Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ịchọta Akụ̀ Ndị Dị Oké Ọnụ Ahịa n’Ọdụ Ụgbọ Mmiri Pel

Ịchọta Akụ̀ Ndị Dị Oké Ọnụ Ahịa n’Ọdụ Ụgbọ Mmiri Pel

Ịchọta Akụ̀ Ndị Dị Oké Ọnụ Ahịa n’Ọdụ Ụgbọ Mmiri Pel

SITE N’AKA ONYE EDEMEDE TETA! N’AUSTRALIA

BROOME bụ obodo dị n’ebe ugwu ọdịda anyanwụ Australia, nke nnukwu ájá na nnukwu mmiri gbara gburugburu. N’ebe ndịda ọwụwa anyanwụ ya, Ọzara Great Sandy gbasaruru n’ebe etiti Australia. N’ebe ọdịda anyanwụ ya, Oké Osimiri India gbatịpụrụ ruo Africa. Ajọ ifufe bụ́ cyclone na-efekarị n’akụkụ a dị n’ebe ugwu ọdịda anyanwụ nke kọntinent ahụ.

N’oge gara aga, n’ala oké osimiri nke ebe okpomọkụ Broome, e nwere ebe ndị oyster na-enwe pel jupụtara nke na a maara Broome dị ka Ọdụ Ụgbọ Mmiri Pel. Ndị ohi oké osimiri, ndị ohu, na ndị a ma ama n’ahịa pel socha n’akụkọ ihe mere eme na-akpali akpali nke Broome.

Nchọpụta Otu Onye Ohi Oké Osimiri Mere

Ọ bụ ezie na onye Netherland bụ́ Dirck Hartog nyochara akụkụ ụwa ebe a nke dịpụrụ adịpụ na 1616, a machaghị ihe banyere ụsọ oké osimiri ebe ọdịda anyanwụ Australia ahụ ruo 1688. N’afọ ahụ, onye England bụ́ onye na-ede akwụkwọ, onye na-ese ihe, nakwa onye ohi oké osimiri bụ́ William Dampier bịarutere n’ụsọ oké osimiri a na mberede mgbe ọ nọ n’ime ụgbọ mmiri ndị ohi oké osimiri bụ́ Cygnet. Mgbe ọ laghachiri n’ebe obibi ya, Dampier bipụtara akwụkwọ kọrọ ahụmahụ ndị o nwere. Ihe odide na ihe osise ya dọọrọ nnọọ mmasị nke ụmụ amaala ibe ya nke na Ndị Agha Mmiri Britain nyere ya ụgbọ mmiri ma nye ya ọrụ ịga mee njem nchọpụta na New Holland, dị ka e si mara Australia mgbe ahụ.

E lere njem Dampier ji ụgbọ mmiri ndị agha mmiri bụ́ Roebuck mee anya dị ka nke kụrụ afọ n’ala. Ọ dịghị ala ọhụrụ a chọpụtara, njem ụgbọ mmiri ahụ bịakwara ná njedebe mgbe ụgbọ mmiri ya na-esighịzi ike tiwara ma mikpuo n’ime mmiri. Dampier lanarịrị, n’ime ihe ndekọ ya banyere njem ya, o dere banyere nchọpụta nke mkpokoro pel.

Akụ̀ na Ụba Sitere n’Ọbara na Bọtịn

O were afọ 160 ọzọ tupu a mata abamuru nke nchọpụta Dampier mere. Na 1854, a malitere ịkpakọ pel n’ebe Dampier kpọrọ Ọnụ Mmiri Shark, ma atụmatụ a agachaghị nke ọma. Ka ọ dịgodị, na nso Ọnụ Mmiri Nichol, a chọtara nnukwute eju mmiri bụ́ oyster a kpọrọ Pinctada maxima. Mkpokoro nke eju mmiri a bụ́ oyster nke na-aha ka efere nri na-enye pel kasị mma n’ụwa—akụ̀ dị oké ọnụ a na-achọsi ike maka iji ya mepụta bọtịn.

Ka ọ na-erule 1890, a na-esite n’ógbè a dị na Broome nke eju mmiri bụ́ oyster jupụtara jiri ụgbọ mmiri na-eburu pel ruru ihe dị ka paụnd ndị England 140,000 aga England kwa afọ. Ọ bụ ezie na a na-ahụ ọtụtụ pel n’ime mkpokoro ndị ahụ, akụ̀ a dị oké ọnụ ahịa bụ nanị uru ntụkwasị. Ọ bụ mkpokoro ahụ n’onwe ya wetaara ndị mbụ a ma ama n’ahịa pel ihe ka ukwuu n’akụ̀ na ụba ha—akụ̀ na ụba a na-ejikarị ndụ ndị mmadụ enweta.

