Olee Otú E Kwesịrị Isi Dọọ Ụmụaka Aka ná Ntị?
Olee Otú E Kwesịrị Isi Dọọ Ụmụaka Aka ná Ntị?
“Nsogbu na-ebilite mgbe a jara ụmụaka mma n’agbanyeghị ihe ha na-eme,” ka akwụkwọ akụkọ bụ́ National Post nke Canada na-ekwu. Ndị nne na nna ụfọdụ kweere na omume a na-eme ka ụmụ ha nwekwuo ùgwù onwe onye. Otú ọ dị, dị ka ọkà akparamàgwà mmadụ bụ́ Roy Baumeister si kwuo, “ùgwù onwe onye dị elu kwesịrị ekwesị mgbe ọ dabeere n’ezi ihe a rụzuru, ma ndị nne na nna kwesịrị ilekwasị anya n’ịkụziri ụmụaka njide onwe onye.”
Nne ma ọ bụ nna nke na-atụ egwu ịgbazi nwa ya ma nwa ya mee ihe ọjọọ na-eme nwata ahụ ihe ọjọọ. E kwuwerị, mgbazi bụ ụzọ isi enye ntụziaka. N’ihi ya, ọ na-akụziri nwatakịrị mere ihe ọjọọ ịghara ime otu mmehie ahụ ọzọ. Otú ọ dị, ọ dị mkpa ka ndị mụrụ ụmụ zere iji obi ọjọọ na-eme mgbazi n’ụzọ na-ekwekọghị n’ihe ọjọọ e mere. (Jeremaịa 46:28) Ha kwesịrị ijide n’aka na ha adịghị eme mgbazi n’ụzọ gabigara ókè. Bible na-ekwu, sị: “Ndị bụ́ nna, akpasula ụmụ unu iwe, ka obi ghara ifu ha.”—Ndị Kọlọsi 3:21.
Na Bible, n’ọnọdụ ọ bụla, e jikọtara mgbazi na ịhụnanya na ịdị nwayọọ, ọ bụghị ya na iwe na obi ọjọọ. Onye ndụmọdụ nwere nkà kwesịrị “ịdị nwayọọ n’ebe mmadụ nile nọ, . . . onye na-anagide ihe ọjọọ, n’ịdị nwayọọ na-adọ ndị na-edo onwe ha imegide ya aka ná ntị.” (2 Timoti 2:24, 25) N’ihi ya, mgbazi nke ndị mụrụ ụmụ ekwesịghị ịbụ nanị ihe nne ma ọ bụ nna na-eji egosipụta mmetụta uche ya. Ọ dịghị ụzọ ọ bụla Bible si akwado iji ụzọ pụrụ imerụ nwatakịrị ahụ, eme ihe.
Ọtụtụ nde ndị mmadụ n’ụwa nile eritewo uru site n’akwụkwọ dị peeji 192 bụ́ Isi Ihe Na-akpata Obi Ụtọ Ezinụlọ. Ụfọdụ n’ime isiakwụkwọ ndị na-ezi ihe dị na ya bụ “Zụlite Nwa Gị Site na Nwa Ọhụrụ” na “Nyere Nwa Gị Nọ n’Afọ Iri na Ụma Aka Inwe Ọganihu.” Iji nweta nke gị, biko kpọtụrụ Ndịàmà Jehova nọ n’ógbè unu. Ọ bụrụ na ị ga-enwe mmasị ka mmadụ kpọtụrụ gị, biko dejupụta akụkụ a pụrụ ịdọkapụta adọkapụta dị na peeji a ma zite ya n’adres e dere na ya ma ọ bụ n’adres nke kwesịrị ekwesị e depụtara na peeji nke 5 na magazin a. Ị ga-enweta aro ndị a kapịrị ọnụ ga-enyere gị aka idozi nsogbu ma mee ka ndụ ezinụlọ gị dị ụtọ otú Onye Okike zubere ka ọ dị.
□ Biko kpọtụrụnụ m iji duziere m ọmụmụ Bible ebe obibi n’efu.