Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ụzọ Isi Mekwuo Ka Ihe Oriri Ghara Ịdị Ize Ndụ

Ụzọ Isi Mekwuo Ka Ihe Oriri Ghara Ịdị Ize Ndụ

Ụzọ Isi Mekwuo Ka Ihe Oriri Ghara Ịdị Ize Ndụ

IRI nri ọ̀ dị ize ndụ? Ndekọ ọnụ ọgụgụ ụfọdụ pụrụ ime ka i kwubie na ọ dị. Dị ka Òtù Ahụ́ Ike Ụwa (WHO) si kwuo, kwa afọ, ọrịa na-esite n’ihe oriri na-emetụta ihe dị ka nde mmadụ 130 nọ n’Ógbè Europe ndị so n’òtù WHO. Na 1998, nanị na United Kingdom, a kọrọ banyere ihe karịrị 100,000 mmadụ nsí sitere n’ihe oriri metụtara—na-akpata ọnwụ nke ihe dị ka mmadụ 200. A na-eme atụmatụ na kwa afọ na United States, a na-esite n’ihe oriri ebute ihe dị ka nde ọrịa 76 nakwa na n’ime ọrịa ndị ahụ, 325,000 na-akpata ịga ụlọ ọgwụ, 5,000 kwa na-akpata ọnwụ.

Gburugburu ụwa, ọ na-esi ike karị inweta atụmatụ e ji nlezianya mee. Otú ọ dị, òtù WHO na-akọ na n’afọ 1998, ihe dị ka nde mmadụ 2.2 nwụrụ n’ọrịa afọ ọsịsa—nde 1.8 n’ime ha bụ ụmụaka. Akụkọ ahụ na-ekwu, sị: “Ọ pụrụ ịbụ mmetọ nke ihe oriri na mmiri ọṅụṅụ kpatara ọnwụ nke ọnụ ọgụgụ dị ukwuu nke ndị ahụ.”

Ọnụ ọgụgụ ndị ahụ pụrụ iyi ihe bubigara ibu ókè. Ma ndekọ ọnụ ọgụgụ ò kwesịrị ime ka ị mawa jijiji banyere ịdị nchebe nke ihe oriri gị? Ma eleghị anya ọ gaghị eme. Tụlee ihe atụ ọzọ. N’Australia, a na-enwe ihe dị ka nde mmadụ 4.2 na-arịa ọrịa sitere n’ihe oriri kwa afọ—ma ọ bụ ihe dị ka mmadụ 11,500 kwa ụbọchị! Ugbu a nke ahụ pụrụ iyi ihe dị ukwuu. Ma lee ya anya n’ụzọ dị iche. Ndị Australia na-eri ihe dị ka ijeri nri 20 n’afọ; n’ime nri ndị ahụ ihe na-erughị otu ụzọ n’ụzọ iri ise nke otu pasent ya na-akpata ọrịa. N’ikwu ya n’ụzọ ọzọ, ihe ize ndụ dị ná nri nke ọ bụla dị nnọọ obere n’ezie.

Ka o sina dị, ihe ize ndụ ahụ dị adị ma na-akpali iche echiche. Gịnị mere ihe oriri ji akpata ọrịa, gịnịkwa ka a pụrụ ime iji belata ihe ize ndụ ahụ?

Ihe Ndị Na-akpata Ọrịa Na-esite n’Ihe Oriri

A pụrụ ibute ọtụtụ ọrịa site n’ihe oriri—ihe karịrị 200 n’ime ha, ka akwụkwo bụ́ Emerging Infectious Diseases na-ekwu. Ma ihe ndị na-akpata ọrịa ndị ahụ nile adịchaghị ọtụtụ. Dị ka Dr. Iain Swadling, bụ́ ọfịsa na-ahụ maka ihe ọmụma banyere ihe oriri nke na-arụ ọrụ n’Ụlọ Ọrụ Na-ahụ Maka Ihe Ọmụma Banyere Ihe Oriri nke Mba Nile, si kwuo, ‘ma eleghị anya ọ bụ ihe na-erughị ụdị nje iri abụọ na anọ’ na-akpata ihe dị ka pasent 90 nke ọrịa nile sitere n’ihe oriri. Olee otú ihe dịgasị iche iche na-akpata ọrịa—nje virus, nje bacteria, nje ndị ọzọ, nsí, na ihe ndị ọzọ—na-esi abanye n’ihe oriri?

