Ihe Ndị Na-eme Ka Ebe Ọrụ Dị Ize Ndụ
Ihe Ndị Na-eme Ka Ebe Ọrụ Dị Ize Ndụ
“Ọnụ ọgụgụ ndị na-anwụ n’ebe ọrụ karịrị ndị na-anwụ n’okporo ụzọ dị iche iche.” Nke ahụ bụ isiokwu e dere n’aka akwụkwọ okpotokpo n’otu akwụkwọ mmapawa nke WorkCover, bụ́ òtù na-ahụ maka nchebe n’ebe ọrụ na New South Wales, Australia, kesara.
N’EZIE, ihe ọghọm ndị na-akpata ọnwụ bụ nanị akụkụ nke nsogbu ahụ. Kwa afọ, ọtụtụ nde mmadụ na-enwe ajọ mmerụ ahụ́, ọbụna ndị na-akpaghasị ndụ, n’ebe ha na-arụ ọrụ. Ọtụtụ ndị ọzọ na-anwụchụ ọnwụ n’ihi ịbụ ndị e kpughepụrụ nye ihe ndị dị ize ndụ ma ọ bụ n’ihi nrụgide ha na-enwe n’ọrụ.
Ebe ọ bụ na ọnwụ na ajọ mmerụ ahụ́ bụ́ ndị ọrụ na-akpata na-ewere ọnọdụ n’ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ n’ụlọ ọrụ na n’ebe achụmnta ego nile, o kwesịrị ekwesị ịjụ, sị: Ruodị ókè hà aṅaa ka ị nọ ná nchebe n’ebe ị na-arụ ọrụ? Olee ọnọdụ ndị e nwere n’ebe ahụ pụrụ itinye ahụ́ ike na ndụ gị n’ihe ize ndụ?
Ebe Nrụgide Jupụtara na Ya
A na-arụgide ndị ọrụ nke ukwuu ịrụpụta ihe. Na Japan, e ji okwu bụ́ karoshi—“ọnwụ sitere n’ịrụbiga ọrụ ókè”—mee ihe na nke mbụ ya n’akwụkwọ ezinụlọ ndị mmadụ nwụnahụrụ gbara ka a kwụọ ha ego iti aka n’obi. Dị ka otu nnyocha e mere ebe ahụ afọ atọ gara aga si gosi, pasent 40 nke ndị Japan, bụ́ ndị na-arụ ọrụ n’ọfịs, tụrụ egwu na ha nwere ike ịnwụ n’ihi ịrụbiga ọrụ ókè. Otu ọkàiwu nke na-ahụ maka ụdị ịgba akwụkwọ ahụ mere atụmatụ na “kwa afọ na Japan, karoshi na-egbu ma ọ dịkarịa ala mmadụ 30,000.”
Ndị uwe ojii nọ na Japan kwuru na nsogbu bụ́ ndị ọrụ na-akpata ha bụ isi ihe na-akpata ịrị elu nke ogbugbu ndị nọ n’agbata afọ ndụ 50 ruo 59 na-egbu onwe ha. Dị ka akwụkwọ bụ́ The Violence-Prone Workplace si kwuo, otu ụlọikpe kpebiri na ọ bụ otu onye a na-arụrụ ọrụ mere ihe kpaliri onye na-arụrụ ya ọrụ bụ́ onye nwere nchegbu ndị metụtara ọrụ, igbu onwe ya.
Akwụkwọ akụkọ Australia bụ́ The Canberra Times kwuru na ‘ndị America agafeela ndị Japan n’itinye ogologo awa kasịnụ n’ọrụ n’ụwa nile.’ N’ihi ya, akụkọ ndị nwere isiokwu dị ka “Oge Ọrụ Dị Ogologo Na-eme Ka Ndị Mmadụ Na-arụgbu Onwe Ha n’Ọrụ” na-akọ banyere ndị ọrụ ike gwụrụ, dị ka ndị na-akwọ ụgbọala e ji ebu ndị ahụ na-adịghị, ndị na-anya ụgbọelu, ndị ọrụ ihe owuwu na ndị ọrụ ụgbọ njem, na ndị ọrụ abalị, bụ́ ndị na-anwụ ka ha nọ n’ọrụ ha.
