Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ụbọchị Ụlọ Elu Abụọ Ahụ Yiri Ibe Ha Dakpọrọ

Ụbọchị Ụlọ Elu Abụọ Ahụ Yiri Ibe Ha Dakpọrọ

Ụbọchị Ụlọ Elu Abụọ Ahụ Yiri Ibe Ha Dakpọrọ

I HE ndị mere na September 11, 2001, na New York City, Washington, D.C., nakwa na Pennsylvania agaghị apụ apụ n’uche ọtụtụ nde, ma ọ bụrụ na ọ bụghị ọtụtụ ijeri ndị bi n’ụwa. Olee ebe ị nọ mgbe ị hụrụ ma ọ bụ nụ akụkọ banyere mwakpo ahụ a wakporo Ebe Azụmahịa Ụwa dị na New York nakwa Pentagon dị na Washington?

Mbibi ahụ dị ịtụnanya e bibiri ihe onwunwe buru nnọọ ibu n’otu ntabi anya nakwa, nke ka nnọọ mkpa, mbibi e bibiri ọtụtụ mmadụ emewo ka ihe a kpọrọ mmadụ nwee ihe mere ha ga-eji kwụsị ma chee echiche.

Gịnị ka anyị mụtaworo banyere ihe ndị anyị na-ebute ụzọ nakwa nhọrọ ndị anyị na-eme ná ndụ? Olee otú ọdachi ndị ahụ si mee ka ụfọdụ n’ime àgwà ọma nke ihe a kpọrọ mmadụ nwere pụta ìhè—mmụọ ịchụ onwe onye n’àjà, ọmịiko, ndidi, na achọghị ọdịmma onwe onye nanị? Isiokwu a na nke na-eso ya ga-agbalị ịza ajụjụ nke abụọ ahụ.

Ndị Lanarịrịnụ Akọọ Ihe Ha Hụrụ

Ozugbo ọdachi ahụ mesịrị na New York, e mechiri ụgbọ okporo ígwè okpuru ala, ìgwè mmadụ jikwa ụkwụ si na ndịda Manhattan pụta—ọtụtụ n’ime ha si n’elu àkwà mmiri Brooklyn na nke Manhattan gafere. Ha pụrụ ịhụ ọfịs na ụlọ obibi akwụkwọ nke isi ụlọ ọrụ ụwa nile nke Ndịàmà Jehova nke ọma. N’oge na-adịghị anya, ụfọdụ ndị si n’ebe ọdachi ahụ mere gbatawa ọsọ ndụ n’ụlọ ndị ahụ.

Alisha (n’aka nri), bụ́ nwa nwanyị nke otu Onyeàmà, so ná ndị mbụ rutere ebe ahụ. Ahụ́ ya jupụtara n’uzuzu na ntụ. * Ọ kọwara, sị: “Ka m nọ n’ụgbọ okporo ígwè na-aga ọrụ, ahụrụ m ka anwụrụ ọkụ si n’Ebe Azụmahịa Ụwa na-akwụpụta. Mgbe m rutere n’ebe ọdachi ahụ mere, ugegbe tọgbọgasị n’ala, okpomọkụ ya rutekwara m ahụ́. Ndị mmadụ nọ na-agba ọsọ n’akụkụ ọ bụla, ebe ndị uwe ojii nọ na-agbalị ịkpọpụsị ndị mmadụ n’ebe ahụ. O yiri ọgbọ agha.

“Agbabara m n’ụlọ dị nso ebe ahụ. Anụziri m mgbawa ahụ mgbe ụgbọelu nke abụọ ahụ suru ụlọ elu nke dị n’ebe ndịda. Agaghị m akọwali otú ebe ahụ dị n’ihi na anwụrụ ọkụ ojii jupụtara ebe nile. A gwara anyị ka anyị si ebe ahụ dị ize ndụ pụọ. E tinyere m n’ụgbọ mmiri gafere Osimiri Ebe Ọwụwa Anyanwụ ruo Brooklyn. Mgbe m rutere n’akụkụ nke ọzọ ahụ, eleliri m anya elu ma hụ ihe odide buru ibu, bụ́ ‘WATCHTOWER.’ Isi ụlọ ọrụ okpukpe mama m! Abanyere m n’ụlọ ọfịs ahụ ozugbo. Amaara m na ọ bụ ebe kasị mma a pụrụ ilekọta m. Asara m ahụ ma kpọọ ndị mụrụ m na fon.”

