Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndị Nkụzi—Gịnị Mere Ha Ji Dị Anyị Mkpa?

Ndị Nkụzi—Gịnị Mere Ha Ji Dị Anyị Mkpa?

Ndị Nkụzi—Gịnị Mere Ha Ji Dị Anyị Mkpa?

“Otu ụbọchị e nwere onye nkụzi bụ́ ọkpọka ka ọtụtụ puku ụbọchị e ji ịdị uchu mụọ ihe mma.”—Ilu Japan.

Ì CHETARA onye nkụzi nke nwere mmetụta dị ukwuu n’ahụ́ gị mgbe ị nọ n’ụlọ akwụkwọ? Ma ọ bụkwanụ, ọ bụrụ na ị ka bụ nwa akwụkwọ, ì nwere onye nkụzi ihe ya kasị amasị gị? Ọ bụrụ otú ahụ, ọ̀ bụ n’ihi gịnị?

Ezi onye nkụzi na-akpali obi ike ma na-eme ka ịmụ ihe bụrụ ọrụ na-akpali akpali. Otu onye dị afọ 70 nke si England na-eji obi ụtọ echeta onye na-akụziri ha Bekee n’ụlọ akwụkwọ dị na Birmingham. “Maazị Clewley mere ka m mata banyere ikike ndị m na-amabughị na m nwere. Ana m eme ihere, adịghịkwa m ekwukebe okwu, n’agbanyeghị nke ahụ, ọ gbakwara m ume isonye n’asọmpi ihe nkiri nke ụlọ akwụkwọ anyị. N’afọ ikpeazụ m, enwetara m ihe nrite n’ihe nkiri ahụ. Apụghị m imewo ya ma a sị na ọ gbaghị m ume. Ọ dị mwute na ahụghị m ya ọzọ ma ọlị n’afọ ndị sochirinụ iji kelee ya maka nrara ọ raara onwe ya nye maka ụmụ akwụkwọ ya.”

Margit, bụ́ nwanyị ọma nke dị afọ 50 na ụma, bụ́ onye si Munich, Germany, na-ekwu, sị: “E nwere otu onye nkụzi ihe ya na-amasị m karịsịa. O nwere ụzọ magburu onwe ya ọ na-esi akọwa ihe ndị dị nnọọ mgbagwoju anya n’ụzọ dị mfe. Ọ na-agba anyị ume ịjụ ajụjụ mgbe ihe na-edoghị anyị anya. Ọ bụghị onye na-adịghị enwe mmasị n’ebe mmadụ nọ, kama nke ahụ, o nwere omume enyi. Nke ahụ mere ka ihe ọmụmụ na-atọ ụtọ karị.”

Peter, bụ́ onye Australia, na-echeta otu onye nkụzi mgbakọ na mwepụ bụ́ onye, dị ka o kwuru, “nyeere anyị aka ịhụ ịdị mkpa nke ihe anyị na-amụ site n’inye anyị ihe atụ ndị dị irè. Mgbe anyị na-amụ ihe ọmụmụ trigonometry, o gosiri anyị otú e si atụ ịdị elu nke ụlọ n’ihe ọ̀tụ̀tụ̀ n’emetụghịdị ya aka, nanị site n’iji ụkpụrụ e ji arụ trigonometry. Echetara m mgbe m gwara onwe m, sị, ‘Nke ahụ bụ ya!’”

Pauline, bụ́ onye si n’ebe ugwu England, gwara onye nkụzi ya, sị: “Mgbakọ na mwepụ na-esiri m ike.” Ọ jụrụ Pauline, sị: “Ị̀ ga-achọ imekwu nke ọma? Apụrụ m inyere gị aka.” Pauline gara n’ihu ikwu, sị: “N’ime ọnwa ole na ole sochirinụ, o lebakwuuru m anya, ọbụna na-enyere m aka mgbe a gbasasịrị akwụkwọ. Amaara m na ọ chọrọ ka m nwee ihe ịga nke ọma—na o nwere mmasị inyere m aka. Ịmara nke a mere ka m rụsikwuo ọrụ ike, emeziwanyere m ihe.”

Angie, bụ́ onye si Scotland, onye dị afọ 30 na ụma ugbu a, na-echeta Maazị Graham, bụ́ onye na-akụziri ha akụkọ ihe mere eme. “O mere ka akụkọ ihe mere eme na-akpali nnọọ mmasị! Ọ na-akọ ihe ndị ahụ mere eme dị ka akụkọ, ọ na-ejikwa nnọọ ịnụ ọkụ n’obi akụzi isiokwu nke ọ bụla. O mere ka ha nile yie nnọọ ka hà na-eme n’ebe ahụ.” O jikwa mmasị na-echeta Oriakụ Hewitt, bụ́ onye nkụzi ya metụrụla agadi nke kụziiri ya ihe n’elemntrị nke mbụ. “Ọ dị obiọma ma na-echebara ndị mmadụ echiche. Otu ụbọchị na klas, agara m ịjụ ya otu ajụjụ. O kuliri m elu. O mere ka m nwee mmetụta na o nwere mmasị n’ezie n’ebe m nọ.”

