Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ihe Mkpori Ndụ Na-akwalite Ezi Ahụ́ Ike—Ịgba Ígwè

Ihe Mkpori Ndụ Na-akwalite Ezi Ahụ́ Ike—Ịgba Ígwè

Ihe Mkpori Ndụ Na-akwalite Ezi Ahụ́ Ike—Ịgba Ígwè

SITE N’AKA ONYE EDEMEDE TETA! NA BRITAIN

OLEE ụgbọala dị ọnụ ala karịa ihe ka n’ọnụ ọgụgụ ná ndị ọzọ, nke na-agbakarị obere ụgbọala n’ọsọ n’ọtụtụ ógbè ndị mepere emepe, nke ka mma maka ahụ́ ike gị, nke na-atọkwa ụtọ? Ọ bụ ịnyịnya ígwè. Ịgba ígwè bụ mmega ahụ́ dị mma nke bara uru ma na-enye obi ụtọ. N’oge mgbe ọtụtụ mmadụ na-enwe nchegbu banyere ahụ́ ike ha, o kwesịrị nnọọ ka i chebara ịgba ígwè echiche.

Site n’Ihe Egwuregwu Gaa n’Ihe E Ji Eme Njem

A na-ekwu na ọ bụ Baron Karl von Drais, bụ́ onye Germany na-arụpụta ihe, mepụtara ịnyịnya ígwè. Ịnyịnya ígwè ụmụaka ọ rụpụtara na 1817, dị nnọọ n’otú e si rụọ ya. Draisine ahụ, nke bụ́ ihe a na-akpọ ya, nwere ụkwụ abụọ, oche, na aka e ji na-eduzi ya—ma o nweghị pedal. A malitere ịzọgharị ya azọgharị na 1839 mgbe onye ụzụ́ bụ́ onye Scotland, bụ́ Kirkpatrick Macmillan, rụnyere n’ụkwụ ya nke azụ, ígwè ndị e ji ihe na-ebuli ihe elu jikọta ha na crank ya. Ọ bụ mgbe ahụ ka ihe gbanwere n’otú ụgbọala ndị nwere ụkwụ abụọ si na-ewu ewu. Otu nna na nwa ya nwoke bụ́ ndị France, bụ́ Pierre na Ernest Michaux, rụnyere pedal na crank nke dị n’ụkwụ ya nke ihu ma rụpụta ịnyịnya ígwè bụ́ velocipede (site n’okwu Latin bụ́ velox, “ngwa ngwa”na pedis, “ụkwụ”), bụ́ ígwè nke na-aka agba ọsọ, nke kakwa mfe iji na-eme ihe.

Ọ̀tụ̀tụ̀ ịgba ọsọ ya mụbara mgbe ụkwụ ya nke ihu bukwuru ibu. E mepụtara ịnyịnya ígwè nkịtị, nke a makwaara dị ka penny-farthing n’England, o nwekwara nnukwute ụkwụ ihu nke dị mita 1.5 n’obosara, bụ́ nke dị nnọọ iche n’ụkwụ ya nke azụ nke dị ntakịrị. A kpọrọ ya ịnyịnya ígwè penny-farthing n’ihi ọdịiche dị n’agbata nnukwute mkpụrụ ego bụ penny na mkpụrụ ego dị nnọọ ntakịrị karị bụ́ farthing.

E mepụtaziri ịnyịnya ígwè nke na-adịghị ize ndụ, nke na-enye ndị na-agba ya ohere ime ọtụtụ ihe dị ka mgbe a na-agba ígwè nkịtị, ma, ọ dị ala karị, nweekwa ụkwụ ndị hà nhata ma ọ bụ ndị fọrọ nke nta ka ọ bụrụ na ha hà nhata. Na 1879, nwoke England bụ́ Henry Lawson mere ngosi na Paris, nke otu ígwè nwere ụkwụ azụ nke chen na-anyagharị. E mesịrị mara ụdị nke a dị ka bicyclette.