Wendell (n’aka nri) bụ onye na-elekọta ọnụ ụzọ na Họtel Marriott dị n’etiti ụlọ elu abụọ ahụ. Ọ kọwara, sị: “Anọ m ọrụ n’ebe a na-anabata ndị ọbịa mgbe mgbawa nke mbụ ahụ weere ọnọdụ. Ahụrụ m ka iberibe ihe dị iche iche na-ada n’akụkụ ọ bụla. Elepụrụ m anya n’okporo ámá ma hụ otu nwoke ọkụ na-agba ka ọ tọgbọ n’ala. Eyipụrụ m jaket na efe m ngwa ngwa ma gbaga ebe ahụ iji gbalịa imenyụ ọkụ ahụ. Onye ọzọ na-agafe agefe bịara nye aka. Ọkụ rechapụrụ uwe nile nwoke ahụ yi ma e wezụga sọks na akpụkpọ ụkwụ ya. Ndị ọrụ mmenyụ ọkụ bịaziri buru ya iji nye ya nlekọta ahụ ike.

“Nwa obere oge mgbe nke ahụ gasịrị, Bryant Gumbel bụ́ onye na-arụ ọrụ n’ụlọ ọrụ mgbasa ozi bụ́ TV CBS kpọrọ m na fon ka m kọọrọ ya ihe na-emenụ dị ka onye ji anya ya hụ. N’ihi ya, ezinụlọ m nọ na Virgin Islands nụrụ ya na TV, ha wee mata na m nọ ndụ.”

Donald, bụ́ onye buru ibu nke dị sentimita 195 n’ogologo, nke na-arụ ọrụ n’Ebe Azụmahịa Ego Ụwa, nọ n’okpukpu nke 31 nke ụlọ ya, na-ele anya kpọmkwem n’Ụlọ Elu Abụọ ahụ Yiri Ibe Ha nakwa na Họtel Marriott ahụ. O kwuru, sị: “Ihe m hụrụ riri m ọnụ ma menye m egwu. Ndị mmadụ si na windo ụlọ elu nke dị n’ebe ugwu na-adapụ ma na-amapụ. Oké egwu tụrụ m, m wee jiri ọsọ ókè m nwere ike si n’ụlọ m gbapụ.”

Ahụmahụ ọzọ bụ nke otu nne nọ n’afọ 60 na ụma na ụmụ ya nwanyị abụọ ndị nọ n’afọ 40 na ụma. Ruth na nwanne ya nwanyị bụ́ Joni na nne ha, bụ́ Janice, nọ n’otu họtel dịdewere Ụlọ Elu Abụọ ahụ Yiri Ibe Ha. Ruth, bụ́ nọọsụ gọọmenti nyere ikike, na-akọ, sị: “Anọ m na-asa ahụ. Na mberede mama m na nwanne m nwanyị tiri mkpu ka m si n’ọnụ ụlọ ịsa ahụ́ ahụ pụta. Anyị nọ n’okpukpu nke 16 nke ụlọ elu ahụ, ha hụkwara ka iberibe ihe dị iche iche na-adafere n’akụkụ windo. Mama m hụrụ nnọọ ka ozu otu nwoke si n’uko ụlọ dịdewere ebe ahụ fefere dị ka a ga-asị na e nwere ebe e si tụpụ ya.

