Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ojiji Chineke Na-eji Ike Eme Ihe—Ò Ziri Ezi?

Ojiji Chineke Na-eji Ike Eme Ihe—Ò Ziri Ezi?

Echiche nke Bible

Ojiji Chineke Na-eji Ike Eme Ihe—Ò Ziri Ezi?

OJIJI a na-eji ike eme ihe n’ụzọ gabigara ókè anọgidewo na-abụ akụkụ nke akụkọ ihe mere eme nke mmadụ. Dị ka otu atụmatụ e mere si gosi, ikekwe mmadụ 170,000,000 abụwo ndị òtù ọchịchị ha gburu na narị afọ nke 20. Dị ka Bible na-akọwa n’ụzọ ziri nnọọ ezi, ụmụ mmadụ anọgidewo na-enwe ike n’ahụ mmadụ ibe ha imejọ ha.—Eklisiastis 8:9.

N’ihi ojiji ụmụ mmadụ na-eji ike gabigara ókè eme ihe n’ụzọ na-ezighị ezi, ụfọdụ ndị pụrụ ile ojiji Chineke na-eji ike ebibi ndị iro ya anya dị ka nke na-adịghị mma. Ọ̀ bụ na ndị Juu, site n’iwu Chineke nyere n’onwe ya, awakpoghị ma gbuo ndị Kenean bi n’Ala Nkwa ahụ? (Deuterọnọmi 20:16, 17) Chineke n’onwe ya ó kwughị na ya ga-etipịa ọchịchị nile na-emegide ya ma mee ka ha gwụsịa? (Daniel 2:44) Ụfọdụ ndị nwere obi eziokwu echewo ma ojiji Chineke na-eji ike eme ihe ò ziri ezi mgbe nile.

Iji Ike Eme Ihe n’Ụzọ Na-ezighị Ezi

Ọ dị oké mkpa ịghọta na ikike nke iji ike eme ihe bụ ihe dị mkpa nke ndị ọchịchị na-eji eme ihe. Ọchịchị nke na-apụghị ịhụ na e debere iwu ya enweghị ike ọ bụla, dị ka a pụrụ isi kwuo ya. Dị ka ihe atụ, n’agbanyeghị na e kwuru na ndị uwe ojii na-emeso mmadụ n’ụzọ na-ezighị ezi, ọ̀ bụ mmadụ ole ga-adị njikere ịghara ịnọ n’okpuru nchebe nke ndị uwe ojii na-enye? Oleekwa onye isi dị mma ga-arụ ụka na usoro ikpe ziri ezi nke nwere ikike adịghị mkpa?

N’otu oge, Mohandas Gandhi, bụ́ onye a ma ama maka asị ọ kpọrọ ime ihe ike, kwuru, sị: “Ka e were ya na mmadụ malitere ime ara ara, ya eburu mma ma malite ịkpa aghara, na-egbukwa onye ọ bụla o zutere, ma ọ dịghị onye ụjọ kwere ijide ya ná ndụ. Ndị obodo ga-ekele onye ọ bụla gburu onye ara a, a ga-ewerekwa ya dị ka onye na-arụ ọrụ ọma.” Ee, ọbụna Gandhi hụrụ mkpa ọ dị iji ike eme ihe n’ọnọdụ ụfọdụ.

O doro anya na inwe ikike nke iji ike mee ihe bụ ihe dị mkpa n’obodo ọ bụla kwụsiri ike. N’ozuzu, mgbe ndị mmadụ katọrọ iji ike eme ihe, ọ bụ iji ike eme ihe n’ụzọ na-ezighị ezi ka ha na-akatọ n’ezie.—Eklisiastis 4:1-3.

“Ụzọ Ya Nile Bụ Ikpe Ziri Ezi”

Akụkọ ihe mere eme enweghị ihe àmà ọ bụla na-egosi na Chineke ejitụwo ike ya mee ihe n’ụzọ na-ezighị ezi. Ọ dịghị achị n’aka ike. Ọ chọrọ ka anyị fee ya n’ịhụnanya. (1 Jọn 4:18, 19) N’eziokwu, Chineke adịghị eji ike eme ihe ma ọ bụrụ na ọ dị ụzọ kwesịrị ekwesị isi zere ya. (Jeremaịa 18:7, 8; 26:3, 13; Ezikiel 18:32; 33:11) Mgbe o kpebikwara iji ike mee ihe, ọ na-enyekarị ọtụtụ ịdọ aka ná ntị ka onye ọ bụla chọrọ ime mgbanwe wee nwee ike ime otú ahụ. (Emọs 3:7; Matiu 24:14) Omume ndị a hà bụ nke Chineke aka ike nke dị obi ọjọọ?

