Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ịnọkwu n’Ìhè n’Ehihie Na-eme Ka E Hie Ụra nke Ọma Karị n’Abalị

Ịnọkwu n’Ìhè n’Ehihie Na-eme Ka E Hie Ụra nke Ọma Karị n’Abalị

Ịnọkwu n’Ìhè n’Ehihie Na-eme Ka E Hie Ụra nke Ọma Karị n’Abalị

Ọ̀ NA-ESIRI gị ike ihi ụra? Nsogbu ahụ pụrụ ịbụ n’ihi anọghị n’ìhè gbachapụrụ agbachapụ n’ehihie, karịsịa ma ọ bụrụ na i mewo agadi. Na nso nso a, ndị nnyocha nọ na Japan nyochara ndị bi n’ebe a na-elekọta ndị ahụ́ na-esighị ike bụ́ ndị na-adịghị ehi ụra nke ọma, ha chọpụtakwara na ehighị ụra nke ọma nke ndị bi n’ebe ahụ bụ n’ihi ọnụnọ ha na-adịghị anọkebe n’ìhè dị n’èzí kwa ụbọchị. N’otu oge ahụ, nnyocha e nyochara ọbara ha na-egosi na ndị agadi a bi n’ebe ahụ nwere ọ̀tụ̀tụ̀ dị ala nke mmiri ọgwụ ahụ́ bụ́ melatonin.

Ọ bụ akụkụ ụbụrụ bụ́ pineal gland na-agbapụta melatonin. N’ọnọdụ kwesịrị ekwesị, mgbapụta ọ na-agbapụta melatonin kwa ụbọchị na-eme ka melatonin nke dị n’ọbara dị “ukwuu n’oge abalị ma na-afọdụ nke nta ka a ghara ịhụ ya n’oge ehihie,” ka akụkọ dị n’akwụkwọ bụ́ The Journal of Clinical Endocrinology & Metabolism na-ekwu. Otú ọ dị, mgbe ndị meworo agadi na-anọghị n’ìhè ruo ókè kwesịrị ekwesị n’oge ehihie, ọ̀tụ̀tụ̀ melatonin nke dị n’ọbara na-adalata. O yiri ka nke a ọ̀ na-eme ka ahụ́ ghara ịmata ọdịiche dị n’etiti ehihie na abalị, bụ́ nke ndị nnyocha kweere na ọ na-eme ka a ghara ihi ụra nke ọma.

Mgbe ndị agadi na-adịghị ehi ụra nke ọma nọrọ n’ìhè na-enwusi ike nke aka mere ruo awa anọ tupu ma ọ bụ mgbe etiti ehihie gasịrị (site n’elekere anya iri nke ụtụtụ ruo ehihe na site n’elekere anya abụọ nke ehihie ruo elekere anya anọ) ruo izu anọ, melatonin ụbụrụ ha na-agbapụta buru ibu “ruo n’ọ̀tụ̀tụ̀ ha ka nke ndị na-eto eto nọ n’ìgwè ọzọ e ji mee nnwale,” ka akụkọ ahụ na-ekwu. * N’otu oge ahụ, ha hiri ụra nke ọma karị.

Nchọpụta ndị a mere ka ndị nnyocha “chee na ndị agadi, karịsịa ndị agadi na-adịghị ehi ụra nke ọma, bụ́ ndị na-anọ n’ìhè dị n’ime ụlọ n’ihe ka ukwuu ná ndụ ha na-adị kwa ụbọchị, pụrụ inweta ìhè na-ezughị ezu iji chịkwaa usoro ihe ndị dị n’ime ahụ́ ha ji arụ ọrụ.” Ebe ọ bụ na ụfọdụ ndị agadi na-aṅụ ọgwụ ndị na-eme ka e nwekwuo melatonin n’ime ahụ́ iji nyere ha aka ihi ụra, akụkọ ahụ na-ekwu, sị: “N’ihi ihe na-adịghị mma pụrụ isi n’ịṅute ọgwụ na-enye melatonin aka pụta, ịnọrọ n’ìhè n’etiti ehihie pụrụ ịbụrụ ndị agadi na-adịghị ehi ụra nke ọma bụ́ ndị ụbụrụ ha na-adịghị agbapụta melatonin zuru ezu, ọgwụ dị mma, dị irè, na-adịghị ize ndụ, ma bụrụ nke mmadụ pụrụ ịchịkwa n’onwe ya karị.”

Ya mere, ọ bụrụ na ị na-anọ n’ime ụlọ n’ihe ka ukwuu n’ụbọchị, ị dịghịkwa ehi ụra nke ọma, gịnị ma ị gbalịa ịnọtụkwu n’èzí—ma ọ bụ ma ọ dịghị ihe ọzọ mee ka ìhè dị ukwuu bata n’ụlọ gị n’ehihie ruo n’ókè kwere mee, ma mee ka ọnụ ụlọ ihi ụra gị gbaa ọchịchịrị n’abalị. Ị pụrụ ịhụ na ịnọkwu n’ìhè n’ehihie na-eme ka e hie ụra nke ọma karị n’abalị.

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 4 Nnyocha ahụ gụnyere ìgwè abụọ e ji mee nnwale: ndị na-eto eto iri na ndị agadi iri ji ahụ́ bụ́ ndị ha na ndị ahụ na-adịghị ehi ụra nke ọma bi n’otu ebe ahụ a na-elekọta ndị ahụ́ na-esighị ike.