Dr. Swadling depụtara ụzọ ise n’ime ụzọ ndị a kasị esi emetọ ihe oriri: “Ịkwadebe ihe oriri ndị e metọrọ emetọ; ndị bu ọrịa/ndị na-arịa ọrịa ịkwadebe nri; echekwaghị ihe oriri nke ọma tinyere ịkwadebe ihe oriri ọtụtụ awa tupu e rie ya; onye na-akwadebe ihe oriri imetọ ihe oriri ahụ mgbe ọ na-akwadebe ya; esigheghị nri esighe ma ọ bụ esitụghị nri n’ọkụ nke ọma.” Ọ bụ ezie na ndepụta ahụ pụrụ iyi ihe ga-akpata nchegbu, o nwetụrụ akụkọ ọma gbara ọkpụrụkpụ. A pụrụ n’ụzọ dị mfe igbochi ihe ka ukwuu n’ọrịa ndị na-esite n’ihe oriri. Iji hụ ihe ị pụrụ ime iji jide n’aka na nri ị na-eri adịghị ize ndụ, leruo igbe dị na peeji nke 18 na nke 19 anya.

Ime Nhọrọ Ndị Ziri Ezi

N’ihi ihe ize ndụ na nchegbu ndị a na-enwegasị banyere ihe oriri, ndị ụfọdụ taa na-ekpebi iwepụta oge iji na-azụ, na-akwadebe, ma na-eri nri ndị e nwetara ọhụrụ karị. Ọ bụrụ na echiche ahụ masịrị gị, chọpụta ụlọ ahịa ndị dị n’ógbè unu bụ́ ndị na-ere ihe ndị a na-esighị esi, ndị a na-etinyeghị ihe. Otu akwụkwọ nduzi ndị na-azụ ihe na-akọwa, sị: “Ọtụtụ ndị na-azụ ihe na-achọ ịgakwuru ndị na-emepụta ihe—n’ahịa izu [ebe a na-ere ihe ndị a na-esighị esi] ma ọ bụ n’ebe a na-emepụta ihe oriri ahụ—iji zụta ihe ndị ahụ mgbe ha kasị dịrị ọhụrụ nakwa iji hụ otú e si emepụta ihe oriri ahụ na ebe e si nweta ha.” Omume a pụrụ inye aka mgbe ị na-azụ anụ.

N’otu aka ahụ, ọ pụrụ ịkasị mma ịzụ ihe oriri ndị a na-enweta n’ógbè gị mgbe ha nọ n’oge ha, ebe ha pụrụ ịkasị bụrụ ndị a na-etinyebeghị ọgwụ nchekwa. Otú ọ dị, cheta na ọ bụrụ na ị gbasoo ụkpụrụ dị otú ahụ, ị gaghị adị na-enwe ụbara mkpụrụ osisi na akwụkwọ nri ndị ị ga-esi na ha ahọrọ n’oge nile n’afọ.

Ì kwesịrị iriwezi ihe oriri ndị e ji ihe si n’okike zụlite? Nke ahụ bụ mkpebi dịịrị onwe onye. Ihe oriri e ji ihe si n’okike zụlite na-amasị ọtụtụ ndị, ihe ịrụ ụka adịghị ya na ọ bụ inwe obi abụọ n’ebe nkà na ụzụ ọgbara ọhụrụ ndị e ji eme ihe n’ụlọ ọrụ ndị na-emepụta ihe oriri dị mere ụfọdụ ji eme otú ahụ. Ma, ọ bụghị mmadụ nile kweere na ọrụ ugbo nke iji ihe ndị si n’okike azụlite ihe oriri na-eme ka e nweta ihe oriri dị nchebe karị.

