Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ruo Ókè Hà Aṅaa Ka Ihe Oriri Gị Bụ Ihe Na-adịghị Ize Ndụ?

Ruo Ókè Hà Aṅaa Ka Ihe Oriri Gị Bụ Ihe Na-adịghị Ize Ndụ?

Ruo Ókè Hà Aṅaa Ka Ihe Oriri Gị Bụ Ihe Na-adịghị Ize Ndụ?

Ị̀ NA-ERI nri ugboro atọ n’ụbọchị? Ya bụrụ otú ahụ, mgbe ị na-erule afọ 70, ị ga-eriwo ihe karịrị nri 75,000. Nye onye Europe, nke ahụ ga-apụta iri—gụnyere ihe ndị ọzọ—ihe dị ka àkwá 10,000, ogbe bred 5,000, 100 akpa poteto, ehi atọ, na atụrụ abụọ. Ihe oriri ha otú ahụ ọ̀ bụ ibu arọ? Ọ dịghị ma ọlị! Lee ka anyị si enwe obi ụtọ ịnụ okwu dị ka “nri abịala”! Onyeisi ụlọ akwụkwọ na-akụzi otú e si esi nri ọbụna kwuru, sị: “Ihe oriri bụ ihe kasị mkpa ná ndụ.”

Ọtụtụ mgbe karị, anyị pụrụ iche na nri anyị na-eri dị mma ma na-akwalite ahụ́ ike. Ma ọ bụrụ na nanị otu n’ime nri 75,000 ndị ahụ enwee ihe na-emerụ ahụ́, anyị pụrụ ịda nnukwute ọrịa. Ànyị pụrụ ijide n’aka na ihe anyị na-eri adịghị ize ndụ? N’oge ndị a, ọnụ ọgụgụ na-arịwanye elu nke ndị mmadụ yiri ka hà na-enwe obi abụọ n’okwu ahụ. Ná mba ụfọdụ, ịdị nchebe nke ihe oriri bụzi ihe bụ́ isi na-akpata nchegbu. N’ihi gịnị?

Ihe Ndị Na-akpata Nchegbu

Kwa afọ, ọrịa a na-ebute site n’ihe oriri na-emetụta ihe dị ka pasent 15 nke ndị bi na Europe. Dị ka ihe atụ, ná mmalite afọ ndị 1980, mmanụ nri nsí dị na ya na Spain gburu ihe dị ka 1,000 mmadụ ma mee ka mmadụ 20,000 ọzọ daa nnukwute ọrịa. Na 1999, ndị bi na Belgium tụrụ oké egwu mgbe a kọrọ na nsí a na-akpọ dioxin pụrụ ịdị n’ihe ndị dị ka àkwá, anụ ọkụkọ, cheese, na bọta. N’oge na-adịbeghị nnọọ anya, ndị na-azụ ihe na Britain tụrụ oké egwu—ụlọ ahịa ndị na-ere anụ ehi n’ebe ahụ enweekwa oké njọ ahịa—mgbe ehi butere ọrịa ehi ara. E nwekwara ntiwapụ nke ọrịa nje na-emetụta ụkwụ na ọnụ, bụ́ nke mere na a ghaghị igbu ma tụfuo ọtụtụ nde ehi, atụrụ, ezì, na ewu.

Ọ bụ ezie na ihe ize ndụ a dị ukwuu, e nwere ihe ndị ọzọ na-echegbu ndị mmadụ ma a bịa n’ihe banyere ihe oriri. Ndị na-azụ ihe na-enwe nchegbu banyere usoro ọhụrụ ndị e ji eme ihe ugbu a n’ịkọ nakwa n’ichekwa ihe oriri. Òtù Ndị Europe dere na 1998, sị: “Nkà na ụzụ ọhụrụ ndị dị ka ime ka ụzarị ọkụ chakwasị ihe oriri na nkà mgbanwe mkpụrụ ndụ ihe nketa nke ihe ọkụkụ ndị a na-eri eri akpatawo arụmụka dị ukwuu.” Usoro nkà mmụta sayensị ọgbara ọhụrụ ndị dị otú ahụ hà na-eme ka ihe oriri anyị ka mma ka ha na-emetọ ya? Gịnịkwanụ ka anyị pụrụ ime iji mee ka ihe oriri anyị bụrụ ihe na-adịghị ize ndụ karị?