Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

N’ihi Gịnị Ka Ịnyịnya Ibu Ọhịa Ji Enwe Akara?

N’ihi Gịnị Ka Ịnyịnya Ibu Ọhịa Ji Enwe Akara?

N’ihi Gịnị Ka Ịnyịnya Ibu Ọhịa Ji Enwe Akara?

Ọ na-esiri ndị kwere n’evolushọn ike ikwu ihe mere ịnyịnya ibu ọhịa ji enwe akara. Ụfọdụ ndị echewo na ha pụrụ ịbụ ihe na-enye ịdọ aka ná ntị. Otú ọ dị, dị ka ihe àmà na-egosi, ọdụm na nnukwu anụmanụ ndị ọzọ na-eri anụmanụ ibe ha adịtụghị atụ akara ịnyịnya ibu ọhịa egwu.

Ndị ọzọ atụwo aro na akara ndị ahụ bụ ihe ndọrọ mmekọahụ. Otú ọ dị, ebe ọ bụ na ịnyịnya ibu ọhịa nile na-enwe otu ụdị akara ahụ, ebe ọ bụkwa na ma oké ma nne na-enwecha akara ahụ, nke a eyighị ka ọ ga-abụ eziokwu.

Ihe ọzọ e chepụtara bụ na ha nwetara akara ọcha na nke ojii ahụ iji nye aka gbochie okpomọkụ nke anwụ Africa. Gịnịkwanụ mere anụmanụ ndị ọzọ na-ejighị enwe akara?

Otu echiche nke zuru ebe nile bụ na ịnyịnya ibu ọhịa nwetara akara ya ka o jiri ha na-ezochi onwe ya. Ndị ọkà mmụta sayensị achọpụtawo na okpomọkụ na-arị elu nke ala dị larịị nke Africa na-eme ka a ghara ịdị na-ahụcha onyinyo ịnyịnya ibu ọhịa n’ezie, na-eme ka o sie ike ịnọ n’ebe dị anya hụ otu anya. Otú ọ dị, nzochi dị otú ahụ nke na-ewere ọnọdụ mgbe ha nọ n’ebe dị anya agaghị aba uru ebe ọ bụ na ọdụm, bụ́ onye iro bụ́ isi nke ịnyịnya ibu ọhịa, na-awakpo ha nanị mgbe ha nọ nso.

E kwuwokwa na mgbe ha nwere ọgba aghara, ìgwè ịnyịnya ibu ọhịa ahụ ndị ahụ́ ha bucha akara bụ́ ndị na-agba ọsọ na-emegharị ọdụm ndị na-achụ ha anya, na-eme ka o siere ha ike inwe ike ilekwasị otu anụmanụ anya. Ma, n’eziokwu, nnyocha ndị e mere banyere anụ ndị bi n’ọhịa egosiwo na ọdụm na-enwe nnọọ nkà ma na-adị irè n’ịchụ ịnyịnya ibu ọhịa dịkwa ka ha na-adị mgbe ha na-achụ anụmanụ ndị ọzọ.

Ihe na-eme ka okwu ahụ gbagwojukwuo anya bụ eziokwu ahụ bụ́ na akara nke ịnyịnya ibu ọhịa pụrụ ọbụna ịbụrụ ya ihe ọghọm mgbe ụfọdụ. N’abalị, mgbe ọ nọ n’ala dị larịị ndị ọnwa na-eti na ha, akara ọcha na nke ojii nke ịnyịnya ibu ọhịa na-eme ka e nwee ike ịhụ ya nke ọma karịa anụmanụ ndị ọzọ nwere nanị otu àgwà. Ebe ọ bụ na ọdụm na-achụkarị nta n’abalị, nke a yiri ka ọ̀ ga-eme ka ịnyịnya ibu ọhịa nọrọ n’ọnọdụ ọjọọ pụrụ iche.

Mgbe ahụ, olee ebe ịnyịnya ibu ọhịa si nweta akara ya? Isi ihe dị mkpa iji ghọta nke a dị n’okwu dị mfe bụ́: “Aka Jehova emewo nke a.” (Job 12:9) Ee, Onye Okike nke mere ka ihe ndị e kere eke nọ n’ụwa nwee ọdịdị na àgwà ndị pụrụ iche bụ́ ndị, n’ihi ọtụtụ ihe mmadụ na-apụghị ịghọtazu, kwadebere ha n’ụzọ magburu onwe ya maka ịdị ndụ. Ọdịdị dị ebube ihe ndị e kere eke nwegasịrị na-emezu nzube ọzọ. Ọ na-enye mmadụ obi ụtọ na ọṅụ. N’ezie, ịma mma nke ihe ndị e kere eke emewo ka ọtụtụ ndị taa nwee otu mmetụta ahụ Devid nwere ogologo oge gara aga: “Lee ka ọrụ Gị si baa ụba nke ukwuu, Jehova! N’amamihe ka I meworo ha nile: ụwa jupụtara n’ihe I nwetara.”—Abụ Ọma 104:24.