Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Olee Otú M Kwesịrị Isi Mesoo Ndị Iwe Ji?

Olee Otú M Kwesịrị Isi Mesoo Ndị Iwe Ji?

Ndị Na-eto Eto Na-ajụ Sị . . .

Olee Otú M Kwesịrị Isi Mesoo Ndị Iwe Ji?

“Iwe juru ya obi. Ana m eche na ọ chọrọ iti m ihe n’ihi na ọ hụrụ na m dị obere. Ka m nọ na-ala azụ azụ, m sịrị ya: ‘Cheretụ! Cheretụ! Cheretụ! Gịnị mere i ji na-achọ iti m ihe? Ọ dịghị ihe m mere gị. Amaghịdị m ihe na-ewe gị iwe. Ànyị nwere ike ikwurịta ya?’”—David, onye dị afọ 16.

Ọ̀DỊTỤWO mgbe ọchọ okwu wesara gị iwe? Bible buru amụma na ndị mmadụ taa ga-abụ “ndị dị ka anụ ọhịa, ndị na-adịghị ahụ ezi ihe n’anya.” (2 Timoti 3:3) Ọ bụkwa ezie na o nwere ike ịbụ na i mewo ihe nile i nwere ike ime iji zere ‘ịbụ enyi onye iwe onye ọnụma,’ a pụrụ inwe mgbe ị na-apụghị nnọọ izere ndị iwe ji. (Ilu 22:24) Olee otú i kwesịrị isi meghachi omume mgbe ị hụrụ onwe gị n’ụdị ọnọdụ ahụ?

Ụzọ Isi Mesoo Onye Iwe Ji

Taa, ọtụtụ ndị ntorobịa pụrụ imeghachi omume site n’igosipụta iwe nke ha. Ma ime otú ahụ bụ nanị nsogbu ka ọ na-akpatakwu. Ọzọkwa, gị onwe gị kwa iwe iwe ga-eme ka ị dị ka onye ahụ iwe ji. Ilu 26:4 na-asị: “Azala onye nzuzu dị ka uche ya gbagọrọ agbagọ si dị, ka i wee ghara ịdị ka ya, ọbụna gị onwe gị.” Jeremy bụ́ onye na-eto eto mụtara ịbụ eziokwu nke okwu ndị a n’ụzọ siri ike. Ọ na-echeta oge ha iri nọ na-eri nri ehihie n’ụlọ akwụkwọ: “E nwere otu ìgwè ụmụ okorobịa ndị na-ejikarị onwe ha na ndị ọzọ eme ihe ọchị. Ọtụtụ mgbe, ha na-ekwu okwu banyere m. Ana m agbachikarị ha nkịtị. Otú ọ dị, mgbe otu onye n’ime ha malitere ikwu banyere nne m, iwe were m, m jirikwa iwe wakwasị ya.” Gịnị si na ya pụta? “O tikasịrị m ahụ,” ka Jeremy na-ekwu.

Bible na-enye ndụmọdụ a amamihe dị na ya: “Ọzịza okwu dị nro na-eme ka ọnụma laghachi azụ: ma okwu mwute na-akpali iwe.” (Ilu 15:1) Ee, ikwu “okwu mwute” mgbe a kpasuru gị iwe ga-eme nanị ka ọnọdụ ahụ ka njọ. Otú ọ dị, ọtụtụ mgbe, nzaghachi dị nro pụrụ ime ka ihe dajụọ ma mee ka ọnọdụ siri ike dajụọ.

Cheta David, bụ́ onye a kpọturu aha ná mmalite. O nwere ike ime ka nwa ahụ na-achọ okwu kọwaara ya ihe mere iwe ji wee ya. O mesịrị bụrụ na ọ dị onye zuuru nri ehihie ya, nanị ihe o mere bụ iweso onye mbụ o zutere iwe. “Iti m ihe agaghị eweghachi nri gị,” ka David kọwaara ya. Ọ gwaziri ya ka ya na ya soro gaa na kafiteria. “Ebe ọ bụ na m maara onye na-ere ihe n’ebe ahụ,” ka David na-echeta, “azụtaara m ya nri ọzọ. O kwere m n’aka, o mesowekwara m dị ka enyi ya mgbe nke ahụ gasịrị.” Ị̀ hụla otú okwu dị nro dịruru n’ike? Dị ka otu ilu si kwuo ya, “ire nro na-anyajikwa ọkpụkpụ.”—Ilu 25:15.

Ịdị Nwayọọ—Ọ̀ Bụ Adịghị Ike Ka Ọ̀ Bụ Ịdị Ike?