Timothy, bụ́ onye si ndịda Gris, kwupụtara ekele ya. “M ka na-echeta onye nkụzi sayensị m. Ọ gbanwere kpam kpam echiche m banyere ụwa gbara m gburugburu nakwa banyere ndụ. O mere ka e nwee ọnọdụ dị ịtụnanya na nke na-eju anya n’ime klas. Ọ kụnyere n’ime anyị ọchịchọ siri ike maka ihe ọmụma na inwe mmasị maka nghọta.”

Ramona, bụ́ onye si California, U.S.A., bụ ihe atụ ọzọ. Ọ na-ede, sị: “Onye nkụzi m n’ụlọ akwụkwọ sekọndrị nwere nnọọ mmasị na Bekee. Ịnụ ọkụ n’obi ya mekwara ka anyị nwee ịnụ ọkụ n’obi! O mere ka ọbụna akụkụ ndị tara akpụ yie ka hà dị mfe.”

Jane, bụ́ onye si Canada, kwuru n’ụzọ kporo ọkụ banyere otu onye nkụzi na-akụziri ha mmụta mmega ahụ́ bụ́ onye “maara nnọọ ụzọ dị iche iche e si atụrụ ndụ nakwa amụ ihe. Ọ na-akpọ anyị aga ebe ndị mara ezigbo mma n’ime obodo ma kụziere anyị otú e si agba ọsọ n’elu snow nakwa otú e si akụ azụ̀ site n’oghere e mepere na ice dị n’elu mmiri. Ọbụna anyị mere bannock, bụ́ ụdị bred ndị India, n’elu ọkụ anyị kwara n’ụlọ ntu n’onwe anyị. Ihe ndị a nile bụ ahụmahụ magburu onwe ya nye nwa agbọghọ na-anọkarị n’ụlọ ma na-amụsi ihe ike!”

Helen bụ nwa agbọghọ na-eme ihere bụ́ onye a mụrụ na Shanghai, onye gakwara akwụkwọ na Hong Kong. Ọ na-echeta, sị: “Mgbe m nọ n’ụlọ akwụkwọ praịmarị nke ise, enwere m onye nkụzi, bụ́ Maazị Chan, bụ́ onye na-akụzi mmụta mmega ahụ́ na ise ihe. Adị m gịrịgịrị, amaghịkwa m akụ volleyball na basketball. O mechughị m ihu. O kwere ka m na-akụ badminton ma na-eme egwuregwu ndị ọzọ m maara eme. Ọ na-echebara mmadụ echiche, dịkwa obiọma.

“Otú ahụ ka ọ dịkwa n’ise ihe—amaghị m ese ihe ma ọ bụ mmadụ. Ya mere o kwere ka m na-ese ụkpụrụ, bụ́ ndị m maara ese. Ebe ọ bụ na m dị obere karịa ụmụ akwụkwọ ndị ọzọ, o mere ka m kweta ịnọ na klas ahụ otu afọ ọzọ. Ọ bụ mgbe ahụ ka e nwere oké mgbanwe n’agụmakwụkwọ m. Enwetara m obi ike ma nwee ọganihu. M ga-enwe ekele n’ebe ọ nọ mgbe nile.”

Olee ndị nkụzi yiri ka hà na-enwe mmetụta kasịnụ? William Ayers na-aza n’akwụkwọ ya bụ́ To Teach—The Journey of a Teacher, sị: “Nkụzi dị irè na-achọ karịsịa onye nkụzi na-echebara mmadụ echiche, nke nwere mmasị n’ebe mmadụ nọ ma jiri ndụ ụmụ akwụkwọ kpọrọ ihe. . . . Nkụzi dị irè adịghị adabere na nkà ma ọ bụ n’ụkpụrụ izi ihe, atụmatụ ma ọ bụ ihe omume ndị a kapịrị ọnụ. . . . Nkụzi na-adabere n’ụzọ bụ́ isi n’ịhụnanya.” Ya mere, ònye bụ onye nkụzi na-enwe ihe ịga nke ọma? O kwuru, sị: “Onye nkụzi nke ruru n’obi gị, onye nkụzi nke ghọtara gị ma ọ bụ nke nwere mmasị n’ebe ị nọ dị ka mmadụ, onye nkụzi nke mmasị o nwere maka ihe—egwú, mgbakọ na mwepụ, Latin, égbé—mere ka i nweekwa mmasị na mkpali maka ha.”

Obi abụọ adịghị ya na ọtụtụ ndị nkụzi enwetawo ekele site n’aka ụmụ akwụkwọ nakwa ọbụna ndị nne na nna, bụrụkwa ndị e si otú ahụ gbaa ume ịnọgide na-akụzi ihe n’agbanyeghị ihe ndọghachi azụ dị iche iche. Ihe a na-ekwukarị n’ọtụtụ okwu ndị ahụ bụ banyere ezi mmasị na obiọma onye nkụzi gosiri nwa akwụkwọ ahụ.

N’ezie, ọ bụghị ndị nkụzi nile na-egosipụta àgwà ọma dị otú ahụ. Anyị aghaghịkwa icheta na ndị nkụzi na-enwekarị ọtụtụ nrụgide bụ́ ndị na-ebelata ihe ha pụrụ imere ụmụ akwụkwọ ha. Nke a na-eduga anyị n’ajụjụ bụ́, Gịnị mere ndị mmadụ na-eji ahọrọ ọrụ dị otú ahụ tara akpụ?

[Foto dị na peeji nke 4]

“Nkụzi na-adabere n’ụzọ bụ́ isi n’ịhụnanya”