Ịchọta Ebe Ha Ga-akpọ nke Ha
Ịchọta Ebe Ha Ga-akpọ nke Ha
“N’agbanyeghị otú o si dị ala, e nweghị ebe dị ka ụlọ mmadụ.”—John Howard Payne.
EBURU ụzọ lụọ agha, agha na-ebighị ebi ma ọlị. E mesịa, e nwee ụkọ mmiri ozuzo, ụkọ mmiri ozuzo nke dịgidere nnọọ adigide. Ngwa ngwa ụkọ mmiri ozuzo ahụ gasịrị, e nwere ụnwụ nri. Ndị mmadụ mekwara nanị otu ihe ha pụrụ ime—ha si n’ebe obibi ha gbapụ ịchọ mmiri, nri, na ọrụ.
Ọtụtụ puku bịarutere n’ókè mba ha n’ebe ndị nche nọ. Ma n’afọ ndị na-adịbeghị anya, a nabataworị otu nde ndị gbara ọsọ ndụ, mba ndị gbara ya gburugburu adịkwaghị anabata ndị ọzọ. Ndị uwe ojii na-eche nche n’ókè mba bụ́ ndị jicha okpiri kpachapụrụ anya ịhụ na ọ dịghị onye ọ bụla mịfeere.
Otu onye ọrụ na-ahụ maka ndị si ná mba ọzọ na-akwabata kọwara hoo haa ihe mere e ji na-egbochi ọnụ ọgụgụ na-arị elu nke ndị na-agba ọsọ ndụ. “Ha adịghị atụ ụtụ isi. Ha na-ebibisị okporo ụzọ. Ha na-egbutusị osisi. Ha na-ekurucha mmiri anyị. Ee e, anyị achọghị ndị ọzọ.” *
Ọnọdụ ọjọọ ndị dị otú ahụ na-aghọwanye ndị a na-ahụkarị. Ndị a chụpụrụ n’ebe obibi ha na-achọpụta na ọ na-esiwanye ike ịchọta ebe ha ga-akpọ nke ha. “Ebe ọ bụ na ọnụ ọgụgụ ndị na-achọ nchebe amụbawo, otú ahụkwa ka ọtụtụ mba na-ajụwanye inye ha nchebe ahụ,” ka otu akụkọ nke Òtù Mba Nile Na-ahụ Maka Mgbaghara wepụtara na nso nso a na-akọ.
Ndị nwere ihe ndabara ọma bụ́ ndị mesịrị ruo n’ogige ndị gbara ọsọ ndụ pụrụ inwetatụ nchebe, ma ọ naghị adịkebe ka mgbe mmadụ nọ n’ụlọ ya. Ọnọdụ ndị dị n’ogige ahụ nwekwara ike ghara ịdịcha mma.
Ndụ n’Ogige Ndị Gbara Ọsọ Ndụ
“Mgbọ pụrụ ịtụgbu gị [n’ụlọ gị], ma n’ebe a [n’ogige ndị gbara ọsọ ndụ], ụmụ gị ga-anwụ n’agụụ,” ka otu onye Africa gbara ọsọ ndụ na-ekpesa. Dị ka nna a na-amakwaghị ihe ọ ga-eme chọpụtara, a na-enwe ụkọ nri na mmiri nakwa ụkọ nke ọnọdụ ịdị ọcha na ebe obibi zuru ezu n’ọtụtụ ogige, mgbe nile. Ihe ndị kpatara ya doro anya. Mba ndị ka na-emepe emepe, bụ́ ndị ọtụtụ puku ndị gbara ọsọ ndụ nujupụtara na mberede, pụrụ ịnọworị na-adọlị nanị iji nyejuo ụmụ amaala ha afọ. Ha apụghị inyere ụba mmadụ ahụ nutara na mberede bụ́ ndị na-achọ ịbata ná mba ha aka nke ukwuu. Mba ndị bakwara ọgaranya karị, n’ịbụ ndị nwere nsogbu ndị nke ha, nwere ike ha agaghị adịcha njikere inye aka n’ịkwado ọtụtụ ndị gbara ọsọ ndụ nọ ná mba ndị ọzọ.