Na mbụ, ndị ahịa pel manyere ndị Aborigine bi n’ógbè ahụ ịghọ ndị na-achọ ihe n’ala mmiri iji chọta pel, bụ́ ọrụ ndị Aborigine bịara mụta nke ọma n’egbughị oge. Ma ịchọta pel n’ala mmiri bụ ọrụ dị ize ndụ, mmiri rikwara ọtụtụ ndị na-achọ ihe n’ala mmiri, azụ̀ shark gbukwara ọtụtụ n’ime ha. Ọtụtụ ndị na-achọ ihe n’ala mmiri nwụkwara n’ihi ọnọdụ ọrụ na-adịghị mma bụ́ nke ndị were ha n’ọrụ manyere ha ịrụ ọrụ na ya. Iji tinyekwuo ndị ọrụ n’ọnụ ọgụgụ ndị Aborigine na-arụ ọrụ, e si na Malaysia na Java bubata ndị na-achọ ihe n’ala mmiri. Mgbe eju mmiri oyster ndị dị n’ime mmiri ndị na-adịghị omimi gwụsịrị, e ruru n’ala mmiri ndị ka mie emi site n’enyemaka nke okpu e ji aga n’ala mmiri ndị e mepụtara n’oge na-adịbeghị anya.

Ego Akọọ “Sọdọm na Gọmọra”

Ìgwè ụgbọ mmiri ndị Broome ji achọ pel mụbara ruo ihe karịrị 400. Ọdịbendị ndị Eshia, ndị Europe, na ndị Aborigine nwere njikọ pụrụ iche bụ́ nke na-adịkarịghị abụ n’ụzọ iwu kwadoro. Otu onye na-achịkọta pel kọwara ọnọdụ a na-enwekarị n’oge ahụ nke ọma, sị: “Broome [bụ] ógbè bara ọgaranya, nke na-eme ajọ omume ma na-anabata ihe ọ bụla, bụ́ ebe a na-ewere ndọrọ ndị Ụkọchukwu na-adọrọkarị uche aga na Sọdọm na Gọmọra dị ka otuto nke na-egosi mmepeanya nke obodo, kama ịbụ ịdọ aka ná ntị banyere ntaramahụhụ Chineke ga-eweta n’ọdịnihu.”

Otú ọ dị, mgbe Agha Ụwa mbụ tiwapụrụ, ahịa ụwa maka pel kasị mma dara, ego kọkwara Broome na mberede. A tụteghachiri ahịa a ruo nwa oge n’agbata Agha Ụwa ndị ahụ, ma mgbe Agha Ụwa nke Abụọ gasịrị, ọdachi ọzọ dakwasịrị Broome. E mepụtara plastik, n’oge na-adịghịkwa anya, bọtịn ndị e ji plastik mee mere ka ọchịchọ a na-achọ pel belata.

‘Imepụta Pel Ndị Dị Oké Ọnụ Ahịa’

Mgbe Agha Ụwa nke Abụọ biri, ndị nnọchianya Australia gara n’ugbo ndị a na-azụ pel dị n’Ago, Japan. N’ebe ahụ, Kokichi Mikimoto enwewo nnọọ nkà n’ịzụlite pel site n’itinye ajịrịja ájá n’ime eju mmiri bụ́ oyster. Akwụkwọ bụ́ Port of Pearls na-ekwu na Mikimoto gwara ndị Australia ahụ na “a pụrụ ịzụlite ọbụna pel ndị ka mma n’osimiri mba ha ndị na-ekpo ọkụ n’ime mkpokoro [oyster] Australia buru ibu karị.” A gbasoro ndụmọdụ ya, n’afọ ndị nke 1970 kwa, oyster ndị e wetara n’Australia nọ na-emepụta ụfọdụ n’ime pel ndị a zụlitere azụlite bụ́ ndị kasị ibu na ndị kasị baa uru.

Ọ bụ ezie na pel ndị a zụlitere n’ọtụtụ akụkụ nke ụwa na-eru milimita 11 n’obosara, pel ndị e nwetara n’Oké Osimiri South pụrụ ibu ibu ruo milimita 18. Nanị otu eriri a ganyejuru pel ndị a buru ibu pụrụ iru ọnụ ego karịrị $500,000. Ka a sịkwa ihe mere a pụrụ iji jiri akụ̀ a dị oké ọnụ ahịa tụnyere daịamọnd ndị a na-achọta n’ala oké osimiri!

[Foto ndị dị na peeji nke 26, 27]

William Dampier

Onye na-achọ pel n’ala mmiri, ka ọ na-achịkọta mkpokoro pel na mmiri dị n’ụsọ osimiri ebe ugwu Broome

Ọkachamara, ka ọ na-ewepụta pel n’ime “oyster”

Otu n’ime ụgbọ mmiri ndị mbụ e ji achọ pel bụ́ nke a rụziri ka ọ na-agba n’oké osimiri

Pel na-enwe àgwà dịgasị iche iche (foto e mere ka o bukwuo ibu)

[Ebe E Sigasị Nweta Foto]

William Dampier: Site n’ikike nke Ọ́bá Akwụkwọ Mba Australia – Ihe Osise Rex Nan Kivell, NK550; onye na-achọ ihe n’ala mmiri: © C. Bryce - Lochman Transparencies; ihe olu na ọkachamara: Site n’ikike nke Ngalaba Na-ahụ Maka Ịkụ Azụ̀ WA, J. Lochman; ụgbọ mmiri: Site n’ikike nke Ngalaba Na-ahụ Maka Ịkụ Azụ̀ WA, C. Young; pel ndị e sere foto ka ha buo ibu: Site n’ikike nke Ngalaba Na-ahụ Maka Ịkụ Azụ̀ WA, R. Rose