Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ịnagide Ihe Ịma Aka nke Ịbụ Nne

Ịnagide Ihe Ịma Aka nke Ịbụ Nne

Ịnagide Ihe Ịma Aka nke Ịbụ Nne

Ebe ọ bụ na ụmụaka na-anọchite anya ọgbọ na-abịa n’ihu, mgbe ahụ e kwesịrị n’ezie ịkwanyere ndị inyom na-akpụzi ha, bụ́ ndị nne ha, ùgwù, na-enye ha nsọpụrụ, na nkwado. N’agbanyeghị na ụwa nke oge a na-enye ihe ọmụma ndị na-emegiderịta onwe ha banyere ịbụ nne, Bible na-ekwusi ike na ụmụ bụ ngọzi sitere n’aka Chineke nakwa na ha pụrụ iwetara ndị mụrụ ha obi ụtọ. (Abụ Ọma 127:3-5) Ma, Akwụkwọ Nsọ adịghị eleghara ọnọdụ ndị a na-enwe n’ịbụ nne anya. Bible dekọrọ ọtụtụ n’ime ihe ịma aka ndị dị na ya.

Mkpebi ndị mụrụ ụmụ na-eme banyere ịzụ ụmụ na ịbụ nne na-enwe mmetụta miri emi na nke na-adịgide adịgide ná ndụ na n’àgwà ụmụ ha. Mkpebi ndị a pụrụ iweta mgbanwe ndị buru ibu n’ụzọ ndụ nke ndị mụrụ ụmụ, n’ihi ya ọ dị mkpa ka e jiri nlezianya mee ha. Ha na-agụnye ajụjụ ndị dị ka: Onye bụ́ nne ò kwesịrị ịrụ ọrụ ego? Ọ bụrụ na o kwesịrị, ruo ókè hà aṅaa? Ònye ga-elekọta ụmụaka mgbe nne ha pụrụ gaa ọrụ? N’ikpeazụ, ndị mụrụ ụmụ aghaghị ime ihe ha chere na ọ bụ ihe kasị mma maka ụmụ ha nakwa ihe ziri ezi n’anya Chineke.

Otú ọ dị, ọ dịghị ndị nne mkpa iche na ha nọ nanị ha ná mgbalị ha ime mkpebi ndị amamihe dị na ha. Ha pụrụ inweta nkasi obi dị ukwuu n’ihe e dere n’Aịsaịa 40:11, bụ́ nke na-egosi na Chineke na-egosi mmasị pụrụ iche ná mkpa nke ndị nne nwere ụmụ ọhụrụ, bụ́ ndị ọ “ga-ewere nwayọọ na-edu.” Chineke na-egosipụta ezigbo mmasị dị otú ahụ site n’inye ọtụtụ ụkpụrụ ndụzi n’ime Bible bụ́ ndị pụrụ ime ka ịbụ nne bụrụ ihe obi ụtọ na nke na-aga nke ọma.

Nwee ezi uche: Ndị Kraịst kwesịrị ịbụ ndị e ji inwe ezi uche mara. (Ndị Filipaị 4:5) Janet Penley, bụ́ onye edemede na nne, matara abamuru nke ụkpụrụ a. “Mgbe m ghọrọ nne enwere m atụmanya dị nnọọ elu,” ka ọ na-ekwu. “Agaje m ịbụ nne kasị mma e nwetụrụla. Agụrụ m akwụkwọ nile ma gee ndị ọkachamara nile ntị. Ma kama inwe mmetụta nke ịbụ onye nwere ihe ịga nke ọma na aka ochie, enwere m mmetụta nke ịbụ onye na-erughị eru ma nwee nchekasị.” O kwuru na “ịnwa imezu ihe ndị ọzọ tụrụ anya ya na ịnwa ịgbaso ụkpụrụ ụfọdụ ‘zuru okè’ na-egbu mmụọ ma na-akpata nchegbu na obi amamikpe.”