Mgbe ihe karịrị nde mmadụ abụọ si n’otu mba Africa gbapụ na 1994, n’ụzọ a na-apụghị izere ezere, ogige ndị gbara ọsọ ndụ ndị e wuru ọkụ ọkụ enweghị mmiri na usoro ịdị ọcha kwesịrị ekwesị. N’ihi ya, ntiwapụ nke ọrịa ọgbụgbọ na ọnyụnyụ gburu ọtụtụ puku mmadụ tupu e gbochie ya. Iji mee ka ihe ka njọ, ndị agha bu ngwá agha banyere n’etiti ndị nkịtị gbara ọsọ ndụ ma weghara nkesa nke ihe enyemaka n’egbughị oge. Ọ bụghị nke mbụ a na-enwe ụdị nsogbu a. “Ọnụnọ nke ndị bu ngwá agha na-anọ n’etiti ndị gbara ọsọ ndụ emewo ka ndị nkịtị nọrọ n’ihe ize ndụ dị ukwuu. O mewo ka ha bụrụ ndị a pụrụ ịkakwasị anya, ịmaja na iwere n’ọrụ soja n’ike,” ka otu akụkọ nke Òtù Mba Ndị Dị n’Otu na-ekwu.
Ndị obodo pụkwara ịhụju anya n’ihi nnubata nke ndị gbara ọsọ ndụ agụụ ji. N’ógbè ndị dị gburugburu Great Lakes nke Africa, ụfọdụ ndị ọchịchị mere mkpesa, sị: “[Ndị gbatara ọsọ ndụ] ebibiela nri anyị chekwara echekwa, bibie ubi anyị, ehi anyị, ogige ntụrụndụ anyị, kpata ụnwụ nri ma gbasaa ọrịa . . . [Ha] na-erite uru site n’enyemaka ihe oriri, ebe anyị na-adịghị enweta ihe ọ bụla.”
Ka o sina dị, nsogbu kasịnụ pụrụ ịbụ eziokwu ahụ bụ́ na ọtụtụ ogige nwa oge maka ndị gbara ọsọ ndụ na-emesị ghọọ ebe obibi na-adịgide adịgide. Dị ka ihe atụ, n’otu mba dị n’Etiti Ebe Ọwụwa Anyanwụ Ụwa, a fakọtara ihe dị ka mmadụ 200,000 gbara ọsọ ndụ n’otu ogige e wuburu maka otu ụzọ n’ụzọ anọ nke ọnụ ọgụgụ ahụ. “Anyị amaghị ebe ọzọ anyị ga-aga,” ka otu n’ime ha ji iwe kwuo. Ndị a gbara ọsọ ndụ bụ́ ndị taworo ahụhụ ruo ogologo oge na-enwe ihe mgbochi siri ike n’ịchọta ọrụ ná mba ha gbagara, a na-emekwa atụmatụ na ihe ruru pasent 95 enweghị ọrụ ma ọ bụ bụrụ ndị na-adịghị arụ ọrụ kwesịrị ekwesị. “N’ezie, amaghị m otú ha si enweta ihe ha ji ebi ndụ,” ka otu onye ọrụ na-ahụ maka ndị gbara ọsọ ndụ kwuru.
Ma ọ bụrụ na ọnọdụ ndị dị n’ogige ndị gbara ọsọ ndụ dị njọ ịnụ ná ntị, ọnọdụ nke ndị a chụpụrụ n’ebe obibi ha bụ́ ndị na-apụghị isi ná mba ha pụọ pụrụ ọbụna ịka njọ.
Nhụsianya nke Ịbụ Onye A Chụpụrụ n’Ebe Obibi Ya
Dị ka Kọmishọna Ukwu nke Mba Ndị Dị n’Otu Maka Ndị Gbara Ọsọ Ndụ si kwuo, “otú nsogbu a bururu n’ibu, nhụjuanya ụmụ mmadụ bụ́ nke na-akpata ya, nakwa mmetụta ọ na-enwe n’udo na ịnọ ná ntụkwasị obi nke mba nile, emewo n’ụzọ ziri ezi ka mmadụ ịbụ onye a chụpụrụ n’ebe obibi ya ná mba ya ghọọ oké ihe nchegbu nye mba nile.” E nwere ọtụtụ ihe mere ndị a na-enweghịzi ebe obibi ji abụkarị ndị a pụrụ imerụ ahụ́ karịa ndị gbara ọsọ ndụ.
