Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Olileanya Dịịrị Ndị Na-arịa Ọrịa Ogbu na Nkwonkwo

Olileanya Dịịrị Ndị Na-arịa Ọrịa Ogbu na Nkwonkwo

Olileanya Dịịrị Ndị Na-arịa Ọrịa Ogbu na Nkwonkwo

“ỌRỊA ogbu na nkwonkwo abụghị ihe bụ́ isi na-egbu mmadụ dị ka ọrịa obi ma ọ bụ ọrịa cancer,” ka Dr. Fatima Mili na-ekwu, “ma ọ na-enwe mmetụta dị ukwuu n’ọdịdị nke ndụ.” Ọrịa ogbu na nkwonkwo pụrụ imetụta akụkụ nile nke ndụ mmadụ. Oleedị ụfọdụ n’ime nsogbu ndị na-arịa ọrịa ogbu na nkwonkwo na-enwe? À pụrụ ịnagide ya?

Katia, * bụ́ onye dị afọ 28, nke si Itali na-ekwu, sị: “Kemgbe a chọpụtara na m na-arịa ọrịa ogbu na nkwonkwo n’oge m dị afọ 20, ndụ m nile agbanwewo. Akwụsịwo m ọrụ ego m na-arụ nakwa ọrụ m na-arụ n’ozi oge nile n’ihi ahụ mgbu m na-enwe.” Ahụ mgbu bụ nsogbu nke ndị nile na-arịa ọrịa ogbu na nkwonkwo na-enwe. Alan, bụ́ onye dị afọ 63, nke si England kwuru, sị: “Mgbe nile ị ga na-enwe ihe mgbu n’otu ebe n’ahụ gị, ọ bụ ezie na e nwere ike ọ gaghị adị ukwuu.” Ike ọgwụgwụ bụ ihe ịma aka ọzọ. “Ọ bụrụgodị na ị pụrụ ịnagide ahụ mgbu na ahụ ọzịza,” ka Sarah, bụ́ onye dị afọ 21 na-ekwu, “ike ọgwụgwụ ya adịghị ekwe odidi.”

Ihe Mgbu Mmetụta Uche

Dị ka Setsuko, bụ́ onye Japan, nke dị afọ 61 si kwuo, ịnagide ahụ mgbu na-adịghị ala ala kwa ụbọchị pụkwara “ime ka i nwee nkụda mmụọ, mkpaghasị uche.” Leenụ, nanị ịnwa iwelite pensụl ma ọ bụ telifon pụrụ ịbụ ihe ịma aka! Kazumi, bụ́ onye dị afọ 47, kwara arịrị, sị: “Ọbụna apụghịzi m ime ihe ndị na-enweghị ihe ha bụ bụ́ ndị nwatakịrị pụrụ ime.” Janice, bụ́ onye dị afọ 60, onye na-enweghịzi ike ịkwụ ọtọ ruo ogologo oge, kwuru, sị: “Ọ na-akụda m mmụọ n’ihi na apụghị m ime ihe ndị m na-emebu.”

Ihe mgbochi ndị dị otú ahụ pụrụ ịkpatara mmadụ obi nkoropụ na ile onwe ya anya n’ụzọ na-ezighị ezi. Gaku, bụ́ onye dị afọ 27, bụ otu n’ime Ndịàmà Jehova, o kwukwara, sị: “Ịbụ onye na-enweghị ike ikere òkè n’ụzọ zuru ezu n’ọrụ nzisa ozi ọma ma ọ bụ n’ime ihe omume n’ọgbakọ na-eme ka m nwee mmetụta nke ịbụ onye na-abaghị uru ọ bụla.” Francesca, bụ́ onye gbasoworo ọrịa ogbu na nkwonkwo mgba kemgbe ọ dị afọ abụọ, na-ekwu na ya “nwere oké nkụda mmụọ.” Nkụda mmụọ dị otú ahụ pụrụ inwe mmetụta dị njọ n’ụzọ ime mmụọ. Joyce, bụ́ Onyeàmà si South Africa, kwetara na ya malitere ịkwụsị ije nzukọ ndị Kraịst. “Apụghị m ịbịa onye ọ bụla nso,” ka ọ kọwara.

