Itinye Aka n’Anwansi—Gịnị Dị Njọ na Ya?
Ndị Na-eto Eto Na-ajụ Sị . . .
Itinye Aka n’Anwansi—Gịnị Dị Njọ na Ya?
NDỊ nọ n’afọ iri na ụma hà nwere mmasị n’ezie n’anwansi? Ìgwè ndị nnyocha nwara ịchọpụta nke ahụ site n’inyocha ụmụ akwụkwọ 115 nọ n’ụlọ akwụkwọ sekọndrị. Nnyocha ahụ kpughere ọnụ ọgụgụ ndị a: Ihe karịrị ọkara n’ime ndị e nyochara (pasent 54) sịrị na ha nwere mmasị n’anwansi nakwa n’ike karịrị nke mmadụ, ebe otu ụzọ n’ụzọ anọ (pasent 26) sịrị na ha nwere “nnọọ mmasị” na ha.
Ndị nnyocha nọ na Mahadum Alaska dị n’Anchorage dere, sị: “Akụkọ ndị na-apụta n’akwụkwọ akụkọ na magazin banyere ịrị elu e chere ọrụ òtù nzuzo metụtara ofufe Ekwensu na-arị . . . abawo ụba n’afọ ndị na-adịbeghị anya.” Ndị ọkachamara na-asị na e nwechaghị ihe àmà e ji n’aka iji kwadoo nzọrọ a na-azọrọ na ofufe Setan agbasawo n’etiti ndị ntorobịa. N’agbanyeghị nke ahụ, ajụjụ adịghị ya na ọtụtụ ndị na-eto eto nwere mmasị n’akụkụ dị iche iche nke ofufe Setan na ime anwansi, a sịgodị na mmasị dị otú ahụ emichaghị emi.
Ya mere, ndị ntorobịa ụfọdụ pụrụ ịjụ, sị, ‘Gịnị dị njọ n’itinye aka n’anwansi?’ Iji zaa ya, ka anyị leba anya n’ụzọ ụfọdụ ndị ntorobịa si etinyedị aka n’anwansi.
Ikike Ndọrọ nke Anwansi
Otu isiokwu pụtara na U.S.News & World Report na-ekwu na “ụmụaka na ndị nọ n’afọ iri na ụma n’oge a bụ ndị na-enweta na ndị a na-ekpughere ụbara ihe osise na ihe ọmụma na-agbagwoju anya—na-enyekarị nsogbu—bụ́ ndị a na-apụghị ichetụdị n’echiche ọbụna n’afọ 20 gara aga. Ọchịchọ ịmata ihe na-akwanye ọtụtụ ndị ntorobịa n’ịgụ akwụkwọ na magazin, ile vidio, ma ọ bụ ịwagharị n’ebe a na-edebe ihe ọmụma n’Internet bụ́ ndị na-ekwu ma ọ bụ na-egosi ihe metụtara anwansi.