“Eyiiri m uwe m ngwa ngwa, anyị malitere ịrịda steepụ. Ndị mmadụ nọ na-eti mkpu nke ukwuu. Anyị pụrụ n’okporo ámá. Anyị nụrụ mgbawa ma hụ ọkụ na-enwu zam zam. E nyere anyị iwu ka anyị jiri ọsọ gbaga Battery Park, bụ́ ebe Ụgbọ Mmiri Staten Island dị. N’ụzọ, anyị ahụghịzi mama anyị, bụ́ onye na-arịa ụkwara ume ọkụ na-ekweghị ala ala. Olee otú ọ ga-esi lanarị n’anwụrụ ọkụ, ntụ, na uzuzu a nile? Anyị jiri ọkara awa na-achọ ya ma anyị ahụghị ya. Otú ọ dị, na mbụ anyị echegbubigaghị onwe anyị ókè n’ihi na ọ bụ onye gbasiri nnọọ ike na onye na-ejideli onwe ya.

“N’ikpeazụ, a gwara anyị ka anyị jiri ụkwụ gaa n’Àkwà Mmiri Brooklyn ma gafee n’akụkụ nke ọzọ. Cheedị banyere obi iru ala anyị nwere mgbe anyị ruru n’akụkụ àkwà miri ahụ nke dị na Brooklyn ma hụ nnukwu ihe odide bụ́ ‘WATCHTOWER’! Anyị maara na anyị nọ ná nchebe.

“A nabatara anyị ma nye anyị ụlọ. E nyekwara anyị uwe, ebe ọ bụ na ọ dịghị nke anyị ga-eji gbanwee. Ma oleekwanụ mama anyị? Anyị ji abali ahụ dum na-agbalị ịchọ ya n’ụlọ ọgwụ dị iche iche ma o nweghị isi. N’ụtụtụ echi ya, mgbe o ji ihe dị ka ọkara gafee elekere anya iri na otu, anyị natara ozi. Mama anyị nọ n’ebe a na-anabata ndị ọbịa n’ala! Gịnị mere ya?”

Janice, bụ́ mama ha, gara n’ihu na-akọ, sị: “Mgbe anyị ji ọsọ si na họtel ahụ pụta, obi ekweghị m ịhapụ otu enyi m meworo agadi, bụ́ onye na-enweghị ike iso anyị pụta. Achọrọ m ịlaghachi ma kupụta ya n’onwe m. Ma nke ahụ dị nnọọ ize ndụ. N’ihi mgbagwoju anya ahụ, mụ na ụmụ m ndị inyom gara iche iche. Otú ọ dị, echegbubigaghị m onwe m ókè, ebe ọ bụ na ha na-ejideli onwe ha, Ruth bụkwa nọọsụ ruru eru.

“Ebe ọ bụla m lere anya, ndị mmadụ chọrọ enyemaka—karịsịa ụmụaka na ụmụ ọhụrụ. Enyeere m ọtụtụ ndị aka ruo ókè m nwere ike. Agara m ebe a na-ahọpụta ndị nwere mmerụ ahụ́ dị iche iche ma na-enye ha nlekọta ahụ ike dabere n’ókè mmerụ ahụ ha hà. Enyere m aka n’ịsa aka na ihu ndị uwe ojii na ndị ọrụ mmenyụ ọkụ, bụ́ ndị jupụtara ná ntụ na uzuzu. Anọrọ m ruo ihe dị ka elekere anya atọ nke ụtụtụ. M wee banye ụgbọ mmiri nke ikpeazụ gaa Staten Island. Echere m na ikekwe ụmụ m ndị inyom agbagawo ebe ahụ. Ma ahụghị m ha.

“N’ụtụtụ, agbalịrị m isoro ụgbọ mmiri nke mbụ laghachi Manhattan, ma abanyelighị m na ya n’ihi na abụghị m onye ọrụ ọnọdụ mberede. Mgbe ahụ, ahụrụ m otu n’ime ndị uwe ojii ahụ m nyeere aka. Akpọrọ m ya, sị: ‘John! Achọrọ m ịlaghachi Manhattan.’ Ọ zaghachiri, sị: ‘Bịa soro m.’

