Ime Ka Ebe Ọrụ Gị Dị Nchebe
Ime Ka Ebe Ọrụ Gị Dị Nchebe
N’AGBANYEGHỊ iwu ndị e mere maka ahụ́ ike na nchebe n’ebe ọrụ, mmadụ imerụ ahụ́ na ịnwụ n’ebe ọrụ ka bụ nnukwu nsogbu. Ya mere, o doro anya na ịnọ ná nchebe n’ebe ọrụ apụghị ịbụ nanị nke a ga-enweta site n’ime iwu. Ndị were mmadụ n’ọrụ na ndị ha were n’ọrụ aghaghị ime ihe ụfọdụ n’onwe ha maka nchebe nke ha na nke ndị ọzọ.
Ya mere, ndị ọrụ nile kwesịrị iji amamihe nyochaa ebe ọrụ ha na otú ha si arụ ọrụ. Dị ka ihe atụ, ị̀ chọpụtawo ma ebe ọrụ gị ọ̀ dị nchebe n’ezie? Ị̀ na-eji mmiri ọgwụ ndị nwere nsí arụ ọrụ? Ọ bụrụ otú ahụ, ị̀ na-echebe onwe gị nke ọma? Ị̀ na-enwe nrụgide mgbe nile? Ị̀ na-anakwere ndokwa ọrụ ndị na-agafe ókè ma ọ bụ awa ole iwu kwadoro?
Azịza nye ajụjụ ndị dị otú a pụrụ ikpughe ihe dị ukwuu banyere otú i nweruru nchebe n’ebe ọrụ.
Ịmata Ihe Ize Ndụ Ndị Dịnụ
Ịgbalị ịgbaso ndokwa ọrụ ezi uche na-adịghị na ya pụrụ ịdị ize ndụ. Mgbe ha nyochasịrị ihe a chọpụtara ná nnyocha e mere ndị ọrụ dị nde 3.6 na ebe ọrụ 37,200, Prọfesọ Lawson Savery nke Mahadum Curtin nke Australia, na otu onye nnyocha bipụtara otu akwụkwọ nnyocha bụ́ nke ha kpọrọ “Long Hours at Work: Are They Dangerous and Do People Consent to Them?” (“Ịrụ Ọrụ Ruo Ogologo Awa: Ọ̀ Dị Ize Ndụ, Ndị Mmadụ Hà Na-anabatakwa Ya?”) Dị ka a pụrụ isi kwuo ya, azịza nye akụkụ abụọ nke ajụjụ ahụ bụcha ee.
N’ezie, ndị ọrụ ike gwụrụ adịghị arụ ọrụ nke ọma, ha na-emehiekwa ihe karị. Prọfesọ Savery kwuru, dị ka a kọrọ ya n’akwụkwọ akụkọ Australia bụ́ The Sun-Herald, sị: “Ọtụtụ ụlọ ọrụ na-akwado ịrụbiga ọrụ ókè, ha na-achọsikwa ndị na-arụbiga ọrụ ókè ike ma na-enye ha ụgwọ ọrụ.” Ihe ndị na-esi na ya apụta
pụrụ ibibi ihe. Ikekwe ọ dịghị ebe nsogbu a pụtara ìhè karịa ka ọ dị n’ụlọ ọrụ ndị ụgbọ njem, bụ́ ebe a pụrụ ịgba ndị ọkwọ ụgbọala ume ma ọ bụ ọbụna manye ha ịkwọ ụgbọala ruo ogologo awa n’ezutụghị ike—nke iwu megidere n’ala ụfọdụ.Àgwà ọrụ ndị na-adịghị mma, bụ́ nke pụrụ ịgụnye akpakọtaghị ihe ọnụ na edebeghị ihe ọcha, na-eweta ihe ize ndụ ọzọ. Ịhapụ ngwá ọrụ ka ha tọgbọrọ aghara aghara n’ala ụlọ ma ọ bụ ịhapụ waya eletrik ndị a kwụnyere n’ọkụ n’ekechighị ha ekechi na-akpatakarị ihe ọghọm, ọbụna ọnwụ. A pụkwara ikwu otu ihe ahụ banyere ileghara ịdọ aka ná ntị ndị e nyere anya mgbe e ji ngwá ọrụ ndị na-eji ike eletrik eme ihe na ígwè ọrụ dị iche iche na-arụ ọrụ. Ihe ọzọ na-akpata mmerụ ahụ́ na ọnwụ bụ ịhapụ ihicha mmanụ wụfuru awụfu—karịsịa ndị nwere nsí. E nwewo ọtụtụ mmerụ ahụ́ mgbe ala ụlọ mmanụ ma ọ bụ mmiri wụsara chịịrị ụkwụ ndị ọrụ. Ya mere, a pụrụ ikwu na ụkpụrụ bụ́ isi banyere àgwà ọrụ dị mma bụ ịdị ọcha na ịkpakọta ihe ọnụ.