Na-eme ka ihe dị mfe: “Ihe ezinụlọ pụrụ ịtụfu n’ụzọ ndụ nke ime ihe oké ọkụ ọkụ,” ka magazin Newsweek na-ekwu, “bụ ahụmahụ pụrụ iche nke ịbụ nwata na ọṅụ nke ndụ ezinụlọ.” Ọ bụ ya mere ọtụtụ ndị bụ́ nne ji achọsi ndụ ka mfe ike. Olee otú ị pụrụ isi nweta ya? Nke mbụ, setịpụ ihe ndị ka mkpa, na-elebara “ihe ndị ka mkpa” anya, gụnyere oge na nlekọta onwe onye nke dị ụmụ gị mkpa. (Ndị Filipaị 1:10, 11) Nke abụọ, tụlee ụzọ ndụ gị. Ọ pụrụ ịbụ na ị ghaghị iwezụga ihe omume na ihe onwunwe ndị na-adịghị mkpa n’ezie n’ụsọ.

Gịnị kasị mkpa ná ndụ gị? Ọ̀ bụ inweta ihe nile otu mgbe, ka ị̀ pụrụ iyigharị ihe mgbaru ọsọ ụfọdụ ka ị na-achụso ndị ọzọ? Carolyn, bụ́ nne na-enwechaghị ihe, kwuru otú o si anagide ọnọdụ ya, sị: “Ana m eme ihe nile ka ha dị mfe ma belata mmefu ego.” Gloria, bụ́ nne ji ụmụ atọ, na-echeta, sị: “Anyị enweghị ego maka uwe ndị na-ewu ewu, ma akwaara m ụmụ m uwe, agwakwara m ha na ha pụrụ iche n’ihi na ọ dịghị onye ọzọ nwere ha.”

Okwu Chineke kwuru na onye “na-edebe nghọta ga-achọta ezi ihe.” (Ilu 19:8) Nghọta dị mkpa iji chọpụta nke dị mkpa n’ime ọtụtụ ihe omume ntụrụndụ, ngwá ụlọ eletrik, na ihe omume ndị na-erikpu ndị nne na ụmụntakịrị. Judith, bụ́ nne si South Africa, kwuru, sị: “Mgbe nile a na-ewepụtara anyị ihe ọhụrụ ndị e mepụtara, nkà na ụzụ ndị ka mma, na ihe ndị ọzọ a na-emere ndị mmadụ!” Lee otú Angela, bụ́ nne ji ụmụ anọ, onye si Germany, si anagide ihe ịma aka ahụ: “Ị ghaghị ikpebi ihe dị oké mkpa ma baara gị uru, ma nyere ụmụ gị aka ime otu ihe ahụ.”

Mee mgbanwe ndị ị pụrụ ime: “Nwee ezi uche na echiche ziri ezi,” ka Bible na-adụ ọdụ ya. (Ilu 3:21, Contemporary English Version) Ọ bụrụ na ị na-arụ ọrụ ego ka ọ dị ugbu a, ezinụlọ gị ọ̀ pụrụ ịdabere nanị n’ego di gị na-akpata? Iji nye aka zaa ajụjụ a, chọpụta ego ole na-afọdụ n’ụgwọ ọnwa gị n’ezie mgbe ị wepụsịrị ụtụ isi, ego ị na-akwụ maka ilekọta ụmụaka, ego ụgbọ, ego uwe, ego ị na-eji eri nri n’ụlọ nri, na mmefu ndị ọzọ. Ọzọkwa, a pụrụ ịna di gị ụtụ isi ka ukwuu site n’ego ọ na-akpata ma ọ bụrụ na ego unu abụọ na-akpata emee ka a gụnye unu ná ndị na-akpata ego buru ibu. Ọ pụrụ iju gị anya ịhụ na ihe fọdụrụnụ dị obere.

Ụfọdụ na-arụ ọrụ awa ole na ole ma ọ bụ n’ebe dị nso n’ụlọ, bụ́ nke pụrụ ịpụta ịkpata ego dị ala ma mee ka e nwee oge buru ibu karị isoro ụmụaka nọkọọ. Ọ bụrụ na i kpebie ịkwụsị ọrụ, ọ bụrụkwa na ọrụ gị dị gị mkpa iji nwee ùgwù onwe onye na afọ ojuju, chee echiche banyere ụzọ ị pụrụ isi nọgide na-enwe mmetụta ndị a mgbe ị nọ n’ụlọ.

