Ụbọchị Agbamakwụkwọ—Ọ Na-enye Obi Ụtọ Ma Na-achọ Ihe Dị Ukwuu n’Aka Mmadụ
Ụbọchị Agbamakwụkwọ—Ọ Na-enye Obi Ụtọ Ma Na-achọ Ihe Dị Ukwuu n’Aka Mmadụ
BIBLE na-egosi na ọ bụ Jehova Chineke—onye maara ụmụ mmadụ karịa onye ọ bụla ọzọ—duziri alụmdi na nwunye mbụ. O guzobere alụmdi na nwunye dị ka ntọala bụ́ isi nke ọha mmadụ. (Jenesis 2:18-24) N’Okwu Chineke e dere n’ike mmụọ nsọ, bụ́ Bible, anyị na-ahụkwa ụkpụrụ dị iche iche pụrụ inye aka n’iduzi anyị mgbe anyị na-eme atụmatụ maka agbamakwụkwọ.
Dị ka ihe atụ, Jizọs sịrị na Ndị Kraịst kwesịrị ‘ịkwụghachi Siza ihe nke Siza.’ (Matiu 22:21) N’ihi ya, ha aghaghị irube isi n’iwu na-achị mba. Alụmdi na nwunye nke kwekọrọ n’ihe ndị iwu chọrọ na-echebe ndị nọ na ya n’ọtụtụ ụzọ, dị ka site n’ịkọwapụta ibu ọrụ e nwere n’ebe ụmụaka nọ (gụnyere nlekọta na agụmakwụkwọ) na ikike nketa. E nwekwara iwu ndị e mere iji chebe ndị òtù ezinụlọ pụọ ná mmegbu na nrigbu. *
Nkwadebe
Ozugbo nwoke na nwanyị kpebiri na ha ga-alụ nakwa na alụmdi na nwunye ahụ ga-ekwekọ n’iwu na n’ụkpụrụ Bible nakwa n’iwu na-achị ala, olee ihe ndị dị irè a na-aghaghị ịtụle? Ụfọdụ n’ime ha bụ ụbọchị na ụdị ememe agbamakwụkwọ a chọrọ ime.
“Ọ pụrụ ịbụ na echiche nwoke na nwanyị ahụ na-aga ịlụ ọhụrụ na nke nne na nna ha agaghị ekwekọcha, ha nwere ike ịnọ n’amaghị ma hà ga-ahọrọ ihe ha chọrọ kpọmkwem ka ha ga-agbaso ọdịnala ezinụlọ ha,” ka otu akwụkwọ kwuru banyere isiokwu ahụ. Gịnị ka a pụrụ ime? “E nweghị ihe ngwọta dị mfe nye okwu a, ma ọ́ bụghị ige ntị nke ọma, kwurịta nsogbu ahụ, ma kwenye n’ihe ụfọdụ. Ọ na-abụ oge mmetụta uche nye onye ọ bụla, ibu ụzọ chebatụrụ ihe echiche na igosipụta nghọta ga-enye aka n’ụzọ dị ukwuu n’ime ka nkwadebe ahụ ka mfe.”—The Complete Wedding Organiser and Record.
Ọ bụ ezie na ndị nne na nna na-ahụ n’anya pụrụ ime ihe dị ukwuu iji hụ na e nwere ihe ịga nke ọma n’ụbọchị ahụ, ha kwesịrị izere ọnwụnwa nke ikwu na a ghaghị ime ihe ndị ha chọrọ. N’aka nke ọzọ, ọ bụ ezie na ọ bụ nwoke na nwanyị ahụ na-aga ịlụ ọhụrụ ga-eme mkpebi ikpeazụ, ha kwesịrị ige ntị na ndụmọdụ ndị e ji ezi obi nye. Mgbe ha na-ekpebi aro ndị ha kwesịrị ịnabata, nwoke na nwanyị ahụ ga-eme nke ọma icheta ndụmọdụ Bible bụ́: “Iwu kwadoro ihe nile; ma ọ bụghị ihe nile bara uru. Iwu kwadoro ihe nile; ma ọ bụghị ihe nile na-ewuli 1 Ndị Kọrint 10:23, 24.