Ọ dịghị òtù mba nile na-ahụ maka ọdịmma nke ndị a chụpụrụ n’ebe obibi ha, usoro mgbasa ozi adịghịkwa agbasakebe ozi banyere ajọ ọnọdụ ha nọ na ya. Ndị ọchịchị mba ha, n’ịbụ ndị mikpuru onwe ha n’otu ụdị agha ma ọ bụ ọzọ, nwere ike ha agaghị adị njikere ma ọ bụ nwee ike ichebe ha. A na-ekewakarị ezinụlọ dị iche iche n’oge ha na-agbapụ site n’ógbè ndị dị ize ndụ. Ọtụtụ mgbe, n’ịbụ ndị a manyere iji ụkwụ mee njem, ụfọdụ ndị a chụpụrụ n’ebe obibi ha adịghịdị adị ndụ mechaa njem ahụ ruo n’ebe dị nchebe karị.
Ọtụtụ n’ime ndị a chụpụrụ n’ebe obibi ha na-achọ nchebe n’obodo ukwu dị iche iche, bụ́ ebe ha na-ebi ndụ n’ọnọdụ ndị siri ike n’ógbè ndị jupụtara ná nkịkara ụlọ ma ọ bụ n’ụlọ ndị a gbahapụrụ agbahapụ. Ndị ọzọ na-agbakọta n’ogige ndị a na-ewughị nke ọma, bụ́ ebe ndị agha na-awakpo mgbe ụfọdụ. Dị ka ọ na-adịkarị, ọnụ ọgụgụ ndị na-anwụ n’etiti ha na-ebu ibu karịa ìgwè ọ bụla ọzọ ná mba ha.
Ọbụna mgbalị ndị e ji ezi nzube mee iji belata ahụhụ nke ndị a chụpụrụ n’ebe obibi ha na-ata pụrụ ịrụpụta ihe dị iche n’ihe e bu n’uche. Akwụkwọ bụ́ The State of the World’s Refugees 2000 na-akọwa, sị: “N’ime iri afọ ikpeazụ nke narị afọ nke 20, òtù ndị na-akwalite ọdịmma ndị mmadụ bụ́ ndị na-eje ozi ná mba ndị agha tisasịrị zọpụtara ndụ ọtụtụ puku mmadụ ma mee ihe dị ukwuu iji belata nhụjuanya ụmụ mmadụ. Otú ọ dị, otu n’ime
ihe ndị dị mkpa a mụtara n’iri afọ ahụ bụ na mgbe a na-alụ agha, òtù ndị ahụ na-alụrịta agha pụrụ iji ihe ndị a na-eme iji kwalite ọdịmma ndị mmadụ mee ihe, ọ pụkwara ịrụpụta ihe a na-ebughị n’uche mee ya nke bụ́ ime ka ndị na-emebi ihe ndị ruuru mmadụ nwekwuo ike. Ọzọkwa, ihe enyemaka ndị òtù ndị na-akwalite ọdịmma ndị mmadụ wetara pụrụ ime ka e nwetakwuo ego e ji alụ agha, na-enye aka n’ịkwado na ime ka agha ahụ nọtekwuo aka.”Ọchịchọ A Na-achọ Ụzọ Ndụ Ka Mma
E wezụga ndị gbara ọsọ ndụ na ndị na-enweghịzi ebe obibi n’obodo ha, e nwere ọnụ ọgụgụ na-arị elu nke ndị na-agba ọsọ ndụ n’ihi ọnọdụ akụ̀ na ụba. E nwere ọtụtụ ihe na-akpata ya. Oghere e nwere n’agbata mba ndị bara ọgaranya n’ụwa na ndị dara ogbenye na-ebuwanye ibu, kwa ụbọchị, ihe omume telivishọn na-egosikwa ụfọdụ n’ime ụmụ amaala ndị kasị daa ogbenye n’ụwa, ụzọ ndụ nke ndị ọgaranya nke mba ụfọdụ. Ime njem n’ụwa nile adịla mfe karị, ókèala mba na-abụwanye nke a pụrụ ịgafe n’ụzọ dị mfe. Agha obodo tinyere ịkpa ókè agbụrụ na nke okpukpe na-akpalikwa ndị mmadụ n’ụzọ siri ike ịkwaga n’ala ndị bara ọgaranya karị.