N’agbanyeghị ihe oriri ndị ị na-ahọrọ, jiri nlezianya na-enyocha ihe ị na-azụ. “A bịa n’ihe oriri,” ka otu ọkachamara e hotara ihe o kwuru n’akwụkwọ akụkọ a na-ebipụta kwa izu bụ́ Die Zeit kwara n’arịrị, “ndị na-azụ ihe na-ele nanị ọnụ ahịa ha anya.” Ịghara imefusi ego dị mma, ma nyochaakwa ndepụta nke ihe ndị e ji mee ihe oriri ahụ. A na-eme atụmatụ na ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ ọkara nke ndị na-azụ ihe oriri n’ala ndị dị n’Ebe Ọdịda Anyanwụ Ụwa adịghị ewepụta oge iji gụọ ihe ọmụma banyere ihe oriri bụ́ nke e biri n’akwụkwọ mmapawa. N’eziokwu, n’ala ụfọdụ akwụkwọ mmapawa adịghị enye ihe ọmụma zuru ezu. Ma ọ bụrụ na ị chọrọ ihe oriri dị mma, mgbe ahụ mee ihe i nwere ike ime iji nyochaa ihe ndị e ji mee ya.

N’agbanyeghị mkpebi ndị i mere banyere ihe oriri ndị ị na-eri, ma eleghị anya ọ ga-adị mkpa ka ị ghara isi ọnwụ mgbe ụfọdụ, na-eme mgbanwe kwekọrọ n’ọnọdụ e nwere n’ala i bi na ya. Nye ọtụtụ ndị n’oge dị ugbu a, ọ bụ nnọọ ihe na-apụghị ikwe omume—ihe na-efu nnukwu ego, ihe na-egbu nnukwu oge, ihe rara nnọọ ahụ́—ịhụ na ha na-eri nanị ihe oriri ndị a chọpụtara na ha dị nchebe n’akụkụ nile.

Nke ahụ ọ̀ dị gị ka ọ bụ ntụle na-egosi enweghị nchekwube n’ụwa nke taa? Ọ bụ ihe na-eme eme. Otú ọ dị, akụkọ ọma e nwere bụ na ihe ga-aka mma n’oge na-adịghị anya.

[Igbe/Foto ndị dị na peeji nke 18, 19]

Ihe Ndị Ị Pụrụ ime

Kwọọ aka gị. Hụ na i ji mmiri ọkụ ncha dị na ya kwọọ aka gị tupu ị kwadebe nri ọ bụla. Kwọọ aka gị mgbe ọ bụla ị nyụsịrị mamịrị ma ọ bụ gasịa mposi, mgbe ọ bụla i mesịrị ka nwa a mụrụ ọhụrụ ma ọ bụ nwatakịrị dị ọcha (dị ka ịgbanwe ákwà nwa ma ọ bụ ihicha ya imi), ma ọ bụ mgbe i metụsịrị anụmanụ ọ bụla aka, gụnyere anụ ndị e ji mere enyi n’ụlọ. Jiri mmiri ọkụ ncha dị na ya saa arịa ọ bụla, bọọdụ ibi ihe, na elu kọbọd na-adị na kichin mgbe ị kwadebesịrị nri ọ bụla—karịsịa mgbe i metụsịrị anụ ma ọ bụ azụ̀ a na-esighị esi aka. “Jiri mmiri dị ṅara ṅara saa mkpụrụ osisi na akwụkwọ nri,” ka magazin bụ́ Test na-atụ aro ya, iji sapụ ahụhụ na ọgwụ ahụhụ fọdụrụ na ya. N’ọtụtụ ọnọdụ, ikpepụ mkpokoro, ịba ihe aba, na isi ihe esi bụ ụzọ ndị kasị mma isi mee ka ihe oriri dị ọcha. Ọ bụrụ akwụkwọ nri lettuce ma ọ bụ cabbage, wepụ ma tụfuo akwụkwọ elu ya.