Nweta enyemaka: Okwu Chineke gosiri ugboro ugboro na ‘ntiku maka enyemaka’ pụrụ ịrụpụta ihe. (Ọpụpụ 2:23, 24; Abụ Ọma 34:15) Mkpu enyemaka nke nne kwesịrị ime ka di ya nyere ya aka. Site ná nkwado ya unu pụrụ inwe ike isetịpụ usoro unu ga-esi kee ọrụ n’ụlọ ka unu wee nwee oge iji ruo ihe mgbaru ọsọ unu abụọ setịpụworo—dị ka isoro ụmụ unu na-anọkọ. Ọ bụrụ na ọ ga-ekwe mee, onye bụ́ nne kwesịkwara ịchọ enyemaka nke ndị ọzọ, gụnyere ndị ezinụlọ na ndị enyi ọ tụkwasịrị obi, bụ́ ndị ha na ya nwere otu ụdị mmasị na ihe mgbaru ọsọ.

Ọtụtụ ndị nne na-enweta nkwado bara uru site n’aka ọgbakọ Ndị Kraịst nke ndị kwere ekwe ibe ha bụ́ nke dị n’ógbè ha. María, bụ́ nne nke ji ụmụ atọ, ghọtara na “isoro ọgbakọ na-akpachi anya” bụ otu n’ime ụzọ ndị “Chineke na-esi egosi anyị ịhụnanya na ọmịiko ma na-egosi anyị na ọ na-eche banyere anyị.”

Wepụta oge maka ntụrụndụ: Ọbụna Jizọs, bụ́ nwoke zuru okè nke nwere nnọọ ume, gwara ndị na-eso ụzọ ya ka ha gaa ‘nanị ha n’ebe ndị mmadụ na-adịghị anọkarị ma zurutụ ike.’ (Mak 6:30-32) Inwe ihe ịga nke ọma dị ka nne dabeere n’ikike i nwere ime ihe ruo n’ókè kwesịrị ekwesị n’oge ndị na-achọ ihe dị ukwuu n’aka gị. Ọ bụ eziokwu na ụmụ gị chọrọ gị, ma ha chọkwara ka i nwee obi ụtọ na afọ ojuju. Ntụrụndụ na-agabigaghị ókè dị gị mkpa.

Angela, bụ́ onye a kpọtụrụ aha ná mbụ, mere ndokwa maka ntụrụndụ: “Ana m ewepụta oge dị jụụ n’ụtụtụ. Ana m ewepụtara onwe m ma ọ dịkarịa ala ọkara awa. Mụ na di m na-enwekwa otu uhuruchi ma ọ bụ abụọ n’izu bụ́ mgbe ụmụ anyị kwesịrị ịga ebe ọzọ n’ụlọ anyị ma mee ihe n’ebe ahụ n’emeghị mkpọtụ. Anyị pụrụ isi otú ahụ nwee otu awa maka onwe anyị.”

Bute ọnọdụ ime mmụọ ụzọ: A chọpụtawo na enwekwaghị nzube na ebuteghị ihe ndị ka mkpa ụzọ na-eme ka ihe ịma aka dị iche iche nke ịbụ nne ka njọ. Ezinụlọ Ndị Kraịst na-enwe obi ụtọ mgbe ha tinyekọtara mgbalị ọnụ iji bute uche Chineke ụzọ ná ndụ ha. Pọl onyeozi dere, sị: “Nsọpụrụ Chineke bara uru maka ihe nile, ebe o nwere nkwa maka ndụ dị ugbu a na nke ahụ gaje ịbịa.” (1 Timoti 4:8) Ezinụlọ nke na-ebi ndụ ná nsọpụrụ Chineke ma na-agbaso nduzi Chineke ndị dị na Bible ga-enwe obi ụtọ. Ọ bụrụgodị na ọ bụ nanị otu onye n’ime ezinụlọ na-etinye ụkpụrụ Bible n’ọrụ, ihe na-adị mma karịa mgbe ọ na-adịghị onye na-etinye ụkpụrụ Bible n’ọrụ.