Ma ka ụfọdụ ndị na-akwaga mba ọzọ—karịsịa ndị nwere ndị ikwu nọ anọ ná mba ndị mepere emepe—na-eme njem ahụ n’enweghị nsogbu, ndị ọzọ na-ebibi ndụ ha. Ndị dabara n’aka ndị na-ebubata ihe na nzuzo na-eche ihe ize ndụ pụrụ iche ihu. (Lee igbe ndị so isiokwu a.) Ezinụlọ kwesịrị iji nlezianya tụlee ihe ize ndụ ndị a tupu ha ana-akwaga ná mba ọzọ n’ihi ihe ndị metụtara akụ̀ na ụba.
N’afọ 1996, otu ụgbọ mmiri mere ochie kpuru n’Oké Osimiri Mediterenian, mmiri rikwara mmadụ 280. Ndị ahụ nwụrụ bụ ndị si India, Pakistan, na Sri Lanka na-akwaga Europe, bụ́ ndị kwụrụ ihe nọ n’agbata $6,000 na $8,000 maka njem ha. Tupu ụgbọ ahụ ekpuo, ha ediwo agụụ, akpịrị ịkpọ nkụ, na iti ihe ruo ọtụtụ izu. “Njem ịba ọgaranya” ha ghọrọ ahụmahụ ọjọọ nke jedebere n’ọdachi.
Ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ onye ọ bụla gbara ọsọ ndụ, onye a chụpụrụ n’ebe obibi ya, ma ọ bụ onye kwagara ná mba ọzọ n’ụzọ iwu na-akwadoghị nwere ahụmahụ ọjọọ nke ya ọ ga-akọ. Ihe ọ sọrọ ya bụrụ ya mere ndị a ji gbapụ n’ebe obibi ha—ma ọ bụ agha, mkpagbu, ma ọ bụ ịda ogbenye—nhụjuanya ha na-akpalite ajụjụ bụ́: Ọ̀ dị mgbe a ga-agwọta nsogbu a? Ka ọnụ ọgụgụ buru ibu ndị gbara ọsọ ndụ hà ga-anọgide na-amụba?
[Ihe e dere n’ala ala peeji]
^ par. 5 Ihe ahụ a kọwara n’elu mere na March 2001 n’otu mba dị n’Eshia. Ma nsogbu ndị yiri ya ebilitewokwa ná mba ụfọdụ n’Africa.
[Igbe/Foto dị na peeji nke 20]
Ọnọdụ Ọjọọ nke Ndị Kwagara Mba Ọzọ n’Ụzọ Iwu Na-akwadoghị
E wezụga ndị gbara ọsọ ndụ na ndị a chụpụrụ n’ebe obibi ha, e nwere ihe nọ n’agbata nde mmadụ 15 na nde 30 nke “ndị kwagara ná mba ọzọ n’ụzọ iwu na-akwadoghị” n’ụwa nile. Ihe ka ukwuu n’ime ndị a bụ ndị na-atụ anya ịgbanahụ ịda ogbenye—nakwa ajọ mbunobi na mkpagbu ma eleghị anya—ná mba ndị ka baa ọgaranya.
Ebe ọ bụ na ọ dịghịzi ekwecha omume ịkwaga ná mba ọzọ n’ụzọ iwu kwadoro n’afọ ndị a, azụmahịa ọhụrụ iwu na-akwadoghị nke ibubata ndị na-akwaga ná mba ọzọ amalitela. N’eziokwu, ibubata ndị na-akwaga ná mba ọzọ aghọziela azụmahịa na-enye ego nye òtù ndị omekome ná mba nile. Ndị ụfọdụ na-eme nchọpụta na-eme atụmatụ na ọ na-enye uru dị ihe dị ka ijeri $12 n’otu afọ, n’enweghị oké ihe ize ndụ nye ndị ahụ na-ebubata ha. Pino Arlacchi, bụ́ Osote Odeakwụkwọ Ukwu nke Mba Ndị Dị n’Otu, kpọrọ ya “ahịa mpụ kasị amụba ngwa ngwa n’ụwa.”
