Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ikiri Ụwa

Ikiri Ụwa

Ikiri Ụwa

Ego Ndị Na-adịghị Ọcha

“Akwụkwọ ego bu nje bacteria agagharị,” ka akwụkwọ akụkọ bụ́ The Globe and Mail nke Canada na-ekwu. Nnyocha e mere na nso nso a na United States gosiri na ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ akwụkwọ ego nile e ji eme ihe bucha nje streptococcus, enterobacter, pseudomonas, nakwa nje ndị ọzọ. Nje ndị a, ka The Globe na-ekwu, “pụrụ ịdị ize ndụ nye ndị ọrịa bụ́ ndị a kpaworo usoro ahụ́ ha ji alụso ọrịa ọgụ aka ọjọọ dị ka ndị agadi na-adịkwaghị ike ma ọ bụ mmadụ ndị nwere HIV-AIDS.” Akwụkwọ ego ụfọdụ na-ebu ọbụna nje ndị dị ize ndụ karị. Ndị nnyocha na-atụ aro na ugbu a pụrụ ịbụ oge maka “ịsa ego asa” n’ụzọ nkịtị. Ka ọ dị ugbu a, na Japan, ndị na-azụ ihe pụrụ inweta ego site ‘n’ígwè ATM ndị dị ọcha’ bụ́ ndị na-ewepụta ego yen ndị e wuworo ewu ruo 200 C (392 F)—nke dị nnọọ n’ókè ga-egbu ọtụtụ nje bacteria ma ghara ire ego ndị ahụ ọkụ.” Mgbe i metụsịrị ego aka, ka The Globe na-adụ ọdụ, “kwọọ aka!”

Ibelata Nnu Okporo Ụzọ Na-eri

N’oge oyi ọ bụla, a na-awụsa agbata tọn nnu 400,000 na nde 1.4 n’okporo ụzọ France iji wepụ snow na ice, ka magazin na-akọ banyere okike bụ́ Terre sauvage na-ekwu. “E nwere mmetụta nnu a nile na-enwe na gburugburu ebe obibi bụ́ nke a na-achọpụta nke nta nke nta.” Nnu ndị a na-awụsa n’okporo ụzọ na-abịa buo ibu n’ala, ọ pụkwara imetọ olulu mmiri ọṅụṅụ, mmiri dị n’okpuru ala, ọdọ mmiri, na iyiala. Ọ na-egbu akụ́kụ́ ndị dị n’ihe dị ka mita 50 site n’okporo ụzọ ndị a wụsara nnu, ọ na-amịkpọkwa ọnụ ọnụ mkpọrọgwụ osisi. Ọ bụrụ na mkpọrọgwụ osisi amịrị ya, ọ na-egbochi usoro osisi na-eji esite n’anyanwụ emepụta nri. Ọ bụrụ na osisi amịrị ya ugboro ugboro, ike ga-agwụ ya o wee kpọnwụọ. Ụmụ anụmanụ ndị a dọtara n’okporo ụzọ iji rachaa nnu ahụ na-abụkarị ndị ụgbọala kụturu ma ọ bụ bụrụ ndị nwụrụ n’ihi ịracha nnu dị nnọọ ukwuu oké ngwa ngwa. N’ọnọdụ ụfọdụ, nnu pụkwara iso kpata mkpụkọta nke ice “na-adịghị acha ọcha” bụ́ nke dị ize ndụ. N’okporo ụzọ snow kpuchiri, ndị ọkwọ ụgbọala na-akpacharakarị anya, ma ọtụtụ ndị adịchaghị akpachara anya n’okporo ụzọ ndị snow na-ekpuchighị, n’amaghị na ice dị otú ahụ pụrụ ịkpụkọtawo. Ndị ọkachamara na-atụ aro, sị: “Jiri nnu mee ihe n’ụzọ ezi uche dị na ya, jiri obere nnu mee ihe.”

