Mmanụ Aṅụ—Ihe Dị Ụtọ nke Na-agwọ Ọrịa
Mmanụ Aṅụ—Ihe Dị Ụtọ nke Na-agwọ Ọrịa
ỤFỌDỤ ndị nnyocha banyere ọgwụ na ahụ́ ike nwere oké mmasị n’ikike mmanụ aṅụ nwere igbu ụmụ nje na ime ka ahụ́ ghara ịfụli elu. Akwụkwọ akụkọ Canada bụ́ The Globe and Mail na-akọ, sị: “N’adịghị ka ọgwụ na-egbu nje, ndị bụ́ ọkpọka, bụ́ ndị na-apụghị igbu nje ndị na-eguzogide ọgwụ, mmanụ aṅụ nwere ike ma ọ dịghị ihe ọzọ, igbu ụfọdụ n’ime ha mgbe a bịara n’ihe banyere ọnyá ndị nje bara.”
Olee ihe dị na mmanụ aṅụ nke na-enye ya ikike ịgwọ ọrịa? Azịza ya na-emetụta aṅụ nke na-arụ ọrụ bụ́ worker bee, bụ́ nke na-ewekọta mmiri ndị na-atọ ụtọ site n’okooko osisi dị iche iche. Asọ mmiri nke aṅụ ahụ nwere glucose-oxidase, bụ́ otu mmiri ọgwụ bụ́ isi nke na-agbari glucose dị n’ime mmiri ahụ na-atọ ụtọ. Otu ihe nke na-esi ná mgbari a apụta bụ hydrogen peroxide, bụ́ nke a na-ejikarị ehicha ọnyá ma na-egbu nje ndị dị n’ime ya. Dị ka ọ na-adịkarị, hydrogen peroxide adịghị arụte ọrụ aka mgbe e tere ya n’ọnyá; ma ọ bụrụ na ọ bụ mmanụ aṅụ ka e tere ya, ọ na-adị iche. “Ozugbo e tere ya n’ọnyá, mmiri ndị dị n’ahụ́ na-agwagbutụ mmanụ aṅụ ahụ, nke a na-ebelatakwa acid dị na mmanụ aṅụ,” ka Globe ahụ na-akọ. Mmiri ọgwụ ahụ na-amalite ịrụ ọrụ n’ebe a acid na-adịkebeghị. Mgbari a a na-agbari shuga dị na mmanụ aṅụ na-abụ nwayọọ nwayọọ ma nọgide na-aga n’ihu. Usoro mgbari a na-eji nwayọọ nwayọọ ewepụta hydrogen peroxide n’ọ̀tụ̀tụ̀ ga-ezu iji gbuo ụmụ nje ndị dị n’ebe ahụ n’enweghị mmetụta dị njọ n’akụkụ ahụ́ ndị gbara ya gburugburu bụ́ ndị na-enweghị ihe mere ha.
Mmanụ aṅụ nwere ọtụtụ ihe nke pụrụ imetụta ọgwụgwọ nke ọnyá, dị ka Globe ahụ si kwuo. “Ntakịrị mmanụ aṅụ e tesara na ya na-eme ka e nwee ebe dị udè nke na-echebe akpụkpọ ahụ́ ma gbochie ya ịghọ apa siri ike. Mmanụ aṅụ na-akwalite uto na mmepụta nke ụmụ aghịrịgha akwara ndị ọhụrụ ma kpalie mkpụrụ ndụ ndị na-emepụta akpụkpọ ahụ́ ọhụrụ itolite.” Tụkwasị na nke ahụ, ihe ndị dị na mmanụ aṅụ bụ́ ndị na-egbochi mgbari nke oxygen na-egbochi ahụ́ ịfụli elu bụ́ nke na-enye aka “ebelata ahụ́ ịza aza, mee ka ọbara na-erugharị nke ọma karị ma mee ka ọnyá ghara ịmụ mmiri.”
“Otú ọ dị, ọ bụghị mmadụ nile pụrụ iji mmanụ aṅụ mee ihe” ka nkọwa ahụ dụrụ n’ọdụ. A na-eme atụmatụ na nje ndị na-eme ka nri nye nsogbu n’ahụ́ dị n’ihe ruru pasent 5 nke mmanụ aṅụ. Ụlọ ọrụ dị iche iche dị ka Health Canada’s Botulism Reference Service nakwa òtù ndị na-ahụ maka ahụ́ ike ụmụaka na-enye ndụmọdụ ka a ghara inye ụmụaka na-erubeghị otu afọ mmanụ aṅụ, n’ihi na “ụmụ ọhụrụ enwebeghị ụmụ ihe ndị dị ndụ bi n’eriri afọ ndị zurunụ iji chebe ha pụọ na nje ahụ.”