Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ihe Oriri Na-adịghị Ize Ndụ Maka Mmadụ Nile

Ihe Oriri Na-adịghị Ize Ndụ Maka Mmadụ Nile

Ihe Oriri Na-adịghị Ize Ndụ Maka Mmadụ Nile

IRI nri dị mma na-atọ ụtọ. Ma dị ka anyị hụworo, ọ naghị adị mfe inweta ihe oriri dị otú ahụ. Nke ka njọ, e nwere ọtụtụ nde mmadụ na-enweghị nhọrọ ọzọ nke ịbịa chegbuwa onwe ha ma ihe oriri ha ọ̀ bụ ihe na-adịghị ize ndụ otú o kwesịrị ma ọ bụ ma ọ̀ na-akwalite ahụ́ ike n’ụzọ zuru ezu. Ha na-echegbu onwe ha otú ha ga-esi nweta ihe oriri zuru ezu iji nnọọ dịgide ndụ. Ọ̀ ga-abụ na Chineke zubere ka ihe dị otú ahụ?

Cheedị banyere ya. Mgbe Chineke tinyere nwoke na nwanyị n’ụwa, hà nwere ihe mere ha ga-eji chegbuo onwe ha banyere ihe oriri? Ọ dịghị ma ọlị! Ihe ndekọ dị n’akwụkwọ Bible bụ́ Jenesis na-ekwu, sị: “Jehova, bụ́ Chineke, wee mee ka osisi nile ọ bụla si n’ala puo, bụ́ nke a na-achọsi ike n’ile anya, nke dịkwa mma ihe oriri.” (Jenesis 2:9) Ya mere, Adam na Iv nwere ụdị ihe oriri dị iche iche na-atọ ụtọ, bụ́kwa nke bara ụba, na-adịghị agwụ agwụ. Chineke nke kere ha maara kpọmkwem ihe dị ha mkpa n’ụzọ ihe oriri; ọ makwaara ihe ga-ewetara ha ọṅụ. N’eziokwu, anyị anọghị n’ogige Iden taa. Ma Chineke ọ̀ gbanweela nzube mbụ ya maka ihe a kpọrọ mmadụ na ụwa?

Anyị nwere ezi ihe mere anyị ga-eji kwere na n’oge na-adịghị anya onye ọ bụla nọ n’ụwa ga-enwe ihe oriri ndị dị mma ma na-akwalite ahụ́ ike n’ụba! Nkwenkwe a pụrụ ịbụ ihe dị ike ga-enyere anyị aka inwe àgwà ziri ezi n’okwu banyere adịghị ize ndụ nke ihe oriri taa. Olileanya dị otú ahụ, ọ bụrụ na e ji ya n’aka ma bụrụ nke a pụrụ ịdabere na ya, pụrụ inyere anyị aka izere nkwesi olu ike ma ọ bụ inwe echiche gabigara ókè.

N’ihi gịnị ka anyị ga-eji jide nnọọ n’aka na n’oge na-adịghị anya ndụ ga-agbanwe? Ndị ji ịdị uchu amụ Okwu Chineke maara na ugbu a anyị na-ebi na “mgbe ikpeazụ” nke usoro ihe a. E ji amamihe ụmụ mmadụ na-achịkwa usoro ihe dị ugbu a, bụ́ nke a na-ejighị n’aka n’ọtụtụ akụkụ nke ndụ ma bụrụ nke dabeere n’ime nnwale. A bịa n’ihe banyere usoro ndị e ji echekwa ihe oriri, e jighị nnọọ n’aka ma hà dị ize ndụ ma ọ bụ na ha adịghị. Ejighị ihe n’aka otú ahụ na-akpata egwu, enweghị nkwekọ, na adịghị n’otu.—2 Timoti 3:1-5.