Ma, a na-anwa ọtụtụ ndị ileghara usoro nchebe anya. Magazin bụ́ Monthly Labor Review kwuru, sị: “Nrụgide a na-enwe n’ebe ọrụ pụrụ ime ka e chee na ileghara ihe ụfọdụ anya dị mkpa iji rụpụta ihe n’ókè ndị ahịa chọrọ.” Ya mere, mmadụ pụrụ iche banyere iwu nchebe, sị, ‘Ọ kpatatụbeghị nsogbu mgbe ọ bụla m leghaara ya anya.’ N’ikwu okwu n’isiokwu a, otu manịja nwere ahụmahụ nke na-elekọta ụlọ mmepụta ihe kwuru, sị: “Otu n’ime ihe ndị kasị njọ ị pụrụ ime n’ọrụ bụ ileghara usoro nchebe anya ma ihe aghara imebi!” N’ihi gịnị? N’ihi na nke a na-akpata inwebiga obi ike ókè na akpachapụghị anya, bụ́ nke na-akpatakwu ihe ọghọm.
A na-akọwakarị mgbawa nke ụlọ ọrụ Chernobyl dị na Ukraine na 1986 dị ka “ihe ọghọm nuklia kasị njọ n’ụwa.” Gịnị gahiere? Otu akụkọ banyere ọdachi ahụ na-ekwu banyere “ọtụtụ oge a kpara ígwè ahụ aka n’akpachapụghị anya” nakwa “ọtụtụ ugboro e leghaara ịdọ aka ná ntị e nyere maka nchebe anya.”
Ma onye were mmadụ n’ọrụ ma onye e were n’ọrụ pụrụ ijikọ aka mata ihe ndị pụrụ ịkpata ọdachi tupu ha emee. Otu ilu Bible amamihe dị na ya na-ekwu, sị: “Onye nwere ezi uche ahụwo ihe ọjọọ, wee zobe onwe ya.” (Ilu 22:3) Ee, onye maara ihe na-ahụ ọnọdụ pụrụ ịdị ize ndụ ma chọwa ụzọ ọ ga-esi chebe onwe ya na ndị ọzọ.
Mgbe ndị were mmadụ n’ọrụ mere nke a, ha na-erite uru, ndị ha were n’ọrụ na-eritekwa uru. Dị ka ihe atụ, otu ụlọ ọrụ nke rụgharịrị ọfịs ha iji zere “nsogbu nke ụlọ na-ebunye ọrịa” chọpụtara na n’oge na-adịghị anya, ọ̀tụ̀tụ̀ nrụpụta ihe ha rịrị elu, ndị ọrụ ha nwekwara afọ ojuju ka nnọọ ukwuu. A chọpụtakwara na ọnụ ọgụgụ ka nta nke ndị ọrụ ha gara ezumike n’ihi ọrịa. Ọ bụghị nanị na nchebara echiche dị otú ahụ maka ahụ́ ike ndị ọzọ na-eme ka onye were mmadụ n’ọrụ na onye e were n’ọrụ nwee obi ụtọ karị, kamakwa, dị ka a hụrụ n’ọnọdụ a, ọ pụkwara ịba uru n’ụzọ akụ̀ na ụba.
Dị ka e kwuru n’isiokwu bu ụzọ, ime ihe ike agbasaala banye n’ebe ọrụ. Gịnị ka ị pụrụ ime iji chebe onwe gị ?
Ihe Ndị A Pụrụ Ime
A hụwo ka ọbụna àgwà ịchọtụ okwu n’ebe ọrụ ghọrọ ajọ mwakpo. Magazin bụ́ Harvard Business Review na-enye ndụmọdụ a na-akpali iche echiche: “Ị chọọ ịkwụsị ime ihe ike n’ebe ọrụ, mara na ndị na-achọtụ okwu na-aga n’ihu ime ihe ndị ka njọ.”
E nwere ike ọ bụghị ọchịchọ nwanyị ịdọta mmasị nke ndị ọrụ ibe ya, ma, ọ bụrụ na ụzọ o si eji ejiji, ụzọ o si ekwu okwu, na ụzọ o si akpa àgwà adịghị egosi imeru ihe n’ókè, ndị ọzọ pụrụ iche na o nwere omume rụrụ arụ. N’oge ndị na-adịbeghị anya, mgbe 1 Timoti 2:9.
