Gịnịkwanụ Ma M Zute Onye M Maara n’Ụlọ Akwụkwọ?
Ndị Na-eto Na-ajụ Sị . . .
Gịnịkwanụ Ma M Zute Onye M Maara n’Ụlọ Akwụkwọ?
“Ịlaghachi n’ụlọ akwụkwọ na Monday siiri m nnọọ ike. A sị na otu n’ime ndị enyi m hụrụ m, m ga-echepụta akụkọ ndị a. Dị ka ihe atụ, m ga-agwa ndị enyi m na m na-anakọtara òtù ndọrọ ndọrọ ọchịchị bụ́ Labor Party ego.”—James, England.
“Ndị hụrụ m kwara m emo n’ụlọ akwụkwọ. M nwetara nrụgide dị ukwuu.”—Débora, Brazil.
GỊNỊ mere ndị ntorobịa a ji na-atụ egwu nke ukwuu banyere ịbụ ndị ndị enyi ha hụrụ? Hà na-eme ihe ụfọdụ iwu megidere? Ọ dịghị, ha na-ekere òkè n’ọrụ ùgwù kasị dịrị na ya, nke kasịkwa mkpa a na-arụ n’ụwa taa. Ha na-arụ ọrụ ahụ Jizọs nyere n’iwu mgbe ọ sịrị: “Ya mere gaanụ mee ndị nke mba nile ka ha bụrụ ndị na-eso ụzọ m, . . . na-ezi ha ka ha debe ihe nile m nyeworo unu n’iwu.”—Matiu 28:19, 20.
Dị ka otu njụta echiche e mere na United States gosiri, ihe karịrị pasent 90 nke ndị nọ n’afọ iri na ụma kwere na Chineke. Ihe dị ka ọkara na-aga chọọchị kwa izu. Ọ bụkwa ezie na ọtụtụ ndị ntorobịa na-ekere òkè n’ihe omume dị iche iche chọọchị na-akwado, dị ka iso òtù ukwe wee na-ekwe ukwe, ole na ole na-eso ụmụ akwụkwọ ibe ha ekwurịta banyere Chineke. Otú ọ dị, a ma Ndịàmà Jehova ama gburugburu ụwa maka ọrụ ime nkwusa ha site n’ọnụ ụzọ ruo n’ọnụ ụzọ. Ọtụtụ puku Ndịàmà na-eto eto na-ekere òkè n’ọrụ a.
Ọ bụrụ na ị bụ Onyeàmà na-eto eto, obi abụọ adịghị ya na gị onwe gị kwa amaliteworị ikere òkè n’ọrụ nkwusa a. Ma nke a apụtachaghị na ime ya dịịrị gị mfe otú ahụ. Dị ka ndị ntorobịa ahụ e hotara ihe ha kwuru ná mmalite, ị pụrụ ịchọpụta na echiche nke izute nwa akwụkwọ ibe gị n’ọnụ ụzọ na-akpata oké nchegbu. “Otu n’ime ihe ndị kasị jọgbuo onwe ha,” ka otu onye ntorobịa bụ́ onye Britain aha ya bụ Jennie, na-ekweta, “bụ otu n’ime ụmụ akwụkwọ ibe m ịhụ m ka m jikeere, yiri sket, buru akpa—dị mma n’anya karịa otú m na-adị n’ụlọ akwụkwọ.”
Egwu nke izute nwa akwụkwọ ibe mmadụ dị nnọọ ike nke na ụfọdụ Ndị Kraịst na-eto eto
amalitewo ịghọ aghụghọ. Otu onye ntorobịa aha ya bụ Leon na-ekwu, sị: “Ama m otu Onyeàmà na-eto eto nke na-eyi jaket nwere ihe e ji ekpuchi ihu ma ọ na-aga ozi ọma, ka o wee nwee ike iji ya kpuchie ihu ya ma ọ hụ ndị enyi ya bụ́ ụmụ akwụkwọ ibe ya.” Ma ndị ntorobịa ndị ọzọ na-ezere nnọọ ime nkwusa n’ógbè ụfọdụ. “Ana m echeta otu oge m kpere ekpere ka anyị ghara ịrụ otu okporo ámá,” ka otu onye ntorobịa aha ya bụ Simon na-echeta, “n’ihi na amaara m na ọtụtụ n’ime ụmụ akwụkwọ anyị bi na ya.”Ọ bụ ihe na-emekarị bụ́ inwe obi erughị ala banyere izute onye ị maara mgbe ị na-eme nkwusa. Otú ọ dị, ikwe ka egwu ahụ merie gị pụrụ nanị ịkpatara gị nsogbu. “Enweburu m echiche ọjọọ dị otú ahụ banyere ime nkwusa,” ka otu onye ntorobịa bụ́ onye Germany, nke aha ya bụ Alicia na-ekweta, “nke na o nwere mmetụta na-adịghị mma n’ọnọdụ ime mmụọ m.”