elu. Ka onye ọ bụla nọgide na-achọ, ọ bụghị uru nke ya, kama nke onye nke ọzọ.”—Ime nkwadebe gụnyere ihe omume dịgasị iche iche, site n’ikesa akwụkwọ ịkpọ òkù ruo n’ịhazi ememe oriri. “Ka nkwadebe a dịkwu n’usoro, otú ahụ ka a na-ebukwu ụzọ chebara ihe echiche ma mee atụmatụ, otú ahụ ka ike ọgwụgwụ na nchegbu a na-enwe na ya ga-adịkwu obere,” ka H. Bowman na-ekwu n’akwụkwọ ya bụ́ Marriage for Moderns. “Ọbụna n’ọnọdụ ndị kasị mma,” ka ọ na-adọ aka ná ntị, “a pụrụ inwetụ ike ọgwụgwụ, ọ bụkwa ihe ezi uche dị na ya ime mgbalị nile amamihe dị na ya iji belata ya.”
A ga-enwe ozi ndị a ga-eje na ndị ọbịa a ga-elekọta. Ndị enyi ma ọ bụ ndị ezinụlọ hà pụrụ iwepụta onwe ha inye aka? À pụrụ ikenye ndị ọzọ ruru eru ọrụ ụfọdụ ọ na-adịchaghị mkpa ka nwoke na nwanyị ahụ rụọ n’onwe ha?
Mmefu
Atụmatụ mmefu ego e ji ezi uche mee dị oké mkpa. Ezi uche adịghị ya ịtụ anya ka nwoke na nwanyị ma ọ bụ nne na nna ha banye n’ụgwọ iji kwụọ ụgwọ maka agbamakwụkwọ karịrị akpa ha. Ọtụtụ ndị bụ́ ndị nwere ego maka agbamakwụkwọ buru ibu ka na-ahọrọkwarị ime ka ọ ghara ibu oké ibu. Ka o sina dị, ụfọdụ ndị nwoke na ndị nwanyị na-alụ ọhụrụ achọpụtawo na ọ na-enye aka inwe ihe ndepụta maka ihe a tụrụ anya imefu na ihe e mesịrị mefuo. Ọ pụkwara ịba uru inwe ihe ndepụta nke ụbọchị ikpeazụ ndị a na-aghaghị ịhazicha ihe nile dị mkpa ka a hazie. Iburu ụbọchị ndị a n’isi yiri ka ọ̀ ga-akpata oké nchekasị.
Ego ole ka agbamakwụkwọ ahụ ga-efu? Ọnụ ahịa ihe na-adịgasị iche iche site n’otu ebe gaa n’ọzọ, ma n’ebe ọ bụla unu bi, ọ ga-abụ ihe amamihe ịjụ onwe unu, sị: ‘Ànyị ga-akwụli ụgwọ ihe nile anyị meworo atụmatụ ha? Hà dị mkpa n’ezie?’ Tina, bụ́ nwanyị a na-alụ ọhụrụ, kwuru, sị: “Ihe ụfọdụ ndị yiri ka hà ‘dị oké mkpa’ mgbe ahụ mesịrị bụrụ ihe ndị na-adịghị mkpa.” Tụlee ndụmọdụ Jizọs nyere: “Ònye n’ime unu bụ́ onye chọrọ iwu ụlọ elu, nke na-adịghị ebu ụzọ nọdụ ala gbakọọ ihe ọ ga-efu, iji hụ ma ò nwere ihe ga-ezu iwucha ya?” (Luk 14:28) Ọ bụrụ na aka unu agaghị eru ihe nile ga-amasị unu, wepụnụ ihe ụfọdụ. Ọ bụrụgodị na aka unu pụrụ iru ihe ka ukwuu, unu ka nwekwara ike ime ka ihe dị mfe.
N’Ịtali, otu ngosi ngwá ahịa e mere iji gosipụta arịa na ihe ndị a pụrụ ime maka agbamakwụkwọ mere atụmatụ ego ole nwanyị a na-aga ịlụ ọhụrụ n’Ịtali nwere ike imefu. Ihe ntecha na idozi isi, $450; ịṅụta ụgbọala ndị oké ozu, $300; ihe osise vidio maka ụbọchị ahụ, $600; ọ́bọ́ foto agbamakwụkwọ (n’agụnyeghị foto), $125-$500; okooko osisi, malite na $600; oriri na nkwari, $45-$90 maka otu onye; uwe agbamakwụkwọ, ihe karịrị $1,200. N’iburu ịdị mkpa nke ihe omume ahụ n’uche, a pụrụ ịghọta ihe mere e ji achọ ime ihe pụrụ iche. Ma ihe ọ bụla unu kpebiri kwesịrị iwere ọnọdụ n’ụzọ ezi uche dị na ya.
