Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ị̀ Maara?

Ị̀ Maara?

Ị̀ Maara?

(A pụrụ ịchọta azịza nye ajụjụ ndị a n’akụkụ Bible ndị e zoro aka na ha, e bipụtakwara ndepụta zuru ezu nke azịza ha na peeji nke 14. Iji nwetakwuo ihe ọmụma, lee akwụkwọ bụ́ “Insight on the Scriptures,” nke Ndịàmà Jehova bipụtara.)

1. N’ihi gịnị ka Aịzaịa ji kwuo banyere ịtụfu ihe efu nile nke ọlaedo na nke ọlaọcha nye ụsụ n’ụbọchị Jehova? (Aịsaịa 2:20)

2. N’ihi gịnị ka e ji gwa ụmụ Izrel ka ha ghara iwesị ihe dị n’akụkụ ubi ha? (Levitikọs 19:9)

3. N’okpuru Iwu Mozis, gịnị ka a chọrọ ka mmadụ mee ma ọ bụrụ na o bibie anya ma ọ bụ kụpụ ezé nke ohu ya? (Ọpụpụ 21:26, 27)

4. Nanị ole mgbe ka ogbu mmadụ pụrụ ịhapụ obodo mgbaba? (Ọnụ Ọgụgụ 35:25)

5. Oge hà aṅaa gabigara site na mgbe Kọniliọs kpegaara Chineke ekpere ruo mgbe Pita bịarutere ịhụ ya? (Ọrụ 10:30-33)

6. Olee otú Pọl sịrị e kwesịrị isi mesoo “ndị na-akpata nkewa na ọnọdụ ndị na-akpata ịsụ ngọngọ”? (Ndị Rom 16:17)

7. Olee aka ọjọọ Setan kpara ahụ́ ike Job mgbe ọ na-agbalị ime ka Job mebie nguzosi ike n’ezi ihe ya? (Job 2:7)

8. Olee ebe ụmụ Izrel nọ mgbe ha riri mana na nke mbụ ya nakwa mgbe mbụ Iwu Ụbọchị Izu Ike ahụ malitere ịdị irè? (Ọpụpụ 16:1)

9. Gịnị ka Ihud ji gbuo Eze Eglọn nke Moab? (Ndị Ikpe 3:16)

10. Olee ógbè Rom ebe ọgbakọ asaa ahụ ndị Jọn zigaara ozi dị na ya? (Mkpughe 1:4)

11. Olee anụ a na-ejikarị akọwa Jizọs, n’ihi gịnịkwa? (Jọn 1:29)

12. Okwu dị aṅaa ka e ji akọwa mmiri ndị bịakọtara ọnụ nke ụwa bụ́ nke dị iche n’ala? (Habakuk 2:14)

13. Gịnị ka Noa ji techie ụgbọ ahụ ka mmiri ghara ịbanye na ya? (Jenesis 6:14)

14. Gịnị weere ọnọdụ n’eluigwe mgbe e chisịrị Kraịst eze? (Mkpughe 12:7)

15. Olee ndị na-eso ụzọ abụọ Jizọs zigara ka ha kwadebe ihe maka ememe Ngabiga ikpeazụ ya? (Luk 22:7-13)

16. N’elu anụmanụ dị aṅaa ka e buru n’amụma na Jizọs ga-anọkwasị banye na Jeruselem n’ụzọ mmeri? (Zekaraịa 9:9)

17. Olee ahụhụ a na-agba ndị umengwụ ume iṅomi? (Ilu 6:6)

18. Gịnị mere mgbe Pita ji mma agha ya mee ihe n’oge ọ na-anwa ichebe Jizọs? (Jọn 18:10)

19. Olee ihe ndị Farisii na-eji nlezianya azapụ iji zere ịbụ ndị rụrụ arụ n’ụzọ ọdịnala? (Matiu 23:24)

20. Ònye ka a maara dị ka onye sọpụụrụ ụmụ ya ndị ikom karịa Jehova? (1 Samuel 2:22, 29)

Azịza Nye Ajụjụ

1. N’ihi na ọ bụ nanị ebe gbara ọchịchịrị na ebe ruru unyi kwesịrị arụsị ndị dị otú ahụ, ọ bụghịkwa ebe dị ùgwù na nke a ma ama

2. Ka ndị ogbenye na ndị ọbịa wee nwee ihe ha ga-atụtụkọrọ

3. Ọ ga-eme ka ohu ahụ nwere onwe ya

4. Mgbe onyeisi nchụàjà nwụrụ

5. Ụbọchị anọ

6. Na-elegide ha anya ma na-ezere ha

7. O weere ihe ofifi ọjọọ tie Job n’ahụ́ ya nile

8. N’ọzara Sin

9. Mma agha nke nwere ọnụ abụọ

10. Eshia

11. Nwa atụrụ. N’ihi àjà Jizọs ji onwe ya chụọ

12. Oké osimiri

13. Bitumen

14. Agha nke mere ka a chụpụ Setan n’eluigwe

15. Pita na Jọn

16. Nwa ịnyịnya

17. Ndanda

18. O bepụrụ ntị aka nri nke Malkọs, bụ́ ohu nnukwu onye nchụàjà

19. Ahụhụ nta

20. Onyeisi nchụàjà bụ́ Ilaị