Onye na-arịa ọrịa a pụkwara inwe nchegbu dị ukwuu banyere ọdịnihu—egwu nke ịghọ onye na-agaghị aga ije wee na-adaberezi n’ebe ndị ọzọ nọ, egwu nke ịbụ onye a hapụrụ n’enweghị onye nlekọta, egwu nke ịda ada ma gbajie ọkpụkpụ, egwu nke ịbụ onye na-agaghịzi enwe ike igbo mkpa ezinụlọ ya. Yoko, bụ́ onye dị afọ 52, kwetara, sị: “Ọ bụrụ na m ahụ ebe ndị zara aza na nkwonkwo m, ụjọ na-atụ m na ha nwere ike ịmụba.”

Ndị òtù ezinụlọ pụkwara inwe ihe mgbu nke uche, n’ịbụ ndị na-eche nhụjuanya nke onye ha hụrụ n’anya ihu kwa ụbọchị. Ndị di na nwunye ụfọdụ pụrụ ọbụna inwe nsogbu siri ike n’alụmdi na nwunye ha. Otu nwanyị nọ n’England nke aha ya bụ́ Denise, kwuru, sị: “Mgbe anyị lụworo ruo afọ 15, di m kwuru, sị, ‘Apụghịzi m ịnagide ọrịa ogbu na nkwonkwo gị a!’ Ọ hapụrụ mụ na nwa anyị nwanyị dị afọ 5.”

Ọrịa ogbu na nkwonkwo si otú a ewetara ma ndị na-arịa ya ma ezinụlọ ha ihe ịma aka dị ukwuu. Ka o sina dị, ọtụtụ ndị na-anagide ya n’ụzọ na-aga nke ọma! Ka anyị leba anya n’otú ụfọdụ ndị si eme otú ahụ.

Iburu Ihe Mgbochi Gị n’Uche

Izu ike nke ọma dị oké mkpa ma ọ bụrụ na ị na-arịa ọrịa ogbu na nkwonkwo; ọ pụrụ ibelata ike ọgwụgwụ. Otú ọ dị, nke a apụtaghị na o nweghịzi ihe ị ga na-eme. Timothy na-akọwa, sị: “Ọ dị gị mkpa ịdị na-arụ ọrụ ka ị ghara ịdị na-eche nanị banyere ọrịa ogbu na nkwonkwo gị n’ihi na ọ bụrụ na i mee otú ahụ, ị ga-anọrọ nnọọ otu ebe na-enwe nanị ahụ mgbu.” Ọkà n’ihe banyere ajụ oyi bụ́ William Ginsburg nke Ụlọ Ọgwụ Mayo na-ekwu, sị: “E nwere ọdịiche na-apụtachaghị ìhè n’etiti ime ihe gabiga ókè na ime ihe dị nnọọ nta. Mgbe ụfọdụ a ghaghị ichetara ndị mmadụ ka ha kwụsịtụlata ọrụ maka ọrịa ha.”

Nke a pụrụ ịgụnye ịgbanwe ụzọ i si ele ihe mgbochi ndị i nwere anya. Daphne, bụ́ onye si South Africa, na-akọ, sị: “Aghaghị m iwere ihe otú o si dị ma mara na m ka nwere ikike ime ihe ụfọdụ; nanị ihe m na-aghaghị ime bụ ime ha n’ụzọ dị nnọọ nwayọọ karị. Kama ichegbu onwe m ma ọ bụ nwewa obi nkoropụ, nanị ihe m na-eme bụ ime ihe obere obere.”

Ọ dịkwa mma ịmata nke ọma ngwá ọrụ ụfọdụ na-enye aka bụ́ ndị pụrụ ịdịnụ, ikekwe soro dọkịta gị ma ọ bụ onye ji usoro mmega ahụ agwọ gị ọrịa kwurịta banyere ya. Keiko na-akọ, sị: “Anyị arụnyewo oche mbugo na steepụ ụlọ anyị. Ịhịọgharị aka ibo na-egbu m mgbu n’aka, ya mere anyị gbanwere ha. Ugbu a, apụrụ m imeghe ibo nile site n’iji isi m nuo ha. Anyị rụnyere aka a na-anyali anyali n’ọnụ mmiri pọmpụ nile dị n’ụlọ anyị ka m wee nwee ike ma ọ dịghị ihe ọzọ ịrụtụ ọrụ n’ụlọ.” Onye ọzọ na-arịa ọrịa ogbu na nkwonkwo nke aha ya bụ Gail na-ekwu, sị: “A gbakwụnyere mkpịsị ugodi ụgbọala m na nke ụlọ m n’ihe dị ogologo, na-eme ka ọ dịrị m mfe ịhịọgharị ha. A gbakwụnyere mbọ́ isi m na brọsh ezé m n’ihe dị ogologo, a pụkwara ịrọ ha gaa n’akụkụ dị iche iche.”

