Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ọrụ Nkụzi—Ihe Ọ Na-ewe na Ihe Ize Ndụ Ndị Dị na Ya

Ọrụ Nkụzi—Ihe Ọ Na-ewe na Ihe Ize Ndụ Ndị Dị na Ya

Ọrụ Nkụzi—Ihe Ọ Na-ewe na Ihe Ize Ndụ Ndị Dị na Ya

“A na-atụ anya ihe dị nnọọ ukwuu n’aka ndị nkụzi, ma ndị ọkà nkụzi a ji ọrụ ha akpọrọ ihe na-enwetakarị obere ịja mma n’aka ọha na eze . . . maka mgbalị ha.”—Ken Eltis, Mahadum Sydney, Australia.

AGHAGHỊ ikweta na ‘ọrụ a kasị mkpa,’ dị ka a na-akpọ ya, nwere ọtụtụ nsogbu—site n’ụgwọ ọnwa na-adịghị ezu ezu ruo n’ọnọdụ ndị jọgburu onwe ha nke ọnụ ụlọ klas; site n’oké ide ihe ruo na klas ndị ụmụ akwụkwọ karịrị akarị na ha; site n’enweghị nkwanye ùgwù na ime ihe ike ruo n’àgwà nke ọ gbasaghị m nke ndị mụrụ ụmụ. Olee otú ụfọdụ ndị nkụzi si eme ihe banyere nsogbu ndị a?

Enweghị Nkwanye Ùgwù

Anyị jụrụ ndị nkụzi anọ si New York City ihe ha chere bụ́ nsogbu ndị bụ́ isi. Ha nile zachara, sị: “Enweghị nkwanye ùgwù.”

Dị ka William, bụ́ onye Kenya si kwuo, ihe agbanweekwala n’akụkụ a n’Africa. O kwuru, sị: “Ụmụaka na-abụwanye ndị na-adịghị akpa ezi àgwà. Mgbe m na-eto eto [ọ dị afọ 40 na ụma ugbu a], ndị nkụzi so ná ndị a na-akwanyere ùgwù karịsịa n’Africa. Ma ndị na-eto eto ma ndị okenye na-ele onye nkụzi anya dị ka onye nlereanya. Nkwanye ùgwù a na-ebelata ebelata. Ọdịbendị nke Ebe Ọdịda Anyanwụ Ụwa ji nwayọọ nwayọọ emetụta ndị na-eto eto, ọbụna n’ime ime obodo Africa. Ihe nkiri sịnịma, vidio, na akwụkwọ ọgụgụ dị iche iche na-egosi enweghị nkwanye ùgwù nye ịbụisi dị ka ịkpa ike.”

Giuliano, bụ́ onye na-akụzi ihe n’Ịtali, kwara arịrị, sị: “Àgwà nnupụisi zuru ọha mmadụ nile na-emetụta ụmụaka.”

Ọgwụ Ọjọọ na Ime Ihe Ike

Ọ dị mwute na ọgwụ ọjọọ aghọwo nsogbu n’ụlọ akwụkwọ dị iche iche—ruo n’ókè nke na onye nkụzi na onye na-ede akwụkwọ bụ́ onye United States bụ́ LouAnne Johnson dere, sị: “Igbochi iji ọgwụ ọjọọ eme ihe bụ akụkụ nke ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ usoro ihe ọmụmụ ụlọ akwụkwọ ọ bụla, malite n’ụlọ akwụkwọ ọta akara. [Ọ bụ anyị dere okwu ụfọdụ n’aka akwụkwọ dị iche.] Ụmụaka maara banyere ọgwụ ọjọọ . . . karịa nnọọ ka ọnụ ọgụgụ ka ukwuu nke ndị toworo eto maara.” Ọ na-agbakwụnye, sị: “Ụmụ akwụkwọ ndị na-enwe mmetụta nke ịbụ ndị na-enweghị obi ike onwe onye, ndị a na-ahụghị n’anya, ndị owu na-ama, ndị ihe na-agbụ, ma ọ bụ ndị na-anọghị ná nchebe yikarịrị ka hà ga-anwale iji ọgwụ ọjọọ eme ihe.”—Two Parts Textbook, One Part Love.