Ọ bụ ezie na ụfọdụ ndị na-emefu ego dị ukwuu, ndị ọzọ na-enwe obi ụtọ ibelata mmefu ego—ma ọ bụ ha na-eme otú ahụ n’ihi na ọ dịghị ihe ọzọ ha pụrụ ime. “Anyị abụọ bụcha ndị ọsụ ụzọ [ndị na-ezisa ozi ọma oge nile], anyị enweghịkwa ego, ma nke ahụ enweghị ihe o mere,” ka otu nwanyị a na-alụ ọhụrụ kwuru. “Nne di m zụtara ákwà iji kwaa uwe, bụ́ nke otu enyi m kwara dị ka onyinye agbamakwụkwọ ya. Di m ji aka dee akwụkwọ ịkpọ òkù, otu enyi anyị bụ́ Onye Kraịst gbazinyere anyị ụgbọala. Anyị zụrụ nanị ihe ndị dị mkpa maka ememe oriri agbamakwụkwọ, otu onye nyekwara anyị mmanya. Ọ bụghị nke e mefuru oké ihe na ya, kama o zuru nnọọ.” Dị ka otu nwoke na-alụ
nwunye ọhụrụ si kwuo, mgbe ndị ezinụlọ na ndị enyi nyere aka n’ụzọ bara uru, “a na-ebelata mmefu ego n’ụzọ dị ukwuu.”Otú ọ sọrọ ha nweruo ego, nwoke na nwanyị bụ́ Ndị Kraịst kwesịrị izere imebiga ihe ókè, ime ihe dị ka ndị ụwa, ma ọ bụ ime oké ngosi. (1 Jọn 2:15-17) Lee ka ọ ga-esi dị mwute ma ọ bụrụ na ememe obi ụtọ dị ka agbamakwụkwọ emee ka mmadụ ghara ịgbaso ụkpụrụ Akwụkwọ Nsọ nke imeru ihe n’ókè, bụ́ nke na-adọ aka ná ntị megide iribiga nri ókè, ịṅụbiga ihe ọṅụṅụ ókè, ma ọ bụ ihe ọ bụla ọzọ pụrụ ime ka mmadụ ghara ịbụ onye “a na-apụghị ikwujọ ekwujọ”!—Ilu 23:20, 21; 1 Timoti 3:2.
Zere ihe na-ewunụ bụ́ ịnwa ime agbamakwụkwọ buru ibu ma maa mma karịa nke ndị ọzọ. Tụlee uwe mwuda dị oké ọnụ ndị inyom abụọ a na-alụ ọhụrụ n’otu ala yiri—otu n’ime uwe mwụda ndị a dị mita 13 n’obosara, ịdị arọ ya dịkwa kilogram 220; nke ọzọ dị mita 300 n’ogologo, bụ́ nke 100 mmadụ na-enyere nwanyị a na-alụ ọhụrụ aka na-achị. Iṅomi ihe ngosi dị otú ahụ ọ̀ ga-ekwekọ na ndụmọdụ Bible banyere inwe ezi uche?—Ndị Filipaị 4:5.
È Kwesịrị Ịgbaso Ọdịnala?
Otú e si eme agbamakwụkwọ dịgasị iche iche site ná mba gaa ná mba, n’ihi ya, ọ gaghị ekwe omume ikwu okwu banyere ha nile. Mgbe nwoke na nwanyị na-aga ịlụ ọhụrụ na-ekpebi ma hà ga-agbaso omenala ụfọdụ, ha ga-eme nke ọma ịjụ onwe ha, sị: ‘Gịnị ka ọ pụtara? Ya na nkwenkwe ụgha nke ichere mmadụ echiche ọma ma ọ bụ echiche ọmụmụ—dị ka ịwụsa ndị ahụ na-alụ di na nwunye ọhụrụ osikapa—hà nwere njikọ? Ya na okpukpe ụgha ma ọ bụ ememe ndị ọzọ Bible katọrọ hà nwere njikọ? Ọ̀ bụ ihe ezi uche na-adịghị na ya ka ọ bụ ihe na-adịghị egosipụta ịhụnanya? Ọ̀ pụrụ imenye ndị ọzọ ihere ma ọ bụ mee ka ha sụọ ngọngọ? Ọ̀ pụrụ ime ka e nyowe ebumnobi di na nwunye ahụ enyowe? Ọ̀ gabigara ókè?’ Ọ bụrụ na unu enwee obi abụọ banyere nke ọ bụla n’ime ihe ndị a, ọ ga-aka mma izere ọdịnala ahụ ma, ya bụrụ na ọ dị mkpa, mee ka ndị ga-abịa mara banyere mkpebi unu tupu oge eruo.
