Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Chọọchị England—Ụlọ Kewara Ekewa

Chọọchị England—Ụlọ Kewara Ekewa

Chọọchị England—Ụlọ Kewara Ekewa

SITE N’AKA ONYE EDEMEDE TETA! NA GREAT BRITAIN

E NWERE Nnọkọ Nkwurịta Okwu Lambeth nke 13 nke Chọọchị England na Canterbury n’afọ 1998 na nso katidral ya dịworo afọ 900. Mgbe Bishọp William E. Swing na-agwa ndị bịara nnọkọ nkwurịta okwu ahụ okwu, o kwuru otu okwu na-ekpughe ihe dị ukwuu, sị: “Okpukpe aghaghị ịkwụsị ịbụ nsogbu ma malite inye ihe ngwọta. Ọ dịghị mgbe ọ bụla udo ga-adị n’etiti mba dị iche iche ọ gwụla ma è nwere udo n’etiti okpukpe dị iche iche.”

Nkewa dị n’etiti okpukpe dị iche iche pụtara ìhè nke ukwuu, dị nnọọ ka nkewa ndị dị n’etiti ndị parish na ndị ụkọchukwu nọ n’otu okpukpe. Otu onye bishọp jụrụ ịga nnọkọ nkwurịta okwu ahụ, bụ́ nke a nọworo na-enwe afọ iri ọ bụla kemgbe 1948, n’ihi na ndị bishọp nwanyị bịara ya. Ụfọdụ ndị bịaranụ akwadoghị iso ndị inyom a kere òkè ná ntụle Bible.

Ọ bụ ezie na okwu banyere ichi ndị inyom ụkọchukwu bụ isi ihe a tụlere ná nnọkọ nkwurịta okwu nke 1988, ndina ụdị onwe bụ isiokwu bụ isi ihe a rụụrụ ụka na 1998. N’ikpeazụ, ndị bishọp ahụ kpebiri na ndịna ụdị onwe “megidere akwụkwọ nsọ.” Gịnị kpaliri mkpebi ahụ?

Otu ihe pụrụ ịbụwo na ndị Anglịkan chọsiri ike ime ka mmekọrịta ha na Chọọchị Roman Katọlik sikwuo ike. Ha ghọtakwara na chọọchị ha agaghị atụ anya na okpukpe abụọ a ga-enwe nkwurịta okwu ma ọ bụrụ na ha anọgide na-akwado “ndina ụdị onwe n’etiti ndị ụkọchukwu.” Isi ihe ọzọ mere ha ji mee mkpebi ahụ pụrụ ịbụwo egwu maka ndị Alakụba. Ime mkpebi ndị nabatara ndị ụkọchukwu na-edina ụdị onwe ha gaara abụwo, dị ka ndị bishọp si Africa si kwuo ya, “njedebe nke nkwurịta okwu Chukwu” ná mba ndị Alakụba.

Akwụkwọ akụkọ bụ́ The Sunday Telegraph kọrọ banyere isiokwu ọzọ kpatara nkewa ná nnọkọ nkwurịta okwu ahụ, sị: “N’akụkụ ụfọdụ nke Africa, nsogbu bụ́ isi nke ndị ụkọchukwu na-eche ihu bụ ịlụ karịa otu nwanyị.” N’ịtụgharị uche n’ọnọdụ amaghị ihe a ga-eme bụ́ nke na-eche ndị Anglịkan ihu n’Africa, otu bishọp kwuru, sị: “Ọ bụrụ na mmadụ enye onyinye buru ibu na Chọọchị ma nwee ihe karịrị otu nwunye, gịnị ka ha ga-eme?” N’ikwu banyere ihe pụrụ isi n’arụmụka ahụ pụta, akwụkwọ akụkọ bụ́ The Times nke London kọrọ, sị: “Ndị bishọp Anglịkan agaghị ekwute okwu banyere ịlụ karịa otu nwanyị.”

Na nke mbụ ya, ndị bishọp Anglịkan kwuru okwu banyere mmekọrịta ha na ndị Alakụba. “E nwere ịkpọasị miri emi n’etiti Ndị Kraịst na ndị Alakụba na Nigeria,” ka bishọp nke Kaduna, Nigeria, na-ekwu, na-azọrọ na e gbuola ihe karịrị 10,000 mmadụ n’esemokwu okpukpe ná mba ya. E kwuru na ọ bụ nanị site n’inwe nghọta ka mma banyere nkwenkwe ndị Alakụba ka a pụrụ igbochi agha okpukpe n’Africa.

Gịnị na-echere ihe karịrị nde mmadụ 70 gburugburu ụwa bụ́, dị ka otu nzọrọ a rụụrụ ụka na-egosi, ndị Anglịkan? * Ọnọdụ ahụ na-akụda mmụọ, n’ihi na dị ka The Times si kwuo: “Nnọkọ nkwurịta okwu ahụ ejuwo ọtụtụ ndị na-ekiri ihe na-emenụ na ndị na-ekere òkè na ya anya n’ihi na mgbe ụfọdụ o yiwo nnọkọ òtù ndọrọ ndọrọ ọchịchị kama iyi chọọchị Ndị Kraịst nọ n’ekpere.”

Ọ bụghị ihe ijuanya na akwụkwọ akụkọ bụ́ The Sunday Times kwubiri na ‘e gosipụtara oké iwe na ibu iro ná nzukọ ahụ.’

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 9 Ọnụ ọgụgụ a bụ́ nde 70 “buru ibu,” ka The Times na-ekwu, ma “ihe a na-adịghị ekwukebe bụ na n’ime ọnụ ọgụgụ a, nde 26 nọ na Chọọchị England. Ihe na-erughị otu nde mmadụ ugbu a na-aga chọọchị n’ebe a [na Britain], ndị ọzọ fọrọnụ bụ nanị ndị Anglịkan elu ọnụ.”

[Foto dị na peeji nke 30]

Katidral Canterbury, nke dị afọ 900