Ndị na-akwaga ná mba ọzọ n’ụzọ iwu na-akwadoghị na-afọ nke nta ka ha ghara inwe nchebe ọ bụla iwu kwadoro, ndị ahụ bubatara ha na-ejichikarịkwa akwụkwọ ikike ngafe ha. A pụrụ ịhụ ndị dị otú ahụ kwagara ná mba ọzọ n’ụlọ ọrụ ndị na-akwụ obere ụgwọ ma nwee ọnọdụ ọrụ dị njọ, ebe ha na-arụ ọrụ n’ebe obibi, n’ụlọ ọrụ ndị na-akụ azụ̀, ma ọ bụ na-arụ ọrụ ugbo. Ụfọdụ na-aghọ ndị akwụna. Ọ bụrụ na ndị ọchịchị ejide ha, o yikarịrị ka a ga-agbara ha ụgbọ nwa mkpi, n’enyeghị ha ego ọ bụla. Ọ bụrụ na ha ajụ ịrụ ọrụ n’ọnọdụ ọjọọ ndị ahụ, a pụrụ iti ha ihe ma ọ bụ metọọ ha n’ụzọ mmekọahụ ma ọ bụ ọbụna yie ezinụlọ ha nọ ná mba ha egwu imeso ha ihe ike.
Ọtụtụ mgbe, òtù ndị omempụ na-arata ndị pụrụ ịkwaga ná mba ọzọ site n’ikwe ha nkwa inwetara ha ọrụ a ga na-akwụ ha ezigbo ego na ya. N’ihi ya, ezinụlọ dara ogbenye pụrụ iji ihe nile ha nwere gbaziri ego nanị iji ziga otu onye n’ime ha Europe ma ọ bụ United States. Ọ bụrụ na onye ahụ kwagara mba ọzọ enweghị ike ịkwụ ụgwọ ihe e mefuru n’isi ya, a ga-atụ anya ka ọ kwụọ ụgwọ ahụ site n’ịrụ ọrụ, bụ́ nke pụrụ iru $40,000. ‘Ndụ ọhụrụ’ ahụ e kwere ya ná nkwa na-aghọ nnọọ ịgba ohu.
[Foto]
Ndị gbatara ọsọ ndụ na Spen n’ụzọ iwu na-akwadoghị
[Igbe/Foto dị na peeji nke 21]
E Mebie Obi Ọcha Ya
Ezinụlọ Siri bi n’ugwu nke Ebe Ndịda Ọwụwa Anyanwụ Eshia, bụ́ ebe nne na nna ya na-akọ osikapa. Otu ụbọchị, otu nwanyị gwara nne na nna ya na ya pụrụ inwetara Siri ọrụ a na-akwụ ezigbo ego na ya n’obodo ukwu. Ihe o kwuru a ga na-akwụ ya nke bụ́ $2,000—nnukwute ego nye ndị ọrụ ubi ahụ bi n’ugwu—siiri ha ike ịjụ. Otú ọ dị, n’oge na-adịghị anya, Siri chọtara onwe ya n’agbụ n’otu ụlọ ndị akwụna. Ndị nwe ya gwara ya na iji nwere onwe ya, ọ ghaghị ịkwụghachi ha $8,000. Siri dị afọ 15 n’oge ahụ.
O kweghị Siri omume ịkwụpụ ụgwọ a. E ji iti ihe na imetọ ya n’ụzọ mmekọahụ mee ka o kwenye. Ọ bụrụhaala na ọ nọgide na-aba uru, a gaghị atọhapụ ya ma ọlị. Eziokwu dị mwute bụ na a na-emesịa tọhapụ ọtụtụ n’ime ndị akwụna dị otú ahụ—ma ọ bụ nanị ịla n’obodo ha gaa nwụọ n’ihi ọrịa AIDS.
Azụmahịa yiri ya na-aga n’ihu n’akụkụ ndị ọzọ nke ụwa. Otu akụkọ e bipụtara na 1999 nke isiokwu ya bụ International Trafficking in Women to the United States mere atụmatụ na a na-ere ma ọ bụ na-azụ ndị inyom na ụmụaka dị n’agbata 700,000 na 2,000,000 kwa afọ, ọtụtụ n’ime ha bụ maka ịgba akwụna. A pụrụ ịghọgbu ụfọdụ ndị, a na-atọrọ nnọọ ndị ọzọ atọrọ; ma a na-amanye ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ ha nile ịrụ ọrụ megidere ọchịchọ ha. Otu onye nọ n’afọ iri na ụma bụ́ onye a napụtara n’aka òtù nwere ndị akwụna kwuru banyere ndị jidere ya, sị: “Ọ dịghị mgbe m chere na nke a ga-ekwe omume. Ndị a bụ anụ ọhịa.”
