Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Mama na Ụmụ Ya Ndị Nwanyị Iri

Mama na Ụmụ Ya Ndị Nwanyị Iri

Mama na Ụmụ Ya Ndị Nwanyị Iri

DỊ KA ESTHER LOZANO SI KỌỌ

ỌBỤ nne na nna bụ́ ndị Armenia mụrụ mama na papa anyị na Bitlis, Turkey. Ná mmalite nke narị afọ gara aga, mgbe a nọ na-egbu ndị Armenia n’ebe nile, papa anyị hapụrụ Turkey gaa United States. Ọ dị ihe dị ka afọ 25. Mama anyị bụ́ Sophia, hapụkwara mgbe oge ụfọdụ gasịrị, mgbe ọ dị afọ 12.

O yiri ka nne na nna e nwere n’ezinụlọ abụọ ahụ kwekọrịtara iziga nne anyị United States ịga lụọ nna anyị, bụ́ Aram Vartanian. Sophia ka bụ nnọọ nwata ịlụ di mgbe ọ bịarutere Fresno, California, n’ihi ya, o sooro onye ga-emesịa bụrụ nne di ya biri ruo mgbe o ruru ogo ịlụ di.

Nwa mbụ nne na nna anyị mụrụ bụ nwa nwoke ha gụrụ Antranig, aha o mechara gbanwee zawa Barney. A mụrụ ya n’August 6, 1914. Ụmụ iri ndị ọzọ sochirinụ bụcha ụmụ nwanyị. Nna anyị ghọrọ Onye Mmụta Bible, dị ka e si mara Ndịàmà Jehova n’oge ahụ, mgbe Shield Toutjian letara Fresno ma kwuoro ndị Armenia okwu ihu ọha na 1924. Ka e mesịrị, ezinụlọ anyị dum gakọrọ nzukọ ndị Kraịst ọnụ.

Anyị kwagara Oakland, California na 1931 ma sonyere ọgbakọ dị n’ebe ahụ. Barney ji ikwesị ntụkwasị obi jeere Jehova ozi na Napa, California, ruo mgbe ọ nwụrụ na 1941. Abụ m nwa nwanyị nke atọ a mụrụ mgbe a mụsịrị Barney, egosipụtakwara m nrara m raara onwe m nye Jehova na 1935. Mgbe ọ gaworo nzukọ ruo ihe dị ka afọ 75, nwanne anyị nwanyị bụ́ Agnes mere baptism na nso nso a! Anyị nile bụ́ ụmụ nwanyị nọ ya, obi dịkwa anyị nnọọ ụtọ na onye nke ikpeazụ n’ime ụmụ nwanyị iri ahụ emewo baptism ugbu a.

N’ụzọ dị mwute, mama anyị anọghị ya. Ọ nwụrụ n’afọ bu ụzọ mgbe ọ dị 100 afọ na ụbọchị 2. A kọrọ akụkọ banyere ọnwụ ya n’akwụkwọ akụkọ California bụ́ Hayward News nke May 14, 1996. O kwuru na “o jeere ọha ozi afọ ofufo dị ka Onyeàmà Jehova site n’ịkụziri . . . ndị nwere mmasị Bible ruo afọ 54.” Isiokwu ahụ kwukwara ihe nwanne anyị nwanyị bụ́ Elizabeth kwuru, bụ́ onye kwuru, sị: “Ụlọ ya na-eghe oghe mgbe ọ bụla, ọ na-emekwa ndokwa mgbe nile maka otu onye ọzọ pụrụ isoro anyị rie nri. . . Ọ na-asị mgbe dum, ‘Bata bịa ṅụrụtụ kọfị, ọ bụrụkwa na ị bịa mgbe o meworo achịcha baklava ya na-atọgbu onwe ya, mara na i nwere ezigbo ihe ndabara.”

Nwanne anyị nwanyị nke tọsịrị anyị, bụ́ Gladys, dị afọ 85, ma nke ikpeazụ anyị dị afọ 66. Anyị nile bụ Ndịàmà na-ejechi ozi anya. Atọ n’ime anyị jere ozi dị ka ndị ozi ala ọzọ mgbe anyị gụsịrị akwụkwọ na Watchtower Bible School of Gilead. Elizabeth, bụ́ onye bi ugbu a na Newport Beach, California, so na klas nke 13 nke ụlọ akwụkwọ ahụ ma jee ozi na Callao, Peru, afọ ise. Ruth so na klas nke 35. Ya na dị ya, bụ́ Alvin Stauffer, jere ozi dị ka ndị ozi ala ọzọ n’Australia ruo afọ ise. Eso m na klas nke anọ nke Gilead, na 1947 kwa, e kenyere m ịga Mexico, bụ́ ebe mụ na Rodolfo Lozano nọ lụọ na 1955. * Anyị abụọ ejewo ozi na Mexico kemgbe ahụ.

Anyị bụ́ ụmụnne nwanyị iri nwere nnọọ ekele maka ezi ahụ ike anyị nwetụrụ. Ọ na-eme ka anyị nwee ike iji obi anyị, mkpụrụ obi anyị, na ike anyị dum nọgide na-ejere Jehova ozi ruo mgbe ọ chọrọ—ma ugbu a ma ruo mgbe ebighị ebi n’ime ụwa ọhụrụ ya.

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 8 A pụrụ ịchọta ahụmahụ ya ná mbipụta Ụlọ Nche nke January 1, 2001.

[Foto dị na peeji nke 28]

Mgbe Agnes mere baptism, 1997

[Foto dị na peeji nke 29]

Elizabeth n’ụbọchị ọ gụsịrị akwụkwọ na Gilead, 1949

[Foto dị na peeji nke 29]

Esther (n’aka nri) n’alaka ụlọ ọrụ Mexico, 1950

[Foto dị na peeji nke 29]

Ruth na Alvin Stauffer mgbe ha na-eje ozi dị ka ndị ozi nke mba nile n’alaka ụlọ ọrụ Mexico, 1987