Ihe ka n’ọnụ ọgụgụ n’ígwè ndị a na-arụpụta n’oge a na-enwe ụkwụ ihu nke ya na nke azụ na-aha nhata. Ya mere, ọdịdị ya agbanwebeghị nke ukwuu. Ụdị ịnyịnya ígwè ndị a na-agba n’ebe nile taa, ịnyịnya ígwè ndị e ji eme ogologo njem, ndị e ji eme ihe n’asọmpi ịgba ọsọ, na ndị e ji arị ugwu na-eme ka ahụ́ ruo ndị na-agba ha ala mgbe ha ji ụkwụ abụọ na-adịghị arọ bụ́ ndị nwere taya rọba na-agba.

Ihe Mkpori Ndụ nke Na-akwalite Ezi Ahụ́ Ike

N’ịbụ nke na-adịghị eme ụ̀zụ̀, nke na-adịghị emetọ ikuku, nke na-agba ọsọ karịa ụgbọala ndị nwere injin n’iji gaa n’ebe ndị dị nso, ịnyịnya ígwè bụ ihe e ji eme njem n’ọtụtụ ala. N’Africa, Eshia na n’ebe ndị ọzọ, ịnyịnya ígwè aghọwo “obu ngwongwo” nke e ji eme njem, ka ndị na-agba ha—ma ọ bụ ndị na-akpọre ha—na-eji ha ebu ngwá ahịa ha aga ahịa. Ọtụtụ mgbe ịnyịnya ígwè na-ebu ihe karịrị otu onye, ebe ndị ikwu na ndị enyi na-awa okporo ígwè nke frem ya ụkwụ ma ọ bụ nọrọ n’azụ ebe e ji ebu ibu bụ́ nke na-adịchaghị enye ntụsara ahụ́.

N’Ebe Ọdịda Anyanwụ Ụwa, bụ́ ebe ụgbọala bụ ihe ndị mmadụ na-ejikarịsị eme njem, ịgba ịnyịnya ígwè amaliteghachila iwu ewu n’ihi nchegbu na-arịwanye elu banyere ahụ́ ike tinyere ọchịchọ nke ịgbanahụ otu ụdị ndụ na-agbụ agbụ a na-ebi n’ebe mepere emepe. E nwewo akụkụ ụzọ ndị e dewere iche maka ịnyịnya ígwè n’akụkụ ọtụtụ ụzọ awara awara. Dị ka ihe atụ, na Britain, ọtụtụ gọọmenti ime obodo ji ụzọ ndị ruru ọtụtụ kilomita ha wepụtara iche maka ndị na-agba ígwè na-etu ọnụ.

E wezụga mmetọ pụrụ isite n’anwụrụ ọkụ ụgbọala, ịgba ígwè pụrụ ịbụ ihe na-akwalite ahụ́ ike. Ọ bụ “ihe nchebe pụọ n’ọrịa obi na akwara, bụ́ ihe kasị akpata ọnwụ na nnwụchu ọnwụ na UK,” ka ọkachamara n’ime njem bụ́ Adrian Davis chọpụtara. Ịgba ígwè na-achọ mgbalị ka ukwuu, ihe dị ka pasent 60 ruo 85 nke ikike kasịnụ mmadụ nwere, ma e jiri ya tụnyere pasent 45 ruo 50 a na-eji eme ihe mgbe a na-eje ije! Ebe ọ bụ na ụkwụ nke onye na-agba ígwè na-ebu ibu dịkarịsịrị ala n’ịdị arọ, ihe ize ndụ nke imebi ọkpụkpụ na-adịkwa ala karịa mgbe e ji ụkwụ na-aga n’okporo ámá.

Ma uru ahụ́ ike ọzọ a na-enweta site n’ịgba ígwè bụ ezi ume ọhụrụ ọ na-enye onye na-agba ya. Nnyocha e mere na-egosi na mmega ahụ́ ọ gụnyere na-akpali mmepụta nke mmiri ọgwụ a na-akpọ endorphin n’ime ụbụrụ, bụ́ nke pụrụ ime ka obi dị mmadụ mma. E wezụga obi ịdị mma, n’ezie ịgba ígwè na-eme ka e nwee ọdịdị ahụ́ ka mma. N’ụzọ dị aṅaa? “N’ọ̀tụ̀tụ̀ ọsọ na-agabigaghị ókè, onye na-agba ya (ígwè) ga-eji ihe dị ka calorie asaa mee ihe n’otu minit, ma ọ bụ calorie 200 n’ime ọkara awa,” ka akwụkwọ akụkọ bụ́ The Guardian na-akọ. Olee ihe ndị na-esi na ya apụta? O nwere ike ịbụ úkwù talatara atalata na apata ụkwụ na-adịkwaghị yọkọ yọkọ.