Onye Okike nke ihe a kpọrọ mmadụ ekwewo nkwa na ya ga-eji usoro ihe ọhụrụ dochie anya usoro ihe dị ugbu a kpam kpam. Nzube mbụ ya—ka ụwa nile ghọọ paradaịs dị ka ogige Iden, nke ezinụlọ ụmụ mmadụ nwere obi ụtọ na ahụ́ ike ga-ebijupụta—ga-emezu. Ikike na-eme ka a dị n’otu nke amamihe Chineke ga-ekpuchizi ụwa. (Aịsaịa 11:9) Amamihe a na-ejighị n’aka nke ụmụ mmadụ agaghịzi adị. Usoro ihe ọhụrụ nke Chineke ga-ewepụ ihe nile ga-eme ka e nwee obi abụọ ma ihe oriri ọ̀ bụ nke na-adịghị ize ndụ. Ọ́ bụghị ihe ezi uche dị na ya ikwubi na Chineke nke kere ụmụ mmadụ ga-aghọtakwa mkpa anyị nwere maka ihe oriri?

Ihe Oriri Zuru Okè nke Sitere n’Aka Onye Okike

Bible nwere amụma ndị doro anya banyere ọnọdụ ibi ndụ nke ga-adị n’usoro ihe nke ga-abịanụ. Aịzaịa onye amụma dere, sị: “[Chineke] ga-enyekwa mmiri ozuzo nke mkpụrụ ọghịgha gị, nke ị ga-agha n’ala ubi gị; na achịcha nke ihe omume nke ala ubi, ọ ga-amakwa abụba, baa ụba: n’ụbọchị ahụ anụ ụlọ gị nile ga-ata nri n’ebe ịta nri sara mbara. Ehi kwa na ụmụ ịnyịnya ibu na-arụ ubi ga-ata nri a gwara agwa nke nnu dị ya, nke e jiworo oseke na ihe ịfụcha ọka fụchaa ya.”

Amụma Aịzaịa na-ekwukwa, sị: “Ọ bụkwa n’ugwu a ka Jehova nke usuu nile nke ndị agha ga-emere ndị nile dị iche iche oké oriri nke ihe mara abụba, bụ́ oké oriri nke ezi mmanya vaịn doro edo, nke ihe mara abụba jupụtara n’ụmị, nke mmanya vaịn doro edo a zara nke ọma.” Na The New American Bible a sụgharịrị nkebi ahịrịokwu ikpeazụ ahụ ịbụ, “oriri nke ihe oriri mara abụba na mmanya ndị magburu onwe ha, ihe oriri dị ụtọ ma dị ọcha, mmanya ndị magburu onwe ha.”—Aịsaịa 25:6; 30:23, 24.

Nke ahụ ọ̀ masịrị gị? Amụma Aịzaịa na-emesi anyị obi ike na onye ọ bụla bi n’usoro ihe ọhụrụ nke Chineke ga-enwe ụbara nke ihe oriri nkịtị. Ọ̀ ga-adị mma oriri? N’ezie ọ ga-adị. Amụma ọzọ na-emesi anyị obi ike na ndị Chineke “ga-ebi, onye ọ bụla n’okpuru osisi vaịn ya na n’okpuru osisi fig ya; ọ dịghịkwa onye ga-eme ka ha maa jijiji.” (Maịka 4:4) Alaeze Mezaịa nke Chineke ga-eme ka e nwee ịnọ ná nchebe zuru ezu dị otú ahụ, bụ́ nke ga-amalite ịchị ụwa nile n’ọdịnihu dị nso.—Aịsaịa 9:6, 7.

Ọ dịghịkwa mgbe a ga-enwe obi abụọ ma ihe oriri ọ̀ bụ nke na-adịghị ize ndụ ma ọ bụ na ọ bụghị. N’ụzọ megidere nke ahụ, anyị ga-enwe obi ụtọ ịgwa ibe anyị: “Nri abịala.”

[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 22]

N’oge na-adịghị anya onye ọ bụla nọ n’ụwa ga-enwe ihe oriri na-akwalite ahụ́ ike, nke dị mma n’ụba

[Foto dị na peeji nke 20]

Chineke na-ekwe nkwa ihe oriri dị mma maka mmadụ nile