E si n’ogige ndị gbara ọsọ ndụ kpọrọ ụfọdụ ndị nwere ihe ndabara ọjọọ, bụ́ ebe a na-apụghị ịjụ nkwa maka ọrụ na ego buru ibu na Europe ma ọ bụ United States. N’ihe banyere ọtụtụ ndị inyom, ọchịchọ ha na-achọ ndụ ka mma edugawo ha n’ịnọ n’ohu n’ụzọ mmekọahụ.
[Igbe/Foto ndị dị na peeji nke 22]
Gbakọọ Ihe Ọ Ga-efu Tupu Ị Na-akwaga ná Mba Ọzọ n’Ihi Ihe Metụtara Akụ̀ na Ụba
N’ihi ọtụtụ òtù ndị omempụ na-ebubata ndị na-akwaga ná mba ọzọ nakwa ihe isi ike dị n’ịkwaga ná mba ndị mepere emepe nke ụwa n’ụzọ iwu kwadoro, ndị bụ́ di na ndị bụ́ nna kwesịrị iji nlezianya chebara ajụjụ ndị na-esonụ echiche tupu ha emee mkpebi.
1. Ọnọdụ akụ̀ na ụba anyị ọ̀ dị nnọọ oké njọ nke na otu onye ma ọ bụ ezinụlọ anyị dum aghaghị ịkwaga ná mba ebe a na-akwụ ụgwọ buru ibu karị?
2. Ego ole ka anyị ga-eji n’ụgwọ iji kwụọ ụgwọ maka njem ahụ, oleekwa otú a ga-esi kwụọ ụgwọ ahụ?
3. Ò ruru eru iji n’ihi uru akụ̀ na ụba nke nwere ike ghara inwe isi kewasịa ezinụlọ? Ọ na-afọ nke nta ka ọ bụrụ ihe na-agaghị ekwe ọtụtụ ndị kwagara ná mba ọzọ n’ụzọ iwu na-akwadoghị omume inweta ọrụ na-adịgide adịgide ná mba ndị mepere emepe.
4. Èkwesịrị m ikwere akụkọ ndị a na-akọ banyere ụgwọ ndị buru ibu karị a na-akwụ na enyemaka gọọmenti? Bible na-ekwu na “onye na-enweghị uche na-ekwere okwu nile ọ bụla: ma onye nwere ezi uche na-aghọta ijeụkwụ ya.”—Ilu 14:15.
5. Olee otú m ga-esi jide n’aka na anyị agaghị adaba n’aka òtù ndị omempụ?
6. Ọ bụrụ na ọ bụ òtù ndị omempụ dị otú ahụ haziri njem ahụ, ò doro m anya na nwunye m—ma ọ bụ nwa m nwanyị—nwere ike ịbụ onye a manyere ịgba akwụna?
7. Àghọtara m na ọ bụrụ na mụ akwaga ná mba ọzọ n’ụzọ iwu na-akwadoghị, e nwere ike agaghị m enweta ọrụ na-adịgide adịgide nakwa na a pụrụ ịgbara m ụgbọ nwa mkpi, ego nile m tinyere na njem ahụ efunahụ m?
8. Àchọrọ m ịghọ onye kwagara ná mba ọzọ n’ụzọ iwu na-akwadoghị ma ọ bụ mewe ihe n’ụzọ akwụwaghị aka ọtọ iji bụrụ onye a nabatara ná mba ndị bara ọgaranya karị?—Matiu 22:21; Ndị Hibru 13:18.
[Ihe Osise/Map dị na peeji nke 20, 21]
(Ị chọọ ịhụ ebe e sere map a, gaa n’akwụkwọ a nke e biri ebi)
Otú Ndị Gbara Ọsọ Ndụ na Ndị Ọrụ Ndị Na-esi Mba Ọzọ Akwabata Si Aga
Ebe ndị e nwere ọnụ ọgụgụ buru ibu nke ndị gbara ọsọ ndụ na ndị a chụpụrụ n’ebe obibi ha
Ebe bụ́ isi ndị ọrụ si mba ọzọ na-akwaga
[Ebe E Sigasị Nweta Foto]
Ebe ndị e si nweta ha: The State of the World’s Refugees; The Global Migration Crisis; na World Refugee Survey 1999.
Mountain High Maps® Copyright © 1997 Digital Wisdom, Inc.
[Foto dị na peeji nke 19]
Onye gbara ọsọ ndụ ka ọ na-echere ka e nye ya ebe ọ ga-ebi
[Ebe E Si Nweta Foto]
FOTO UN 186226/M. Grafman