ụfọdụ omume ndị a na-ezubeghị iji dọta mmasị na-ekwesịghị ekwesị akpatawo nsogbu ndị siri ike, gụnyere ịchụso mmadụ ná nzuzo, ndina n’ike, ma ọ bụ ọbụna igbu ọchụ. Ya mere, kpachara anya maka otú ejiji gị na akparamàgwà gị si emetụta ndị ọzọ. Ṅaa ntị na ndụmọdụ Bible bụ́: ‘Jiri uwe a haziri nke ọma na-achọ onwe gị mma n’imeru ihe n’ókè na uche zuru okè.’—Magazin bụ́ Monthly Labor Review chọpụtara ọnọdụ ọzọ pụrụ ịdị ize ndụ, na-ekwu, sị: “A na-enwe nchegbu banyere ndị e were n’ọrụ bụ́ ndị na-arụ ọrụ nanị ha n’abalị n’ebe ndị mmadụ na-anọghị.” Ya mere tụlee: Ọ̀ bụ ihe amamihe dị na ya ịnakwere ihe ize ndụ ndị a pụrụ inwe ọtụtụ mgbe n’ihi mmadụ ịrụ ọrụ nanị ya na-akpatakarị, karịsịa n’ime abalị? Uru ego a ga-enweta ò kwekọrọ n’ezie n’ihe ize ndụ dị otú ahụ?
Ọ dịkwa oké mkpa ịtụle otú anyị si emeghachi omume n’àgwà na-akpasu iwe na nke iseokwu nke ndị ọrụ ibe anyị bụ́ ndị nwere nrụgide na-akpa. Gịnị ka a pụrụ ime iji bịajụọ ọnọdụ pụrụ ịdị ize ndụ? Otu ilu Bible na-enye ndụmọdụ, sị: “Ọzịza okwu dị nro na-eme ka ọnụma laghachi azụ: ma okwu mwute na-akpali iwe.” (Ilu 15:1) Ee, site n’iji obi ọma na nkwanye ùgwù eme ihe, ị pụrụ ime ihe dị ukwuu n’ibelata nrụgide ma zere esemokwu.
N’ebe ọrụ nke taa bụ́ nke jupụtara ná nrụgide, a na-enwe omume iwe na nke esemokwu n’ebe nile. Ọ bụ ezie na ọ pụrụ iyi ka ọ̀ bụ anyị ka a na-emeso ya, ọ pụrụ nnọọ ịbụ na onye ahụ na-eme otú ahụ n’ihi nrụgide na obi nkoropụ o nwejuworo. Ọ pụrụ nanị ịbụ na anyị nọ n’ebe na-ekwesịghị ekwesị n’oge na-ekwesịghị ekwesị. Ya mere, otú anyị si emeghachi omume dị mkpa. Ọ pụrụ ime ka ọnọdụ ahụ dajụọ ma ọ bụkwanụ mee ka ọ ka njọ.
Otú ọ dị, ma eleghị anya, e nwere echiche dịgasị iche iche n’ezie. Akwụkwọ bụ́ Resolving Conflicts at Work kwuru ihe a na-enye aka, sị: “Mgbe anyị na-ese okwu, . . . ọ na-esi ike anyị iji ezi obi kwuo n’ụzọ doro anya ihe bụ́ mmetụta anyị n’ezie.” Gịnị pụrụ ịkpata ya? Akwụkwọ ahụ gara n’ihu ikwu, sị: “Esemokwu anyị nwere ikike nke imegharị anyị anya, anyị abịazie kwere na ime ihe ike bụ nanị ihe ngwọta dịnụ.”
Gịnị bụ ihe ngwọta e nwere? NA-EGE NTỊ! Akwụkwọ ahụ e hotara n’elu na-ekwu, sị: “Site n’ige ndị anyị na ha na-ekwekọrịtaghị ntị nke ọma . . . , anyị pụrụ ịkwụsị inwe nnọọ mmetụta uche nke ga-akpali anyị ịchọ ka esemokwu ahụ gaa n’ihu ma chọọ ihe ngwọta.” Nke a bụ ndụmọdụ dị mma maka ime ka enweghị nkwekọrịta ma ọ bụ nghọtahie ghara ịghọ esemokwu dị ukwuu.
Ya mere, n’ụzọ amamihe dị na ya, jiri ụzọ ezi uche dị na ya mee ihe maka nchebe. Nke a gụnyere iji nlezianya na-agbaso iwu nchịkwa ndị e mere maka nchebe. Ime nke a pụrụ ime nnọọ ka ebe ọrụ dị nchebe karị.
Ọ bụkwa eziokwu na àgwà anyị banyere ndụ, ọrụ, na ntụrụndụ pụrụ inwe mmetụta n’ụdị ọrụ anyị na-ahọrọ nakwa otú anyị si eme ihe maka nchebe. Isiokwu na-esonụ pụrụ inyere anyị aka ime nhọrọ ndị dị mma n’akụkụ a.
[Foto dị na peeji nke 19]
Hichaa mmanụ wụfuru awụfu nke ọma
[Foto dị na peeji nke 21]
Nzaghachi dị nro pụrụ ịbịajụ ọnọdụ nrụgide