Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gịnị Na-akpata Ọgbọ nke Jupụtara n’Ọnụma?

Gịnị Na-akpata Ọgbọ nke Jupụtara n’Ọnụma?

Gịnị Na-akpata Ọgbọ nke Jupụtara n’Ọnụma?

A GBAGBURU otu nwoke ka ọ nọ n’otu ụlọ mmanya dị na Prague, Czech Republic. N’ihi gịnị? Onye ahụ gbagburu ya were iwe n’ihi egwú na-ada oké ụda onye ahụ ọ gbagburu nọ na-akpọ na kaseti ya. E ji osisi e ji eme egwuregwu hockey kụgbuo otu onye ọkwọ ụgbọala n’otu ebe ụzọ gaferịtara ibe ha na Cape Town, South Africa. Ihe àmà gosiri na onye kụgburu ya were iwe n’ihi na ọ gbara ya ọkụ n’ihu. Otu onye nọọsụ si Britain nke bi n’Australia bụ onye otu onye bụbu enyi ya nwoke bụ́ onye iwe ji gbakara ibo ụzọ ya; wụkwasị ya mmanụ ụgbọala, mụnye ya ọkụ, ma hapụ ya ka ọ nwụọ.

À na-akọ akụkọ banyere ọnụma—ọnụma n’okporo ụzọ, ọnụma n’ebe obibi, ọnụma n’ime ụgbọelu—karịa otú ha mere n’ezie? Ka hà bụ nanị ihe àmà a na-ahụ anya nke nnukwute nsogbu na-apụtabeghị ìhè ndị yiri mgbawa dị n’ahụ́ ụlọ? Ihe ndị bụ́ eziokwu na-egosi na nke ikpeazụ a bụ ya.

N’okporo ụzọ, “akụkọ banyere ime ihe ike n’okporo ụzọ ejiriwo ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ pasent 7 na-arị elu kwa afọ kemgbe 1990,” ka otu akụkọ sitere n’aka Òtù Ndị Ọrụ Ụgbọala America (AAA) Òtù Na-ahụ Maka Ịdị Nchebe nke Okporo Ụzọ kwuru.

Ọnụma juru ebe nile n’ebe obibi. Dị ka ihe atụ, n’afọ 1998, ndị uwe ojii nọ na steeti New South Wales nke Australia natara akụkọ ime ihe ike n’ebe obibi nke ji pasent 50 rịa elu. Otu n’ime ndị inyom anọ ọ bụla ná mba ahụ bụ́ ndị lụrụ di ma ọ bụ ndị binyeere nwoke ọzọ n’ụzọ iwu na-akwadoghị abụwo ndị ndị òtù ha mesoro ihe ike.

Akụkọ ahụ bụ otu ihe ahụ n’ime ụgbọelu. Egwu nke ndị njem nọ n’ụgbọelu iwe iwe na mberede ma wakpoo ndị orụ, ndị njem ibe ha, na ọbụna ndị na-anya ụgbọelu, emewo ka ụfọdụ n’ime ụlọ ọrụ ụgbọelu ndị bụ́ isi nke ụwa na-enye ndị ọrụ ha na-arụ ọrụ n’ụgbọelu ajị̀ pụrụ iche e mere iji na-ekedo ndị na-eme ihe ike n’oche ha.

N’ihi gịnị ka ọnụ ọgụgụ na-arịwanye elu nke ndị mmadụ ji yie ka ha apụghị ịchịkwa mmetụta ha? Gịnị na-akpata ime ihe n’ọnụma ndị a? Ọ̀ ga-ekwe omume n’ezie ịchịkwa mmetụta ndị a?

Gịnị Mere Ọnụma Ji Arị Elu?

Inwe ọnụma bụ iwe oké iwe. Ihe na-akpata ime ihe n’ọnụma bụ ikwe ka iwe rịa elu ruo mgbe e gosipụtara ya. “Esemokwu nke ndị ji okporo ụzọ eme ihe na-enwe adịghị abụkarị n’ihi ihe mere otu ugboro. Kama nke ahụ, ha yiri ka hà bụ n’ihi àgwà onwe onye na ọtụtụ nrụgide dị ná ndụ onye ọkwọ ụgbọala ahụ,” ka David K. Willis, bụ́ onyeisi oche nke Òtù Na-ahụ Maka Ịdị Nchebe nke Okporo Ụzọ nke AAA na-ekwu.

