Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Onye Nọ N’afọ Iri Na Ụma Nke Ji Okpukpe Ya Akpa Nganga

Onye Nọ N’afọ Iri Na Ụma Nke Ji Okpukpe Ya Akpa Nganga

Onye Nọ N’afọ Iri Na Ụma Nke Ji Okpukpe Ya Akpa Nganga

MGBE Andrew dị afọ 13, e kenyere ya ide ihe odide ụlọ akwụkwọ nke isiokwu ya dabeere n’ihe nketa ọdịbendị. “Na mbụ,” ka ọ na-ekwu, “echere m na m ga-ede banyere nna m ochie, ma abịaziri m chee sị: ‘Cheregodị! Abụ m otu n’ime Ndịàmà Jehova. Nke a bụ ohere magburu onwe ya ikwu okwu banyere okwukwe m!’

“Enyere m ihe odide m isiokwu bụ́ ‘Gụzosie Ike,’ edebekwara m otu nnukwute bọọdụ ịma ọkwa na-egosi ajọ mkpagbu Ndịàmà Jehova chere ihu na Nazi Germany. Ihe ndị m gosiri gụnyere ihe oyiyi nke yunifọm nwere purple triangle na foto dịgasị iche iche nakwa akwụkwọ ozi ndị sitere n’ezinụlọ Kusserow. * Dị ka akwụkwọ nkesa, eji m akwụkwọ ozi dị iche iche Ndịàmà Jehova zigaara gọọmenti Germany, bụ́ ndị ji ụzọ nnọpụiche ndọrọ ndọrọ ọchịchị nakwa nguzosi ike katọọ mmeso ọjọọ e mesoro Ndịàmà Jehova. Ka ihe omume ahụ na-aga n’ihu, a na-egosikwa vidio bụ́ Jehovah’s Witnesses Stand Firm Against Nazi Assault n’akwụsịghị akwụsị. Akpọsakwara m Bible, broshuọ, na traktị dị iche iche.

“E buru ụzọ gosi ụmụ akwụkwọ na ndị nkụzi nile ihe omume anyị n’ụlọ a na-anọ eme egwuregwu n’ụlọ akwụkwọ anyị. Ná mgbede na-esonụ a kpọrọ ezinụlọ na ndị enyi ha òkù. Ọtụtụ ndị jụrụ m ajụjụ, ebe ọ bụ na ha amaghị na ndị Nazi kpagburu Ndịàmà Jehova.”

Andrew kwetara na ya aghaghị inwe obi ike iji kwuo okwu banyere okwukwe ya. “Amaara m na ụfọdụ ndị ga-akwa m emo,” ka ọ na-ekwu, “ma ọ gaara ewute m ma ọ bụrụ na emeghị m ya. Egosiri m ndị tụfuru ndụ ha iji gbachitere okwukwe ha n’ebe Jehova nọ, n’ihi ya ekpebiri m na ma ọ dịghị ihe ọzọ, apụrụ m ịnagide nkatọ ụfọdụ.”

N’ikpeazụ, Andrew nwere obi ụtọ na o jiri ohere ahụ dapụtaranụ gbaa àmà. “Esoro m ndị mmadụ nwee mkparịta ụka banyere ihe mere anyị adịghị aga agha, enyefekwara m ndị nwere mmasị Bible, akwụkwọ, na traktị dị iche iche,” ka ọ na-ekwu, na-agbakwụnye, sị: “Echeghị m na ọ dịwo mgbe m kpara nganga n’ihi ịbụ otu n’ime Ndịàmà Jehova karịa n’oge ahụ.”

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 3 E ji purple triangle mara Ndịàmà Jehova n’ogige ndị ahụ. Ndị ezinụlọ Kusserow guzosiri ike na nkwenkwe ha dị ka Ndịàmà Jehova n’oge ọchịchị ndị Nazi. Lee Ụlọ Nche nke March 1, 1986, peeji nke 10-15.