Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Aha Chineke Akpalie Arụmụka

Aha Chineke Akpalie Arụmụka

Aha Chineke Akpalie Arụmụka

SITE N’AKA ONYE EDEMEDE TETA! NA NETHERLANDS

NDỊ sụgharịrị otu Bible Dutch ọhụrụ akpaliwo arụmụka n’etiti ndị ọkà mmụta Bible nakwa n’etiti ndị nkịtị. Gịnị kpatara ya? Ọ bụ mkpebi ha mere iji okwu bụ́ Heer, ma ọ bụ Onyenwe anyị sụgharịa aha Chineke.

Na December 1998, nanị izu ole na ole mgbe ndị nsụgharị ahụ wepụtasịrị mbipụta nnwale nke Bible ahụ ha sụgharịrị, otu ìgwè ndị inyom so na Kerk en Wereld (Chọọchị na Ụwa), bụ́ òtù dị na Protestant, ji akwụkwọ ozi mee mkpesa. N’ihi gịnị? Ha lere okwu ahụ bụ́ “onyenwe anyị” anya dị ka ihe “na-egosibiga ịbụ nwoke ókè.” N’oge na-adịghị anya, ìgwè ndị ọzọ—ndị Katọlik na ndị Protestant—sonyere ná mkpesa ahụ. Na February 1999, ndị ọkà mmụta atọ gbakwụnyere echiche nke ha site n’ikwu na ha kwadoro nanị idegharị mkpụrụ akwụkwọ Hibru anọ ndị ahụ mejupụtara aha Chineke n’asụsụ ọzọ dị ka YHWH. Nwa obere oge mgbe nke ahụ gasịrị, ndị ọkà mmụta Bible, ndị nsụgharị, na ndị ọkà mmụta okpukpe nwere nzukọ n’Amsterdam iji tụlee okwu ahụ. Mgbe e nwesịrị nkwurịta okwu ahụ, a gwara ndị nile bịaranụ ka ha gosi nsụgharị nke ha họọrọ site n’ịtụli aka.

N’okpuru isiokwu bụ́ “N’ihi Chineke, Ka Anyị Ghara Ịlụ Ọgụ n’Ihi Aha Chineke,” akwụkwọ akụkọ bụ́ Nieuwsblad van het Noorden kọrọ banyere ihe si na ya pụta: “Nanị mmadụ asaa kwadoro ONYENWE ANYỊ site ná ntụli aka. Ma ihe ka ọtụtụ n’aha ndị ọzọ a pụrụ iji dochie ya enwetaghị nkwado dị ukwuu site ná ntụli aka: Aha ahụ (1), Onye (3), Onye Nwere Obi Ebere (6), Onye A Na-apụghị Ịkpọ Aha Ya (7), Onye Na-adị Ndụ (10), Onye Na-adịru Ebighị Ebi (15). Nke merikwaranụ bụ . . . YHWH!” Na March 15, 2001, Kọmitii Nlekọta nke nsụgharị Bible ọhụrụ ahụ kpebiri iji HEER (ONYENWE ANY) e dere ná mkpụrụ akwụkwọ ukwu e dere ntakịrị ntakịrị dochie anya aha Chineke.

Arụmụka a na-eme ka ọ pụta ìhè na n’agbanyeghị enweghị nkwekọrịta n’ihe banyere ihe ka mma a ga-eji sụgharịa aha Chineke n’asụsụ Dutch, ndị ọkà mmụta kwenyere na Chineke nwere aha aka. N’asụsụ Hibru, ihe mejupụtara aha ahụ bụ mkpụrụ akwụkwọ Hibru anọ, bụ́ יהוה, ma ọ bụ YHWH. Olee otú Bible Dutch ndị ọzọ, ma ndị nke oge gara aga ma ndị nke ugbu a, siworo sụgharịa YHWH?

Na 1762, onye Netherlands aha ya bụ Nicolaas Goetzee wepụtara nsụgharị Staten nke Bible bụ́ nke nwere peeji ndị buru ibu. O kwuru na peeji bu isiokwu ya, sị: “N’ihi ihe ndị gbara ọkpụrụkpụ a maara nke ọma, anyị asụgharịghị Aha Ncheta Chineke, bụ́ JEHOVA.” Ndị ọkà mmụta ndị ọzọ a maara nke ọma bụ́ ndị Netherlands—dị ka Prọfesọ Nicolaas Beets na Petrus Augustus de Genestet—ejiwokwa aha ahụ bụ́ Jehova mee ihe.

Ọ dị mma ịmara na e ji aha bụ́ Jehova mee ihe n’ebe nile na Bible bụ́ New World Translation of the Holy Scriptures *. Ihe odide ntụkwasị nke New World Translation n’asụsụ Dutch na-ekwu na ọ “na-anọgide na-eji otu ụdị bụ́ ‘Jehova’ eme ihe n’ihi na ndị mmadụ amarawo ya nke ọma eri ọtụtụ narị afọ. Ọzọkwa, ọ na-echekwa . . . mkpụrụ akwụkwọ anọ mejupụtara aha Chineke, bụ́ YHWH.” Bible New World Translation esiwo otú a nyere ọtụtụ nde ndị mmadụ aka ịmata eziokwu banyere aha Chineke.

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 8 Nke Ndịàmà Jehova bipụtara.