N’eziokwu, echiche nke inwe ‘ire dị nro’ pụrụ iyi ihe na-adịghị akpali mmasị. Imeghachi omume n’iwe mgbe onye ọzọ wesoro gị iwe pụrụ iyi ka ọ̀ na-egosi na ị dị ike ma ọ bụ na ị bụ nwoke. Ị pụrụ ọbụna iche na ọ bụrụ na ị dị nwayọọ, ndị ọzọ ga-eche na ị dịghị ike n’ezie. Ma, gịnị kpọmkwem ka ịdị nwayọọ pụtara? Dị ka otu akwụkwọ e ji eme nnyocha si kwuo, ịdị nwayọọ pụtara ịbụ onye dị nro. Otú ọ dị, otu akwụkwọ a na-ekwukwa, sị: “Ịdị nro a nwere ike nke yiri ike ígwè.” N’ihi ya, kama ịbụ ihe àmà nke adịghị ike, ịdị nwayọọ pụrụ ịbụ ihe àmà nke ike. N’ụzọ dị aṅaa?

Otú ọ dị, otu ihe bụ na onye dị nwayọọ n’obi na-ejide onwe ya, ọ bụghịkwa onye a na-akpasu iwe ngwa ngwa. N’aka nke ọzọ, onye na-adịghị nwayọọ na-enwe obi erughị ala, iwe, ma ọ bụ ọbụna bụrụ onye na-enweghị olileanya. Ọ dịghịkwa enwe njide onwe onye. N’ịbụ onye na-enweghị ike ịchịkwa mmetụta ya, o yiri ka ya na ndị ọzọ ha ga na-ese okwu ugboro ugboro. Ee, “obodo e tikpọrọ etikpọ nke mgbidi na-adịghị ka onye ọ bụla nke na-adịghị egbochi mmụọ ya bụ.” (Ilu 25:28) Ọ bụrụ otú ahụ, n’ezie ọ bụ onye dị nwayọọ n’obi bụ onye dị ike!

Ihe Atụ nke Ịdị Nwayọọ Ndị Dị na Bible

Cheedị banyere Jisọs Kraịst. Ọ kọwara onwe ya dị ka “Onye nwayọọ na Onye wedatara onwe ya ala n’obi.” (Matiu 11:29) Ọ dịghị mgbe ọ bụ onye aka ike ma ọ bụ onye na-enweghị ezi uche, na-akwụghachi ihe ọjọọ n’ọnọdụ ihe ọjọọ. N’ezie, Pita onyeozi, bụ́ enyi Jisọs, kọrọ, sị: “Mgbe a na-ekwutọ [Jisọs], Ọ dịghị ekwutọghachi ọzọ; mgbe Ọ na-ahụ ahụhụ, Ọ dịghị aba mba; kama Ọ raara Onwe ya nye n’aka Onye ahụ Nke na-ekpe ikpe ziri ezi.” (1 Pita 2:23) Otú ọ dị, cheta na otu Jisọs a ‘bara n’ụlọukwu Chineke ma kpuo tebụl nile nke ndị na-agbanwe ego ihu.’ (Matiu 21:12) Ọ bụrụkwa na ọ dị mgbe ọ chọrọ enyemaka Chineke, Jisọs gaara akpọ “ihe karịrị legion iri na abụọ n’ime ndị mmụọ ozi”! (Matiu 26:53) Ee e, ọ bụtụghị onye na-adịghị ike.

Tụleekwa ihe nlereanya nke Onyeikpe Gideọn setịpụrụ, dị ka e dekọrọ ya na Bible ná Ndị Ikpe 8:1-3. Mgbe o nwesịrị otu oké mmeri n’agha, iwe were ụfọdụ ndị agha si n’ebo Efraim n’ihi na ha chere na e nyeghị ha ohere ikere òkè n’otuto nke ibu agha. “Gịnị bụ ihe a i meworo anyị, na ị kpọghị anyị, mgbe i jere ibuso Midian agha?” ka ha jụrụ. “Ha wee soro ya isesi okwu ike.” Ugbu a Gideọn bụ “dike bụ́ dimkpa.” (Ndị Ikpe 6:12) Ọ gaara azaghachiworị okwu mkpasu iwe ha nanị site n’ime ihe ike. Kama ime otú ahụ, o nyere ha azịza dị nro nke mere ka ike gwụ ndị ahụ isi na-anụ ọkụ. “Gịnị ka m meworo ugbu a dị ka nke unu mere?” ka Gideọn jụrụ. Gịnị si ná nzaghachi obi umeala a pụta? “Obi ọkụ ha jụụrụ n’ahụ ya.”

N’ikpeazụ, tụlee ihe ndekọ Bible banyere otu nwanyị aha ya bụ Abigail. Devid nọ na-ezogharị mgbe ọ na-agba ọsọ n’ihi onye iro ya bụ́ Sọl, eze Israel. Ọ bụ ezie na ha nọ n’ala ọzọ, ọtụtụ mgbe ndị ikom Devid chedoro ma chebe ndị Israel ibe ha. Otu nwoke ha nyeere aka bụ di Abigail bụ́ Nebal, nwoke bara ọgaranya. Otú ọ dị, Nebal “siri ike n’obi, jọọkwa njọ n’omume nile.” Mgbe ndị ikom Devid chọrọ ihe ha ga-eri, ha rịọrọ Nebal ka o nyetụ ha ihe oriri. Kama igosi ekele maka nchebe ndị ikom Devid chebere ya n’efu, Nebal ‘makwasịrị’ ndị ozi Devid ma zilaga ha n’enyeghị ha ihe ọ bụla.—1 Samuel 25:2-11, 14.

