Ọrụ Nkụzi—Afọ Ojuju na Ọṅụ Ndị A Na-enweta na Ya
Ọrụ Nkụzi—Afọ Ojuju na Ọṅụ Ndị A Na-enweta na Ya
“Ị̀ na-ajụ ihe mere m ji nọgide na-abụ onye nkụzi? Ọ bụ ezie na ọrụ nkụzi pụrụ isi ike ma na-agwụ ike, ịhụ ụmụaka ka ha nile na-enwe mkpali banyere ịmụ ihe nakwa ịhụ ka ha na-enwe ọganihu bụ ya na-akpali m ịnọgide na-abụ onye nkụzi.”—Leemarys, onye nkụzi nọ na New York City.
N’AGBANYEGHỊ ihe ịma aka, ihe ndọghachi azụ, na ndakpọ olileanya nile ahụ, ọtụtụ nde ndị nkụzi n’ụwa nile na-anọgide n’ọrụ ha họọrọ. Gịnịkwa na-akwali ọtụtụ puku ụmụ akwụkwọ ịgbalịsi ike iji ruo eru ịbụ ndị nkụzi ebe ha maara na e nwere ike ha agaghị enweta nkwado zuru ezu? Gịnị na-eme ka ha nọgide?
Inna, bụ́ onye nkụzi si Russia, kọwara, sị: “Ọ bụ ahụmahụ dị ụtọ ịhụ ndị bụbu ụmụ akwụkwọ gị ka ha toruworo ogo mmadụ, ịnụ ka ha na-ekwu na ihe ha mụtara n’aka gị baara ha uru. Ọ bụ nnọọ ihe na-agba ume mgbe ha kwuru na ha na-eji obi ụtọ echeta afọ ndị gị na ha nọrọ.”
Giuliano, bụ́ onye nkụzi e hotara ihe o kwuru n’isiokwu ndị bu ụzọ, kwuru, sị: “Otu n’ime afọ ojuju kasịnụ bụ ịmata na i nwewo ihe ịga nke ọma n’ịkpali mmasị ụmụ akwụkwọ ahụ n’otu isiokwu. Dị ka ihe atụ, mgbe m kọwasịrị otu isi ihe banyere akụkọ ihe mere eme, ụfọdụ ụmụ akwụkwọ kwuru, sị: ‘Akwụsịla. Gwakwuo anyị!’ Okwu ndị a sitere n’obi pụrụ imechapụ gị obi n’ụbọchị obi na-adịghị gị mma n’ụlọ akwụkwọ n’ihi na ị matawo na ị kụnyewo ihe n’uche ndị ahụ na-eto eto nke bụ́ ihe ọhụrụ nye ha. Ọ na-enye nnọọ obi ụtọ ịhụ ihu ha mgbe anya ha gbukepụrụ n’ihi na ha aghọtawo otu isiokwu.”
Elena, bụ́ onye nkụzi nọ n’Ịtali, kwuru, sị: “Ekweere m na a na-enweta afọ ojuju ọtụtụ mgbe n’ụmụ obere ihe ndị na-eme kwa ụbọchị, n’obere ọganihu nke ụmụ akwụkwọ na-enwe, karịa n’ihe ndị dị ukwuu a rụzuru, bụ́ ndị a na-adịghị enwekebe.”
Connie, bụ́ onye Australia dị afọ 30 na ụma, kwuru, sị: “Ọ bụ ihe na-enye nnọọ afọ ojuju mgbe nwa akwụkwọ gị na ya nwere mmekọrịta dị mma wepụtara oge iji deere gị akwụkwọ ozi nke na-ekwupụta ekele maka mgbalị gị.”
Oscar, bụ́ onye si Mendoza, Argentina, chekwara otú ahụ: “Ọ na-eme ka m nwee mmetụta na mgbalị m nile abụghị n’efu mgbe ụmụ akwụkwọ m zutere m n’ụzọ ma ọ bụ n’ebe ọzọ ma gosi ekele maka ihe m kụziiri ha.” Angel, bụ́ onye nọ na Madrid, Spen, kwuru, sị: “Afọ ojuju kasịnụ m na-enwe, n’ịbụ onye tinyeworo akụkụ ụfọdụ nke ndụ m n’ọrụ a magburu onwe ya ma taa akpụ, bụ, n’ụzọ obi abụọ na-adịghị na ya, ịhụ ndị na-eto eto m kụziiri ihe ka ha ghọrọ ndị ikom na ndị inyom na-akwụwa aka ọtọ, bụ́ nke mgbalị m so kpata.”
Leemarys, bụ́ onye e hotara ihe o kwuru ná mmalite, kwuru, sị: “Ana m eche n’ezie na ndị nkụzi bụ ndị pụrụ iche. O nwekwararị otú ọ dị bụ́ anyị iburu ibu ọrụ dị nnọọ ukwuu otú ahụ. Ma ọ bụrụ na ị pụrụ iweta mgbanwe—ma ọ̀ bụ n’ebe ụmụaka iri ma ọ bụ n’ebe nanị otu nọ—ị rụrụ ọrụ gị, ọ dịghịkwa mmetụta ga-aka nke ị ga-enwe mma. Ị na-eji ọṅụ arụ ya.”
Ì Kelewo Ndị Nkụzi Gị?