Ọṅụ na Mmetụta Uche
Mmetụta uche a na-enwe n’oké ụbọchị ahụ pụrụ ịbụ ma nke obi ụtọ ma nke anya mmiri. “Enwere m ọṅụ nke ukwuu, o yiri mmadụ inweta ihe ọ tụsiri anya ya ike,” ka otu nwanyị a na-alụ ọhụrụ kwuru. Ma otu nwoke na-alụ nwunye ọhụrụ na-echeta, sị: “Ọ bụ ụbọchị kasị njọ nakwa nke kasị mma ná ndụ m. Ndị ọgọ m nọ na-ebe ákwá nke ukwuu n’ihi na m na-akpọnara ha nwa nwanyị mbụ ha, nwunye m nọ na-ebe ákwá mgbe ọ hụrụ nne na nna ya ka ha na-ebe ákwá, n’ikpeazụkwa, amalitekwara m ibe ákwá n’ihi na ihe nile ahụ ekweghịzi m odidi.”
Mmeghachi omume ndị dị otú a ekwesịghị ịkpata ahụ́ erughị ala—ọ bụ n’ihi nrụgide. O kwesịghịkwa ịbụ ihe ijuanya ma ọ bụrụ na e nwetụ nsogbu mgbe ụfọdụ n’etiti ezịnụlọ ndị ahụ, ọbụna n’etiti di na nwunye ahụ n’onwe ha. “E kwuwerị, ma eleghị anya ọ bụ ahụmahụ mbụ ha n’ịhazikọta nnukwu nnọkọ oriri ọnụ, mkpali na-adị na ya yiri ka ọ̀ ga-emetụta mmekọrịta ha n’ụzọ ụfọdụ,” ka akwụkwọ bụ́ The Complete Wedding Organiser and Record na-ekwu. “Ọ gaghị enye aka ọ bụla iwe iwe n’ihi na ihe agaghị otú a tụrụ anya ya; ịchọ ndụmọdụ na nkwado n’oge dị otú a ga-arụpụta ihe ndị bara uru.”
Otu nwoke na-alụ nwunye ọhụrụ kwuru, sị: “Ihe m gaara enwewo nnọọ ekele inwe bụ́kwa nke m kwaworo ụta mgbe mgbe n’ihi enweghị ya bụ onye ndụmọdụ m pụrụ ịkọrọ ihe nzuzo, onye m pụkwara ịgwa mmetụta m.” Olee onye ọzọ ka mma ịrụ ọrụ ahụ n’abụghị enyi ma ọ bụ onye ikwu tozuru okè ma ọ bụ onye ọzọ nwere ahụmahụ n’ọgbakọ Ndị Kraịst?
Mgbe ndị nne na nna hụrụ ka nwa ha na-ahapụ ezinụlọ ha, ha pụrụ inwe ngwakọta nke ọṅụ, nganga, ịchọ ka ihe dịghachi otú ọ dịbu, na ụjọ. Otú ọ dị, ha kwesịrị icheta n’ụzọ achọghị ọdịmma onwe onye nanị na oge eruola mgbe nwa ha “ga-ahapụ nna ya na nne ya” iji wee rapara n’ahụ́ di ma ọ bụ nwunye ya, ha ewee bụrụ “otu anụ ahụ́” dị ka Onye Okike zubere. (Jenesis 2:24) N’ikwu banyere mmeghachi omume ya n’ọlụlụ nwunye nke nwa nwoke mbụ ya, otu nne na-echeta, sị: “Anya mmiri gbara m, ma tinyere anya mmiri mwute ahụ, anya mmiri ọṅụ gbara m maka inweta ezigbo nwunye nwa.”
Iji mee ka ememe ahụ bụrụ nke dị ụtọ ma na-ewuli elu, ọ dị ndị nne na nna mkpa—dịkwa ka ọ dị nwoke na nwanyị ahụ na-alụ ọhụrụ—igosipụta àgwà Ndị Kraịst nke imekọ ihe ọnụ, ịnọ jụụ, achọghị ọdịmma onwe onye nanị, na ịnagide ihe.—1 Ndị Kọrint 13:4-8; Ndị Galeshia 5:22-24; Ndị Filipaị 2:2-4.