Ihe na-eso akpata oké nrụgide a bụ ọtụtụ ihe ọmụma a na-atụ anya ka anyị na-anara kwa ụbọchị. Azụ akwụkwọ bụ́ Information Overload, nke David Lewis dere na-ekwu, sị: “Ihe ọmụma gabigara ókè na-erikpu ọtụtụ ndị ọrụ taa . . . N’ịbụ ndị ihe ọmụma karịrị akarị, . . . ha na-enwe nrụgide gabiga ókè, na-eme nnọọ ihe n’akpacharaghị anya, bụrụ ndị na-enweghịzi ike ịrụ ọrụ nke ọma n’ihi ịtụle ihe.” Mgbe otu akwụkwọ akụkọ na-ehota otu ihe atụ nke ihe ọmụma a gabigara ókè, o kwuru, sị: “Akwụkwọ akụkọ a na-ebipụta n’ime izu na-ebu nnọọ ihe ọmụma nke onye nkịtị nke dịrị ndụ na narị afọ nke 17 ga-enweta ná ndụ ya nile.”

Ihe anyị na-etinye n’ọnụ anyị pụkwara ịdị na-akpatakwu iwe iwe. Nnyocha abụọ sara mbara e mere egosiwo na e jikọrọ isekarị okwu na ise siga, ịṅụ mmanya na-aba n’anya, na iri nri na-adịghị edozi ahụ. Ụzọ ndụ a zuru ebe nile na-akpatakwu nrụgide na obi nkoropụ—obi nkoropụ nke na-apụta ìhè n’ịkpọ iyi, enweghị ndidi, na enweghị ntachi obi.

Àgwà Ọjọọ na Ihe Nkiri Sịnịma

Ka ọ na-ekwu okwu banyere njikọ dị n’etiti àgwà ọjọọ na mpụ, Dr. Adam Graycar, bụ́ onye ntụzi n’Ụlọ Ọrụ Australia Na-amụ Banyere Mpụ (AIC), na-ekwu, sị: “Ilekwasị anya ọzọ ná nkwanye ùgwù na àgwà ọma pụrụ ịbụ otu n’ime nzọụkwụ ndị kasị pụta ìhè n’ibelata ụmụ obere mpụ.” Ụlọ ọrụ ahụ na-atụ aro inwe ndidi, ntachi obi, na izere ịkpọ iyi. Ma e meghị otú ahụ, ka ọ na-ekwu, ọ pụrụ ime ka ịkpa aghara ghọọ ime mpụ. N’ụzọ na-emegide onwe ya, ụdị ntụrụndụ ọtụtụ ndị na-ahọrọ iji belata obi nkoropụ na nrụgide na-akpata omume enweghị ntachi obi na ọnụma n’ezie. N’ụzọ dị aṅaa?

“Ụmụaka na ndị okenye na-enuga n’ebe a na-eme ihe nkiri sịnịma ije kirie ebe a na-egbu mmadụ ma na-ebibi ihe. A na-erepụ ihe nkiri vidio ndị na-egosi ime ihe ike nke ukwuu, ọ na-ewetakwa ego buru ibu. ‘Ihe egwuregwu ndị dị n’ụdị ihe e ji alụ agha’ ka bụ ihe ọtụtụ ụmụaka na-enwe mmasị na ha, ọ bụ ezie na ọ dịghị amasịkebe ndị mụrụ ha. Ọtụtụ ndị, ma ndị okenye ma ụmụntakịrị, na-enwe nnọọ mmasị n’ime ihe ike ndị a na-egosi na telivishọn, telivishọn na-ekerekwa òkè dị mkpa n’ịkpọsa ụkpụrụ ọdịbendị dị iche iche,” ka otu akụkọ sitere n’ụlọ ọrụ AIC na-ekwu. Olee ihe jikọtara nke a na ọnụma okporo ámá nakwa nke ebe obibi? Akụkọ ahụ kwubiri, sị: “Ruo n’ókè ọha mmadụ nabataruru ime ihe ike, otú ahụ ka ụkpụrụ onye nke ọ bụla nọ na ya ga-adịkwa.”

Ọtụtụ ndị taa ga-asị na iwe iwe bụ nnọọ ụzọ dị otú o kwesịrị nke isi meghachi omume ná nrụgide, mmeghachi omume a na-apụghị izere ezere n’ebe ọha mmadụ nwere oké nrụgide, nke na-emekwa omume iwe, nọ. Mgbe ahụ, ọ̀ bụ eziokwu na echiche ahụ a ma ama bụ́ na “Iwe wee gị, wee ya,” bụ ezi ndụmọdụ n’ezie?

È Kwesịrị Ịchịkwa Iwe?

Dị nnọọ ka ugwu mgbawa na-akpatara ndị bi ya gburugburu mbibi, n’otú aka ahụkwa, onye na-ewe oké iwe na-emerụ ndị nọ ya gburugburu ahụ́. Ọ na-emerụkwa onwe ya ahụ́ nke ukwuu. N’ụzọ dị aṅaa? “Iwe iwe na-eduga ọbụna n’omume iwe ka njọ,” ka magazin bụ́ The Journal of the American Medical Association (JAMA) na-ekwu. Dị ka nnyocha na-egosi, ndị ikom bụ́ ndị na-egosipụta iwe “yikarịrị ka hà ga-anwụ mgbe ha na-erule afọ 50 karịa ndị na-adịghị eme otú ahụ.”