Mkpu Ikwiikwii Na-ekpughe Ọnọdụ Ahụ́ Ike Ha

Mgbe ikwiikwii ndị na-achatụ nchara nchara tiri mkpu, ha na-ekpughe ọnọdụ ahụ́ ike ha, ka magazin bụ́ The Economist na-ekwu. “Stephen Redpath nke Ngalaba Na-ahụ Maka Njikọ nke Ihe Ndị Dị Ndụ na Gburugburu Ha na Nkà Mmụta Banyere Mmiri na Britain na ndị ibe ya nyochara ikwiikwii 22 na-achatụ nchara nchara bụ́ ndị nọ n’Oké Ọhịa Kielder dị n’ebe ugwu England.” Ndị nnyocha ahụ “kpọrọ teepu e tinyere mkpu oké ikwiikwii ndị ha na-amaghị ma tụlee oge o were ndị ha ji mee nnyocha ịzaghachi mkpu ahụ.” O were ikwiikwii ndị nwere nje ka ukwuu n’ọbara ha oge ka ukwuu ịzaghachi—o were ndị nke nwere nje kasị ukwuu oge ji okpukpu abụọ karịa oge o were ikwiikwii ndị na-enweghị nje ịzaghachi. Ọzọkwa, mgbe ikwiikwii ndị ka nwee nje tiri mkpu, ụda olu ha dị ala karịa nke ikwiikwii ndị ji ahụ́. “N’ebe ikwiikwii n’onwe ha nọ, obi abụọ adịghị ya na nke a bụ mkpughe a na-amaghị ụma mee,” ka The Economist na-ekwu.

Abamuru nke Ịgụrụ Nwatakịrị Ihe

“Mgbe [ụmụaka] hụrụ na nne na nna ha na-eji ọchịchọ obi agụ ihe, ha na-agbalị iṅomi ha,” ka akwụkwọ akụkọ Poland a na-ebipụta kwa izu bụ́ Przyjaciółka na-ekwu. N’ọgbọ ụmụaka na-ekiri TV n’ụzọ na-arịwanye elu, ka akụkọ ahụ na-ekwu, ọ bara uru ịgụrụ ụmụaka ihe ọbụna ndị ka dị nnọọ afọ abụọ, na-adọrọ uche ha aga n’ihe osise, na-akọwakwa ha. Ndị nne na nna pụrụ ịjụ nwa ha ajụjụ banyere ihe ha ka gụpụrụ iji hụ ma ọ̀ ghọtara ihe ọmụma ahụ. “Ọ bụrụkwa na ịgụ ihe ahụ agbụ nwatakịrị ahụ na mberede . . . , gbalịa ime ka ọ na-akpali mmasị site n’imegharị ahụ́ n’okwu n’ụzọ na-akpali mmasị nakwa site n’ịgbanwe ụda olu.” A na-agba ndị mụrụ ụmụ ume ịmata ihe ndị na-amasị nwa ha ma gwa ya okwu banyere ha. “Kwuo banyere akwụkwọ ndị kasị amasị gị mgbe ị bụ nwatakịrị, kwuo isiokwu ụfọdụ na-adọrọ mmasị. . . . Ike agwụla gị ịgụrụ ụmụ gị ihe, ọbụna mgbe ha pụrụ ịgụ ihe n’onwe ha,” ka Przyjaciółka na-ekwu. “Mgbe ụfọdụ, ọ na-ezu ịgụ ole na ole n’ime peeji ndị mbụ iji gbaa ya ume, nwatakịrị ahụ ga-ejizi obi ụtọ gụrụ gawa.”