Mgbe ọ nụrụ ya, iwe were Devid, o nyekwara ndị ikom ya iwu, sị: “Keenụ, nwoke ọ bụla mma agha ya n’úkwù ya.” Devid na ndị ikom ya nọ n’ụzọ ịga gbuo Nebal na ndị ikom nile aka ha dị ọcha nọ n’ezinụlọ ya mgbe Abigail mere ihe iji gbochie ya. O ji nnukwute onyinye nke ihe oriri na ihe ọṅụṅụ gaa zute Devid. Ọ rịọrọ mgbaghara maka omume na-ezighị ezi di ya mere ma rịọ Devid ka ọ ghara igbu ndị aka ha dị ọcha.—1 Samuel 25:13, 18-31.

Arịrịọ obi umeala Abigail rịọrọ mere ka iwe Devid dajụọ. N’ezie, n’ịghọta ókè iwe ya dịruworo njọ, Devid sịrị: “Onye a gọziri agọzi ka Jehova, bụ́ Chineke Israel, bụ, Onye zitere gị taa izute m: ihe a gọziri agọzi ka ezi uche gị bụkwa, onye a gọziri agọzi ka ị bụkwa, onye gbochiworo m taa ka m ghara ịba n’ikpe ọmụma ọbara, ka aka m gharakwa ịzọpụta m.” (1 Samuel 25:32-35) Ee, ọtụtụ mgbe, “ọzịza okwu dị nro” pụrụ ime ka ọnụma nke ndị ọzọ dajụọ. Otú ọ dị, gịnị ma ọ bụrụ na nzaghachi dị nro i nyere enweghị mmetụta dị otú ahụ?

“Hapụ Ya”

Ị pụrụ izere ịkwanye nkụ n’ọkụ ahụ nanị site n’isi n’ebe ahụ pụọ. “Mgbe nkụ na-adịghị ọkụ ga-anyụ,” ka Bible na-ekwu. Ọ na-adọkwa aka ná ntị, sị: “Tupu ịlụ ọgụ esie ike hapụ ya.” (Ilu 17:14; 26:20) “Otu nwa okorobịa a ma ama n’ụlọ akwụkwọ bịakwutere m wee chọọ ikwunyere m okwu,” ka Merissa dị afọ 17 kwuru. Ọ gwara m na m mara mma. N’oge na-adịghị anya, enyi ya nwanyị ji oké iwe bịakwute m. O boro m ebubo na mụ na-achụ enyi ya nwoke ma chọọ ịba m ọgụ! Agbalịrị m ịkọwara ya ihe merenụ, ma o kweghị ege m ntị. Mgbe a gbasasịrị akwụkwọ, ya na ụfọdụ ụmụ agbọghọ ndị ọzọ bịaghachiri ịbịa tie m ihe! Akpọrọ m onye nche n’egbughị oge, akọwakwaara m nwa agbọghọ ahụ iwe ji na adịghị m alụ ọgụ nakwa na ọ bụ enyi ya nwoke bịakwutere m. Mgbe nke ahụ gasịrị, esi m ebe ahụ pụọ.” Merissa ekweghị ka iwe jide ya. Ọ bụghị nanị na ọ gbaara ịlụ ọgụ ọsọ, kamakwa o mere ihe iji chebe onwe ya. Dị ka Ilu 17:27 si kwuo, “onye na-egbochi okwu ọnụ ya maara ihe ọmụma: ọzọ, onye mmụọ ya jụụrụ ajụrụ bụ onye nghọta.”

Gịnịkwanụ ma ọ bụrụ na ọ bụ gị ka ụta dịịrị maka ịkpasu mmadụ iwe—ma eleghị anya n’amaghị ụma? Rịọ mgbaghara, rịọkwa ya ngwa ngwa! Nke a agwụla ihe pụrụ ịdị mkpa iji mee ka iwe onye nke ọzọ dajụọ. Ugbu a bụ oge e nwere ọtụtụ ihe nrụgide, ọtụtụ ndị na-ewekwa iwe ọkụ. Ma ọ bụrụ na ị na-etinye ụkpụrụ Bible n’ọrụ ná mmekọrịta gị na ndị ọzọ, ị pụrụ izere ịbụ onye e ji iwe mesoo ma eleghị anya.

[Foto ndị dị na peeji nke 20]

“Ọzịza okwu dị nro na-eme ka ọnụma laghachi azụ”

[Foto dị na peeji nke 21]

Mgbe ụfọdụ, ị ghaghị nnọọ isi n’ebe ahụ pụọ