Òtù Na-ahụ Maka Obi n’America kwuru n’otu aka ahụ, sị: “Ndị ikom na-eme ihe n’iwe ji okpukpu abụọ nọrọ n’ihe ize ndụ nke ịrịa ọrịa strok karịa ndị ikom na-achịkwa iwe ha.” Ịdọ aka ná ntị a dị mkpa nye ma ndị ikom ma ndị inyom.

Olee ndụmọdụ na-adị irè n’ezie? Rịba ama otú ndụmọdụ akwụkwọ ụwa ụfọdụ na-enye na ndụmọdụ nke akwụkwọ a kasị kesaa nke na-ekwu banyere mmekọrịta ụmụ mmadụ, bụ́ Bible, si yie.

Chịkwaa Iwe—Zere Ọnụma

Dr. Redford B. Williams na-ekwu na magazin bụ́ JAMA, sị: “Ndụmọdụ ahụ nke dị mfe bụ́, ‘iwe wee gị, wee ya,’ eyighị . . . ka ọ̀ ga-enyecha aka. Nke ka nnọọ mkpa bụ ịmụta ụzọ isi nyochaa iwe gị ma chịkwaa ya.” Ọ na-atụ arọ ka ị jụọ onwe gị, sị: “(1) Ọnọdụ a ọ̀ dị mkpa nye m? (2) Echiche m na mmetụta m hà kwekọrọ n’ihe ndị bụ́ eziokwu? (3) À pụrụ ịgbanwe ọnọdụ a, nke na agaghị m ewekwa iwe a?”

Ilu 14:29; 29:11 “Onye na-adịghị ewe iwe ọsọ ọsọ nwere ọtụtụ nghọta: ma onye nwere obi ọkụ na-ebuli uche gbagọrọ agbagọ. Mmụọ nile nke onwe ya ka onye nzuzu na-eme ka ọ pụta ìhè: ma onye maara ihe na-egbochi mmụọ ya, na-emekwa ka ọ dajụọ.”

Ndị Efesọs 4:26 “Weenụ iwe, ma unu emehiekwala; ka anyanwụ ghara ịda n’ebe unu nọ n’ọnọdụ mkpasu iwe.”

Frank Donovan, n’akwụkwọ ya bụ́ Dealing With Anger—Self-Help Solutions for Men, na-atụ aro sị: “Ịgbanahụ iwe—ma ọ bụ n’ịkpọ okwu aha karị, isi n’ebe ahụ pụọ na izere ndị ọzọ n’oge iwe ji gị—bụ ụzọ ime ihe dị mkpa ma baa uru n’ụzọ pụrụ iche n’oge nnukwu iwe ji gị.”

Ilu 17:14 “Dị ka mgbe mmadụ na-ehupụ mmiri, otú a ka isi mmalite iseokwu dị: n’ihi ya tupu ịlụ ọgụ esie ike hapụ ya.”

Bertram Rothschild, ka ọ na-ede ihe na magazin bụ́ The Humanist, kwuru, sị: “Iwe . . . bụ n’ụzọ bụ́ isi ibu ọrụ dịịrị mmadụ. Ihe ndị mere anyị ga-eji wee iwe dị anyị n’ụbụrụ. . . . Ugboro ole na ole iwe rụpụtara ihe enweghị ihe ọ bụ ma e were ha tụnyere ọtụtụ ugboro o mere ka ihe ka njọ. Ọ ka nnọọ mma ịhapụ iwe iwe karịa iwe ya.”

Abụ Ọma 37:8 “Haa aka iwe iwe, hapụkwa ọnụma: emela ka iwe gị dị ọkụ, ọ na-eduba nanị n’ime ihe ọjọọ.”

Ilu 15:1 “Ọzịza okwu dị nro na-eme ka ọnụma laghachi azụ: ma okwu mwute na-akpali iwe.”

Ilu 29:22 “Onye iwe na-akpali iseokwu, ọzọ, onye na-enwe ọnụma hie nne na-ejehie hie nne.”

Ọtụtụ nde Ndịàmà Jehova gburugburu ụwa kwadoro ndụmọdụ ahụ dị n’elu. Anyị na-akpọ gị òkù ịga nzukọ ha n’Ụlọ Nzukọ Alaeze dị n’ógbè unu ma hụ n’onwe gị na ibi ndụ kwekọrọ na ndụmọdụ Bible na-adị irè n’ezie n’agbanyeghị na anyị na-ebi n’ọgbọ nke jupụtara n’ọnụma.

[Foto ndị dị na peeji nke 27]

Dị nnọọ ka ugwu mgbawa, onye na-enwe ọnụma a na-achịkwaghị achịkwa na-ebibi ihe

[Foto dị na peeji nke 28]

Ndụmọdụ Bible na-adị irè n’ezie