“Mgbe m rutere Manhattan, agaghachiri m na Họtel Marriott ahụ. Ikekwe ohere ka dị iji nyere enyi m meworo agadi aka. Ụzọ adịghị adị! Họtel ahụ adakasịala. Ebe ndịda nke obodo ahụ kụrụ owu—ọ dịghị mmadụ ọ bụla a hụrụ na ya. Ọ bụ nanị ndị uwe ojii na ndị ọrụ mmenyụ ọkụ bụ́ ndị nọ nnọọ ná mwute bụ́ ndị ihu ha mikpọchara amịkpọ nọ ebe ahụ.

“Agara m n’ihu ruo Àkwà Mmiri Brooklyn. Ka m na-erule nso n’isi ya nke ọzọ, ahụrụ m ihe odide m maara nke ọma, ‘WATCHTOWER.’ Ikekwe apụrụ m ịhụ ụmụ m ndị inyom n’ebe ahụ. Dị ka m tụrụ anya ya, ha gbadatara bịa n’ebe ahụ a na-anabata ndị ọbịa ikele m. Anyị makụrụ nnọọ onwe anyị, anya mmiri gbakwara anyị!

“N’ụzọ dị ịtụnanya, ụkwara ume ọkụ ejideghị m ọbụna otu ugboro, n’agbanyeghị anwụrụ ọkụ, uzuzu, na ntụ ahụ nile. Anọgidere m na-ekpe ekpere, n’ihi na achọrọ m ịbụ onye bara uru, ọ bụghị ibu arọ.”

“Ọ dịghị Ebe Ọ Ga-ada!”

Rachel, bụ́ nwanyị nọ ná mmalite afọ iri abụọ na ụma ya, gwara onye edemede Teta! sị: “Anọ m na-agbada n’okporo ámá ebe ụlọ anyị dị na ndịda Manhattan mgbe m nụrụ ụzụ ụgbọelu na-efefe n’elu. Ọ dasiri nnọọ ụda ike nke na o mere ka m lelie anya elu. O juru m nnọọ anya—ahụrụ m nnukwute ụgbọelu bụ́ nke o doro anya na ọ na-achọ ịda ada. Echere m echiche ihe mere o ji na-efesi nnọọ ike ma na-efe nnọọ ala ala. Ọ dịghị ebe ọ ga-ada! Ikekwe onye na-anya ya apụghịzi ịchịkwa ya. Anụziri m ka otu nwanyị na-eti mkpu, sị: ‘Ụgbọelu ahụ suru ụlọ ahụ ugbu a!’ Nnukwute ọkụ si n’ụlọ elu nke dị n’ebe ugwu ahụ nupụta. Ahụrụ m nnukwute oghere ojii n’ụlọ elu ahụ.

“Ọ bụ ihe kasị emenye egwu m hụtụworo ná ndụ m. O yighị m ka ihe mere eme. Anọ m nnọọ ebe ahụ ghewe ọnụ oghe. N’ime obere oge, ụgbọelu ọzọ suru ụlọ elu nke abụọ, n’ikpeazụkwa, ụlọ elu abụọ ahụ dakpọrọ. Oké egwu tụrụ m. Apụghị m ịnagide ya!”

“Ọ Bụrụ na Ọ Ga-adị Mkpa Ka M Gwuo Mmiri, M Ga-egwu”

Denise, bụ́ onye dị afọ 16, ka rutere nnọọ ụlọ akwụkwọ ha bụ́ nke dị n’akụkụ Ụlọ Ọrụ Na-ere Ihe Ibé nke America, bụ́ nke dị ma a gafee ụlọ atọ n’ebe ndịda Ebe Azụmahịa Ụwa. “O ji nnọọ ntakịrị ihe gafee elekere anya 9:00 nke ụtụtụ. Amaara m na ọ dị ihe merenụ, ma amaghị m ihe ọ bụ. Anọ m na klas ebe anyị nọ na-amụ banyere akụkọ ihe mere eme n’okpukpu nke 11 nke ụlọ akwụkwọ ahụ. Ụjọ ji ụmụ akwụkwọ ahụ nile. Onye nkuzi anyị ka chọrọ ka anyị lee ule. Anyị chọrọ ịpụ ma lawa.