Otú ọ dị, gịnị mere i ji kwesị ịdị na-eme nkwusa—karịsịa ma ọ bụrụ na ọ na-esiri gị ike ime otú ahụ? N’ịza ya, ka anyị tụlee ihe mere Chineke ji nye gị ibu ọrụ a. Mgbe ahụ anyị ga-egosi otú ọ ga-esi kwe gị omume imeri egwu gị site n’itinye mgbalị na ime mkpebi siri ike.
Ibu Ọrụ nke Ime Nkwusa
Nke mbụ, ọ pụrụ inyere gị aka ịtule eziokwu ahụ bụ́ na ọ bụghị ihe ọhụrụ ma ọ bụ ihe na-atụ n’anya isoro ndị ọzọ na-ekerịta ihe ndị i kweere. Malite n’oge ochie, ndị ikom na ndị inyom na-atụ egwu Chineke emewo otú ahụ. Dị ka ihe atụ, Noa bụ onye a kasị mara amara dị ka onye wuru otu nnukwu ụgbọ. (Jenesis 6:14-16) Ma dị ka 2 Pita 2:5 si kwuo, ọ bụkwa “onye na-ekwusa ezi omume.” Noa weere ya dị ka ọrụ dịịrị ya ịdọ ndị ọzọ aka ná ntị banyere mbibi na-abịanụ.—Matiu 24:37-39.
Mgbe e mesịrị, ọ bụ ezie na e nyeghị ndị Juu iwu ndị a kapịrị ọnụ ka ha kwusaara ndị na-abụghị ndị Juu ozi ọma, ọtụtụ ndị sooro ndị ọzọ kerịta ihe ha kweere. N’ihi ya, onye ala ọzọ aha ya bụ Rut nụrụ banyere Jehova. N’inwe ekele n’ebe nne di ya bụ́ onye Juu, bụ́ Naomi nọ, Rut gwara ya, sị: “Ndị gị ga-abụ ndị m, Chineke gị ga-abụkwa Chineke m.” (Rut 1:16) E mesịa, Eze Solomọn kwuru na ọtụtụ ndị na-abụghị ndị Juu ga-abịa nụrụ “aha ukwu” Jehova ma fee ofufe n’ụlọ nsọ Ya.—1 Ndị Eze 8:41, 42.
Ugbu a ọ bụrụ na ndị ohu Chineke ndị a nke oge ochie gwara ndị ọzọ okwu—n’agbanyeghị na e nyeghị ha iwu kpọmkwem ka ha mee otú ahụ—lee ka Ndị Kraịst taa kwesịrị isi were ya karị dị ka ọrụ dịịrị ha ime nkwusa! E kwuwerị, e nyewo anyị iwu ikwusa “ozi ọma nke a nke alaeze.” (Matiu 24:14) Anyị dị ka Pọl onyeozi, n’ihi na e mewo ka anyị nwee mkpa nke ịkpọsa ozi ọma a. (1 Ndị Kọrint 9:16) Nzọpụta anyị dị nnọọ n’ihe ize ndụ. Ndị Rom 10:9, 10 na-ekwu, sị: “Ọ bụrụ na ị na-akpọsa ‘okwu ahụ n’ọnụ gị’ n’ihu ọha, na Jizọs bụ Onyenwe anyị, . . . a ga-azọpụta gị. N’ihi na mmadụ na-eji obi egosipụta okwukwe maka ezi omume, ma ọnụ ka mmadụ na-eji eme nkwupụta ihu ọha maka nzọpụta.”
Olee ebe ị pụrụ ime “nkwupụta ihu ọha” ahụ? Ọ bụ ezie na ime nkwusa mberede nwere ọnọdụ ya, ozi ụlọ n’ụlọ ka bụkwa otu n’ime ụzọ ndị kasị dị irè nke isi rute ndị ọzọ. (Ọrụ 5:42; 20:20) À gụpụrụ gị n’ikere òkè n’ọrụ a n’ihi na ị na-eto eto? Ọ dịghị ma ọlị. Bible na-enye iwu a n’Abụ Ọma 148:12, 13, sị: “Ma ụmụ okorobịa ma ụmụ agbọghọ; ndị agadi, ha na ụmụntakịrị: ka ha too aha Jehova.”