Nkwado Ezinụlọ—“Isi Iyi nke Ume”

Carla, bụ́ onye si Brazil, na-ekwu, sị: “Nkwado di m na-enye abụwo nke dị oké mkpa. Eziokwu ahụ bụ́ na ọ na-eso m aga na nke dọkịta mere ka m nwee obi ike. Anyị abụọ chọpụtara otú ọrịa ahụ si emetụta ahụ m, ihe ndị bụ́ mgbaàmà ya, na ọgwụgwọ ga-adị mkpa. Enwere m obi iru ala n’ihi na ọ ghọtara ihe na-arịa m.” Ee, ndị bụ́ di ma ọ bụ nwunye bụ́ ndị na-anabata ihe mgbochi nke onye òtù ọlụlụ ha nakwa ndị dị njikere ịmata ọnọdụ ha, pụrụ ịbụ isi iyi dị ukwuu nke ume na nkwado.

Dị ka ihe atụ, Bette weere ọrụ nhicha mgbe ọrịa ogbu na nkwonkwo di ya belatara ọrụ iwu ihe owuwu ya. Ọ bụghị nanị na di Kazumi lekọtara ya kamakwa ọ na-arụ ọrụ ụlọ ndị nwunye ya na-apụghị ịrụ. Ọzọkwa, ọ kụziiri ụmụ ha ime ihe ha pụrụ ime iji nye aka. Kazumi na-ekwu, sị: “Di m abụwo isi iyi nke ume. E wezụga enyemaka ya, ọnọdụ m gaara aka nnọọ njọ.”

Otu nwanyị aha ya bụ Carol, bụ́ onye si Australia nyere ịdọ aka ná ntị a: “Kpachara anya ka ị ghara inwe ihe omume gabigara ókè n’atụmatụ ọrụ gị. Ana m enwe mmetụta nke ịbụ onye na-erughị eru ma ọ bụrụ na m apụghị ime ihe otú ndị ezinụlọ m si eme.” Nkwado ezinụlọ pụrụ ịbụrụ ndị na-arịa ọrịa a isi iyi nke ume mgbe e ji nghọta na nchebara echiche nye ya.

Ihe Enyemaka Ime Mmụọ

Katia na-ekwu, sị: “Mgbe mmadụ na-arịa ọrịa dị ka nke a, ọ na-ekwenyesi ike na ọ dịghị onye maara ahụmahụ ọ na-enwe. Nke a na-eme ka ọ dị mkpa ichigharịkwuru Jehova Chineke, na-amara na ọ na-aghọta ọnọdụ ahụ na nke mmetụta uche anyị n’ezie. (Abụ Ọma 31:7) Iso ya na-enwe ezi mmekọrịta emewo ka m nwee udo nke uche iji nagide nrịanrịa m n’ụzọ fọrọ nke nta ka ọ bụrụ n’ụzọ enweghị mgbakasị ahụ.” N’ụzọ ziri ezi, Bible na-akpọ Jehova “Chineke nke nkasi obi nile; Onye na-akasi anyị obi ná mkpagbu anyị nile.”—2 Ndị Kọrint 1:3, 4.

Ya mere, ekpere pụrụ ịbụ isi iyi dị ike nke nkasi obi nye onye na-enwe ahụ mgbu na-adịghị ala ala. Kazumi na-akọ, sị: “N’ogologo abalị ndị m na-apụghị ihi ụra n’ihi ahụ mgbu m, ejiriwo m anya mmiri gwa Jehova ihe dị m n’obi, na-arịọ ya maka ume iji die ahụ mgbu ahụ nakwa maka amamihe iji nagide ihe isi ike m nile. Jehova azawo ekpere m n’ụzọ doro anya.” N’otu aka ahụ, Francesca enwetawo nkwado ịhụnanya Chineke. Ọ na-ekwu, sị: “Ahụwo m mmezu nke okwu ndị dị ná Ndị Filipaị 4:13: ‘Enwere m ike n’ihe nile n’ime Onye ahụ Nke na-eme m ka m dị ike.’”

