Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Nsogbu Zuru Ụwa Ọnụ

Nsogbu Zuru Ụwa Ọnụ

Nsogbu Zuru Ụwa Ọnụ

“Igbu onwe onye bụ nnukwu nsogbu ahụ ike nke ọha na eze.”—David Satcher, dọkịta ukwu United States, na 1999.

OKWU ahụ bụ nke mbụ, n’akụkọ ihe mere eme, dọkịta ukwu United States na-ekwu na igbu onwe onye bụ okwu metụtara ọha na eze. Ọnụ ọgụgụ ndị nọ ná mba ahụ bú ndị na-egbu onwe ha ugbu a karịrị ọnụ ọgụgụ ndị ndị ọzọ na-egbu. Ka a sịkwa ihe mere Ndị Omeiwu United States ji kpọsaa mgbochi igbu onwe onye dị ka ihe mba ahụ ga-ebute ụzọ.

Ma, ọnụ ọgụgụ ndị na-egbu onwe ha na United States, nke bụ́ mmadụ 11.4 n’ime mmadụ 100,000 ọ bụla na 1997, dị ala karịa ọnụ ọgụgụ ndị na-egbu onwe ha n’ụwa nile bụ́ nke Òtù Ahụ Ike Ụwa bipụtara na 2000—mmadụ 16 n’ime mmadụ 100,000 ọ bụla. Ọnụ ọgụgụ ndị na-egbu onwe ha n’ụwa nile ejiwo pasent 60 mụbaa n’afọ 45 gara aga. Ugbu a, n’otu afọ, n’ụwa nile, ihe dị ka otu nde mmadụ na-egbu onwe ha. Ná ngụkọta, nke ahụ bụ ihe dị ka otu onye kwa sekọnd 40!

Otú ọ dị, ihe ndekọ ọnụ ọgụgụ apụghị inye nkọwa zuru ezu nke ọnọdụ ahụ. Ọtụtụ mgbe, ndị òtù ezinụlọ adịghị ekweta na onye ahụ nwụrụ anwụ gburu onwe ya. Ọzọkwa, a na-eme atụmatụ na mgbe ọ bụla mmadụ gburu onwe ya, agbata mmadụ 10 na 25 na-anwa igbu onwe ha. Otu nnyocha chọpụtara na pasent 27 nke ụmụ kọleji nọ na United States kwetara na n’ime afọ gara aga, ha echesiwo echiche ike banyere igbu onwe ha; pasent 8 nke ìgwè ahụ e nyochara kwuru na ha anwawo igbu onwe ha. Nnyocha ndị ọzọ e mere egosiwo na ọ dịwo mgbe site na pasent 5 ruo 15 nke ndị toworo eto chere echiche igbu onwe ha.

Ndịrịta Iche nke Ọdịbendị

Otú ndị mmadụ si ele igbu onwe onye anya dịgasị nnọọ iche iche. Ụfọdụ ndị na-ele ya anya dị ka mpụ, ndị ọzọ na-ele ya anya dị ka ụzọ onye ụjọ si ezere ihe, ọbụna ndị ọzọ na-elekwa ya anya dị ka ụzọ dị ùgwù nke isi rịọ mgbaghara maka omume nzuzu. Ọbụna ụfọdụ na-ele ya anya dị ka ụzọ dị mma mmadụ isi kwadoo ihe ọ na-azọ. N’ihi gịnị ka e ji nwee echiche dị iche iche otú ahụ? Ọdịbendị na-ekere òkè bụ́ isi. N’eziokwu, obere akwụkwọ akụkọ bụ́ The Harvard Mental Health Letter na-ekwu na ọdịbendị pụrụ ọbụna “imepe ohere nke mmadụ igbu onwe ya.”

Tụlee otu mba dị n’etiti Europe—Hungary. Dr. Zoltán Rihmer na-ezo aka n’ọnụ ọgụgụ dị ukwuu nke ndị na-egbu onwe ha n’ebe ahụ dị ka “‘omume’ dị mwute” nke Hungary. Béla Buda, bụ́ onye ntụzi ọrụ n’Ụlọ Ọrụ Mba Na-ahụ Maka Ahụ Ike nke Hungary, kwuru na ọ naghị ara nnọọ ndị Hungary ahụ igbu onwe ha, maka ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ ihe ọ bụla. Dị ka Buda si kwuo, ihe a na-ekwukarị bụ “ọ na-arịa cancer—ọ maara otú ọ ga-esi weta ọnọdụ ahụ ná njedebe.”