Ihe Mkpori Ndụ Na-adịghị Ize Ndụ

Nchegbu na-arị elu a na-enwe n’ala ebe ndị a na-ejikarị ụgbọala eme ihe bụ nchebe nke ndị na-agba ígwè. Dị ka ihe atụ, mmadụ ò kwesịrị ikpu okpu na-enye nchebe? Mmadụ ime ihe iji chebe onwe ya bụ nnọọ ihe amamihe dị na ya. N’aka nke ọzọ, nanị ikpu okpu na-enye nchebe adịghị eme ka e jide n’aka na onye na-agba ígwè agaghị emerụ ahụ́. Celia Hall, bụ́ onye na-ede akụkụ pụrụ iche n’akwụkwọ akụkọ dọọrọ uche gaa n’otu ihe ọmụmụ e mere banyere mmadụ 1,700 na-agba ígwè, bụ́ ndị nọ n’afọ dịgasị iche iche, ndị kpucha okpu na-enye nchebe. Otu n’ime ihe ndị na-atụ n’anya a chọpụtara n’ihe ọmụmụ ahụ bụ na ikpu okpu na-enye nchebe mere ka ndị ahụ na-agba ígwè nwee echiche na-ezighị ezi nke ịbụ ndị na-anọghị n’ihe ize ndụ. Nke kadị njọ bụ na pasent 6 n’ime ha kpu okpu na-adịghị ha mma n’isi. Mgbe e nwere ihe ọghọm, okpu ya na isi mmadụ na-ahaghị na-eji pasent 50 amụba ihe ize ndụ nke imerụ ahụ́. Ọ bụrụ na i kpu okpu na-enye nchebe, jide n’aka na ya na isi gị hà. Na-enyocha okpu nwa gị mgbe nile. Okpu karịrị isi ya pụrụ ịkpatara ya ọnwụ.

Ọtụtụ mgbe ndị na-anya ụgbọala na-ele ndị na-agba ígwè anya dị ka ihe mkpasu iwe, ha na-elegharakwa ha anya. Ya mere, mee ka a na-ahụ gị anya. Yiri uwe na-enye nchebe—nke na-enwu enwu n’ehihie, na-egbuke egbuke n’abalị. Ọ dịkwa mkpa ka a na-ahụ ígwè gị anya, ọbụna n’ọchịchịrị. Itinye ihe ndị na-egbuke egbuke na pedal ya na inwe ọkụ ihu na ọkụ azụ dị ọcha bụcha ihe ndị iwu na-achọkarị, ha bụkwa n’ezie ihe amamihe dị na ha ime iji chebe onwe onye. Jide n’aka na ihe ndị na-adịghị ize ndụ ị na-ahọrọ iji eme ihe ruru ihe iwu chọrọ ná mba gị.

Ịnyịnya ígwè a na-elezi anya nke ọma dị mkpa iji zere mmerụ ahụ́. Na-enyocha ya; na-ehicha ma na-edozi ya mgbe nile. Mgbe i mesịrị ihe ndị a, ị pụrụ ịhụ na ọ bụ ihe amamihe dị na ya “ịpụ n’ụzọ” mgbe ị na-agba ígwè n’ógbè gị. Ma iji mee nke a n’ụzọ na-adịghị ize ndụ, ị ga-achọ ụdị ịnyịnya ígwè kwesịrị ekwesị—Lee igbe bụ́ “Nke Kwesịrị Gị.”