Ihe Ịma Aka nke Ikwusara Ndị Ọgbọ Mmadụ Ozi Ọma
N’eziokwu, ọ pụrụ ịbụ ihe na-eme ihere na ihe na-akpata oké nchegbu ịga ozi ọma ma zute onye gị na ya nọ n’otu ụlọ akwụkwọ. E kwuwerị, ọ bụ nanị ihe dị otú o kwesịrị bụ́ ịchọ ka ị bụrụ onye ndị ọzọ nabatara. Ọ dịghị onye na-achọ ka a na-ama ya njakịrị, na-akparị ya, ma ọ bụ na-ekwutọ ya. Dịkwa ka otu onye ntorobịa aha ya bụ Tanya si kwuo ya, “obi kpọrọ ụmụ akwụkwọ nkụ!” Ya mere, dị ka ọ na-adịkarị ị pụrụ ịdị na-eche ihe ụmụ akwụkwọ ibe gị ga-eme ma ha hụ gị ka i jikeere jiri Bible n’aka. Ọ dị mwute ikwu na ha pụrụ ịkwa gị emo. “Ọ dị otu nwatakịrị nwoke mụ na ya nọ na klas, onye anyị na ha bi n’otu ụlọ,” ka otu onye ntorobịa bụ́ onye Brazil aha ya bụ Felipe na-echeta. “Ọ na-adị na-asị, ‘I buliela Bible! Gịnị ka i bu n’akpa ahụ?’”
Ịbụ onye e si otú ahụ na-ama njakịrị abụghị ihe e ji achị ọchị. Bible na-agwa anyị na nwanne Jenesis 21:9) Pọl onyeozi ewereghị mmeso ọjọọ a dị ka ihe nta. Ná Ndị Galeshia 4:29, onyeozi ahụ n’ụzọ ziri ezi kpọrọ ya ‘mkpagbu.’
Aịzik otu nna ji ya na ya, bụ́ Ishmael, mere Aịzik, bụ́ nwa Ebreham, ihe bụ́ n’ezie ihe ọchị obi ọjọọ. (N’otú aka ahụ, Jizọs dọrọ aka ná ntị na ụfọdụ ndị ga-enwe obi ọjọọ n’ebe ụmụazụ ya nọ. Ọ sịrị: “Ọ bụrụ na ụwa akpọọ unu asị, unu mara na ọ kpọwo m asị tupu ọ kpọọ unu asị. A sị na unu bụ akụkụ nke ụwa, ụwa gaara ahụ ihe bụ́ nke ya n’anya. Ma n’ihi na unu abụghị akụkụ nke ụwa, kama ahọpụtawo m unu n’ụwa, n’ihi nke a ụwa na-akpọ unu asị.”—Jọn 15:18, 19.
Mgbe ahụ, dị ka Onye Kraịst, ị ghaghị ịdị njikere inweta mkpagbu ụfọdụ. (2 Timoti 3:12) Ọ bụrụgodị na ị gwatụbeghị ndị ọgbọ gị okwu banyere Bible, ụfọdụ ka pụrụ ịkpagbu gị nanị n’ihi na i na-ejigidesi ụkpụrụ omume dị elu ike, ị naghịkwa esonyere ha n’àgwà ọjọọ ha. (1 Pita 4:4) Otú ọ dị, Jizọs kwuru okwu nkasi obi ndị a: “Obi ụtọ na-adịrị unu mgbe ndị mmadụ na-akọcha unu ma na-akpagbu unu, jirikwa ụgha na-ekwu ụdị ihe ọjọọ ọ bụla megide unu n’ihi m.” (Matiu 5:11) Olee otú ịbụ onye a na-ama njakịrị ma ọ bụ na-akwa emo pụrụ isi mee gị obi ụtọ? N’ihi na ị maara na ị na-eme ka obi Jehova Chineke ṅụrịa! (Ilu 27:11) Sitekwa n’ime ihe na-atọ Chineke ụtọ, ị na-eme ka i sonye ná ndị ga-anata ụgwọ ọrụ nke bụ́ ndụ ebighị ebi!—Luk 10:25-28.
N’ụzọ na-enye obi ụtọ, o yighị ka ụmụ akwụkwọ ibe gị nile—ma ọ bụ ọbụna ihe ka n’ọnụ ọgụgụ n’ime ha—ha ga-emeso gị n’ụzọ obi ọjọọ ma ọ bụrụ na i zute ha n’ozi. Otu onye ntorobịa bụ́ onye Britain, onye aha ya bụ Angela na-echetara anyị, sị: “Mgbe i zutere nwa akwụkwọ ibe gị n’ọnụ ụzọ, ọtụtụ mgbe ahụ́ erughị ala ha na-akarị nke gị!” N’ezie, ọtụtụ na-achọ nnọọ ịmata ihe ị ga-ekwu. Ka o sina dị, ọtụtụ Ndị Kraịst na-eto eto na-enwe nnukwute ihe ịga nke ọma n’ịgbara ụmụ akwụkwọ ibe ha àmà. Isiokwu anyị ọzọ n’usoro isiokwu a ga-atụle ụzọ ụfọdụ gị onwe gị kwa pụrụ isi mee otú ahụ.
[Foto dị na peeji nke 14]
Ọtụtụ ndị ntorobịa na-atụ egwu izute nwa akwụkwọ ibe ha mgbe ha nọ n’ozi ọma
[Foto dị na peeji nke 16]
Ekwela ka ịma njakịrị mee ka ihere ihe i kweere na-eme gị