Ken, bụ́ onye nkụzi nọ n’Australia jụrụ, sị: “Olee otú ndị nkụzi anyị ga-esi na-akụziri onye dị afọ itoolu nke nne na nna ya dubara n’iji ọgwụ ọjọọ eme ihe, wee bụrụzie onye ọgwụ ọjọọ riri ahụ́, ihe?” Michael, bụ́ onye dị afọ 30 na ụma, na-akụzi ihe n’otu ụlọ akwụkwọ sekọndrị dị na Germany. Ọ na-ede, sị: “Banyere iji ọgwụ ọjọọ eme ihe, anyị maara nke ọma na ọ na-eme eme; ọ na-esi nnọọ ike ka a chọpụta ya.” O kwukwara banyere enweghị nkwanye ùgwù ma kwuo na ọ “na-apụta ìhè n’àgwà ibibi ihe nke ụmụ akwụkwọ,” na-agbakwụnye, sị: “A na-etetọcha tebụl na ahụ́ ájá, na-ebibikwa tebụl na oche. Ndị uwe ojii ejidetụwo ụfọdụ n’ime ụmụ akwụkwọ m maka ntụtụaka n’ụlọ ahịa ma ọ bụ ihe ndị yiri ya. Ka a sịkwa ihe mere e ji ezukarịkwa ohi n’ụlọ akwụkwọ!”

Amira na-akụzi ihe na Guanajuato State, Mexico. Ọ na-ekweta, sị: “Anyị na-eche nsogbu nke ime ihe ike na iri ahụ́ nke ọgwụ ọjọọ n’ezinụlọ ihu, bụ́ ndị na-emetụta ụmụaka kpọmkwem. Ha nọ nnọọ na gburugburu ebe ha na-amụta asụsụ rere ure na àgwà ọjọọ ndị ọzọ. Otu nnukwu nsogbu ọzọ bụ ịda ogbenye. N’agbanyeghị na a dịghị akwụ ụgwọ akwụkwọ n’ebe a, ndị mụrụ ụmụ aghaghị ịzụta akwụkwọ ide ihe, mkpịsị akwụkwọ, na ihe ndị ọzọ. Ma a ga-ebugodịnụ ụzọ rie nri.”

Égbè n’Ụlọ Akwụkwọ?

Na United States, égbè ndị a gbara n’ụlọ akwụkwọ na nso nso a emewo ka ọ pụta ìhè na ime ihe ike ndị e ji égbè eme abụghị obere nsogbu n’ala ahụ. Otu akụkọ na-ekwu, sị: “A na-eme atụmatụ na a na-ewebata égbè 135,000 n’ụlọ akwụkwọ ọha na eze dị 87,125 bụ́ ndị dị ná mba ahụ kwa ụbọchị. Iji belata ọnụ ọgụgụ égbè a na-ewebata n’ụlọ akwụkwọ dị iche iche, ndị isi ụlọ akwụkwọ na-eji ngwá ọrụ electronic ndị na-achọpụta ihe ndị e ji ígwè mee eme ihe, jirikwa kamera ndị e ji eledo ndị mmadụ, nkịta ndị a zụrụ n’ụzọ pụrụ iche iji imi nụta ísìsì égbè, inyocha oche ụmụ akwụkwọ, kaadị e ji amata mmadụ, nakwa ịmachibido ibubata akpa akwụkwọ n’ụlọ akwụkwọ eme ihe.” (Teaching in America) Ihe ndị dị otú ahụ a na-eme maka nchebe na-eme ka mmadụ jụọ, sị, Ànyị na-ekwu banyere ụlọ akwụkwọ ka ọ̀ bụ ụlọ mkpọrọ? Akụkọ ahụ na-agbakwụnye na a chụwo ihe karịrị ụmụ akwụkwọ 6,000 n’ihi iji égbè aga ụlọ akwụkwọ!