“Mgbe ahụ, ụlọ ahụ mara jijiji ka ụgbọelu nke abụọ ahụ suru ụlọ elu nke ebe ndịda ahụ. Ma anyị aka-amaghị ihe merenụ. Na mberede, anụrụ m n’obere redio onye nkuzi anyị na-eji anata ozi: ‘Ụgbọelu abụọ esuwo Ụlọ Elu Abụọ ahụ Yiri Ibe Ha!’ Echere m n’obi m sị, ‘Ọ bụghị ihe ezi uche dị na ya ịnọgide ebe a. Ihe a bụ iyi ọha egwu, ebe ọzọ ọ ga-emetụta bụ Ụlọ Ọrụ ahụ Na-ere Ihe Ibé.’ N’ihi ya anyị pụrụ.

“Anyị gbagara Battery Park. Atụgharịrị m ile ihe na-emenụ. Ahụrụ m na ụlọ elu nke ebe ndịda ahụ gaje ịda. Mgbe ahụ echere m na ọ ga-akụdasị ụlọ ndị ọzọ, na-eme ka ụlọ nile ahụ toro ogo daa. Anọ m na-adọlị ikute ume, ebe ọ bụ na ntụ na uzuzu kpọchiri m imi na akpịrị. Agbagara m n’Osimiri Ebe Ọwụwa Anyanwụ, na-eche, sị: ‘Ọ bụrụ na ọ ga-adị mkpa ka m gwuo mmiri, m ga-egwu.’ Ka m na-agbapụ, anọ m na-ekpegara Jehova ekpere ka ọ zọpụta m.

“E mesịa, e tinyere m n’ụgbọ mmiri na-aga New Jersey. O were mama m ihe karịrị awa ise iji chọta m, ma ọ dịghịnụ ihe ọzọ, ọ dịghị ihe mere m!”

“Nke A Ọ̀ Bụ Ụbọchị Ikpeazụ nke Ndụ M?”

Joshua, bụ́ onye dị afọ 28, si Princeton, New Jersey, nọ na-akụzi ihe na klas n’okpukpu nke 40 nke ụlọ elu nke ebe ugwu ahụ. Ọ na-echeta, sị: “Na mberede, o yiri ka bọmbụ ọ̀ gbawara. Ebe nile mara jijiji, mgbe ahụkwa echere m, sị: ‘Mba, ọ bụ ala ọma jijiji.’ Elepụrụ m anya n’èzí, ọ dịkwa egwu—anwụrụ ọkụ na iberibe ihe dị iche iche na-agba ụlọ ahụ gburugburu. Agwara m ndị klas ahụ, sị: ‘Onye ọ bụla hapụ ihe o ji. Ka anyị pụọ!’

“Anyị gbadawara steepụ, bụ́ ndị anwụrụ ọkụ nọ na-ejupụta na ha, mmiri sikwa na pọmpụ ndị e ji agbanyụ ọkụ na-agbapụta. Ma anyị amaghị jijiji. Anọgidere m na-ekpe ekpere ka ọ bụrụ na anyị họọrọ steepụ nke kwesịrị ekwesị ka anyị ghara izute ọkụ ihu na ihu.

“Ka m nọ na-agbada steepụ ahụ, echere m, sị: ‘Nke a ọ̀ bụ ụbọchị ikpeazụ nke ndụ m?’ Anọgidere m na-ekpegara Jehova ekpere, enwekwara m mmetụta dị ịtụnanya nke obi ịdị jụụ. Enwetụbeghị obi ịdị jụụ dị otú ahụ. Agaghị m echezọ oge ahụ ma ọlị.

