Echiche Ziri Ezi Banyere Ọrụ
Echiche Ziri Ezi Banyere Ọrụ
OTU onye soja na-anụ ọkụ n’obi n’ọrụ ya rụrụ ọrụ gafee mgbe ha ji enwe nkwụsịtụ maka nri ehihie iji rụchaa ọrụ ọga ya chọrọ ngwa ngwa. Mgbe ndị ọrụ ibe ya si nri ehihie lọta, ha hụrụ ya ka ọ dakwasịrị n’ọrụ ahụ dị n’elu tebụl ya—nwụọ.
N’ihe na-erughị awa abụọ mgbe e mesịrị, ọ tụrụ ndị ọfịsa ibe ya n’anya mgbe ọga ha kpọrọ na fon ma kwuo, sị: “Ihe mere ——— dị mwute, ma achọrọ m onye ga-anọchi ya ka ọ na-erule ụtụtụ echi!” Nke a mere ka ndị na-ahụ ihe na-emenụ chewa, sị, Ọ̀ bụ nanị ịrụ ọrụ ka ọfịsa a bara uru ya n’anya ọga ya?
Ahụmahụ a mere eme na-egosipụta otu ihe na-emenụ—na ihe a na-ejikarị atụ uru mmadụ bara bụ nanị ihe ọ na-arụpụtara onye were ya n’ọrụ. Nke a pụrụ ime ka mmadụ jụọ, sị: M̀ dị ndụ ịrụ ọrụ, ka m na-arụ ọrụ iji dịrị ndụ? Olee akụkụ nke ndụ m ndị m na-achụ n’àjà maka ọrụ m?
Ime Nhọrọ Ndị Amamihe Dị na Ha
Abụọ n’ime nhọrọ ụfọdụ ndị na-ele anya dị ka ndị kasị mkpa ná ndụ bụ ndị a na-eme ngwa ngwa—nhọrọ nke onye òtù ọlụlụ na nhọrọ nke ọrụ. Ma ọrụ ma alụmdi na nwunye bụbu ihe ndị a na-ele anya dị ka ndị na-adịgide adịgide. Ya mere, a na-eji nlezianya echebara nke ọ bụla n’ime ha echiche tupu e mee nhọrọ. Mgbe mgbe, a na-achọ ndụmọdụ site n’aka ndị enyi meworo okenye ma ọ bụ n’aka ndị nne na nna.
Otú ọ dị, n’ụbọchị ndị a, o yiri ka ọtụtụ ndị hà na-ahọrọ onye òtù ọlụlụ na-adabere kpam kpam ná mma elu ahụ́, na-eche na ọ bụrụ na ihe agazighị otú ha si chọọ, ha pụrụ ịchọ onye ọzọ. N’otu aka ahụ, ọtụtụ ndị na-ahọrọ ọrụ na-adabere
n’ụzọ bụ́ isi n’ihe ha weere dị ka ihe ndọrọ dị na ya, n’atụleghị ihe ndị na-adịghị mma pụrụ isi na ya pụta. Ma ọ bụkwanụ ma ọ dịghị ihe ọzọ, ha na-eleghara ihe ndị na-adịghị mma pụrụ isi na ya pụta anya site n’iche, sị, ‘Apụrụ m ịhụ maka ha.’N’ụzọ dị mwute, ndị inyom bi ná mba ndị dara ogbenye karị na-azaghachikarị ná mkpọsa ndị na-akpali akpali a na-eme maka ọrụ ndị na-ekwe nkwa ụzọ ndụ na-adọrọ adọrọ n’ebe ọzọ. Otú ọ dị, ha ruo ná mba ahụ, a na-akpọgakarị ha n’ụlọ ndị akwụna bụ́ ebe ndụ ha dị ka ndị akwụna na-adị njọ karịa ndụ ha nọ na-ebi tupu mgbe ahụ. Ụdị ajọ ịgba ohu ọgbara ọhụrụ a bụ “ihe otiti nke na-agaghị akwụsị akwụsị,” dị ka otu isiokwu nke magazin bụ́ World Press Review si kwuo.
À pụkwara ịraba ndị mmadụ n’ịnakwere ọrụ dị mma ma ha emesịa nọrọzie dị ka ohu? Ihe a emewo eme! Dị ka ihe atụ, ụlọ ọrụ ụfọdụ na-enye ihe ndị oké ozu dị ịrịba ama maka ọdịmma ndị ọrụ ha. Ndị a pụrụ ịgụnye ọnụ ụlọ iri ihe nke ezinụlọ na ndị enyi ga-eji na-eme ihe, ibu ha n’ụgbọala n’efu na ịsara ha ákwà ha, inwe ndị dọkịta ezé n’ụlọ ọrụ ha, iji ebe mmega ahụ́ eme ihe n’efu, na inye nkwado ego maka iri ihe n’ụlọ nri ndị dị oké ọnụ.
“Otu ụlọ ọrụ kwụrụ ọbụna ụlọ ọrụ na-elekọta ndị na-eyi oge mkpapụ ụgwọ maka ndị ọrụ ha rụbigara ọrụ ókè,” ka odeakụkọ bụ́ Richard Reeves na-akọ. Ma kpachara anya! Ọ na-akọwa, sị: “Ụlọ ọrụ ndị a na-ewepụta atụmatụ ndị ga-eme ka ndụ ka mma, nanị n’otu ọnọdụ—na ị ga-ekwe ka ha na-achịkwa ndụ gị; na ị ga na-arụ ọrụ awa 18 n’ụbọchị nakwa ná ngwụsị izu, na-eri nri, na-enwe mmega ahụ́, na-egwurị egwu, ọbụna na-ehi n’ọfịs iji rụọ ọrụ mgbe ọ bụla a chọrọ gị.”
