe ike nke di ya ga-akakwu njọ. “O yiwo egwu igbu m, ụmụ anyị, nakwa ya onwe ya,” ka ọ na-ekwu. “N’otu oge, ọ rụgidere m mkpà n’olu. N’oge ọzọ, o ji égbè yie m egwu, tụgide m ya ná ntị, ma kpaghee utu égbè ahụ! Ihe ọma mere na mgbọ adịghị ya, ma ọ fọrọ nke nta ka egwu tụgbuo m.”

Ogologo Oge nke Ịgbachi Nkịtị

Dị ka Roxana, ọtụtụ nde ndị inyom gburugburu ụwa na-ahụju anya n’aka ndị ikom na-eme ihe ike. * Ọtụtụ n’ime ha na-agbachi nkịtị n’ahụmahụ ọjọọ ha. Ha na-eche na ịkọ nsogbu ahụ agaghị aba uru ọ bụla. E kwuwerị, ọtụtụ ndị di na-emeso nwunye ha n’ụzọ dị njọ agọnahụwo nnọọ ebubo ndị e boro ha site n’ikwu okwu ndị dị ka “Ọ dịghị ara ahụ iwe ewee nwunye m” ma ọ bụ “Ọ na-etinyekarị ihe nnu na ose.”

Ọ dị mwute na ọtụtụ ndị inyom na-ebi mgbe nile n’ụjọ ịbụ ndị a wakporo n’ebe ha kwesịrị inwe mmetụta kasịnụ nke ịnọ ná nchebe—ebe obibi ha. Ma, a na-enwekarị ọmịiko n’ahụ onye na-eme ya kama ịbụ n’ahụ onye a na-emeso ya. N’ezie, ụfọdụ ndị apụghị ikweta na nwoke nke yiri nwa amaala a na-akwanyere ùgwù ga-eti nwunye ya ihe. Tụlee ihe mere otu nwanyị aha ya bụ Anita mgbe o kwupụtara mmeso ọjọọ di ya a na-asọpụrụ nke ọma nọ na-emeso ya. “Otu n’ime ndị enyi anyị gwara m, sị: ‘Olee otú ị ga-esi boo ezigbo nwoke dị otú ahụ ebubo?’ Onye ọzọ sịrị na ọ ghaghị ịbụ na ọ dị otú m si akpasu ya iwe! Ọbụna mgbe a gbasịrị ihe di m na-eme n’anwụ, ụfọdụ n’ime ndị enyi m malitere ize m eze. Ha chere na m kwesịịrị ịdị na-edi ya n’ihi na ‘ọ bụ otú ahụ ka ndị ikom dị.’”

Dị ka ahụmahụ Anita na-egosi, ọ na-esiri ọtụtụ ndị ike ịghọta eziokwu ahụ dị mwute bụ́ na e nwere ndị na-eti onye òtù ọlụlụ ha ihe. Gịnị na-eduga nwoke n’iji nnọọ obi ọjọọ na-emeso nwunye ọ na-azọrọ na ọ hụrụ n’anya? Olee otú a pụrụ isi nyere ndị a na-emeso ihe ike aka?

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

^ par. 2 A gbanwewo aha ụfọdụ n’usoro isiokwu a.

^ par. 7 Anyị maara na a na-emesokwa ọtụtụ ndị ikom ihe ike. Ma nnyocha e mere na-egosi na o yikarịrị ka ndị inyom hà ga-enweta mmerụ ahụ ndị ka nnọọ njọ. N’ihi ya, isiokwu ndị a na-atụle mmeso ọjọọ nke onye a na-emeso ya bụ nwanyị.

[Igbe/Foto dị na peeji nke 4]

Ụdị Dị Iche Iche nke Ime Ihe Ike n’Ebe Obibi

Dị ka Nkwupụta Mba Ndị Dị n’Otu Banyere Ịkwụsị Ihe Ike Megide Ndị Inyom gosiri, okwu bụ́ “imeso ndị inyom ihe ike” pụrụ izo aka ‘n’omume ọ bụla nke ime ihe ike a na-emeso ndị inyom bụ́ nke na-akpata ma ọ bụ nke yiri ka ọ̀ ga-akpata mmerụ ahụ, nsogbu mmekọahụ ma ọ bụ ihe mgbu nke uche ma ọ bụ nhụjuanya nke ndị inyom, gụnyere iyi mmadụ egwu na a ga emeso ya omume ndị dị otú ahụ, mmanye ma ọ bụ iji aka ike anapụ mmadụ nnwere onwe, ma ọ̀ na-ewere ọnọdụ n’ihu ọha ma ọ bụ na nzuzo.” Ihe ndị ọzọ ime ihe ike a gụnyere bụ, “ime ihe ike n’ụzọ anụ ahụ, n’ụzọ mmekọahụ nakwa n’ụzọ akparamàgwà nke na-ewere ọnọdụ n’ezinụlọ nakwa n’obodo, gụnyere iti ihe, imetọ ụmụntakịrị ndị inyom n’ụzọ mmekọahụ, ime ihe ike ndị metụtara ụgwọ isi nwanyị, mmadụ idina nwunye ya n’ike, ibekasị akụkụ ahụ mmadụ ji bụrụ nwanyị na ọdịnala ndị ọzọ na-emerụ ndị inyom ahụ.”