N’India, ọ dị mgbe e nwere otu omenala okpukpe a maara dị ka suttee. Ọ bụ ezie na ọ dịwo anya a machibidoro omume a, bụ́ nwanyị di ya nwụrụ ịtụnye onwe ya n’ebe a na-esu ozu di ya ọkụ, a kwụsịchabeghị ya. Dị ka a kọrọ, mgbe otu nwanyị si otú a gbuo onwe ya, ọtụtụ n’ime ndị obodo ahụ toro ọdachi ahụ. Dị ka magazin bụ́ India Today si kwuo, n’ime ọtụtụ afọ gara aga, ógbè India ahụ “ahụwo ka ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ ndị inyom 25 suru onwe ha ọkụ n’ebe a na-esu ozu di ha ọkụ.”

N’ụzọ dị ịrịba ama, na Japan ndị na-anwụ site n’igbu onwe ha ji okpukpu atọ karịa ndị ihe mberede okporo ụzọ na-egbu! “E ji otu ụdị ememe nke mmadụ iji aka ya bọọ onwe ya (seppuku ma ọ bụ hara-kiri) bụ́ nke gbanyeworo nnọọ mkpọrọgwụ mara ọdịbendị Japan, bụ́ nke na-akatọtụbeghị igbu onwe onye, ka akwụkwọ bụ́ Japan—An Illustrated Encyclopedia na-ekwu.

N’akwụkwọ ya bụ́ Bushido—The Soul of Japan, Inazo Nitobe, bụ́ onye mesịrị ghọọ osote odeakwụkwọ ukwu nke Njikọ Mba Nile, kọwara àgwà igbu onwe onye a nke ọdịbendị na-akpali. O dere, sị: “N’ịbụ ihe a malitere mgbe ụwa na-emepechabeghị anya, [seppuku] bụ ụzọ ndị dike pụrụ isi weta obi amamikpe nke mpụ ha mere ná njedebe, rịọ mgbaghara maka njehie ha, zere mmechuihu, wepụ mmetụta nke nsogbu ọ bụla ha kpatara, ma ọ bụ gosi obi eziokwu ha.” Ọ bụ ezie na ụdị igbu onwe onye a n’ụzọ ememe bụ n’ozuzu ya ihe gara aga, mmadụ ole na ole ka na-eme ya n’ihi mmetụta ọ na-enwe n’ọha mmadụ.

N’aka nke ọzọ, na Krisendọm, ọ dịwo anya a na-ele igbu onwe onye anya dị ka mpụ. Ka ọ na-erule na narị afọ nke isii na asaa, Chọọchị Roman Katọlik chụpụrụ ndị gburu onwe ha ma jụ imere ha ememe olili ozu. N’ebe ụfọdụ, ịnụrụ okpukpe ọkụ n’obi akpatawo omenala ndị dị ịtụnanya banyere igbu onwe onye—gụnyere ịkwụwa ozu ahụ n’elu osisi nakwa ọbụna iji osisi dụpuo ya obi.

N’ụzọ dị iche n’ihe a tụrụ anya ya, ndị nwara igbu onwe ha pụrụ inweta amamikpe ọnwụ. A kwụgburu onye England nke narị afọ nke 19 n’ihi ịnwa igbu onwe ya site n’ịfọ onwe ya mma n’olu. Ndị ọchịchị si otú a mezuo ihe nwoke ahụ n’onwe ya na-emelighị. Ọ bụ ezie na ntaramahụhụ maka mmadụ ịnwa igbu onwe ya agbanweela n’ime afọ ndị gafeworonụ, ọ bụ na 1961 ka Nzukọ Ndị Isi nke Britain kwupụtara na igbu onwe onye na ịnwa igbu onwe onye abụghịzi mpụ. Na Ireland ọ nọgidere na-abụ mpụ ruo na 1993.

Taa, ụfọdụ ndị na-ede akwụkwọ na-akwado igbu onwe onye dị ka ihe ọzọ a pụrụ ime. Otu akwụkwọ e dere na 1991 bụ́ nke na-ekwu banyere inyere onye na-arịa ọrịa na-enweghị ngwọta aka igbu onwe ya tụrụ aro ụzọ dị iche iche mmadụ ga-esi gbuo onwe ya. Ka e mesịrị, ọtụtụ ndị na-adịghị arịa ọrịa na-enweghị ngwọta jiri otu n’ime ụzọ ndị ahụ a tụrụ aro ha na-eme ihe.

Igbu onwe onye ọ̀ bụ ihe ngwọta maka nsogbu mmadụ n’ezie? Ka ọ̀ dị ezi ihe ndị mere a ga-eji nọgide na-adị ndụ? Tupu anyị atụlee ajụjụ ndị a, ka anyị buru ụzọ tụlee ihe ndị na-akpata mmadụ igbu onwe ya.

[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 14]

N’otu afọ nanị, n’ụwa nile, ihe dị ka otu nde mmadụ na-egbu onwe ha. Ná ngụkọta, nke ahụ bụ otu onye n’ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ kwa sekọnd 40!