Ụfọdụ ụmụ nwanyị a na-alụ ọhụrụ na-atụ egwu Eklisiastis 9:11) Gbalịa ka ị ghara ịgbachu ihu mgbe e zutere ihe isi ike, ma nọgide na-enwe nchekwube. Ọ bụrụ na e nwee ihe na-agazighị agazi, cheta na n’afọ ndị na-abịanụ, ị pụrụ ịchị ọchị banyere ya mgbe ị na-akọ akụkọ ya. Ekwela ka obere ihe ndị na-agazighị agazi mebie ọṅụ nke agbamakwụkwọ ahụ n’onwe ya.
na ihe ga-emebi nnọọ n’ụbọchị agbamakwụkwọ ha—na ụgbọala ha ga-ada afọ wee ruo ebe a na-eme ememe ahụ n’azụ oge, na ihu igwe agaghị adị mma, ma ọ bụ na uwe agbamakwụkwọ ha nwere ike bibie nnọọ n’ụzọ a na-apụghị imekwata emekwata mgbe oge rurula. Ma eleghị anya, ọ dịghị nke ọ bụla n’ime ha ga-eme. Otú ọ dị, lee ihe anya otú ha dị. Ọ bụghị ihe nile ga-agazi nnọọ n’enweghị nsogbu. A ghaghị ịnakwere ihe ndọghachi azụ ụfọdụ. ([Ihe e dere n’ala ala peeji]
^ par. 3 Banyere nke a, ọtụtụ ala machibidoro ịlụ karịa otu nwunye, idina onye ikwu, igwu wayo, imeso di ma ọ bụ nwunye ihe ike, na ịlụ di ma ọ bụ nwunye n’etorughị etoru.
[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 7]
“Ihe ụfọdụ ndị yiri ka hà ‘dị oké mkpa’ mgbe ahụ, mesịrị bụrụ ihe ndị na-adịghị mkpa.”—TINA, NWANYỊ A NA-ALỤ ỌHỤRỤ
[Igbe/Foto ndị dị na peeji nke 7]
IHE ATỤ NKE NDEPỤTA IHE NDỊ A GA-AKWADEBE *
Ọnwa 6 n’ihu ma ọ bụ karịa
❑ Soro onye na-aga ịbụ di ma ọ bụ nwunye gị, ndị ọgọ gị, na nne na nna gị kwurịta atụmatụ ndị ị na-eme
❑ Kpebienụ ụdị agbamakwụkwọ unu chọrọ
❑ Meenụ atụmatụ ihe a ga-emefu
❑ Chọpụtanụ ihe ndị iwu chọrọ
❑ Nwetanụ ebe a ga-anọ eme ememe oriri
❑ Gwanụ onye foto
Ọnwa 4
❑ Họta (site n’uwe ndị i nwere enwe), zụta, ma ọ bụ kwaa uwe agbamakwụkwọ
❑ Tụọnụ ọda maka okooko osisi
❑ Họtanụ ma tụọ ọda maka akwụkwọ ịkpọ òkù
Ọnwa 2
❑ Kesaanụ akwụkwọ ịkpọ òkù
❑ Zụtanụ mgbaaka
❑ Meenụ ndejupụta akwụkwọ ndị dị mkpa
1 ọnwa
❑ Yitụnụ ihe ndị unu ga-eyi n’ụbọchị agbamakwụkwọ
❑ Jidenụ n’aka na ọda ndị a tụrụ na nkwekọrịta ndị e mere ka nwere isi
❑ Deenụ kaadị ekele maka onyinye ndị unu nataworo
Izu 2
❑ Malitenụ ịkwaga ihe ndị bụ́ nke unu n’ụlọ ọhụrụ unu
1 izu
❑ Jidenụ n’aka na ndị enyemaka nile maara ihe a tụrụ anya ka ha mee
❑ Meenụ ndokwa maka ibughachi ihe ndị a ṅụtara aṅụta ma ọ bụ ndị a gbazitere agbazite
❑ Kenyenụ ndị ọzọ ọrụ ọ bụla unu nwere ike ikenye ha
[Ihe e dere n’ala ala peeji]
^ par. 31 A pụrụ ịgbanwe nke a ka o kwekọọ n’ihe ndị iwu obodo chọrọ nakwa ọnọdụ onwe onye.
[Foto dị na peeji nke 8]
“Ihe Chineke kekọtaworo, mmadụ ọ bụla atọsala ya”