Adele, onye bụ́ nne bụ́ Onye Kraịst nke na-arụ ọrụ oge nile, ahụwo abamuru nke iji ihe ime mmụọ akpọrọ ihe. Ọ na-ekwu, sị: “Anyị nwere ọtụtụ nduzi na ihe ọmụma n’akwụkwọ ndị dabeere na Bible bụ́ ndị na-eme ka anyị mara ihe ụmụ anyị na-eche ihu na otú anyị pụrụ isi nyere ha aka. Ịhụ ka ụmụ gị na-anabata ihe ị na-enye ha n’ụzọ ime mmụọ na-eme ka o kwesị mgbalị i tinyere. Mgbe ị hụrụ ụmụ obere ihe ndị dị mma n’àgwà ha na ụzọ ha si eche echiche, ị na-aghọta na ha na-anabata nduzi gị nakwa na mgbalị gị na-arụpụta ihe dị mma.” *

Ee, ọ pụrụ ikwe mee imeri ihe isi ike nke ịbụ nne. Chineke n’onwe ya na-enye mmesi obi ike nke na-akasi obi na mgbalị nke ndị nne dị uchu, na-achụkwa onwe ha n’àjà bụ́ ndị tụkwasịrị ya obi agaghị abụ na nkịtị. Ndị nne bụ́ ndị na-eso ya enwe mmekọrịta pụrụ inweta nkasi obi ná nkwa o kwere ‘inye onye dara mbà ike.’—Aịsaịa 40:29.

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 16 Ndịàmà Jehova ebipụtawo ọtụtụ akwụkwọ dabeere na Bible bụ́ ndị a haziri maka ịzụ ụmụaka. Ha gụnyere Akwukwọm nke Akukọ Bible, Ajụjụ Ndị Na-eto Eto Na-ajụ—Azịza Ndị Na-adị Irè, na Isi Ihe Na-akpata Obi Ụtọ Ezinụlọ.

[Igbe dị na peeji nke 10]

Mmetụta nke Otu Nne Nwere n’Ahụ́ Nwa Ya.

Dị ka nne, mgbe ụfọdụ ị pụrụ ịdị na-eche otú i si enwe mmetụta ná ndụ nwa gị. Mgbe ụfọdụ, mmetụta nke ndị ọgbọ, ndị nkụzi, ntụrụndụ, egwuregwu vidio, na egwú pụrụ iyi ka hà karịrị nke gị.

Tụlee ihe atụ nke Jokebed, bụ́ nne Mozis. O biri n’oge ihe siri oké ike, o nwechaghịkwa ọnụ n’ihe banyere ihe ga-eme nwa ya nwoke. Ma, o jiri ohere ndị o nwere mee ihe iji duzie uto ya. Nke mbụ, o gosiri okwukwe obi ike site n’ịjụ ikwe ka e gbuo Mozis. Chineke nyere ya ụgwọ ọrụ maka okwukwe ya ọ bụghị nanị site n’ichekwa ndụ nwa ọhụrụ ahụ kamakwa site n’ime ndokwa maka ọnọdụ ndị mere ka Jokebed bụrụ onye na-azụ ya—na nne ya.—Ọpụpụ 1:15, 16; 2:1-10.

Ọ pụtara ìhè na Jokebed nyere aka ịkpụzi àgwà nwa ya nwoke. Eziokwu ahụ bụ́ na Mozis bụ́ onye toworo eto sooro ndị Hibru na Chineke ha na-enwe mmekọrịta n’agbanyeghị ịbụ onye sitere n’ezinụlọ Eze n’Ijipt bụ ihe àmà na-egosi mmetụta ndị mụrụ ya nwere n’ahụ́ ya mgbe ọ na-eto eto.—Ndị Hibru 11:24-26.

Dị ka nne, ma eleghị anya i nwere ohere ịkpụzi nwa gị karịa otú Jokebed nwere. Ị̀ na-eji afọ ole na ole mgbe obere nwa gị bụ nwata eme ihe iji nye ya ntụziaka ga-adịgide adịgide, nke nsọpụrụ Chineke? Ka ị̀ na-ekwe ka nkwenkwe, omenala, na ihe omume ndị jupụtara ebe nile na-emetụta uto nwa gị?

[Foto ndị dị na peeji nke 10]

Mee ka ndị ọzọ sonye n’ọrụ ụlọ, wepụta oge unu ga-anọrọ nanị unu, ma bute ihe ime mmụọ ụzọ