Ka ụlọ ọrụ dị iche iche na-eme nhazigharị na mgbubilata nke ọnụ ọgụgụ ndị ọrụ iji nọgide na-enweta uru, a na-arụgidekwu nnọọ ndị e were n’ọrụ ịrụpụtakwu ihe. Akwụkwọ bụ́ British Medical Journal kọrọ na mgbubilata nke ọnụ ọgụgụ ndị ọrụ na-enwe mmetụta na-adịghị mma n’ahụ́ ike nke ndị e were n’ọrụ.
Ime Ihe Ike n’Ebe Ọrụ
Ndị e were n’ọrụ bụ́ ndị na-arụbiga ọrụ ókè na ndị na-enwe nrụgide abụghị ihe ize ndụ nye nanị
onwe ha. Otu nnyocha e mere na Britain gosiri na ọtụtụ ndị na-arụ ọrụ n’ọfịs na-ewesa ndị ọrụ ibe ha iwe n’ihe ka ukwuu n’ụbọchị ọrụ ha nakwa na esemokwu dị otú ahụ na-akpatakarị ime ihe ike .“Kwa izu, a na-egbu ihe dị ka ndị ọrụ America 15 mgbe ha nọ n’ebe ọrụ ha,” ka magazin bụ́ Business Week na-ekwu. Magazin bụ́ Harvard Business Review na-ekwu, sị: “Ọ dịghị manịja ọ bụla na-enwe mmasị ikwu okwu banyere ime ihe ike n’ebe ọrụ. Ma nke bụ́ eziokwu bụ na kwa afọ, ọtụtụ narị ndị e were n’ọrụ na-awakpo ma ọ bụ ọbụna na-egbu ndị ọrụ ibe ha.”
N’aka nke ọzọ, ọtụtụ ndị na-abụ ndị ndị ahịa ha na-emeso ihe ike n’ebe ọrụ. Otu akụkọ ngalaba ihe ọmụmụ banyere mpụ n’Australia na-akọ na ụfọdụ ndị dọkịta na-atụ nnọọ egwu ịbụ ndị a wakporo ajọ mwakpo nke na ha na na-akpọrọ ndị nchedo mgbe ha na-aga ileta onye ọrịa n’ụlọ. Ndị ọzọ nọ n’ihe ize ndụ gụnyere ndị uwe ojii na ndị nkụzi.
Ụdị ọzọ nke ime ihe ike n’ebe ọrụ bụ mmegbu n’ụzọ mmetụta uche, bụ́ nke Òtù Mba Nile Na-ahụ Maka Ọrụ maara dị ka ime ihe ike nke mmetụta uche. Ụdị bụ́ isi nke mmegbu a bụ mmaja.
Prọfesọ Robert L. Veninga nke Mahadum Minnesota, U.S.A., na-akọ na “nchekasị na nrịanrịa ndị ọ na-akpata na-emetụta ndị ọrụ n’ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ akụkụ nile nke ụwa.” O kwuru na “nsogbu bụ́ isi dị ka Akụkọ Banyere Ọrụ Ụwa Nile nke 1993 bụ́ nke Òtù Mba Nile Na-ahụ Maka Ọrụ nke Mba Ndị Dị n’Otu si gosi, bụ na nrụgide na-esite n’ebe ọrụ ndị a na-adịghị eji mmadụ akpọrọ ihe na ha, ndị na-agbanwe agbanwe mgbe nile, ma bụrụ ebe ndị a na-esekarị okwu na ha.”
Ya mere ajụjụ bụ, Gịnị ka ndị were mmadụ n’ọrụ na ndị ha were n’ọrụ pụrụ ime iji mee ka ebe ọrụ ha dị nchebe karị? A ga-atụle nke a n’isiokwu na-esonụ.