Dị ka nwa akwụkwọ ma ọ bụ nne ma ọ bụ nna, ì keletụwo onye nkụzi maka oge, mgbalị, na mmasị o gosiworo? Ma ọ̀ bụkwanụ ọbụna ziga akwụkwọ ozi ekele? Arthur, bụ́ onye si Nairobi, Kenya, kwuru ihe bụ́ eziokwu: “Ndị nkụzi na-emekwa nke ọma ma a jaa ha mma. Ndị gọọmenti, ndị nne na nna, na ụmụ akwụkwọ kwesịrị iji ha na ozi ha na-eje kpọrọ nnọọ ihe.”
Onye na-ede akwụkwọ nke bụ́kwa onye nkụzi bụ́ LouAnne Johnson, dere, sị: “Mgbe ọ bụla m nwetara otu akwụkwọ ozi na-adịghị mma banyere onye nkụzi, ana m enweta otu narị ndị dị mma, bụ́ nke na-akwado ihe m kweere bụ́ na e nwere nnọọ ọtụtụ ezigbo ndị nkụzi karịa ndị ọjọọ.” N’ụzọ na-akpali mmasị, ọtụtụ ndị na-akwụ ndị ọrụ nchọpụta ụgwọ n’ezie iji “nyere ha aka chọta onye bụbu onye nkụzi ha. Ndị mmadụ na-achọ ịhụ ndị nkụzi ha ma kelee ha.”
Ndị nkụzi na-atọ ntọala dị oké mkpa maka mmụta mmadụ. Ọbụna ndị prọfesọ kasịnụ bụ́ ndị nọ na mahadum ndị a kasị anụ aha ha ji ndị nkụzi ụgwọ bụ́ ndị tinyere oge na mgbalị iji kpalie ma zụlite ọchịchọ ha maka agụmakwụkwọ, ihe ọmụma, na nghọta. Arthur, bụ́ onye nọ na Nairobi, na-ekwu, sị: “Ndị isi nile nọ n’ụlọ ọrụ ọha na eze na nke ndị nkịtị nwe bụ ndị onye nkụzi kụziwooro ihe n’otu oge ná ndụ ha.”
Lee ekele anyị kwesịrị inwekwu n’ebe ndị inyom na ndị ikom ahụ kpaliri ọchịchọ anyị ịmata ihe nọ, bụ́ ndị kpaliri uche na obi anyị, ndị gosiri anyị otú e si emejụ akpịrị ịkpọ nkụ anyị maka ihe ọmụma na nghọta!
Lee ekele anyị kwesịrị inwe n’ebe Onye Ọkà Nkụzi Ukwu ahụ, bụ́ Jehova Chineke nọ, bụ́ onye mere ka e jiri ike mmụọ nsọ dee okwu ndị dị n’Ilu 2:1-6: “Nwa m, ọ bụrụ na ị nara okwu ọnụ m nile, ọ bụrụkwa na i zobe ihe nile m nyere n’iwu n’ebe ị nọ; ị tọọrọ amamihe ntị gị n’ala, wee wezụga obi gị inwe nghọta; ee, ọ bụrụ na ọ bụ mmata ka ị na-akpọku, ọ bụrụkwa na ọ bụ nghọta ka ị na-eweliri olu gị; ọ bụrụ na ị chọọ ya dị ka ọlaọcha, ọ bụrụkwa na ọ bụ dị ka akụ̀ zoro ezo ka ị na-egwupụta ya: mgbe ahụ ka ị ga-aghọta egwu Jehova, ọ bụkwa ihe ọmụma Chineke ka ị ga-achọta. N’ihi na Jehova na-enye amamihe; n’ọnụ Ya ka ihe ọmụma na nghọta si apụta.”
Rịba okwu bụ́ “ọ bụrụ na” ama bụ́ nke na-egosi ọnọdụ nke ihe dabeere na ya, bụ́ nke pụtara ugboro atọ n’akụkụ Akwụkwọ Nsọ ahụ na-akpali iche echiche. Chetụdị n’echiche, ọ bụrụ na anyị dị njikere ịnakwere ihe ịma aka ahụ, anyị pụrụ ‘ịchọta ihe ọmụma Chineke’! Nke ahụ bụ mmụta kasịnụ n’ezie.
[Igbe dị na peeji nke 13]
Nne nke Nwere Obi Ụtọ
Otu onye nkụzi nọ na New York City natara akwụkwọ ozi na-esonụ:
“Ọ ga-amasị m ikele gị site n’ala ala obi m maka ihe i mewooro ụmụ m. Site ná nchebara echiche gị, obiọma gị, na nkà gị, i nyeworo ha aka iru ọ̀tụ̀tụ̀ dị elu bụ́ nke m ji n’aka na ha agaraghị eru ma e wezụga gị. I mewo ka m jiri ụmụ m na-anya isi—ahụmahụ m na-agaghị echefu echefu ma ọlị. Abụ m, S. B.”
Ọ̀ dị onye nkụzi ị maara ị pụrụ ịgba ume?
[Foto dị na peeji nke 12]
‘Ọ na-enye nnọọ obi ụtọ ịhụ ka anya ụmụ akwụkwọ gbukepụrụ n’ihi na ha aghọtawo otu isiokwu.’—GIULIANO, ỊTALI
[Foto ndị dị na peeji nke 13]
‘Ọ bụ ihe na-enye nnọọ afọ ojuju mgbe nwa akwụkwọ wepụtara oge iji dee akwụkwọ ozi ekele.’—CONNIE, AUSTRALIA