Iris, bụ́ onye nkụzi nọ na New York City, gwara Teta!, sị: “Ụmụ akwụkwọ na-ezobata ngwá ọgụ n’ụlọ akwụkwọ. Ngwá electronic ndị ahụ bụ́ ndị na-achọpụta ihe ndị e ji ígwè mee adịghị eme ka a ghara iwebata ngwá ọgụ. Imebisi ihe n’ụlọ akwụkwọ bụ nsogbu ọzọ bụ́ isi.”

Ọ bụ n’ụdị ebe a a na-enweghị ụkpụrụ nchịkwa ka ndị nkụzi ji ọrụ ha akpọrọ ihe na-adọga iji kụzie ihe ọmụma na ụkpụrụ ọma. Ka a sịkwa ihe mere ọtụtụ ndị nkụzi ji ada mbà n’obi ma na-enwe oké ike ọgwụgwụ. Rolf Busch, bụ́ onyeisi nke Òtù Ndị Nkụzi na Thuringia, Germany, kwuru, sị: “Ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ otu ụzọ n’ụzọ atọ nke otu nde ndị nkụzi nọ na Germany na-ada ọrịa n’ihi nchekasị. Ha na-enwe oké ike ọgwụgwụ n’ọrụ ha.”

Ụmụaka Inwe Ụmụ

Nsogbu ọzọ bụ́ isi bụ inwe mmekọahụ nke ndị nọ n’oge uto. George S. Morrison, bụ́ onye dere akwụkwọ bụ́ Teaching in America, kwuru banyere ala ahụ, sị: “Ihe dị ka 1 nde ndị nọ n’afọ iri na ụma (pasent 11 nke ụmụ agbọghọ dị afọ 15 ruo 19) na-atụrụ ime kwa afọ.” United States nwere ọnụ ọgụgụ kasị elu nke ndị nọ n’afọ iri na ụma na-atụrụ ime ná mba nile mepere emepe.

Iris kwadoro ịbụ eziokwu nke ọnọdụ a, o kwuru, sị: “Nanị ihe ndị nọ n’afọ iri na ụma na-ekwu banyere ha bụ mmekọahụ na nnọkọ mkpori ndụ. Ọ na-agba ha ka ara. Ugbu a, anyị nwere Internet n’ime kọmputa ụlọ akwụkwọ anyị! Nke ahụ pụtara na ha ga na-enweta ìgwè nkwurịta okwu na ihe ndị na-akpali agụụ mmekọahụ n’Internet.” Angel, bụ́ onye si Madrid, Spen, kọrọ, sị: “Inwe mmekọahụ aghara aghara bụ ihe na-eme eme n’etiti ụmụ akwụkwọ. E nwewo ụmụ akwụkwọ ndị ka dị nnọọ obere tụụrụ ime.”

“Ndị Oku Nwa nọ n’Ọkwá Dị Elu”

Mkpesa ọzọ ụfọdụ ndị nkụzi na-eme bụ na ọtụtụ ndị mụrụ ụmụ adịghị eburu ibu ọrụ ha bụ́ ịkụziri ụmụ ha ihe n’ụlọ. Ndị nkụzi na-eche na ndị mụrụ ụmụ kwesịrị ịbụ ndị nkụzi mbụ nke ụmụ ha. Ezi àgwà kwesịrị ịmalite n’ụlọ. Ka a sịkwa ihe mere Sandra Feldman, bụ́ onyeisi nke Òtù Ndị Nkụzi n’America, ji kwuo na “ọ dị mkpa ka a na-emeso ndị nkụzi . . . dị ka a na-emeso ndị ọkachamara ndị ọzọ, ọ bụghịkwa dị ka ndị oku nwa nọ n’ọkwá dị elu.”