Ịgba Ígwè Dị Ka Ihe Egwuregwu

Nye ụfọdụ ndị, ịgba ígwè bụ ihe egwuregwu. Ihe ndị na-awụ ibobo n’ahụ́ mere mgbe a gbara ọsọ bụ́ Tour de France emewo ka e jikọta asọmpi ịgba ígwè na ịṅụ ọgwụ ọjọọ na aghụghọ. Magazin bụ́ Time, n’otu isiokwu a kpọrọ “Ka Ọgwụ Kasị Mma Merie!,” kwuru na ọsọ ahụ jupụtara “n’ọgba aghara.” N’ịbụ nke arụmụka banyere ịṅụ ọgwụ ọjọọ na mmiri ọgwụ ndị na-enye aka ka e mee nke ọma karị gbara gburugburu, e mebiwo ùgwù egwuregwu ahụ nwere.

Ndị na-agba ígwè, bụ́ ndị maara ihe na-eji nlezianya elebara otú oge na mgbalị ha na-etinye n’egwuregwu ha haruru anya. Ọbụna mgbe uru ahụ́ ike a na-enweta mere ka ịgba ígwè bụrụ ihe na-adọrọ adọrọ, ndị na-emeru ihe n’ókè na-aghọta na mmega ahụ́ bụ nanị otu n’ime ihe ndị dị mkpa iji nweta ogologo ndụ na ezi ahụ́ ike. Otú ọ dị, mgbe ọzọ ị magooro n’elu ígwè gị ịgba ya, nweta obi ụtọ dị n’ịgba ígwè!

[Igbe/Foto ndị dị na peeji nke 27]

Nke Kwesịrị Gị

Ịnyịnya ígwè ndị e ji arị ugwu bụ n’ezie ụdị ndị e mere maka iji na-agba n’ụdị ebe nile, bụ́ ndị na-enwe frem dị ntakịrị ma sie ike, aka na-arọghị arọ, pedal ndị dị elu karịa otú ọ na-adị n’ụdị ígwè nkịtị a na-enwekarị, na taya sara mbara ndị na-ejide ala ndị na-adịghị larịị. Ụdị gia dị iche iche na-eme ka ọ dịtụrụ onye na-agba ya mfe karị mgbe ọ na-arị ugwu.

Ọ bụrụ na ị na-agba ya ma n’ụzọ ndị elu ha siri ike ma n’ala ndị na-adịghị larịị, mgbe ahụ ihe dị gị mkpa bụ ụdị nke nwere ihe ndị dị n’ụdị ndị ọzọ, njikọta nke ụdị ígwè e ji arị ugwu na ụdị ígwè nkịtị a na-enwekarị. Ụdị ígwè a na-enwe taya dị warara karị na pedal ndị dị ala karị. Ụdị ígwè ndị a na-enwekarị na-eme ka onye na-agba ya gbatịa agbatịa karị, na-enwekwa gia ole na ole karị.

N’agbanyeghị ụdị nke ị họọrọ, jide n’aka na ọ bụ nke gị na ya hà. Buru ụzọ nwalee ya. Mezie aka ya, oche ya, na pedal ya otú ga-adị gị mma. Mgbe ị wara ya ụkwụ, i kwesịrị inwe ike ịzọdo ụkwụ n’ala (lee anya n’elu).

Ị ga-enwe ọnọdụ kasị dị nchebe na nke ga-eme ka ahụ́ ruo gị ala mgbe ị na-agba ya ma ọ bụrụ na i mezie otú oche ya dịruru elu ka i wee nwee ike ịgbatị ụkwụ gị mgbe ị zọkwasịrị ikiri ụkwụ gị na pedal mgbe ọ kasị dịrị nso n’ala (lee anya n’aka ekpe). N’ozuzu ya, e kwesịrị ime ka aka ya na oche ya hara nhata n’ịdị elu.—Ebe o si: Magazin bụ́ Which?

[Foto dị na peeji nke 25]

“Penny farthing”

[Ebe E Si Nweta Foto]

Police Gazette, 1889

[Foto dị na peeji nke 25]

“Velocipede”

[Ebe E Si Nweta Foto]

Ndị ikom: A Pictorial Archive from Nineteenth-Century Sources/ Dover Publications, Inc.

[Foto dị na peeji nke 26]

Ịnyịnya ígwè bụ ihe e ji ebu ibu n’ọtụtụ ala

[Foto ndị dị na peeji nke 26]

N’ebe ụfọdụ, iwu na-achọ ka e kpuru okpu