Ojiji Chineke na-eji ike eme ihe enweghị ihe jikọrọ ya na ojiji ụmụ mmadụ na-eji ike na-ekwesịghị ekwesị eme ihe n’ụzọ na-ezighị ezi. “Ụzọ Ya nile bụ ikpe ziri ezi,” ka Mosis na-ekwu banyere Jehova, “Chineke Nke kwesịrị ntụkwasị obi, Nke na-enweghị ajọ omume.” (Deuterọnọmi 32:4) N’adịghị ka ọchịchị nke ụmụ mmadụ na-achị n’aka ike, ọchịchị Chineke adịghị adabere n’onye nwere ike ka ukwuu. N’ọnọdụ nke ọ bụla, o ji ike mee ihe n’ụzọ kwekọrọ n’ịhụnanya, amamihe, na ezi ikpe ya zuru okè.—Abụ Ọma 111:2, 3, 7; Matiu 23:37.

Dị ka ihe atụ, mgbe Chineke bibiri ndị ajọ omume n’oge Iju Mmiri ahụ, o mere ya mgbe ọtụtụ afọ nke ịdọ aka ná ntị gasịrị. Onye ọ bụla chọrọnụ gaara erite uru site ná nchebe nke ụgbọ ahụ ma lanarị. Ọ bụ nanị mmadụ asatọ mere otú ahụ. (1 Pita 3:19, 20; 2 Pita 2:5) N’oge Joshua, Israel na-emezu ihe Chineke kpere n’ikpe n’ahụ ndị Kenean rụrụ arụ, bụ́ ikpe a mara ha ihe karịrị afọ 400 tupu mgbe ahụ! (Jenesis 15:13-21) N’oge ahụ nile, a gaghị asị na ndị Kenean ahụghị ihe àmà siri ike na-egosi na ndị Israel bụ ndị Chineke họpụtara. (Joshua 2:9-21; 9:24-27) Ma, e wezụga ndị Gibeọn, ọ dịghị mba Kenean ọ bụla rịọrọ ka e meere ha ebere ma ọ bụ jiri ohere ha nwere kpee udo. Kama nke ahụ, ndị Kenean kpebiri ime ka obi ha sie ike megide Chineke.—Joshua 11:19, 20.

Chineke Nwere Ikike Ime Ihe

Mgbe anyị na-agbalị ịghọta ojiji Chineke na-eji ike eme ihe, anyị aghaghị ịmalite site n’ịghọta otu eziokwu bụ́ isi banyere ọnọdụ anyị n’ebe Chineke nọ. “Anyị onwe anyị bụ ụrọ, Gị onwe gị bụ onye na-akpụ anyị,” ka Aịsaịa onye amụma jiri obi umeala kweta. (Aịsaịa 64:8) N’ụzọ doro anya, dị ka Onye Okike nke eluigwe na ala, Chineke pụrụ iji ike mee ihe n’ụzọ ọ bụla masịrị ya. N’ịghọta ikike Chineke nwere, dị ka Solomọn, anyị pụrụ ikwu, sị: “Okwu eze nwere ike; ònye ga-asịkwa ya, Gịnị ka ị na-eme?”—Eklisiastis 8:4; Ndị Rom 9:20, 21.

N’ihi ọnọdụ Chineke dị ka Onye Okike nwere ike ime ihe nile, ọ bụ ya nwere ikike inye na iwere ndụ n’elu ụwa. N’ezie, ụmụ mmadụ enweghị ikike ziri ezi na amamihe ile ojiji Chineke na-eji ike eme ihe anya n’ụzọ na-ezighị ezi. Mmadụ aghaghị ịmụta ime ka echiche ya kwekọọ n’echiche nke Chineke. “Ọ́ bụghị ụzọ nile nke unu ka a na-emeghị ka o guzozie?” ka Jehova jụrụ.—Ezikiel 18:29, NW; Aịsaịa 45:9.

Ọ bụ echiche ikpe ziri ezi nke Jehova na ịhụnanya ọ hụrụ ụmụ mmadụ ga-akwali ya ikpochapụ ndị na-eji ike eme ihe n’ụzọ na-ezighị ezi nakwa ndị na-eji ike emebi ihe ndị ruuru ndị ọzọ n’ụwa. Omume a nke iji ike eme ihe ga-eme ka e nwee ọnọdụ ndị dị mma n’ụwa maka ndị nile hụrụ udo n’anya bụ́ ndị chọrọ ya. (Abụ Ọma 37:10, 11; Nehum 1:9) Ọchịchị Chineke ga-esi otú a bụrụ nke ziri ezi na nke e wepụrụ n’ụta ruo mgbe ebighị ebi.—Mkpughe 22:12-15.