Mgbe mgbe ndị mụrụ ụmụ adịghị akwado ịdọ aka ná ntị a na-enye n’ụlọ akwụkwọ. Leemarys, bụ́ onye e hotara ihe o kwuru n’isiokwu bu ụzọ, gwara Teta!, sị: “Ọ bụrụ na i kpesara onyeisi ụlọ akwụkwọ banyere ụmụaka na-enupụ isi, tupu ị mara ihe na-emenụ, ndị mụrụ ha awakpowala gị!” Busch, bụ́ onye e hotara ihe o kwuru na mbụ, kwuru banyere ịchịkwa ụmụ akwụkwọ dị isi ike, sị: “Ọzụzụ ezinụlọ na-apụzi n’anya. Ị pụghịzi iche na ọnụ ọgụgụ ka ukwuu nke ụmụaka si n’ezinụlọ e nyere ha nnọọ nzụlite dị mma.” Estela, bụ́ onye si Mendoza, Argentina, kwuru, sị: “Anyị bụ́ ndị nkụzi na-atụ ụmụ akwụkwọ ụjọ. Ọ bụrụ na anyị enye ha akara mmụta dị ala, ha na-atụ anyị okwute ma ọ bụ wakpoo anyị. Ọ bụrụ na anyị nwere ụgbọala, ha ebibie ya.”

Ọ̀ bụ ihe ijuanya na n’ọtụtụ mba e nwere ụkọ ndị nkụzi? Vartan Gregorian, bụ́ onyeisi nke Ụlọ Ọrụ Carnegie dị na New York, dọrọ aka ná ntị, sị: “Ụlọ akwụkwọ anyị ndị dị na [United States] a ga-achọ ihe ruru ndị nkụzi ọhụrụ dị nde 2.5 n’ime afọ iri na-abịanụ.” Obodo ukwu ndị bụ́ isi “na-achọsi ndị nkụzi si India, West Indies, South Africa, Europe na ebe ọ bụla ọzọ a pụrụ ịhụ ezi ndị nkụzi ike.” N’ezie, nke a pụtara na ebe ndị ahụ pụkwara inwe ụkọ ndị nkụzi.

N’ihi Gịnị Ka E Ji Enwe Ụkọ Ndị Nkụzi?

Yoshinori, bụ́ onye nkụzi na Japan nke kụziworo ihe ruo afọ 32, kwuru na “ọrụ nkụzi bụ nnukwu ọrụ nke nwere ezi ihe mkpali, ndị Japan na-akwanyekwara ya ùgwù dị ukwuu.” N’ụzọ dị mwute, ọ bụghị otú ahụ ka ọ dị n’ọdịbendị nile. Gregorian, bụ́ onye e hotara ihe o kwuru ná mbụ, kwukwara na ‘a naghị akwanyere ndị nkụzi ùgwù kwesịrị ọrụ ha, ha adịghị enweta nlebara anya na ihe iti aka n’obi. . . . N’ihe ka ukwuu na steeti ndị dị na [United States], a na-akwụ ndị nkụzi ụgwọ dị ala karịa ndị ọzọ na-arụ ọrụ ndị chọrọ akara ugo mmụta bachelor ma ọ bụ master.”

Ken Eltis, bụ́ onye e hotara ihe o kwuru ná mmalite, dere, sị: “Gịnị ga-eme ma ọ bụrụ na ndị nkụzi achọpụta na a na-akwụ ndị na-arụ ọtụtụ ọrụ chọrọ akara mmụta ka ala nnukwu ụgwọ karịa ka a na-akwụ ndị nkụzi? Ma ọ̀ bụ mgbe a na-akwụ ụmụ akwụkwọ ha kụziiri ihe nanị ọnwa iri na abụọ gara aga . . . ụgwọ ugbu a karịa ha ma ọ bụ ọbụna yie ka à ga-akwụ ha ụgwọ karịa ha n’afọ ise na-abịa abịa? Nchọpụta dị otú ahụ ga-emetụtarịrị ùgwù onwe onye nke onye nkụzi.”