“Mgbe anyị mesịrị si n’ụlọ ahụ pụta, ndị uwe ojii na-akpọpụ onye ọ bụla. Eleliri m anya n’ụlọ elu ndị ahụ ma hụ na a kụpuwo ụlọ abụọ ahụ. Ọ dị ka ọ̀ bụ ná nrọ.

“Mgbe ahụ anụrụ m ụda na-emenye egwu—ajọ ịda jii nke dị ka a ga-asị na ọtụtụ puku mmadụ kpachiri ume. O yiri ka a ga-asị na New York kwụụrụ otu ebe. Iti mkpu sochiri ya. Ụlọ elu nke ebe ndịda ahụ nọ na-ada n’onwe ya! Nnukwu anwụrụ ọkụ, ntụ, na uzuzu na-enute n’ebe anyị nọ. Ọ dị ka ihe e ji nkà tinye n’ihe nkiri sinima. Ma nke a mere eme. Ka nnukwu anwụrụ ọkụ ahụ rutere n’ebe anyị nọ, anyị ekutechaghịzi ume.

“Eruru m n’Àkwà Mmiri Manhattan, bụ́ ebe m nọrọ tụgharịa ma hụ ụlọ elu nke ebe ugwu na polu TV ya ka ha na-adakasị. Ka m na-agafe àkwà mmiri ahụ, anọgidere m nnọọ na-ekpe ekpere ka m ruo Betel, bụ́ isi ụlọ ọrụ ụwa nile nke Ndịàmà Jehova. Enwetụbeghị m obi ụtọ ná ndụ m nile otú m nwere ịhụ ebe ahụ. N’ebe ahụkwa, ná mgbidi ụlọ obibi akwụkwọ ahụ, e nwere nnukwute ihe odide ọtụtụ puku mmadụ pụrụ ịhụ kwa ụbọchị, bụ́ ‘Na-agụ Okwu Chineke Bụ́ Bible Nsọ Kwa Ụbọchị!’ Echere m, sị: ‘Ọ fọrọ nke nta ka m ruo ebe ahụ. Nọgide nnọọ na-aga.’

“Ka m na-eche banyere ihe ndị ahụ merenụ, ha emewo ka m hụ na ọ dị mkpa ka m mata ihe ndị ka mkpa ná ndụ m—na ihe ndị ka mkpa ná ndụ kwesịrị ibute ụzọ.”

Ahụrụ M Ndị Mmadụ  Ka Ha Si n’Ụlọ Elu ahụ Na-amapụ”

Jessica, bụ́ onye dị afọ 22, hụrụ ihe ndị ahụ merenụ mgbe o si n’ebe nkwụsịtụ ụzọ okpuru ala nke dị n’ebe ndịda nke obodo ukwu pụta. “Eleliri m anya elu ma hụ ka ntụ, iberibe ihe dị iche iche, na iberibe ígwè dị iche iche na-awụdata. Ndị mmadụ nọ na-eche ka ha jiri fon ọha mee ihe, ha nọkwa na-atụwanye egwu n’ihi oge a na-egbu. Ekpere m ekpere maka inwe obi dị jụụ. Mgbe ahụ mgbawa ọzọ weere ọnọdụ. Ígwè na ugegbe si n’elu na-ada. Anụrụ m ka a na-eti mkpu, sị, ‘Ọ bụ ụgbọelu ọzọ!’

“Eleliri m anya elu, ọ bụghịdị ihe a na-ele ele—ndị mmadụ na-amapụ site n’okpukpu ndị nke elu bụ́ ebe anwụrụ na ọkụ ahụ si na-enupụta. M ka pụrụ ise onyinyo ya—otu nwoke ya na otu nwanyị. Ha jidere windo ruo oge ụfọdụ. Mgbe ahụ, ha hapụrụ aka wee si n’ebe dị oké elu datuwa. Apụghị m ịnagide ihe m hụrụ.