Akụkụ Ire E Ji Anụ Ụtọ Ihe Bụ́ Ndị Na-adịghị Arụ Ọrụ nke Ọma

Kwa afọ na Japan, ikike ịnụ ụtọ ihe nke ihe karịrị mmadụ 140,000, gụnyere ọnụ ọgụgụ kachasị ukwuu nke ndị na-eto eto e nwetụrụla, adịghị arụ ọrụ nke ọma, dị ka atụmatụ ọkachamara n’ihe banyere ntị, imi, na akpịrị bụ́ Hiroshi Tomita mere gosiri. Ọ bụ ezie na ịṅụ ọgwụ na nsogbu ahụ́ ike pụrụ ịkpalite nsogbu ahụ, ka akụkọ dị n’akwụkwọ akụkọ bụ́ The Daily Yomiuri na-ekwu, Tomita kweere na ihe dị ka pasent 30 n’ime ha metụtara mmadụ ịbụ onye na-adịchaghị eri nri ndị nwere zinc, bụ́ ụdị ihe oriri dị oké mkpa. “Zinc,” ka akụkọ ahụ na-ekwu, “na-arụ ọrụ bụ́ isi n’imepụta mkpụrụ ndụ ọhụrụ ndị na-eme ka a nụ ụtọ ihe, ụkọ [zinc] na-ejikwa nke nta nke nta eduga n’anụghị ụtọ ihe.” Nri ratụ ratụ, nri e ji mmiri ọgwụ chekwaa, nakwa iri nanị otu ụdị nri, na-esocha akpata nsogbu ahụ. Akụkọ ahụ na-akọwa na “ihe ndị e ji eme ka nri tọwanye ụtọ ndị dị ka phosphate, bụ́ ndị na-adị n’ọtụtụ ihe oriri ndị a kwadebeworo, na-ebelata nnweta ahụ́ na-enweta zinc ma gbochie ojiji ahụ́ na-eji ya eme ihe.” Tomita na-atụrụ ndị na-adịghị anụ ụtọ nri aro ka ha na-eri nri ndị nwere zinc n’ụba. Ha gụnyere ejula mmiri dị iche iche, obere azụ̀, na imeju. Iri ụdị nri dị iche iche bụ́ ndị na-akwalite ahụ́ ike pụrụ ime ka ihe ndị na-eme ka a nụ ụtọ ihe n’ire dịghachi mma, ma ọ bụrụ na a gwọghị nsogbu siri ike ruo ihe karịrị ọnwa isii, ohere e nwere maka mgbake ga-adị obere, ka Tomita na-ekwu.

Ụlọ Ofufe Ndị Alakụba Na-ejupụta na United States

N’igosipụta ọnụ ọgụgụ na-ariwanye elu nke ndị Alakụba, “ọnụ ọgụgụ ụlọ ofufe ndị alakụba dị na United States ejiriwo ihe dị ka pasent 25 mụbaa n’ime afọ isii, ruo ihe karịrị 1,200,” ka akwụkwọ akụkọ bụ́ The New York Times na-ekwu. John Esposito, bụ́ onye ntụzi ọrụ nke Ngalaba Maka Ịghọta Ndị Alakụba na Ndị Kraịst bụ́ nke dị na Mahadum Georgetown, chere na ọnụ ọgụgụ ndị Alakụba e nwere ugbu a dị “ihe dị ka nde anọ ruo nde isii.” Ọnụ ọgụgụ ahụ pụrụ ọbụna ịkarị nke ahụ, dị ka otu nnyocha nke òtù anọ nke Ndị Alakụba America hụrụ maka ya si gosi. Ihe ọ sọrọ ya mee, “nkwabata a nọgidere na-akwabata site ná mba ọzọ nakwa ibu ọtụtụ ezinụlọ ndị Alakụba butụrụ” ga-eme ka ọnụ ọgụgụ ahụ nọgide na-arị elu, ka Esposito kwuru. “N’ime ihe dị ka iri afọ ole na ole, Alakụba ga-abụ okpukpe nke abụọ kasị ukwuu n’America.” Times na-ekwu na a chọpụtara na ọnụ ọgụgụ ‘ka nnọọ ukwuu nke ndị na-aga n’ụlọ ofufe ndị Alakụba bụ ndị ikom.’ Nnyocha ahụ gosikwara na “ndị na-efe ofufe n’ebe ahụ si n’agbụrụ dịgasị iche iche: otu ụzọ n’ụzọ atọ bụ ndị Ndịda Eshia, pasent 30 bụ ndị Africa America, pasent 25 bụ ndị Arab.”