William Ayers dere, sị: “A na-akwụ ndị nkụzi ụgwọ dị nta . . . A na-akwụ anyị ná nkezi, otu ụzọ n’ụzọ anọ nke ihe a na-akwụ ndị ọkàiwu, ọkara nke ihe a na-akwụ ndị nhazi ego, ihe dị ala karịa ihe a na-akwụ ndị na-anya gwongworo na ndị na-arụ ọrụ n’ọdụ ụgbọ mmiri. . . . Ọ dịghị ọrụ ọzọ na-achọ nnọọ ihe dị ukwuu n’aka mmadụ ma bụrụ nke a na-akwụ nnọọ ego dị nta na ya ka ọrụ nkụzi.” (To Teach—The Journey of a Teacher) N’otu isiokwu ahụ, Janet Reno, onye bụbu ọkaikpe ukwu nke mba United States, kwuru na November 2000, sị: “Anyị pụrụ iziga ndị mmadụ n’ọnwa. . . . Anyị na-akwụ ndị na-emere anyị egwuregwu nnukwu ụgwọ. Gịnị mere na anyị apụghị ịkwụ ndị nkụzi anyị ụgwọ?”

“N’ozuzu ya, a na-akwụ ndị nkụzi ụgwọ dị nta,” ka Leemarys kwuru. “N’agbanyeghị ọtụtụ afọ m gụrụ akwụkwọ, a ka na-akwụ m nanị obere ego kwa afọ na New York City ebe a, n’agbanyeghị nrụgide na nsogbu ndị na-esite n’ụdị ndụ dị n’obodo ukwu.” Valentina, bụ́ onye nkụzi na St. Petersburg, Russia, kwuru, sị: “Ọrụ onye nkụzi bụ nke a na-adịghị eji akpọrọ oké ihe ma a bịa n’ihe banyere ụgwọ a na-akwụ. Ihe a na-akwụ ha anọwo na-abụ nke kasị nnọọ ala.” Marlene, bụ́ onye si Chubut, Argentina, chekwara otú ahụ: “Ụgwọ ọnwa dị ala na-amanye anyị ịrụ ọrụ n’ebe abụọ ma ọ bụ atọ, na-agbagharị site n’otu ebe gaa n’ọzọ. Nke a na-ebelata ịdị irè anyị n’ezie.” Arthur, bụ́ onye nkụzi si Nairobi, Kenya, gwara Teta! sị: “N’ihi ọnọdụ akụ̀ na ụba na-adịwanye njọ, ndụ m dị ka onye nkụzi abụbeghị nke dị mfe. Dị ka ọtụtụ n’ime ndị ọrụ ibe m ga-ekweta, ụgwọ ọnwa dị ala anọgidewo na-egbochi ndị mmadụ ịhọrọ ọrụ anyị.”

Diana, bụ́ onye nkụzi si New York City, mere mkpesa banyere oké ide ihe bụ́ nke na-ewe ihe ka ukwuu n’oge nke ndị nkụzi. Otu mkpesa a na-emekarị bụ: “Fọm ndị a ga-edejupụta, fọm ndị na-enweghị isi—n’ụbọchị nile.”

Ndị Nkụzi Ezughị Ezu, Ụmụ Akwụkwọ Karịrị Akarị

Berthold, bụ́ onye si Düren, Germany, kwupụtara mkpesa ọzọ a na-emekarị: “Klas na-ebu nnọọ ibu! Ụfọdụ n’ebe a nwere ihe ruru ụmụ akwụkwọ 34. Nke a pụtara na anyị apụghị ilebara ụmụ akwụkwọ nwere nsogbu anya. A dịghị ahụ ha. A na-eleghara mkpa ha nwere n’otu n’otu anya.”