Mgbe mgbe, Jehova Chineke na-enye nkwado site n’ọgbakọ ndị Kraịst. Dị ka ihe atụ, Gail na-ekwu banyere enyemaka o nwetara site n’aka ụmụnna nwoke na ụmụnna nwanyị ime mmụọ ya nọ n’ọgbakọ Ndịàmà Jehova dị n’ógbè ya. “Ịhụnanya ha nyeere m aka ịghara ịda mbà n’obi,” ka Gail kwuru. N’otu aka ahụ, mgbe a jụrụ Keiko, sị, “Ọ̀ dị ihe ọ bụla ị pụrụ icheta bụ́ nke tọrọ gị ụtọ ná ndụ?,” ọ zaghachiri, sị: “Ee, ọ bụ ịhụnanya na ọmịiko nile onye ọ bụla nọ n’ọgbakọ na-egosi m!”

N’ọgbakọ dị iche iche nke Ndịàmà Jehova, ndị nlekọta na-ebute ụzọ n’inye nkwado dị otú ahụ. Setsuko na-ekwu, sị: “Amaghị m ka m ga-esi kọwaa ụdị mmetụta ọ na-enwe n’ahụ onye na-alụso nrịanrịa ọgụ mgbe ndị okenye gere ntị ma nye nkasi obi.” Otú ọ dị, dị ka otu onye na-arịa ọrịa ogbu na nkwonkwo nke aha ya bụ Daniel na-echetara anyị, “ụmụnna ime mmụọ anyị ndị nwoke na ndị nwanyị pụrụ inyere anyị aka nanị ma anyị kwe ha.” Ya mere, ọ dị mkpa ka ndị na-arịa ọrịa a nọgide na-eso ndị Kraịst ibe ha na-akpakọrịta, na-anwa ike ha ịga nzukọ ọgbakọ. (Ndị Hibru 10:24, 25) N’ebe ahụ, ha pụrụ inweta agbamume ime mmụọ dị ha mkpa iji na-atachi obi.

Nhụjuanya Ga-akwụsị

Ndị na-arịa ọrịa ogbu na nkwonkwo nnwere ekele n’ebe ndị ọrụ ahụ ike nọ maka ọganihu e nweworo ka ọ dị ugbu a. Otú ọ dị, ọbụna ọgwụgwọ ndị kasị mma adịtụghị eweta ngwọta. N’ikpeazụ, ndị na-arịa ọrịa a pụrụ ịchọta nkasi obi kasịnụ site n’ịnakwere nkwa dị iche iche Chineke kwere maka ụwa ọhụrụ. * (Aịsaịa 33:24; Mkpughe 21:3, 4) N’ụwa ahụ, “onye ngwụrọ ga-amali dị ka ele.” (Aịsaịa 35:6) Ọrịa ogbu na nkwonkwo na ọrịa nile ndị ọzọ na-eti ihe a kpọrọ mmadụ ihe otiti ga-apụ n’anya ruo mgbe ebighị ebi! Peter, bụ́ onye na-arịa ọrịa ogbu na nkwonkwo nke ọkpụkpụ azụ, si otú a kwuo ya: “Apụrụ m ịhụ ìhè n’isi isi ọwa a gbara ọchịchịrị nke m na-aga na ya.” N’otu aka ahụ, otu nwanyị bụ́ onye Kraịst aha ya bụ Giuliana kwuru, sị: “Ana m ewere ụbọchị ọ bụla gaferenụ dị ka ọgụ m meriworo, otu ụbọchị agafeela n’ime ụbọchị ndị m ga-atachi obi tupu ọgwụgwụ eruo!” Ee, oge mgbe ma ọrịa ogbu na nkwonkwo ma nhụjuanya nile ga-akwụsị eruwo nso!

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

^ par. 3 A gbanwewo ụfọdụ aha ndị a.

^ par. 24 Ọ bụrụ na ị ga-achọ ka otu n’ime Ndịàmà Jehova bịa na nke gị iji kọwaara gị nkwa dị iche iche nke Bible, gaa n’ọgbakọ Ndịàmà Jehova dị n’ógbè gị ma ọ bụ detara ndị bipụtara magazin a akwụkwọ.

[Foto ndị dị na peeji nke 10]

E nwere ọtụtụ ngwá ọrụ ndị na-enyere ndị na-arịa ọrịa ogbu na nkwonkwo aka ibi ndụ bara uru

[Foto dị na peeji nke 12]

A pụrụ inweta nkwado ịhụnanya ná nzukọ ndị Kraịst