Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ị̀ Maara?

Ị̀ Maara?

Ị̀ Maara?

(A pụrụ ịchọta azịza nye ajụjụ ndị a n’akụkụ Bible ndị e zoro aka na ha, e bipụtakwara ndepụta zuru ezu nke azịza ha na peeji nke 17. Iji nwetakwuo ihe ọmụma, lee akwụkwọ bụ́ “Insight on the Scriptures,” nke Ndịàmà Jehova bipụtara.)

1. Dị ka Jems si kwuo, gịnị bụ ihe e ji amata ezi Onye Kraịst? (Jems 1:27)

2. Gịnị bụ ihe otiti ikpeazụ e tiri ndị Ijipt, nke mere ka ha hapụ ụmụ Izrel? (Ọpụpụ 11:1, 5)

3. Mkpụrụ akwụkwọ dịgasị aṅaa n’usoro mkpụrụ akwụkwọ Grik ka e ji mee ihe n’izo aka n’ebe Jehova nọ? (Mkpughe 1:8)

4. Gịnị mere Jehova achụpụghịrị ụmụ Izrel ndị nile bi n’Ala Nkwa ahụ ngwa ngwa? (Ọpụpụ 23:29, 30)

5. Iji chebe onwe ya na ezinụlọ ya, ihe atọ dị aṅaa ka a chọrọ ka Rehab mee? (Joshua 2:18-20)

6. Olee ihe otiti anụ ahụ́ Setan tiri Job? (Job 2:7, 8)

7. N’ihi gịnị ka Zakịọs ji rịgoro n’elu osisi fig yiri osisi mọlberi? (Luk 19:3, 4)

8. Ụmụnne ndị ikom ole ka Devid nwere bụ́ ndị tọrọ ya? (1 Ihe E Mere 2:15)

9. Olee otú eze nwanyị Sheba si nwalee amamihe Solomọn? (1 Ndị Eze 10:1)

10. Gịnị bụ okwu Hibru maka “Onyenwe anyị”? (Jenesis 15:2)

11. Ọ̀ bụ mgbe ndị na-eso ụzọ Jizọs hụrụ ihe àmà dị aṅaa ka ha ga-esi na Judia gbapụ? (Mak 13:14)

12. N’ihi gịnị ka anyị pụrụ iji nwee olileanya inweta ndụ ebighị ebi n’eziokwu? (Taịtọs 1:2)

13. Gịnị ka e ji rụọ ụgbọ ahụ e tinyere obere nwa bụ́ Mozis na ya ? (Ọpụpụ 2:3)

14. Ngwá egwú dị aṅaa, nke a kpọrọ aha nanị otu ugboro na Bible ka a kpọrọ mgbe a na-eme ememe maka ibuga Igbe ahụ na Jeruselem? (2 Samuel 6:5)

15. Ndị na-eso ụzọ ole ka Jizọs zipụrụ ka ha buru ya ụzọ gawa n’ịgba àmà ikpeazụ ya na Judia? (Luk 10:1)

16. Gịnị bụ nzube ndị Farisii mgbe ha na-ajụ Jizọs ajụjụ? (Matiu 22:15)

17. Gịnị ga-eme ọbụna “aha ndị na-emebi iwu”? (Ilu 10:7)

Azịza Nye Ajụjụ

1. “Mmadụ idebe onwe ya n’enweghị ntụpọ n’ebe ụwa dị,” na ichebara ndị di ha ma ọ bụ nne na nna ha nwụnahụrụ echiche

2. Ọnwụ nke ihe nile e buru ụzọ mụọ, malite na mmadụ ruo n’anụ ọhịa

3. Alfa na omega

4. Ka anụ ọhịa wee ghara ịmụba karịa ha n’ala e mere ka ọ tọgbọrọ chakoo na mberede

5. Ịkpọkọta ndị ezinụlọ ha n’ụlọ ya, ikegide eriri uhie na windo, nakwa ịghara ikpughe ihe banyere nleta nke ndị nledo ahụ

6. Ihe ofifi ọjọọ site n’isi ruo n’ụkwụ

7. Ọ pụghị ịhụ Jizọs n’ihi na ọ dị obere

8. Isii

9. O ji “ilu dị iche iche nwaa ya”

10. Adonay [ma ọ bụ Adhonai]

11. “Ihe arụ nke na-akpata ịtọgbọrọ n’efu ka o guzo n’ebe ọ na-ekwesịghị iguzo”

12. Chineke kwere nkwa ya, ọ pụghịkwa ikwu okwu ụgha

13. Papyrus

14. Castanet

15. 70 (mmadụ abụọ abụọ ụzọ 35)

16. Ka ha wee “jide ya n’okwu ya”

17. Ọ “ga-ere ure” ma pụọ n’anya