Dị ka Akụkọ Ụwa BBC A Na-akọ n’Internet si kwuo, ihe omume na-ewu ewu ndị a na-eme na TV bụ́ ndị na-egosi mgbaasị na ozu ndị na-aṅụ ọbara mmadụ “na-akpali ụmụaka inwe mmasị ná mgbaasị, dị ka a na-ekwu.” N’otu aka ahụ, e nwere egwú rock na-ada oké ụda na-ekwu banyere ime ihe ike na ndị mmụọ ọjọọ. Onye na-ede akụkụ pụrụ iche n’akwụkwọ akụkọ bụ́ Tom Harpur dere n’akwụkwọ akụkọ Toronto bụ́ The Sunday Star, sị: “Aghaghị m inye ịdọ aka ná ntị kasị sie ike a pụrụ inye banyere ihe na-eme [n’egwú]. . . . Ahụtụbeghị m ihe jọrọ njọ ka ya. Ihe jupụtara n’egwú ndị ahụ bụ ara ọgbụgba, ịbụ ndị ihe na-egbu ka mmanya, ndị mmụọ ọjọọ, mwụfu ọbara, ịbụ ọnụ, ụdị ime ihe ike ọ bụla, gụnyere idina mmadụ n’ike, ibekasị ahụ́ onwe onye, igbu ọchụ, na igbu onwe onye. Ọnwụ na mbibi, amụma ọdachi, ngọnarị nke ezi ihe nile na nnabata nke arụ
na ajọ ihe nile—ihe ndị a bụ okwu ndị na-adị na ha.”Igere egwú dị otú ahụ ọ̀ pụrụ n’ezie ịkpata àgwà na-eduga n’ịla n’iyi? Ihe àmà na-egosi na ma ọ dịghị ihe ọzọ o mere otú ahụ otu mgbe—mgbe otu onye ntorobịa dị afọ 14 nọ na United States magburu nne ya ma mesịakwa gbuo onwe ya. E kojuru akwụkwọ mmapanye e sere ndị na-akụ egwú rock na-ada oké ụda n’ahụ́ ụlọ ya dum. Nna ya rịọrọ mgbe nke ahụ gasịrị, sị: “Gwa ndị mụrụ ụmụ ka ha mụrụ anya maka ụdị egwú ụmụ ha na-egere.” O kwuru na otu izu tupu nwa ya egbuo nne ya, ọ nọgidere na-agụ egwú rock na-ekwu “banyere ọbara na mmadụ igbu nne ya.”
E nwekwara egwuregwu njije, nke ụfọdụ n’ime ha na-enye ndị na-egwu ha ohere ime dị ka ndị dibịa afa na ndị anwansi ndị ọzọ. Ọtụtụ n’ime egwuregwu ndị a na-enwe ime ihe ike ndị metụtara ndị mmụọ ọjọọ. *
Ka o sina dị, òtù nnyocha bụ́ Mediascope na-akọ, sị: “Nnyocha e mere na-egosi na ịhọrọ egwú rock na-ada oké ụda pụrụ ịbụ ihe àmà pụtara ìhè na-egosi mmadụ ikewapụ onwe ya iche, iji ihe ndị na-eri ahụ́ eme ihe n’ụzọ na-ezighị ezi, ọrịa uche, ihe ize ndụ nke igbu onwe onye . . . ma ọ bụ ịkpa àgwà ndị dị ize ndụ n’oge uto, otú ọ dị, ọ bụghị egwú na-akpata akparamàgwà ndị a. A na-eche na ndị nọ n’afọ iri na ụma bụ́ ndị na-echebu nsogbu ndị ahụ ihu pụrụ ịbụ ndị egwú rock na-ada oké ụda dọọrọ, n’ihi na egwú ndị ahụ na-ekwupụta ihe ndị na-echegbu ha.”
Ọ pụrụ ịbụ na ndị nnyocha nile agaghị ekwenye n’ihe ize ndụ ndị dị n’ige egwú ọjọọ. Ma mmadụ ịdị na-ekiri vidio, ịdị na-egere egwú, ma ọ bụ na-egwu egwuregwu ndị na-adọrọ uche gaa n’ime ihe ike ma ọ bụ ịla onwe onye n’iyi, ọ́ bụghị ihe na-egbu egbu? Ma, nye Ndị Kraịst, itinye aka n’anwansi na-akpata ihe ize ndụ dị njọ ọbụna karị.
Otú Chineke Si Ele Anwansi Anya
Ná 1 Ndị Kọrint 10:20, Pọl onyeozi dọrọ Ndị Kraịst aka ná ntị, sị: “Achọghịkwa m ka unu bụrụ ndị ha na ndị mmụọ ọjọọ na-ekerịta òkè.” Olee ndị kpọmkwem bụ́ ndị mmụọ ọjọọ, gịnịkwa mere o ji dị oké ize ndụ iso ha na-emekọ ihe? N’ịza ya kpọmkwem, ndị mmụọ ọjọọ bụbu ndị mmụọ ozi, ndị họọrọ iso Setan bụ́ Ekwensu. Setan pụtara “Onye Nguzogide,” Ekwensu pụtakwara “Onye Nkwutọ.” Dị ka Bible si kwuo, mmụọ ozi a bụbu nwa Chineke mere onwe ya onye nguzogide na onye nkwutọ site n’ịhọrọ inupụrụ Chineke isi. Ka oge na-aga, ọ ratara ndị mmụọ ozi ndị ọzọ isoro ya n’ụzọ nnupụisi ya. Ìgwè a si otú a ghọọ ndị mmụọ ọjọọ.—Jenesis 3:1-15; 6:1-4; Jud 6.
