Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

“Ụbọchị Anyị Kasị Nwee Obi Ụtọ ná Ndụ”

“Ụbọchị Anyị Kasị Nwee Obi Ụtọ ná Ndụ”

“Ụbọchị Anyị Kasị Nwee Obi Ụtọ ná Ndụ”

OGE agbamakwụkwọ bụ oge aṅụrị. Ọtụtụ di na nwunye ekwuwo, sị: “Ọ bụ ụbọchị anyị kasị nwee obi ụtọ ná ndụ.” Ma ọ pụkwara ịbụ otu n’ime ihe kasị achọ ihe n’aka mmadụ. Nchegbu na ike ọgwụgwụ nwoke na nwanyị ahụ na-alụ ọhụrụ na ndị ezinụlọ ha na-enwe pụrụ ịdị ukwuu n’ihi mkpebi na nkwadebe nile dị mkpa ka e mee, nakwa n’ihi ọtụtụ ndị bụ́ ndị nwoke na nwanyị ahụ na-alụ ọhụrụ ga-ezute n’ụbọchị ahụ.

Agbamakwụkwọ na-aka akara mmalite nke ụzọ ndụ ọhụrụ nye di na nwunye ahụ. Ma ọ bụghị nanị ha ka ọ ga-emetụta. Ebe ọ bụ na ọlụlụ nke nwa nwoke, nwa nwanyị, nwanne nwanyị, ma ọ bụ nwanne nwoke na-apụtakarị na onye a hụrụ n’anya na-amalite ezinụlọ dị iche, ndị ezinụlọ ya ga-enwe mmetụta gwara ọgwa mgbe mgbe.

Ememe agbamakwụkwọ na-adịgasị iche iche site n’otu mba gaa n’ọzọ, ọ gaghịkwa ekwe omume ịtụle ha nile ebe a. Isiokwu ndị a ga-elekwasị anya n’ihe ndị ghọworo omenala n’ala ndị dị n’Ebe Ọdịda Anyanwụ Ụwa nakwa n’ala ndị yiri ha. N’ebe ndị ahụ, ịlụ di na nwunye pụrụ ifu nnọọ nnukwu ego. Ụfọdụ ndị na-emefu nnukwu ego n’ụbọchị agbamakwụkwọ, gụnyere ịkwụ ụgwọ ụlọ ezumezu ma ọ bụ ụlọ oriri maka ememe oriri nakwa ịkwadebe ihe oriri. A na-eme atụmatụ na n’Ịtali, agbamakwụkwọ dị otú o kwesịrị na-efu ihe karịrị $10,000. Na Japan, nakwa n’ebe ndị ọzọ, ọnụ ego ahụ pụrụ ịdị elu karị. Dị ka ọ na-adịkarị, ọ bụghị nwoke na nwanyị ahụ na-alụ ọhụrụ na-akwụ ego ahụ. Ọ bụ nne na nna ha na-akwụ ya.

Agbamakwụkwọ bụ achụmnta ego na-enye nnukwu ego. Ọtụtụ ụlọ ọrụ achụmnta ego na-akwalite echiche nke otú agbamakwụkwọ “bụ́ ịgba” kwesịrị ịdị, bụ́ nke ọ na-adịghị ihe kọrọ ụkọ na ya. E kwuwerị, ka ha na-enye echiche ya, “nke a bụ ụbọchị ị na-akasị enwe obi ụtọ ná ndụ!” N’ihi ya, ha na-ekwu banyere ọtụtụ ngwá ahịa ha nwere na ihe ndị ha pụrụ ime, ha na-asịkwa na ọ bụrụ na ị chọrọ ka oké ụbọchị gị ahụ bụrụ ịgba, ị ghaghị ịnakwere ha. Ha pụrụ ịbụ ịkpọ ndị mmadụ òkù n’ụzọ pụrụ iche, uwe agbamakwụkwọ “mara mma nke ukwuu,” uwe ụmụada ndị ga-enyere nwanyị a na-alụ ọhụrụ aka, na kootu maka ndị enyi a họtara ahọta nke nwoke na-alụ nwunye ọhụrụ. E nwekwara okooko osisi, ụgbọala limousine, ikekwe ụlọ nri ebe a ga-enwe oriri na nkwari, onye foto, ndị egwú, na ihe ndị ọzọ. Ihe nile a na-edepụta bụ́ ndị nwoke na nwanyị ahụ na-aga ịlụ ọhụrụ pụrụ ịchọ, nakwa ihe ndekọ na-eso ya nke ihe ha ga-efu, pụrụ ime ka ụjọ tụọ ọtụtụ ndị bụ́ nna.

N’ọtụtụ ebe, a na-eji ime ihe n’ụzọ ọdịnala akpọrọ oké ihe. A na-enwe ụzọ e guzobere e kwesịrị isi mee ihe dị iche iche, a na-atụkwa anya na nwoke na nwanyị ahụ na-aga ịlụ ọhụrụ ga-agbaso ha. Ee, e nwere ọtụtụ ihe a ga-echeta, ma e nwere nanị oge dị nta a ga-eji hazie ha nile.

Nke ahụ ọ̀ bụ atụmanya na-akpali akpali ka ọ bụ nke na-akụda mmụọ? Ihe ọ sọrọ gị zaa, ịtụle ihe nile agbamakwụkwọ pụrụ ịgụnye na-ewelite ọtụtụ ajụjụ. Gịnị ka ịlụ di na nwunye pụtara n’ụbọchị ndị a? Ihe ndị a nile hà dị mkpa iji nwee agbamakwụkwọ “dị mma”? Olee otú a pụrụ isi merie ihe isi ike ndị a na-enwe n’ụzọ anụ ahụ́ nakwa n’ụzọ mmetụta uche?

N’agbanyeghị nchekasị nile ahụ, ọtụtụ ndị ahaziwo ihe ndị metụtara agbamakwụkwọ ha n’ụzọ gara nke ọma ma nụ ụtọ ememe ahụ. Ahụmahụ ha pụrụ inyere ndị ọzọ na-akwadebe otu ememe ahụ aka. Ọzọkwa, e nwere ụkpụrụ Bible ndị pụrụ inye aka mgbe a na-eme atụmatụ maka agbamakwụkwọ, nke ga-eme ka ụbọchị ahụ bụrụ nke dị mma, nke obi ụtọ na nke na-ewuli elu nye mmadụ nile.