“E mesịa, erutere m Àkwà Mmiri Brooklyn, bụ́ ebe m nọ yipụ akpụkpọ ụkwụ m na-ekweghị m ịgba ọsọ ma gbara gawa n’akụkụ osimiri nke Brooklyn. Abanyere m n’ọfịs Watchtower, bụ́ ebe e nyeere m aka ozugbo iji mee ka obi ruo m ala.

“N’abalị ahụ, n’ụlọ, agụrụ m na Teta! (Bekee) nke August 22, 2001, usoro isiokwu bụ́ ‘Coping With Post-traumatic Stress’ (Ịnagide Mkpaghasị Uche nke Na-abịa Mgbe Ọdachi Gasịrị). Lee ka ihe ọmụma ahụ si dị m mkpa nke ukwuu!”

Ịdị ukwuu nke ọdachi ahụ kpaliri ndị mmadụ inye aka n’ụzọ ọ bụla ha nwere ike. Isiokwu na-esonụ ga-akọwa akụkụ nke ahụ.

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 7 Teta! gbara ọtụtụ ndị ọzọ lanarịrịnụ ajụjụ ọnụ, bụ́ ndị a na-apụghị itinyecha ná ntụle a dị mkpirikpi. Nkwado ha nyere aka mee ka e nwetazuo ma gosipụta ịbụ eziokwu nke akụkọ ndị a.

[Ihe Osise/Foto ndị dị na peeji 8, 9]

(Ị chọọ ịhụ ebe e sere map a, gaa n’akwụkwọ a nke e biri ebi)

IHE NDỊ E BIBIRI

1 ỤLỌ ELU NKE DỊ N’EBE UGWU 1 Ebe Azụmahịa Ụwa

2 ỤLỌ ELU NKE DỊ N’EBE NDỊDA 2 Ebe Azụmahịa Ụwa

3 HỌTEL MARRIOTT 3 Ebe Azụmahịa Ụwa

7 7 EBE AZỤMAHỊA ỤWA

EBE NDỊ E BIBIRI NKE UKWUU

4 4 EBE AZỤMAHỊA ỤWA

5 5 EBE AZỤMAHỊA ỤWA

L OTU ỤLỌ AHỊA LIBERTY

D ỤLỌ AKỤ̀ DEUTSCHE 130 Liberty St.

6 6 ỤLỌ ỌRỤ U.S. MAKA MBUPỤ NA MBUBATA IHE 6 Ebe Azụmahịa Ụwa

N S EBE UGWU NA EBE NDỊDA EBE NDỊ ỤKWỤ NA-ESI AGAFE

EBE NDỊ E BIBIRI AKỤKỤ HA ỤFỌDỤ

2F 2 EBE AZỤMAHỊA EGO ỤWA

3F 3 EBE AZỤMAHỊA EGO ỤWA

W WINTER GARDEN

[Ebe E Si Nweta Foto]

N’October 4, 2001 Map 3D nke Ebe Ndịda Manhattan, nke Urban Data Solutions, Inc., sere

[Foto]

N’elu elu: Ụlọ elu nke dị n’ebe ndịda buru ụzọ dakpọọ

N’elu: Ụfọdụ ndị gbagara n’ụlọ Watchtower maka nchebe

N’aka nri: Ọtụtụ narị ndị ọrụ mgbanyụ ọkụ na ndị ọrụ nnapụta nọ na-arụ ọrụ n’enweghị ike ọgwụgwụ n’Ebe Ihe Ọdachi ahụ Mere

[Ebe E Sigasị Nweta Foto]

Foto AP/Jerry Torrens

Andrea Booher/Foto Ụlọ Ọrụ Mgbasa Ozi bụ́ FEMA

[Ebe E Si Nweta Foto Dị na peeji 3]

Foto AP/Marty Lederhandler

[Ebe E Si Nweta Foto Dị na peeji 4]

Foto AP/Suzanne Plunkett