Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ò Kwesịrị Ekwesị Ka Ndị Karịst Na-ekere Òkè n’Ememe Afọ Ọhụrụ?

Ò Kwesịrị Ekwesị Ka Ndị Karịst Na-ekere Òkè n’Ememe Afọ Ọhụrụ?

Echiche nke Bible

Ò Kwesịrị Ekwesị Ka Ndị Karịst Na-ekere Òkè n’Ememe Afọ Ọhụrụ?

“EHIHIE na-ebute Abalị Na-abọta Afọ Ọhụrụ ụzọ na-adịkarị jụụ,” ka Fernando, bụ́ dọkịta nọ na Brazil na-ekwu. “E ruzie n’ihe dị ka elekere anya 11, ha amalite ịbịarute—ọtụtụ ndị ọrịa bu ọnyá ebe a mara ha mma ma ọ bụ ebe a gbara ha égbè, ndị nọ n’afọ iri na ụma bụ́ ndị merụrụ ahụ n’ihe mberede ụgbọala, na ndị nwunye e tiri ihe. Ọ na-afọ nke nta ka ọ bụrụ ihe ọṅụṅụ na-aba n’anya na-akpata ha nile.”

N’ịtụle ihe e kwuru n’elu, ọ bụtụghị ihe ijuanya na otu mbipụta sitere Brazil zoro aka n’ụbọchị mbụ n’afọ dị ka ụbọchị mmanya ogbugbu nke mba nile. Otu ụlọ ọrụ mgbasa ozi dị na Europe na-ekwu na “Afọ Ọhụrụ bụ maka ndị nkịtị na-enwe mmasị n’ibi ndụ ihe ụtọ,” na-agbakwụnye na ọ bụ “otu n’ime agha na-adịghị ebi ebi nke mmadụ na ihe ọṅụṅụ na-aba n’anya na-alụ.”

N’eziokwu, ọ bụghị mmadụ nile na-eme ememe Afọ Ọhụrụ site n’oké aṅụrụma na ime ihe ike. N’eziokwu, ọtụtụ ndị na-eji mmasị echeta ememe ahụ. “Mgbe anyị bụ ụmụaka, anyị na-atụsi anya Abalị Ga-abọta Afọ Ọhụrụ ike,” ka Fernando, bụ́ onye e hotara ihe o kwuru ná mmalite, na-ekwu. “A na-enwekarị ọtụtụ egwuregwu, ihe oriri, na ihe ọṅụṅụ. N’etiti abalị, anyị na-amakụ ibe anyị, susuo ọnụ, ma kelee ibe anyị ‘Nwee Obi Ụtọ n’Afọ Ọhụrụ!’”

N’otu aka ahụ, ọtụtụ ndị taa na-eche na ha na-ekere òkè n’ememe Afọ Ọhụrụ n’emebigaghị ihe ókè. Ma, Ndị Kraịst na-eme nke ọma inyocha mmalite nke ememe a na-ewu ewu na ihe ọ pụtara. Ememe Afọ Ọhụrụ ọ̀ megidere ozizi Bible?

Ihe Ndị Bụ́ Eziokwu Sitere n’Oge Gara Aga

Ememe Afọ Ọhụrụ abụghị ihe ọhụrụ. Ihe odide dị iche iche nke oge ochie na-egosi na e mere ha na Babilọn laarị azụ na narị afọ iri nke atọ T.O.A. Ememe ahụ, bụ́ nke e mere n’etiti ọnwa March, biri otu okwu. “N’oge ahụ, ọ bụ chi bụ́ Marduk na-ekpebi ọdịhihu a kara aka nke mba ahụ maka afọ na-abịa abịa,” ka akwụkwọ bụ́ The World Book Encyclopedia na-ekwu. Ememe afọ ọhụrụ nke ndị Babilọn na-ewe ụbọchị 11 ma gụnye àjà dị iche iche, ime ngagharị n’ahịrị, na ememe ala imepụta ihe.

Ruo oge ụfọdụ, ndị Rom kwa na-amalite afọ ha n’ọnwa March. Ma na 46 T.O.A., Eze Ukwu Julius Siza tiri iwu na ọ ga-amalite n’ụbọchị mbụ nke ọnwa January. Ụbọchị ahụ bụ nke a rarawooro nye Janus, bụ́ chi nke mmalite ihe, ugbu a kwa, ọ ga-akakwa akara ụbọchị mbụ nke afọ ndị Rom. Ụbọchị a na-eme ya gbanwere, ma ọdịdị mkpori ndụ nke ememe ahụ dịgidere. N’ụbọchị mbụ nke January, ndị mmadụ “mere ihe n’ụzọ ndị gabigara nnọọ ókè,” ka akwụkwọ bụ́ Cyclopedia nke McClintock na Strong dere na-ekwu, “nweekwa nkwenkwe ụgha dịgasị iche iche nke ndị ọgọ mmụọ.”

