Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ị̀ Maara?

Ị̀ Maara?

Ị̀ Maara?

(A pụrụ ịchọta azịza nye ajụjụ ndị a n’ebe ndị e zoro aka na Bible, e bipụtakwara ndepụta zuru ezu nke azịza ha na peeji nke 18. Iji nwetakwuo ihe ọmụma, lee akwụkwọ bụ́ “Insight on the Scriptures,” nke Ndịàmà Jehova bipụtara.)

1. Dị ka Pita si kwuo, olee ihe ndị “na-ebu agha imegide mkpụrụ obi”? (1 Pita 2:11)

2. Mgbe e mesịrị ka isi zuo Eze Nebukadneza okè, gịnị ka o kwetara banyere Jehova? (Daniel 4:34, 35)

3. Gịnị mere na Jisọs ‘ekweghị ka onye ọ bụla buru ihe gabiga n’etiti ụlọukwu Chineke’? (Mak 11:16)

4. Aka dị aṅaa ka Eze Senakerib nke Asiria mara Eze Hezekaịa nke Juda? (2 Ndị Eze 18:23)

5. Gịnị ka Jisọs gbara ume ka a na-eme kama ịdị na-aṅụ iyi n’ebughị ụzọ chee echiche nke ọma? (Matiu 5:37)

6. Dị ka Iwu Mosis si kwuo, gịnị ka a ga-eme, ọbụna nwanne mmadụ, bụ́ onye chọrọ ka e fee chi ndị ọzọ? (Deuterọnọmi 13:6-10)

7. Jehova kwere Abraham nkwa na ya agaghị ebibi Sọdọm na Gọmọra ma ọ bụrụ na e nweta ọnụ ọgụgụ ikpeazụ hà aṅaa? (Jenesis 18:32)

8. Olee otú Eze Sọl si nwụọ? (1 Samuel 31:3, 4)

9. N’ihi gịnị ka e ji mee ka Uza nwụọ mgbe ọ nwara ijide Igbe ahụ ka ọ ghara ịda? (Ọnụ ọgụgụ 4:15, 19, 20; 2 Samuel 6:6, 7)

10. Olee obodo Masedonia a kpọkwasịrị aha chi anyanwụ ndị Grik? (Ọrụ 17:1)

11. Olee okwu dị na Bible nke na-egosi akụkụ ebe ọwụwa anyanwụ? (Mkpughe 16:12)

12. Afọ ole ka Devid chịrị dị ka eze Israel?

13. Olee ebe Jisọs nọ na-ezu ike mgbe o sooro nwanyị Sameria kwurịta okwu? (Jọn 4:6)

14. N’ihi gịnị ka o ji dị oké mkpa ‘izere okwu efu nile e merụrụ emerụ’? (2 Timoti 2:16)

15. Gịnị bụ aha ụmụ ndị ikom atọ Noa? (Jenesis 10:1)

16. Dị ka ihe àmà na-egosi, n’ime ndị dike 11 bụ́ ndị Gad ‘kewapụtara onwe ha jekwuru Devid’ n’ọzara, olee onye nke e kwuru na ọ ‘ha ka otu puku’? (1 Ihe E Mere 12:8-14)

17. Okwu ọmịiko dị aṅaa ka Jisọs kwuru mgbe ndị na-eso ụzọ ya mere ihe ọ na-atụghị anya ya site n’ịda n’ụra n’abalị ahụ a raara ya nye? (Mak 14:38)

18. Olee eze Israel nke Jisọs sitere n’eriri ọmụmụ ya? (Ndị Rom 1:3)

19. Olee ndị inyom anọ a kpọrọ aha ha kpọmkwem dị ka ndị nọ na-aga n’ili Jisọs iji were ihe ndị na-esi ísì ụtọ tee ozu ya? (Mak 16:1; Luk 24:10)

Azịza Nye Ajụjụ

1. “Ihe ọjọọ dị iche iche na-agụ anụ ahụ”

2. Ọchịchị ya na-adịru “ebighị ebi,” ọ dịghịkwa onye pụrụ ime ka ọ ghara imezu nzube ya

3. N’ihi na ha nọ na-eji ogige ụlọukwu ahụ eme ihe dị ka ụzọ dị nkenke ha na-esi aga akụkụ ndị ọzọ nke obodo ukwu ahụ

4. Ka ọ nara ịnyịnya 2,000 ma hụ ma ọ̀ pụrụ ịkpọta ndị ga-anọkwasị ha

5. “Ka okwu unu bụrụ, Ee, ee; Ee e, ee e”

6. A ga-eme ka ọ nwụọ

7. Iri

8. N’ịbụ onye ụta nke ndị Filistia merụrụ ahụ nke ukwuu, o gburu onwe ya site n’ịdakwasị mma agha ya

9. Iwu Chineke bụ na ọ dịghị ọnọdụ ọ bụla kwesịrị ime ka ndị a na-enyeghị ikike metụ Igbe ahụ aka

10. Apọlonịa

11. ‘Ọwụwa anyanwụ’

12. 40

13. N’isi iyi Jekọb

14. “Ha ga-aga karị n’ihu n’asọpụrụghị Chineke”

15. Shem, Ham, na Jefet

16. Iza

17. “Mmụọ nke mmadụ dị ọkụ n’ezie, ma anụ ahụ adịghị ike”

18. Devid

19. Meri Magdalini, Salomi, Joana, na Meri nne Jemes