Ịhọrọ Ọrụ Ọzọ Ka Mma
Otu ilu ochie na-ekwu, sị: “Ọ dịịrị nkịta dị ndụ mma karịa ọdụm nwụrụ anwụ.” (Eklisiastis 9:4) Ilu dị otú ahụ na-ewelite ajụjụ bụ́, Èkwesịrị m iji ndụ m ma ọ bụ ahụ́ ike m chụọ àjà maka ọrụ m? Ná nzaghachi, ọtụtụ ndị atụleghachiwo ọnọdụ ha ma hụ ụzọ ha ga-esi na-egbo mkpa onwe ha nke ọma—nakwa nke ezinụlọ ha ma ọ bụrụ na ha nwere—tinyekwara ibi ndụ obi ụtọ nke nwere nzube.
N’eziokwu, ime otú ahụ na-achọkarị imeru ihe
n’ókè, ọ pụkwara ịchọ mmadụ ịmata ihe ndị dị ya mkpa n’ezie, kama ịbụ ihe ndị na-adịghị mkpa bụ́ ndị ọ chọrọ. Ndị na-achọ ọkwá na ùgwù pụrụ ịjụ nhọrọ ndị katụ ala, ọbụna ha pụrụ ile ndị họọrọ ha anya dị ka ndị iberibe. Ma gịnị n’ezie dị mkpa ná ndụ? Ị̀ kwụsịtụwo na nso nso a ma chebara nke a echiche?Eze Solomọn maara ihe, bụ́ onye dere ilu ahụ e hotara n’elu, nwere nnọọ ihe onwunwe karịa ma eleghị anya mmadụ ọ bụla ọzọ. Ma n’ikwu ihe dị mkpa n’ezie n’ụzọ dị nkenke, o dere n’ike mmụọ nsọ Chineke, sị: “Ka anyị nụrụ nkwubi okwu a nile: tụọ egwu Chineke, debekwa ihe nile O nyere n’iwu; n’ihi na nke a bụ ọrụ mmadụ nile.”—Eklisiastis 12:13.
N’otu oge ahụ, Solomọn ji ọrụ kpọrọ ihe. ‘Ọ dịghị ihe ka mma,’ ka o dere, ‘karịa ka mmadụ na-eri ihe na-aṅụkwa ihe ọṅụṅụ, na-emekwa ka mkpụrụ obi ya hụ ezi ihe n’ime ndọgbu nke ọ na-adọgbu onwe ya n’ọrụ.’ (Eklisiastis 2:24) N’otu aka ahụkwa, Jizọs Kraịst, bụ́ Solomọn ahụ Ka Ukwuu, ji ọrụ kpọrọ ihe, dịkwa ka Nna ya nke eluigwe ji ọrụ kpọrọ ihe. “Nna m anọgidewo na-arụ ọrụ ruo ugbu a, anọgidewokwa m na-arụ ọrụ,” ka Jizọs kọwara.—Jọn 5:17; Matiu 12:42.
Ma, ka ọ dị ugbu a, afọ ndụ mmadụ dị mkpirikpi. (Abụ Ọma 90:10) Ma Kraịst maara na a ga-enwe ndụ na-adịgide adịgide n’elu ụwa n’okpuru ịchịisi Alaeze ahụ, bụ́ nke ọ kụziiri ụmụazụ ya ikpe ekpere maka ya. Ọ bụ ya mere o ji gbaa ume n’Ozizi Elu Ugwu ya a ma ama, sị: “Ya mere, nọgidenụ buru ụzọ na-achọ alaeze ahụ na ezi omume [Chineke], a ga-atụkwasịkwara unu ihe ọzọ ndị a nile.”—Mat. 6:9, 10, 33.
Bible na-ekwe nkwa ndụ n’okpuru Alaeze ahụ, sị: “Ha ga-ewukwa ụlọ, biri n’ime ha; ha ga-akụkwa ubi vaịn, rie mkpụrụ ha. Ha agaghị ewu ụlọ, onye ọzọ ebichie; . . . ndị M họpụtaworo ga-enwekwa ihe aka ha rụtara mgbe dị anya nke ukwuu.”—Aịsaịa 65:21, 22.
Lee atụmanya magburu onwe ya nke a bụ—ịnụ ụtọ ndụ ebighị ebi bụ́ nke gụnyere ọrụ bara uru bụ́ nke na-enye afọ ojuju! Iji nlezianya tụlee ọnọdụ anyị onwe anyị taa pụrụ ikpughe na ọ dị anyị mkpa ịtụleghachi akụkụ ụfọdụ nke ọrụ anyị taa iji zere ihe ize ndụ ụfọdụ pụrụ imetụta n’ụzọ dị njọ ohere anyị nwere inweta “ndụ ahụ nke bụ́ ndụ n’ezie”—ndụ n’ọdịnihu n’okpuru Alaeze Chineke. (1 Timoti 6:19) Ya mere, ka anyị gosipụta n’ọrụ anyị, ma ọ bụ n’ihe ọ bụla anyị na-eme, na anyị na-akwanyere Onye nyere anyị ndụ ùgwù.—Ndị Kọlọsi 3:23.
[Foto ndị dị na peeji nke 22, 23]
N’okpuru Alaeze Chineke, ndị mmadụ ga-arụ ọrụ dị nchebe ma na-enye afọ ojuju