Leemarys, bụ́ onye e hotara ihe o kwuru ná mbụ, kọwara, sị: “N’afọ gara aga, nsogbu kasịnụ m nwere, e wezụga ndị nne na nna na-akpa àgwà ọ gbasaghị m, bụ na m nwere ụmụaka 35 na klas m. Chetụdịnụ n’echiche ịnwa ịkụziri ụmụaka 35 dịcha afọ isii ihe!”

Iris kwuru, sị: “N’ebe a na New York, e nwere ụkọ ndị nkụzi, karịsịa ndị na-akụzi mgbakọ na mwepụ na sayensị. Ha pụrụ inweta ọrụ ndị ka mma ebe ọzọ. N’ihi ya, obodo ukwu ahụ akpọtala ọtụtụ ndị nkụzi si ná mba ọzọ.”

N’ụzọ doro anya, ọrụ nkụzi bụ ọrụ na-achọ ihe dị ukwuu n’aka mmadụ. Gịnịzi na-anọgide na-akpali ndị nkụzi? N’ihi gịnị ka ha na-eji anọgidesi ike na ya? Isiokwu ikpeazụ anyị ga-atụle ajụjụ ndị a.

[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 9]

A na-eme atụmatụ na a na-eji égbè dị 135,000 aga ụlọ akwụkwọ ndị dị na United States kwa ụbọchị

[Igbe/Foto dị na peeji nke 10]

Gịnị Na-eme Mmadụ Ezigbo Onye Nkụzi?

Olee otú ị ga-esi akọwa ezigbo onye nkụzi? Ọ̀ bụ onye pụrụ ịzụlite ikike ncheta nwata nke na ọ pụrụ iburu ihe n’isi ma gafee ule? Ka ọ̀ bụ onye na-akụziri mmadụ ịjụ ajụjụ, iche echiche, na ịtụgharị uche? Ọ̀ bụ onye na-enyere nwata aka ịghọ ezi nwa amaala?

“Mgbe anyị bụ́ ndị nkụzi ghọtara na anyị na ụmụ akwụkwọ anyị na-emekọ ogologo njem dị mgbagwoju anya nke ndụ, mgbe anyị malitere iji nkwanye ùgwù na nsọpụrụ ruuru ha na-emeso ha dị ka mmadụ, mgbe ahụ anyị nọ n’ụzọ na-eduga n’ịghọ ndị nkụzi ruru eru. Ọ dị nnọọ mfe—taakwa akpụ.”—To Teach—The Journey of a Teacher.

Ezigbo onye nkụzi na-aghọta ihe nwa akwụkwọ ọ bụla ga-emeli ma mara otú ọ ga-esi mee ka o nwee ọganihu. William Ayers kwuru, sị: “Anyị aghaghị ịchọta ụzọ ka mma, ụzọ na-ewulite ikike, ahụmahụ, na nkà dị iche . . . Ọ na-echetara m arịrịọ otu nne bụ́ onye American India, bụ́ onye a kpọrọ nwa ya nwoke dị afọ ise ‘onye na-adịghị ngwa n’ịmụta ihe,’ rịọrọ, sị: ‘Wind-Wolf maara aha ihe karịrị nnụnụ iri anọ nakwa otú ha si abanye ná mba ọzọ. Ọ maara na a na-enwe ábụ́bà iri na atọ n’ọdụdụ ugo gbasara nku ya nke ọma. Ihe dị ya mkpa bụ onye nkụzi nke maara ihe ọ ga-emeli.’”

Iji nweta ihe kasịnụ n’ebe nwata nke ọ bụla nọ, onye nkụzi aghaghị ịchọpụta ihe ndị na-amasị ya na ihe ndị mere o ji akpa àgwà ụfọdụ. Onye nkụzi jikwa ọrụ ya akpọrọ ihe aghaghị inwe mmasị n’ebe ụmụaka nọ.

[Ebe E Si Nweta Foto]

Mba Ndị Dị n’Otu/Foto Saw Lwin sere

[Igbe dị na peeji nke 11]

Ịmụ Ihe Ọ̀ Ga Na-abụ Ihe Mkpori Ndụ Mgbe Nile?