Sighee ya esighee. Ọ bụrụ na ọkụ e ji esi ihe oriri na-enwusi nnọọ ike, ihe oriri ahụ agbọọkwa nke ọma, ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ nje bacteria, nje virus, na nje ndị ọzọ nile ga-anwụ. E kwesịrị isi anụ ọkụkọ ka ọ gafee ọbụna otú ahụ. Nri a na-esitụ n’ọkụ kwesịrị ịdị ọkụ ma na-agbọ agbọ. Atala anụ ọkụkọ ime ya ka na-acha pinki pinki, àkwá nke odo ya ma ọ bụ nke akụkụ ya na-acha ọcha na-agbapụta mmiri, ma ọ bụ azụ̀ nke na-eghebeghị eghe nakwa nke ị na-apụghị iji fọk dụwaa n’ụzọ dị mfe.

Debe ihe oriri iche. Na-edebe anụ, anụ ọkụkọ, ma ọ bụ azụ̀ a na-esighị esi iche n’ebe ihe oriri ndị ọzọ dị mgbe nile—mgbe ị na-azụ ha, mgbe ị na-echekwa ha, na mgbe ị na-akwadebe ha. Ekwela ka mmiri ha sọkwuru ma ọ bụ takwasị ibe ha ma ọ bụ ihe oriri ndị ọzọ. Ọzọkwa, ya adịla mgbe ị ga-etinye nri e siri esi n’efere e tinyeburu anụ, azụ̀, ma ọ bụ anụ ọkụkọ a na-esighị esi, ọ gwụla ma e ji mmiri ọkụ ncha dị na ya saa efere ahụ nke ọma.

Chekwaa ihe oriri nke ọma ma debe ya n’ebe jụrụ ezigbo oyi. Friji pụrụ igbochi mbanye nke nje bacteria dị ize ndụ, ma ọ ghaghị inwe ọ̀tụ̀tụ̀ ịjụ oyi na-eme ka mmiri jụọ ezigbo oyi. Friza kwesịrị inwe ọ̀tụ̀tụ̀ ịjụ oyi na-akpụkọ mmiri. Weghachi ihe oriri na-emebi emebi n’ebe i wetara ya n’ime awa abụọ. Ọ bụrụ na ị ga-ebu ụzọ bupụta nri tupu e riwe ya, kpuchie nri nile ekpuchie ka ijiji ghara ibekwasị na ha.

Kpachara anya mgbe ị na-eri nri n’èzí. Dị ka otu atụmatụ e mere si gosi, site n’ihe dị ka pasent 60 ruo 80 nke ndị na-arịa ọrịa na-esite n’ihe oriri n’ala ụfọdụ mepere emepe na-ebute ya ná nri ndị e siri ma zụta n’èzí. Hụ na ụlọ nri ọ bụla ị gara kwekọrọ n’ụkpụrụ ahụ́ ike iwu chọrọ. Kwuo ka e nye gị anụ e siri nke ọma. Mgbe a bịara n’ihe banyere nri a na-adịghị eri n’ebe a zụtara ya, hụ na i riri ya n’ime awa abụọ mgbe ị zụtasịrị ya. Ọ bụrụ na ọ gafee oge ahụ, sitụ nri ahụ n’ọkụ ka o ruo 74 degrees Celsius.

Tụfuo ihe oriri ị na-enyo enyo. Ọ bụrụ na ị maghị ma ihe oriri ọ̀ dị mma ka o mebiela, ọ ka mma ịtụfu ya ma chebe onwe gị. N’eziokwu, ọ bụghị ihe amamihe imebi ihe oriri dị mma. Ma, ịda ọrịa site n’iri ihe oriri mebiri emebi pụrụ ifu gị ihe ọbụna karị.

[Ebe E Si Nweta Foto]

—Ihe ka ukwuu na ya dabeere na Food Safety Tips, bụ́ nke Kansụl Nkà na Ụzụ Na-ahụ Maka Adịghị Ize Ndụ nke Ihe Oriri na United States, dere.