Ọbụna taa, ememe okpukpe ndị dabeere na nkwenkwe ụgha na-eso nnọọ n’ememe dị iche iche nke Afọ Ọhụrụ. Dị ka ihe atụ, n’ebe ụfọdụ nke Ebe Ndịda America, ọtụtụ ndị na-anabata Afọ Ọhụrụ site n’iguzoro ọtọ n’ụkwụ aka nri ha. Ndị ọzọ na-egbu opi, na-agbakwa nọkaụt. Dị ka otu omenala ndị Czechoslovakia si dị, Abalị Na-abọta Afọ Ọhụrụ bụ oge maka iri ofe lentil, ebe ndị Slovak, dị ka ọdịnala ha si dị, na-etinye ego ma ọ bụ mkpokoro azụ̀ n’okpuru ákwà tebụl. Ememe ndị dị otú ahụ, bụ́ ndị e guzobere iji gbochie ihe ndabara ọjọọ ma mee ka e nwee ọganihu, na-eme nanị ka nkwenkwe oge gboo ahụ dịgide nke bụ́ na mmalite nke afọ ọhụrụ bụ oge ikpebi ọdịnihu a kara aka.

Echiche nke Bible

Bible na-adụ Ndị Kraịst ọdụ ‘ije ije n’ụzọ dị otú o kwesịrị, ọ bụghị n’oriri oké mkpọtụ na ịṅụ oké mmanya.’ * (Ndị Rom 13:12-14; Ndị Galeshia 5:19-21; 1 Pita 4:3) Ebe ọ bụ na ememe Afọ Ọhụrụ na-abụkarị ndị e ji imebiga ihe ókè ndị ahụ Bible katọrọ mara, Ndị Kraịst adịghị ekere òkè na ha. Nke a apụtaghị na Ndị Kraịst bụ ndị ihe ọṅụ na-adịghị adị mma. N’ụzọ dị iche, ha maara na Bible na-agwa ndị na-efe ezi Chineke ahụ ofufe ugboro ugboro ka ha na-aṅụrị ọṅụ—e nwekwara ọtụtụ ihe kpatara ya. (Deuterọnọmi 26:10, 11; Abụ Ọma 32:11; Ilu 5:15-19; Eklisiastis 3:22; 11:9) Bible kwetakwara na ihe oriri na ihe ọṅụṅụ na-esokarị ịṅụrị ọṅụ.—Abụ Ọma 104:15; Eklisiastis 9:7a.

Otú ọ dị, dị ka anyị hụworo, ememe Afọ Ọhụrụ gbanyere mkpọrọgwụ n’omenala ndị ọgọ mmụọ. Ofufe ụgha bụ ihe na-adịghị ọcha na nke na-asọ oyi n’anya Jehova Chineke, Ndị Kraịst na-ajụkwa ihe omume ndị si n’ebe ndị dị otú ahụ malite. (Deuterọnọmi 18:9-12; Ezikiel 22:3, 4) Pọl onyeozi dere, sị: “Olee mkpakọrịta ezi omume na mmebi iwu nwere? Ma ọ bụ olee òkè ìhè na ọchịchịrị nwere? Ọzọkwa, olee nkwekọ dị n’etiti Kraịst na Belial?” E nwere ezi ihe mere Pọl ji gbakwụnye, sị: “Kwụsịkwanụ ibitụ ihe na-adịghị ọcha aka.”—2 Ndị Kọrint 6:14-17a.

Ndị Kraịst na-aghọtakwa na ikere òkè n’ememe okpukpe ndị dabeere na nkwenkwe ụgha adịghị eme ka e nwee obi ụtọ na ọganihu—karịsịa ebe ọ bụ na ikere òkè n’ememe ndị dị otú ahụ pụrụ ime ka mmadụ ghara inwekwa ihu ọma Chineke. (Eklisiastis 9:11; Aịsaịa 65:11, 12) Ọzọkwa, Bible na-adụ Ndị Kraịst ọdụ imeru ihe n’ókè na inwe nchịkwa onwe onye n’akparamàgwà ha. (1 Timoti 3:2, 11) N’ụzọ doro anya, ọ ga-abụ ihe na-ezighị ezi onye na-azọrọ na ya na-agbaso ozizi Kraịst ikere òkè n’ememe e ji imebiga nnọọ ihe ókè mara.

N’agbanyeghị otú ememe Afọ Ọhụrụ pụrụ isi na-adọrọ mmasị ma na-atọ ụtọ, Bible na-agwa anyị ka anyị ‘kwụsị ibitụ ihe na-adịghị ọcha aka’ nakwa ka anyị “sachapụ onwe anyị mmerụ ọ bụla nke anụ ahụ́ na mmụọ.” N’ebe ndị na-erube isi na ya nọ, Jehova na-enye ihe mmesi obi ike na-enye obi ụtọ bụ́: “M ga-anabatakwa unu. . . . M ga-abụkwara unu nna, unu ga-abụkwara m ụmụ ndị ikom na ụmụ ndị inyom.” (2 Ndị Kọrint 6:17b–7:1) N’ezie, ọ na-ekwe ndị na-eguzosi ike n’ihe nye ya nkwa ngọzi na ọganihu ebighị ebi.—Abụ Ọma 37:18, 28; Mkpughe 21:3, 4, 7.

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 12 Aka Pọl zoro “n’oriri oké mkpọtụ na ịṅụ oké mmanya” pụrụ ịgụnyewo ndị nke a na-eme n’oge ememe Afọ Ọhụrụ, ebe ọ bụ na ha na-ewu ewu na Rom na narị afọ mbụ.