Jizọs kpọrọ Setan “onye na-achị ụwa a.” (Jọn 12:31) Setan na ndị mmụọ ọjọọ ya na-ewe “oké iwe” n’ihi mbibi ha na-eru nso. (Mkpughe 12:9-12) Ọ bụghị ihe ijuanya na ndị ha na ndị mmụọ ọjọọ mekọworo ihe ahụwo na obi tara ha mmiri. Otu nwanyị nọ na Suriname bụ́ onye tolitere n’ezinụlọ mere mgbaasị ji anya ya abụọ hụ otú ndị mmụọ ọjọọ si “enwe obi ụtọ n’imekpa ndị dabara n’aka ha ahụ́ bụ́ ndị na-achọghị ime ihe ha chọrọ.” * Ya mere, mmadụ na ndị mmụọ a e kere eke dị obi ọjọọ imekọ ihe n’ụzọ ọ bụla dị ize ndụ nke ukwuu!
N’ihi nke a, Chineke nyere ndị ya n’oge ochie, bụ́ ụmụ Izrel, iwu ka ha zere ime anwansi ọ bụla. “Ihe arụ nke Jehova ka onye ọ bụla na-eme ihe ndị a bụ,” ka Deuterọnọmi 18:10-12 na-adọ aka ná ntị. A dọkwara Ndị Kraịst aka ná ntị na Chineke ga-ebibi “ndị na-eme mgbaasị.” (Mkpughe 21:8) Chineke mara ọbụna itinye aka n’anwansi ikpe. “Kwụsịkwanụ ibitụ ihe na-adịghị ọcha aka,” ka Bible nyere n’iwu.—2 Ndị Kọrint 6:17.
Inwere Onwe Onye Pụọ n’Ime Anwansi
Ì hiewo ụzọ wee tinye aka n’anwansi? Ọ bụrụ otú ahụ, tụlee ihe mere na narị afọ mbụ n’obodo Efesọs. Ọtụtụ ndị n’ebe ahụ “na-eme majik.” Ma ọrụ ndị dị ike Pọl onyeozi rụrụ site n’enyemaka nke mmụọ nsọ kpaliri ụfọdụ ndị. Gịnị si na ya pụta? “Ọnụ ọgụgụ dịtụ ukwuu nke ndị na-eme majik chịkọtara akwụkwọ ha ma kpọọ ha ọkụ n’ihu mmadụ nile. Ha wee gbakọta ọnụ ahịa ha ma hụ na ha ruru puku mkpụrụ ego ọlaọcha iri ise. Otú a, okwu Jehova nọgidere na-eto eto ma na-enwe mmeri n’ụzọ dị ike.”—Ọrụ 19:11-20.
Gịnị ka nke a na-agwa anyị? Na ọ bụrụ na mmadụ achọọ ịgbanahụ njichi nke ndị mmụọ ọjọọ, onye ahụ aghaghị ibibi arịa nile metụtara ofufe Setan! Nke a na-agụnye akwụkwọ, magazin, akwụkwọ mmapanye, akwụkwọ na-akpa ọchị, vidio, ọgwụ (ndị a na-eyi maka “nchebe”) na ihe nile metụtara ndị mmụọ ọjọọ a na-enweta n’Internet. (Deuterọnọmi 7:25, 26) Tụfuo ihe ọ bụla a pụrụ iji mee ihe n’ịjụ ndị mmụọ ase, dị ka ugegbe e ji akọ ọdịnihu ma ọ bụ bọọdụ Ouija. Tụfuokwa egwú ma ọ bụ vidio ndị nwere okwu ndị metụtara ofufe Setan.