Ụlọ Ndị Na-ebunye Ọrịa

“Ụlọ ndị dị na Melbourne [Australia] bụ́ ndị na-erubeghị otu afọ nwere uzu ọkụ ndị na-agbaze ngwa ngwa n’ikuku (VOC) ndị ji okpukpu 20 karịa ókè Kansụl Mba Na-ahụ Maka Ahụ́ Ike na Nnyocha Ọgwụ kwuru na ọ dịghị ize ndụ,” ka magazin bụ́ New Scientist na-ekwu. Otu n’ime ọgwụ ndị a bụ formaldehyde, “bụ́ nke na-akpata ahụ́ mgbakasị na ikekwe ọrịa cancer.” Formaldehyde na-abanye n’ikuku site n’ihe ndị e ji ewu ihe owuwu dị ka osisi a na-atụ n’ala ụlọ na oche. Kapet ndị ọhụrụ na-ewepụta ọgwụ styrene, bụ́ ihe ọzọ a na-enyo enyo na ọ na-akpata ọrịa cancer, “ebe ágbá na mmiri ọgwụ ndị na-agbari ihe na-ewepụta uzu ọkụ dịgasị iche iche nwere nsí,” ka akụkọ ahụ na-ekwu. “Ọgwụ ndị ahụ eyikarịghị ka hà ga-eweta ihe iyi egwu dị njọ nye ahụ́ ike ihe ka n’ọtụtụ ndị mmadụ. Ma ha pụrụ ịkpata isi ọwụwa ma metụta mmadụ ole na ole bụ́ ndị ihe na-emetụtakarị.”

Mba Kasị Emepụta Mmiri Ara Ehi n’Ụwa

India bụzi mba kasị emepụta mmiri ara ehi n’ụwa, ka magazin bụ́ The Hindustan Times na-ekwu. Ụlọ ọrụ bụ́ Worldwatch Institute [dị na Washington, D.C.] nke nwere nnọọ mmasị na gburugburu ebe obibi etowo mgbanwe India nwere ná mmepụta nke mmiri ara ehi,” ka akụkọ ahụ na-ekwu. “Kemgbe 1914, mmiri ara ehi aghọwo ihe bụ́ isi India na-emepụta n’ọrụ ugbo, na 1997 kwa, mba ahụ gafere United States iji ghọọ mba kasị emepụta mmiri ara ehi n’ụwa.” E hotara Lester Brown bụ́ onyeisi oche nke ụlọ ọrụ Worldwatch Institute dị ka onye na-ekwu, sị: “N’ụzọ dị ịrịba ama, o mere nke ahụ site n’iji mkpo ihe ndị a na-akọpụta n’ubi na ihe ndị e wefọrọ n’ubi mere nri anụ kama iji ọka. India bịara nwee ike ịmụba ihe ndị na-enye ehi protein n’ejighị ọka mmadụ na-eri eri mere nri ehi.”

Mmefu Ego E Mere Ka Ọ Dị Mfe

Ọganihu e nweworo na nkà na ụzụ emewo ka ịzụ ihe ghọọ ihe ọtụtụ ndị Canada na-eme mgbe nile kwa ụbọchị, ka akwụkwọ akụkọ bụ́ Calgary Herald na-ekwu. “Ndị na-azụ ihe pụrụ ịzụ ihe n’akwụsịghị akwụsị n’Internet, na telivishọn, site n’iji akwụkwọ ozi tụọ ngwá ahịa ma ọ bụ n’iji kaadị e ji azụrụ ihe n’aka zụrụ ihe n’egbughị oge.” Kaadị ndị nwere ihe dị ukwuu a pụrụ iji ha zụọ n’aka na-akwali ndị mmadụ imefu ego gabiga ókè. Ụfọdụ kaadị e ji azụrụ ihe n’aka na-akwalikwu ndị mmadụ ịzụ ihe. Larry Wood, bụ́ prọfesọ na ngalaba na-ahụ maka ihe ndị metụtara ego na Mahadum nke Calgary kwuru, sị: “Ndị mmadụ ga-enwe ego iji zụọ ihe ma ha ga-eji kaadị ha ji azụrụ ihe n’aka zụọ ya ka e nye ha ihe nrite, na-eche na ha ga-eji ego ahụ kwụọ ụgwọ ya mgbe ọnwa gwụrụ. E mesịa ha na-emefu ego ahụ ma burukwa ụgwọ.” Otú ọ dị, Wood kweere na nsogbu ahụ dị nnọọ ukwuu ọbụna karị. N’ịgbalị ịnọgide na-ebi ndụ dị mma, ndị na-azụ ihe, ka o chere, ga-abanye n’ụgwọ kama ibelata mmefu ego. Dị ka nnyocha Ngụkọ Ọnụ Ọgụgụ Canada nke 1999 gosiri, ngụkọta nke ụgwọ ndị Canada bu na kaadị e ji azụ ihe n’aka karịrị ijeri $14.