Onye nkụzi bụ́ William Ayers depụtara echiche iri na-ezighị ezi e nwere banyere nkụzi. Otu n’ime ha bụ: “Ezigbo ndị nkụzi na-eme ka ịmụ ihe bụrụ ihe mkpori ndụ.” Ọ gara n’ihu ikwu, sị: “Mkpori ndụ na-adọpụ uche, na-atọ ọchị. Ndị na-eme ihe ọchị bụ ndị na-eme ihe mkpori ndụ. Ihe ọchị pụrụ ịbụ ihe mkpori ndụ. Ịmụ ihe pụrụ ime ka e jiri uche na-eme ihe, ime ka e tinye obi dum n’ihe, ịbụ ihe dị ịtụnanya, ihe na-agbagwoju anya, nakwa ihe na-adịkarị nnọọ ụtọ. Ọ bụrụ na ọ bụ mkpori ndụ, ọ dịnụ mma. Ma ọ dịghị mkpa na ọ ga-abụ ihe mkpori ndụ.” Ọ gbakwụnyere, sị: “Ọrụ nkụzi chọrọ ọ̀tụ̀tụ̀ dị ukwuu nke ihe ọmụma, ikike, nkà, na nghọta—nke kasịkwa mkpa, ọ chọrọ onye na-echebara ndị mmadụ echiche.”—To TeachThe Journey of a Teacher.

Sumio, bụ́ onye bi na Nagoya City, Japan, na-ahụ nsogbu a n’etiti ụmụ akwụkwọ ya: “Ọtụtụ ụmụ akwụkwọ ndị nọ na kọleji enweghị mmasị ọ bụla n’ihe ọ bụla ma e wezụga n’ikpori ndụ na ime ihe na-adịghị achọ itinye mgbalị ọ bụla.”

Rosa, bụ́ onye ndụmọdụ ụmụ akwụkwọ si Brooklyn, New York, kwuru, sị: “Àgwà zuru ebe nile nke ụmụ akwụkwọ bụ na ịmụ ihe na-agbụ agbụ. Onye nkụzi na-agbụ agbụ. Ha chere na ihe nile kwesịrị ịbụ ihe mkpori ndụ. Ha adịghị echeta na ihe ị ga-enweta site n’ịmụ ihe dabeere ná mgbalị i tinyere na ya.”

Inwe mmasị gabigara ókè ná mkpori ndụ na-eme ka o sikwuoro ndị na-eto eto ike ime mgbalị na ịchụ ihe n’àjà. Sumio, bụ́ onye e hotara ihe o kwuru n’elu, kwuru, sị: “Ihe bụ́ isiokwu bụ na ha apụghị ịmata ihe ga-emetụta ọdịnihu ha. E nwere nnọọ nanị ụmụ akwụkwọ kọleji ole na ole bụ́ ndị na-eche na ọ bụrụ na ha arụsie ọrụ ike ugbu a iji nweta otu ihe, ọ ga-abara ha nnọọ uru n’ọdịnihu.”

[Foto dị na peeji nke 7]

DIANA, U.S.A.

[Foto dị na peeji nke 8]

‘A na-eji ọgwụ ọjọọ eme ihe n’ebe nile ma ọ na-esi nnọọ ike ka a chọpụta ya.’—MICHAEL, GERMANY

[Foto dị na peeji nke 8]

“Anyị na-eche nsogbu nke ime ihe ike na iri ahụ́ nke ọgwụ ọjọọ n’ezinụlọ ihu.”—AMIRA, MEXICO

[Foto dị na peeji nke 9]

“Ọ dị mkpa ka a na-emeso ndị nkụzi . . . dị ka a na-emeso ndị ọkachamara ndị ọzọ, ọ bụghịkwa dị ka ndị oku nwa nọ n’ọkwá dị elu.”—SANDRA FELDMAN, ONYEISI ÒTÙ NDỊ NKỤZI NKE AMERICA