Ọ na-achọ obi ike na mkpebi siri ike iwere nzọụkwụ dị ike dị otú ahụ. Ma abamuru ya pụrụ ịdị ukwuu. Otu nwanyị bụ́ Onye Kraịst aha ya bụ Jean * zụrụ otu ihe egwuregwu kọmputa nke yiri ihe na-apụghị imerụ ahụ́ na mbụ. Ka ọ na-egwu egwuregwu ahụ ruo n’ogo ya dị iche iche, ọ chọpụtara akụkụ ụfọdụ n’egwuregwu ahụ na-enye echiche ime mgbaasị. N’oge na-adịghị anya, ọ malitere ịrọ nrọ ọjọọ! “M biliri n’etiti abalị wee bibie compact disc ndị egwuregwu ahụ dị na ha,” ka Jean kwuru. Gịnị si na ya pụta? “Enwebeghị m nsogbu ọ bụla kemgbe ahụ.”
Ọ bụrụ na i gosipụta ezi mkpebi siri ike inwere onwe gị, ị ga-enwe ihe ịga nke ọma. Cheta mkpebi siri ike Jizọs gosiri mgbe Ekwensu nwara ịrata ya ka o fee ya ofufe. “Jizọs sịrị ya: ‘Pụọ, Setan! N’ihi na e dere, sị, “Ọ bụ Jehova bụ́ Chineke gị ka ị na-aghaghị ife ofufe, ọ bụkwa nanị ya ka ị na-aghaghị ijere ozi dị nsọ.”’ Mgbe ahụ Ekwensu hapụrụ ya.”—Matiu 4:8-11.
Alụla Ọgụ ahụ Nanị Gị
Pọl onyeozi na-echetara anyị na Ndị Kraịst nile “nwere mgba . . . megide ìgwè ndị mmụọ ọjọọ n’ebe ndị dị n’eluigwe.” (Ndị Efesọs 6:12) Ma anwala ịlụso Setan na ndị mmụọ ọjọọ ya ọgụ nanị gị. Nweta enyemaka site n’aka ndị mụrụ gị na-atụ egwu Chineke na ndị okenye nọ n’ọgbakọ Ndị Kraịst ị nọ na ya. Ọ pụrụ ime gị ihere ikwupụta na i tinyere aka na ya, ma ọ pụrụ ime ka i nweta enyemaka dị gị oké mkpa.—Jems 5:14, 15.
Chetakwa na Bible na-asị: “Na-eguzogidenụ Ekwensu, ọ ga-agbapụkwa n’ebe unu nọ. Bịaruonụ Chineke nso, ọ ga-abịarukwa unu nso.” (Jems 4:7, 8) Ee, i nwere nkwado Jehova Chineke! Ọ ga-enyere gị aka inwere onwe gị pụọ n’ọnyà nke anwansi.
[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]
^ par. 10 Lee isiokwu bụ́ “Ndị Na-eto Eto Na-ajụ Sị . . . È Nwere Ihe Ize Ndụ n’Egwuregwu Njije?,” ná mbipụta Teta! (Bekee) nke August 22, 1999.
^ par. 15 Lee isiokwu bụ́ “Ịpụ n’Okpuru Ike nke Mgbaasị” ná mbipụta nke September 1, 1987, na magazin ya na nke a na-agakọ bụ́ Ụlọ Nche, nke Ndịàmà Jehova bipụtara.
^ par. 20 A gbanwewo aha ahụ.
[Foto dị na peeji nke 30]
Tụfuo ihe nile metụtara ofufe Setan
[Foto dị na peeji nke 30]
Kpachara anya maka ebe a na-edebe ihe ọmụma n’Internet bụ́ ndị na-akwado ime mgbaasị